Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-ekwu Eziokwu

Na-ekwu Eziokwu

“Na-agwanụ ibe unu eziokwu.”—ZEK. 8:16.

ABỤ: 56, 124

1, 2. Olee ihe kacha kpaa ụmụ mmadụ aka ọjọọ? Olee onye o si n’aka?

ỤFỌDỤ ihe ndị mmadụ mepụtarala emeela ka ihe dịtụrụ anyị mma. Ha bụ telefon, ụgbọala, frig, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ma, ihe ọhụrụ ndị ọzọ e mepụtara akpatarala ụmụ mmadụ ezigbo nsogbu. Ha bụ nsí égbè, ogbunigwe, sịga, bọmb atọm, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. Ma, e nwere ihe dịrịla adị tupu e mepụta ihe ndị a. Ọ bụ ihe a kacha kpaa ụmụ mmadụ aka ọjọọ. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ụgha. Ụgha bụ mmadụ ikwu ihe ọ maara na ọ bụghị eziokwu iji duhie mmadụ. Olee onye mbụ ghara ụgha? Ọ bụ Ekwensu. Jizọs kpọrọ ya “nna ụgha.” (Gụọ Jọn 8:44.) Olee mgbe ọ ghara ụgha a?

2 Ọ ghara ụgha a ọtụtụ puku afọ gara aga n’ogige Iden. Adam na Iv nọ na-ekpori ndụ na Paradaịs mara mma Jehova kere ka ha biri na ya. Chineke gwara ha na ọ bụrụ na ha erie “mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ,” na ha ga-anwụ. Ọ bụ eziokwu na Setan ma ihe a Chineke gwara ha, o ji agwọ gwa Iv okwu. Ọ sịrị ya: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.” Ihe a bụ ụgha mbụ. Setan gwakwara ya, sị: “Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.” —Jen. 2:15-17; 3:1-5.

3. Gịnị mere e nwere ike iji kwuo na ụgha ahụ Ekwensu ghaara Iv gosiri na Ekwensu dị obi ọjọọ? Olee nsogbu ọ kpatarala?

3 Ụgha ahụ Ekwensu ghaara Iv gosiri na Ekwensu dị obi ọjọọ. O doro ya anya na Iv kweta ihe o kwuru ma rie mkpụrụ osisi ahụ na ọ ga-anwụ. Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi ma mechaa nwụọ. (Jen. 3:6; 5:5) Ihe ọzọ bụ na mmehie a Adam mere mere ka ‘ọnwụ gbasaa ruo mmadụ niile.’ Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na “ọnwụ chịrị dị ka eze . . . , ọbụna chịa ndị na-emeghị mmehie nke yiri mmebi iwu Adam.” (Rom 5:12, 14) Ọ bụ ya mere na anyị ezughị okè, anyị anaghịkwa adị ndụ ebighị ebi bụ́ ihe Chineke bu n’obi kee anyị. Kama, anyị na-ebi naanị ihe dị ka ‘afọ iri asaa, ọ bụrụkwa na anyị enwee ike pụrụ iche, anyị na-adị afọ iri asatọ,’ ndụ anyị ‘jupụtakwara ná nsogbu na ihe ọjọọ.’ (Ọma 90:10) Ihe a niile mere n’ihi ụgha ahụ Ekwensu ghara.

4. (a) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịmata azịza ha? (b) Olee onye Abụ Ọma 15:1, 2 kwuru ga-abụ enyi Jehova?

4 Jizọs kwuru banyere Ekwensu, sị: “O guzosighịkwa ike n’eziokwu, n’ihi na eziokwu adịghị n’ime ya.” Setan agbanwebeghị, n’ihi na ọ ka ji ụgha ya “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpu. 12:9) Anyị achọghị ka Setan duhie anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịmata azịza ajụjụ atọ dị mkpa. Ha bụ, olee otú Setan si eduhie ndị mmadụ? Gịnị mere ndị mmadụ ji aghakarị ụgha? Ọ bụrụ na anyị achọghị ka anyị na Chineke kwụsị ịdị ná mma otú Adam na Iv mere, olee otú anyị ga-esi ‘na-ekwu eziokwu’ mgbe niile?—Gụọ Abụ Ọma 15:1, 2.

