Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Dịrị Obiọma ma Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche Ka Jehova

Dịrị Obiọma ma Na-echebara Ndị Ọzọ Echiche Ka Jehova

“Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe.”​—⁠ỌMA 41:⁠1.

ABỤ: 130, 107

1. Olee otú ndị na-efe Chineke si egosi na ha hụrụ ibe ha n’anya?

NDỊ na-efe Chineke n’ụwa niile bụ otu ezinụlọ hụrụ ibe ha n’anya. (1 Jọn 4:​16, 21) Mgbe ụfọdụ, ha na-ahapụ ihe ụfọdụ dị ha mkpa n’ihi ụmụnna ha. Ma ọtụtụ mgbe, ha na-esi n’ụmụ obere ihe ha na-emere ụmụnna ha egosi na ha hụrụ ha n’anya. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịgwa ụmụnna ha okwu ọma ma ọ bụ jiri obiọma meso ha ihe. Ọ bụrụ na anyị echebara ndị ọzọ echiche, anyị na-eṅomi Nna anyị nke eluigwe.​—⁠Efe. 5:⁠1.

2. Olee otú Jizọs si ṅomie Nna ya n’otú o si hụ ndị mmadụ n’anya?

2 Jizọs ṅomiri Nna ya nke ọma. Ọ sịrị: “Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume . . . , n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.” (Mat. 11:​28, 29) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka Jizọs ma anyị “na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe,” Nna anyị nke eluigwe ga-agọzi anyị, anyị ga na-enwekwa ezigbo obi ụtọ. (Ọma 41:⁠1) N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú anyị nwere ike isi na-echebara ndị ọzọ echiche. Anyị ga-elekwasị anya n’ezinụlọ, n’ọgbakọ, nakwa n’ozi ọma.

NA-ECHEBARA NDỊ EZINỤLỌ GỊ ECHICHE

3. Olee otú di ga-esi na-echebara nwunye ya echiche? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

Ndị bụ́ di kwesịrị ibute ụzọ n’ichebara ndị ezinụlọ ha echiche. (Efe. 5:25; 6:⁠4) Baịbụl kwuru na ndị bụ́ di kwesịrị ịna-echebara ndị nwunye ha echiche ma na-aghọta ha. (1 Pita 3:⁠7) Di nke na-aghọta nwunye ya nke ọma ma na ya akaghị nwunye ya mma, ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ụzọ ya na nwunye ya si dịrị iche. (Jen. 2:18) Ọ na-echebara otú obi dị nwunye ya echiche ma na-akwanyere ya ùgwù. Otu nwanna nwaanyị bi na Kanada kwuru banyere di ya, sị: “Ọ naghị eleghara otú obi dị m anya, ma ọ bụ gwa m, sị, ‘I kwesịghị iche echiche otú ahụ.’ Ọ na-egekwa m ntị nke ọma. M kwuo otú obi dị m, ọ na-eji obiọma agbazi m.”

4. Olee otú di ga-esi egosi na ya na-echebara otú obi na-adị nwunye ya echiche mgbe ya na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ na-ekwurịta okwu?

4 Di nke na-eche echiche nke ọma anaghị eleghara otú obi na-adị nwunye ya anya mgbe ya na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ na-ekwurịta okwu. Ọ naghị achụ ha ma ọ bụ nwewe mmasị na-adịghị mma n’ebe ha nọ. Ọ naghịkwa enwe ụdị mmasị ahụ ma ọ nọrọ n’Ịntanet. (Job 31:⁠1) N’eziokwu, ọ naghị ahapụ nwunye ya, ọ bụghị naanị n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya, kama ọ bụ na ọ hụrụ Jehova n’anya ma kpọọ ihe ọjọọ asị.​—⁠Gụọ Abụ Ọma 19:14; 97:⁠10.

