ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Septemba 2018

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Ọktoba 29 ruo Disemba 2, 2018

‘Unu Maara Ihe Ndị A, Unu Ga-enwe Obi Ụtọ ma Unu Na-eme Ha’

Olee otú anyị ga-esi na-adị umeala n’obi, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị na-eme otú ahụ?

Ndị Kraịst Merala Agadi Jehova Ji Ozi Unu Na-ejere Ya Kpọrọ Ihe

Olee otú Ndị Kraịst merela agadi sirila gosi na ha dị umeala n’obi?

Na-ahụ Ndị Ọzọ n’Anya n’Ihi na Ọ Na-ewuli Ha Elu

Chọpụta otú anyị ga-esi na-eme ka okwukwe ibe anyị sie ike n’oge a tara akpụ.

Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Na-efe “Chineke Bụ́ Onye Obi Ụtọ”

Olee otú anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị na-enwe?

Ị̀ Ma Ihe Na-akụnụ?

Olee otú ndị mmadụ si ama ihe na-akụnụ n’oge Baịbụl?

Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nke Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche

Olee ihe magburu onwe ya Jehova mere iji gosi na ya na-echebara ndị ọzọ echiche?

Dịrị Obiọma ma Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche Ka Jehova

Mụta ihe ndị ị ga-eme ka ị na-echebara ndị ọzọ echiche n’ezinụlọ, n’ogbakọ nakwa n’ozi ọma.