OTÚ SETAN SI NA-EDUHIE NDỊ MMADỤ

5. Olee otú Setan si na-eduhie ndị mmadụ taa?

5 O doro Pọl onyeozi anya na anyị ga-agbali mbọ mee ka ‘Setan ghara ịghọgbu anyị, n’ihi na anyị abụghị ndị na-amaghị atụmatụ ya.’ (2 Kọr. 2:11) Anyị ma na ọ bụ Setan na-achị ụwa a. Okpukpe ụgha, ndị ọchịchị na-arụrụ aka, na ndị ahịa ji anyaukwu achụ ego so ná ndị ọ na-achị. (1 Jọn 5:19) N’ihi ya, o jughị anyị anya na Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eme ka ndị ọnu na-eru n’okwu “na-ekwu okwu ụgha.” (1 Tim. 4:1, 2) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị oji ego achụ nta ego na-agha ụgha ma ha kpọsawa ngwá ahịa ha ka ha nwee ike ire ngwá ahịa ndị na-adịghị mma ma ọ bụkwanụ iji ghọgbuo ndị mmadụ ma napụta ha ego.

6, 7. (a) Gịnị mere o ji jọgbuo onwe ya ma ndị isi okpukpe na-agha ụgha? (b) Olee ụgha ndị ị nụrụla ndị isi okpukpe na-agha?

6 Ọ jọgburu onwe ya ma ndị isi okpukpe na-aghara ndị mmadụ ụgha. Maka gịnị? Ọ bụ maka na mmadụ kwere n’ozizi ụgha ha na-akụzi ma na-eme ihe Chineke kpọrọ asị, o nwere ike ime ka ndụ ebighị ebi kwaa onye ahụ. (Hos. 4:9) Jizọs ma na ndị isi okpukpe e nwere n’oge ya nọ na-eduhie ndị mmadụ. Ọ gwara ha okwu ihu na ihu, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! n’ihi na unu na-agafe oké osimiri na ala akọrọ iji tọghata otu onye, mgbe ọ ghọkwara onye a tọghatara, unu na-eme ka o jiri okpukpu abụọ ghọọ onye a ga-atụba na Gehena [ya bụ, mbibi ebighị ebi] karịa unu.” (Mat. 23:15) Jizọs katọsiri ndị isi okpukpe ụgha ndị ahụ ike. N’eziokwu, ha ‘si ná nna ha bụ́ Ekwensu, bụ́ ogbu mmadụ.’—Jọn 8:44.

7 E nwere ọtụtụ ndị isi okpukpe n’ụwa taa. E nwere ike ịna-akpọ ha ndị pastọ, ndị ụkọchukwu, ndị rabaị, ma ọ bụ utu aha ndị ọzọ. Ha dị ka ndị isi okpukpe e nwere n’oge ndịozi Jizọs. Ha “na-ekpuchi eziokwu” si n’Okwu Chineke, ma ‘jiri eziokwu nke Chineke gbanwere okwu ụgha.’ (Rom 1:18, 25) Ha na-akụziri ndị mmadụ ozizi ụgha ndị dị ka “onye a zọpụtara, a zọpụtachaala ya,” mkpụrụ obi anwụghị anwụ, na ịlọ ụwa. Ha na-akụzikwara ndị mmadụ echiche iberiibe bụ́ na Chineke kwadoro ka nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị na-enwe mmekọahụ, kwadokwa nwoke ịlụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ịlụ nwaanyị.

8. Olee ụgha anyị na-atụ anya na ndị ọchịchị ga-agha n’oge na-adịghị anya? Olee ihe anyị kwesịrị ime?

8 Ndị ọchịchị na-aghara ndị mmadụ ụgha iji megharịa ha anya. Otu n’ime okpookpo ụgha ha ga-agha n’oge na-adịghị anya bụ na ha emeela ka e nwee “udo na obi iru ala.” Ma “mgbe ahụ ka mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya.” N’ihi ya, anyị ekwesịghị ikwere ihe ahụ ndị ọchịchị ga na-ekwu. Ha agaghị na-agwa ndị mmadụ eziokwu na ụwa a nọ n’ọnọdụ jọgburu onwe ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị “maara nke ọma na ụbọchị Jehova na-abịa kpọmkwem dị ka onye ohi si abịa n’abalị.”—1 Tesa. 5:1-4.