5. Olee otú nwunye ga-esi egosi na ya na-echebara di ya echiche?

5 Mgbe di na-eme ka onyeisi ya bụ́ Jizọs Kraịst, ọ ga-adịkwuru nwunye ya mfe ịkwanyere ya “ùgwù nke ukwuu.” (Efe. 5:​22-25, 33) Ọ bụrụ na ọ na-akwanyere di ya ùgwù, ọ ga na-aghọta otú obi dị di ya. Ọ ga-ejikwa obiọma na-emeso di ya ihe, ma mgbe ọ hụrụ na di ya ji ọrụ ọgbakọ n’aka ma ọ bụ mgbe e nwere ihe na-enye di ya nsogbu n’obi. Otu di bi na Briten kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, nwunye m hụ otú ihu m dị, ọ na-aghọta na o nwere ihe na-enye m nsogbu n’obi. Mgbe ahụ, ọ ga-eme ihe Ilu 20:5 kwuru, ya bụrụgodị na ọ ga-echere oge kwesịrị ekwesị ọ ga-eji ‘sepụta’ ihe ahụ na-enye m nsogbu n’obi ma ọ bụrụ ihe mụ na ya nwere ike ikwurịta.”

6. Olee otú anyị niile ga-esi nyere ụmụaka aka ịna-echebara ndị ọzọ echiche? Oleekwa uru ọ ga-abara ụmụaka ndị ahụ?

6 Ọ bụrụ na nne na nna ana-egosi ibe ha obiọma ma na-akwanyere ibe ha ùgwù, ụmụ ha ga na-eṅomi ha. Ha kwesịkwara ịna-akụziri ụmụ ha ka ha na-echebara ndị ọzọ echiche ma na-egosi ha obiọma. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịkụziri ụmụ ha ka ha ghara ịna-agbagharị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha na ụmụ ha gaa ebe a na-akụ ngaji n’ezé ma kwụrụ n’ahịrị ikuru nri, ha nwekwara ike ịgwa ụmụ ha ka ha chere ka ndị agadi kuru tupu ha ekuru. Ma, anyị niile nwere ike inyere ndị nne na nna aka. Dị ka ihe atụ, nwatakịrị meere anyị ihe ọma, o nwere ike ịbụ na o mepeere anyị ụzọ, anyị kwesịrị ịja ya mma. Ime otú ahụ ga-eme ka obi na-atọ ya ụtọ, meekwa ka ọ mụta na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”​—⁠Ọrụ 20:⁠35.

‘NA-ECHEBARA IBE UNU ECHICHE’ N’ỌGBAKỌ

7. Olee otú Jizọs si chebara otu nwoke ntị chiri echiche? Oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs n’ihe a o mere?

7 Otu ụbọchị mgbe Jizọs nọ n’ógbè ndị dị gburugburu Dikapọlis, ndị mmadụ “kpọtaara ya otu nwoke ntị chiri nke nwekwara nsogbu ikwu okwu.” (Mak 7:​31-35) Kama Jizọs ịnọ n’ihu ọha gwọọ ya, ọ ‘kpọọrọ naanị ya pụọ,’ ma gwọọ ya. N’ihi gịnị? Ebe ọ bụ na ntị chiri nwoke ahụ, ọ ga-abụ na ahụ́ agaghị eru ya ala ịnọ n’ihu ọha agwọọ ya. Ọ ga-abụkwa na Jizọs chọpụtara nsogbu nwoke a ma kpọrọ ya gaa ebe ndị mmadụ na-anọghị gwọọ ya. Ọ bụ eziokwu na anyị enweghị ike ịrụ ọrụ ebube, ma anyị kwesịrị ichebara mkpa ụmụnna anyị echiche nakwa otú obi dị ha ma gosi ha obiọma. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.” (Hib. 10:24) Jizọs ghọtara otú obi dị nwoke ahụ ntị chiri ma gosi ya obiọma. Anyị kwesịkwara iṅomi ya.

8, 9. Olee otú anyị nwere ike isi gosi ndị agadi na ndị nwere nkwarụ na anyị na-echebara ha echiche? (Nye ihe atụ.)