IHE MERE NDỊ MMADỤ JI AGHAKARỊ ỤGHA

9, 10. (a) Gịnị mere ndị mmadụ ji agha ụgha? Olee nsogbu ọ kpatarala? (b) Olee ihe anyị kwesịrị icheta gbasara Jehova?

9 Ọ bụrụ na ihe ọhụrụ amalite iwu ewu, a na-emepụtazi ya ka ọ bụrụ atụrụ tawa. Otú ahụ ka ọ dịkwa ụgha ndị mmadụ na-agha. Ọtụtụ mmadụ na-aghakarị ụgha taa, ọ bụghịkwa naanị ndị ọnụ na-eru n’okwu na-agha ụgha iji duhie ndị ọzọ. N’isiokwu bụ́ “Ihe Mere Anyị Ji Agha Ụgha,” nke otu nwoke aha ya bụ Y. Bhattacharjee dere, o kwuru, sị: “Ụgha abaala ndị mmadụ n’ọbara.” Ihe ọ pụtara bụ na ndị mmadụ na-eche na o nweghị ihe dị njọ n’ịgha ụgha. Ndị mmadụ na-aghakarị ụgha iji chebe onwe ha. O nwere ike ịbụ ka ha kpuchie ihe ha mejọrọ ma ọ bụ mpụ ndị ha mere. Ha na-aghakwa ụgha iji nweta ego ma ọ bụ iji nweta ihe ga-abara ha uru. Isiokwu ahụ kwukwara na ọ naghị esiri ụfọdụ ndị ike ịghara “ndị ha na-amaghị ndị ha bụ, ndị ọrụ ibe ha, ndị enyi ha, nakwa ndị ha hụrụ n’anya ụgha.”

10 Olee ihe ụgha a niile kpatarala? O meela ka ndị mmadụ kwụsị ịtụkwasị ibe ha obi, meekwa ka enyi na enyi tisaa. Dị ka ihe atụ, chegodị otú obi ga-esi agbawa nwoke ma ọ chọpụta na nwunye ya kwara iko ma ghaara ya ụgha iji kpuchie ihe o mere. Ma ọ bụ chegodị otú o si jọgbuo onwe ya ma nwoke na-emekpọ nwunye ya na ụmụ ya ọnụ, ma ya pụta n’ihu ọha, ya emee ka ezigbo mmadụ. Ma, anyị kwesịrị icheta na ụdị ndị a enweghị ike ịghọgbu Jehova, n’ihi na “ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe” n’anya ya.—Hib. 4:13.

11. Olee ihe ihe ọjọọ Ananayas na Safaịra mere na-akụziri anyị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

11 Di ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị otú ‘Setan si mee ka obi sie’ otu di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ike ịghara Chineke ụgha. Ananayas na Safaịra kpara nkata n’obi ha ịghọgbu ndịozi. Ha rere ụfọdụ ihe onwunwe ha ma wetara ndịozi ụfọdụ ego ha retara. Ha chọrọ ka a na-eto ha n’ọgbakọ, n’ihi ya, ha gwara ndịozi na ha wetachara ego niile ha retara. Ma, Jehova ma na ha ghara ụgha, ma gbuo ha.—Ọrụ 5:1-10.

12. Gịnị ga-eme ndị ụgha niile obi tara mmiri, bụ́ ndị na-achọghị ichegharị? N’ihi gịnị?

12 Olee otú Jehova si ele ịgha ụgha anya? Ndị ụgha niile obi tara mmiri, bụ́ ndị na-achọghị ichegharị, ga-aba “n’ime ọdọ ọkụ” ka Setan. (Mkpu. 20:10; 21:8; Ọma 5:6) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova weere ndị a na-agha ụgha otú ahụ o si were onye ọ bụla na-akpa àgwà ka “nkịta,” ya bụ, ndị na-akpa àgwà na-asọ oyi n’anya Jehova.—Mkpu. 22:15.