8 Na-echebara ndị agadi na ndị nwere nkwarụ echiche. Àgwà kacha mkpa e ji ama ọgbakọ Ndị Kraịst bụ na onye ọ bụla hụrụ ibe ya n’anya, ọ bụghị ịrụpụta ọtụtụ ihe. (Jọn 13:​34, 35) Ịhụnanya a na-eme ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ụmụnna anyị ndị agadi na ndị nwere nkwarụ aka ịna-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Anyị na-enyere ha aka, ọ bụrụgodị na ihe ha nwere ike ime ebughị ibu. (Mat. 13:23) Nwanna Michael, bụ́ onye na-eji ígwè ndị ngwọrọ aga ije, kwuru na obi na-atọ ya ụtọ maka aka ndị ezinụlọ ya na ụmụnna nọ n’ìgwè ozi ubi ha na-enyere ya. O kwuru, sị: “Aka a ha na-enyere m emeela ka m na-abịa ọmụmụ ihe ọtụtụ ugboro, na-agachikwa ozi ọma anya. Ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị na-atọ m ụtọ karịchaa.”

9 N’ọtụtụ Betel, e nwere ndị agadi na ndị nwere nkwarụ. Ndị okenye na-eje ozi na Betel na-egosi na ha hụrụ ha n’anya. Otú ha si eme ya bụ na ha na-ahazi ka ha jiri akwụkwọ ozi na ekwentị na-ezi ozi ọma. Otu nwanna dị afọ iri asatọ na isii aha ya bụ Bill na-edegara ndị nọ n’ebe dịpụrụ adịpụ akwụkwọ ozi. O kwuru, sị: “Obi na-atọ anyị ụtọ na anyị na-edegara ndị mmadụ akwụkwọ ozi.” Nwanna nwaanyị aha ya bụ Nancy, bụ́ onye fọrọ obere ka o ruo iri afọ itoolu, kwuru, sị: “Eleghị m ide akwụkwọ ozi anya ka naanị idere mmadụ ozi tinye ya n’envelopu mechie. Ọ bụ ozi ọma. Ndị mmadụ kwesịrị ịmata eziokwu.” Nwanna nwaanyị aha ya bụ Ethel, bụ́ onye a mụrụ n’afọ 1921, kwuru, sị: “Ahụ́ na-egbukarị m mgbu. Ụbọchị ụfọdụ, ọ na-esiri m ike ibili yiri ákwà.” N’agbanyeghị ya, ọ na-atọ ya ụtọ iji ekwentị na-ezi ozi ọma, o nwekwara ụfọdụ nletaghachi. Otu nwanna nwaanyị dị afọ iri asatọ na ise aha ya bụ Barbara kwuru, sị: “Ọ na-esiri m ezigbo ike ịga ozi ọma n’ihi ọrịa m na-arịa. Ma, iji ekwentị ezi ozi ọma na-eme ka m na-agwa ndị ọzọ okwu. Jehova, i meela.” N’ihe na-erughị otu afọ, ụfọdụ ụmụnna merela agadi, bụ́ ndị na-eje ozi n’otu Betel, rụtara otu puku awa, narị abụọ na iri abụọ na asatọ n’ozi ọma. Ha dere akwụkwọ ozi dị puku isii, narị abụọ na iri isii na ise, kpọọ puku mmadụ abụọ n’ekwentị, nyefeekwa akwụkwọ dị puku isii, narị atọ na iri na ise. O doro anya na mbọ ndị a ha gbara mere ka obi na-atọ Jehova ezigbo ụtọ.​—⁠Ilu 27:⁠11.