13. Olee ihe anyị ma gbasara Jehova? Olee ihe nke ahụ ga-eme ka anyị mee?

13 Anyị ma na Jehova “abụghị mmadụ nke na ọ ga-agha ụgha.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ‘ọ gaghị ekwe omume Chineke ịgha ụgha.’ (Ọnụ Ọgụ. 23:19; Hib. 6:18) ‘Jehova kpọrọ ire na-agha ụgha asị.’ (Ilu 6:16, 17) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị ya mma, anyị kwesịrị ikwu eziokwu mgbe niile. Ọ bụ ya mere na anyị ‘anaghị aghara ibe anyị ụgha.’—Kọl. 3:9.

ANYỊ ‘NA-AGWA IBE ANYỊ EZIOKWU’

14. (a) Olee ihe mere ezigbo Ndị Kraịst ji dị iche ná ndị nọ n’okpukpe ụgha? (b) Kọwaa ihe e kwuru na Luk 6:45.

14 Olee otu ụzọ ezigbo Ndị Kraịst si dị iche ná ndị nọ n’okpukpe ụgha? Ọ bụ n’ihi na anyị ‘na-agwa ibe anyị eziokwu.’ (Gụọ Zekaraya 8:16, 17.) Pọl kwuru, sị: “Anyị na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke, . . . site n’okwu bụ́ eziokwu.” (2 Kọr. 6:4, 7) Jizọs kwuru na ‘ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.’ (Luk 6:45) N’ihi ya, ọ bụrụ na ezigbo mmadụ ana-ekwu eziokwu n’obi ya, ihe ọ ga na-ekwu ga-abụ eziokwu. Ọ ga na-agwa ndị ọ na-amaghị ndị ha bụ, ndị ọrụ ibe ya, ndị enyi ya na ndị ọ hụrụ n’anya eziokwu. Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi gosi na anyị na-agbalị ikwu eziokwu n’ihe niile.

Ò nwere ihe dị njọ ị hụrụ n’otú nwanna nwaanyị a si ebi ndụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15, na nke 16)

15. (a) Gịnị mere ọ dịghị mma ime ihe ọjọọ na nzuzo? (b) Olee ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ka ha ghara ime ihe ọjọọ ndị ọgbọ ha na-eme? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji.)

15 Ị̀ bụ onye na-eto eto chọrọ ka ị dị ka ndị enyi gị? Kpachara anya ka ị ghara ime ihe ụfọdụ n’ime ha merela, ya bụ, ime ihe ọjọọ na nzuzo. Ha na-eme ka ndị ezigbo mmadụ ma ha na ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị ọgbakọ ha nọrọ, na-akpakwanụ àgwà ọjọọ ma ha na ndị enyi ha ndị ụwa nọrọ ma ọ bụ mgbe ha nọ n’Ịntanet. Ha nwere ike na-ekwu okwu iberiibe, na-eyi uwe ndị na-ekwesịghị ekwesị, na-ege egwú na-adịghị mma, na-aṅụbiga mmanya ókè, na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, ha na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ana-akpa na nzuzo, ma ọ bụkwanụ na-eme ihe ọjọọ ndị ọzọ. Ha na-aghara ndị mụrụ ha, ụmụnna ha, nakwa Jehova ụgha. (Ọma 26:4, 5) Jehova ma mgbe anyị ‘ji egbugbere ọnụ anyị na-asọpụrụ ya, ma obi anyị dị nnọọ anya n’ebe ọ nọ.’ (Mak 7:6) Ọ kacha mma ime ihe a Ilu kwuru. Ọ sirị: “Ka obi gị ghara inwere ndị mmehie anyaụfụ, kama na-atụ egwu Jehova ogologo ụbọchị dum.”—Ilu 23:17. *

16. Olee otú anyị kwesịrị isi aza ajụjụ mgbe anyị na-edejupụta akwụkwọ anyị chọrọ iji abanye n’ozi oge niile?

16 O nwere ike ịbụ na ị chọrọ ịbụ ọsụ ụzọ oge niile ma ọ bụ ịbanye n’ozi oge niile pụrụ iche, dị ka ije ozi na Betel. Mgbe ị na-edejupụta akwụkwọ i ji abanye, ọ dị mkpa ka ị zaa ihe bụ́ eziokwu n’ajụjụ niile a jụrụ ebe ahụ n’ihe gbasara ahụ́ ike gị, ụdị ihe ndị i ji atụrụ ndụ, nakwa àgwà gị. (Hib. 13:18) Ọ bụrụkwanụ na e nwere àgwà ọjọọ ị kpara, nke ị na-agwabeghị ndị okenye? Gwa ha ka ha nyere gị aka ka i nwee ike iji akọnuche dị ọcha na-ejere Jehova ozi.—Rom 9:1; Gal. 6:1.

17. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ndị na-emegide anyị gbaa anyị ajụjụ banyere ụmụnna anyị?

17 Olee ihe i kwesịrị ime ma ndị ọchịchị machibido ọrụ anyị iwu n’ebe i bi, nwụchie gị ma jụọ gị ajụjụ banyere ụmụnna gị? Ì kwesịrị ịgwa ha ihe niile ị ma banyere ha? Gịnị ka Jizọs mere mgbe gọvanọ Rom na-agba ya ajụjụ? E nwere mgbe Jizọs na-ekwughị ihe ọ bụla. O mere ihe a Baịbụl kwuru, nke sịrị: “Oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekli. 3:1, 7; Mat. 27:11-14) Ọ bụrụ na anyị anọrọ n’ụdị ọnọdụ a, anyị kwesịrị ịdị akọ ka anyị ghara itinye ụmụnna anyị ná nsogbu.—Ilu 10:19; 11:12.

Olee otú ị ga-esi ekpebi mgbe ị ga-agba nkịtị na mgbe ị ga-ekwu eziokwu? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17 na nke 18)

18. Gịnị ka anyi kwesịrị ime ma ndị okenye jụọ anyị ajụjụ gbasara ụmụnna anyị?

18 Ọ bụrụkwanụ na ị ma na nwanna gị na ya nọ n’ọgbakọ mere mmehie dị oké njọ? Ndị okenye, bụ́ ndị ọrụ ha bụ ime ka ọgbakọ dịrị ọcha nwere ike ịjụ gị ihe ị ma banyere ya. Olee ihe ị ga-eme, nke ka nke, ma ọ bụrụ na nwanna ahụ bụ ezigbo enyi gị ma ọ bụ onye ikwu gị? Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-ekupụ ikwesị ntụkwasị obi dị ka ume ga-ekwu ihe ziri ezi.” (Ilu 12:17; 21:28) N’ihi ya, i kwesịrị ịgwa ndị okenye eziokwu niile, ọ bụghị izochiri ha ihe ụfọdụ. Ndị okenye kwesịrị ịma ihe niile ka ha nwee ike ikpebi ụzọ kacha mma ha ga-esi nyere nwanna ahụ aka ka ya na Jehova dịghachi ná mma.—Jems 5:14, 15.

19. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?

19 Devid gwara Jehova, sị: “Eziokwu nke dị n’ime obi mmadụ na-atọ gị ụtọ.” (Ọma 51:6) Devid ma na ikwu eziokwu na-esi n’obi anyị. Ezigbo Ndị Kraịst ‘na-agwa ibe ha eziokwu’ n’ihe niile ha na-eme ná ndụ. Ebe anyị bụ ndị ozi Chineke, ụzọ ọzọ anyị ga-esi egosi na anyị dị iche bụ ịkụziri ndị mmadụ eziokwu si na Baịbụl. Anyi ga-atụle otú anyị ga-esi eme ya n’isiokwu na-eso nke a.

^ para. 15 Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Otú M Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ M Na-enye M?,” na isiokwu bụ́, “Ọ Bụrụ na M Na-ebi Ndụ Ihu Abụọ, Ònye Ka M Kwesịrị Ịgwa?” Ha dị n’isi nke 15 na nke 16 n’akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2.