10. Olee otú anyị ga-esi enyere ụmụnna anyị aka ka ha rite ezigbo uru n’ọmụmụ ihe?

10 Na-echebara ụmụnna echiche n’ọmụmụ ihe. Anyị chọrọ ka ụmụnna anyị na-erite ezigbo uru n’ọmụmụ ihe. Ịna-echebara ha echiche ga-enyere ha aka ime otú ahụ. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Otu ụzọ bụ ịbịa ọmụmụ ihe n’oge ka anyị ghara ịdọpụ ha uche. Mgbe ụfọdụ, ihe ndị anyị na-atụghị anya ha nwere ike ime ka anyị ghara ịbịa n’oge. Ma, ọ bụrụ na anyị na-abịakarị n’azụ oge, anyị kwesịrị iche otú o si na-akpa ụmụnna anyị aka ọjọọ, nakwa mgbanwe anyị ga-eme iji gosi na anyị na-echebara ha echiche. Chetakwa na ọ bụ Jehova na Ọkpara ya gwara anyị ka anyị na-abịa ọmụmụ ihe. (Mat. 18:20) Anyị kwesịrị ịna-akwanyere ha ùgwù.

11. Gịnị mere ụmụnna ndị nwere ihe omume n’ọmụmụ ihe kwesịrị iji mee ihe e kwuru na 1 Ndị Kọrịnt 14:⁠40?

11 Ọ bụrụ na anyị na-echebara ụmụnna anyị echiche, anyị ga-eme ihe a Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Ka e mee ihe niile n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.” (1 Kọr. 14:40) Ụmụnna ndị nwere ihe omume n’ọmụmụ ihe na-eme ihe a Baịbụl kwuru. Otú ha si eme ya bụ na ha anaghị eri oge n’ihe omume ha. Ha na-esi otú a egosi na ha na-echebara ma nwanna ọzọ ga-eme ihe omume ma ọgbakọ echiche. Chegodị otú o nwere ike isi kpaa ụmụnna aka ọjọọ ma ọ bụrụ na e mechighị ọmụmụ ihe n’oge. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ụmụnna ga-anya ụgbọala ogologo oge tupu ha eruo ụlọ ha. Ndị ọzọ nwere ike ịchọ ụgbọala ha ga-eji ala ma ọ bụ jiri ụkwụ gaa ogologo ije tupu ha eruo ụlọ. E nwekwara ndị nke di ha ma ọ bụ nwunye ha na-abụghị Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị ahụ́ na-agbakasị ma di ha ma ọ bụ nwunye ha ghara ịlọta n’oge.

12. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ndị okenye ùgwù ma na-ahụ ha n’anya? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Na-akwanyere Ndị Na-edu Ndú Ùgwù.”)

12 Anyị kwesịrị ịna-akwanyere ndị okenye ùgwù ma na-ahụ ha n’anya n’ihi na ha na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ ma na-anụ ọkụ n’obi n’ozi ọma. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:​12, 13.) O doro anya na obi na-atọ gị ụtọ maka mbọ ha na-agba n’ihi gị. Otú ị ga-esi egosi na obi dị gị ụtọ bụ ịna-erubere ha isi ma na-akwado ha, n’ihi na ‘ha na-eche mkpụrụ obi gị nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ.’​—⁠Hib. 13:​7, 17.

NA-ECHEBARA NDỊ ỌZỌ ECHICHE N’OZI ỌMA

13. Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Jizọs si meso ndị mmadụ ihe?

13 Aịzaya kwuru banyere Jizọs, sị: “Ọ dịghị ahịhịa amị a zọturu azọtu ọ ga-agbaji; ọ gaghịkwa emenyụ owu oriọna nke na-achọ ịnyụ anyụ.” (Aịza. 42:⁠3) Otú Jizọs si hụ ndị mmadụ n’anya mere ka ọ na-enwere ha ọmịiko. Ọ ghọtara otú obi dị ndị e nwere ike ikwu na ha dị ka ahịhịa amị a zọturu azọtu ma ọ bụ owu oriọna nke na-achọ ịnyụ anyụ. Nke a mere ka ọ na-echebara ha echiche, jiri obiọma na ndidi na-emeso ha ihe. O kwedịrị ka ụmụaka bịakwute ya. (Mak 10:14) Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị enweghị ike ịghọtacha ndị mmadụ ma ọ bụ kụziere ha ihe ka Jizọs. Otú anyị si agwa ndị anyị na-ezi ozi ọma okwu, mgbe anyị na-agwa ha okwu, nakwa oge anyị ga-anọru na-egosi na anyị na-echebara ha echiche.

14. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-echebara otú anyị si agwa ndị mmadụ okwu echiche?

14 Olee otú anyị kwesịrị isi na-agwa ndị mmadụ okwu? Taa, ndị oji ego achụ nta ego, ndị ọchịchị nakwa ndị isi okpukpe obi tara mmiri ma na-arụrụ aka na-agba ọtụtụ nde mmadụ “akpụkpọ, na-achụsakwa ha.” (Mat. 9:36) Nke a emeela ka ọtụtụ ndị ghara ịna-atụkwasị ndị mmadụ obi, meekwa ka ha ghara inwe olileanya. N’ihi ya, ụdị okwu anyị na-agwa ha na ụda olu anyị kwesịrị igosi na anyị dị obiọma nakwa na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. N’eziokwu, ihe mere ọtụtụ ndị ji ege anyị ntị abụghị naanị na anyị na-akụzi Baịbụl nke ọma, kama, ọ bụ n’ihi na anyị nwere ezigbo mmasị n’ebe ha nọ ma na-akwanyere ha ùgwù.

15. Olee ụfọdụ ihe ndị anyị ga-eme iji gosi na anyị nwere ezigbo mmasị n’ebe ndị anyị na-ezi ozi ọma nọ ma na-akwanyere ha ùgwù?

15 E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-eme iji gosi na anyị nwere ezigbo mmasị n’ebe ndị anyị na-ezi ozi ọma nọ ma na-akwanyere ha ùgwù. Dị ka ihe atụ, ịjụ ha ajụjụ bụ ụzọ magburu onwe ya anyị si akụzi ihe. Anyị kwesịrị ịjụ ha ajụjụ ndị na-egosi na anyị dị obiọma ma na-akwanyere ha ùgwù. Otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ nke na-eje ozi n’ebe ọtụtụ ndị na-emekarị ihere mụtara otú o nwere ike isi na-ajụ ha ajụjụ ka ọ ghara imenye ha ihere. Ọ naghị ajụ ha ajụjụ ha na-agaghị azatali. Dị ka ihe atụ, ọ naghị ajụ ha ajụjụ ndị dị ka, ‘Ị̀ ma aha Chineke?’ ma ọ bụ ‘Gịnị bụ Alaeze Chineke?’ Kama, ọ na-agwa ha ihe dị ka, “Amụtara m na Baịbụl na Chineke nwere aha. M̀ nwere ike igosi gị ya?” Otú a ọsụ ụzọ a si na-ezi ozi ọma nwere ike ọ gaghị adaba n’ebe niile, n’ihi na omenala dị iche iche, ndị mmadụ adịrịkwa iche iche. Ma, anyị kwesịrị ichebara ndị ọzọ echiche ma na-akwanyere ha ùgwù mgbe niile. Ka anyị nwee ike ime otú a, anyị kwesịrị ịmata ha nke ọma.

16, 17. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị dị obiọma mgbe anyị na-ekpebi (a) oge anyị ga-eji aga na nke ndị mmadụ izi ha ozi ọma? (b) oge anyị kwesịrị ịnọru na nke ha?

16 Ole mgbe anyị kwesịrị ịga na nke ndị mmadụ? Mgbe anyị na-aga ozi ụlọ n’ụlọ, o nweghị onye sị anyị bịa. Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka anyị gaa n’oge ndị mmadụ ga-achọ ka anyị na ha kwurịta okwu. (Mat. 7:12) Dị ka ihe atụ, ndị bi n’ókèala unu, hà na-ehi ụra ruo ogologo oge ná ngwụcha izu? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ike ịga ziwe ndị mmadụ ozi ọma n’okporo ámá, n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, ma ọ bụ gaa nletaghachi na nke ndị ị ma na ha ga-anọ ya.

17 Olee otú anyị kwesịrị ịnọru na nke mmadụ? Ọtụtụ ndị anaghị enwe ohere, n’ihi ya, ọ dị mma ka i kwuo okwu gị nkenke, nke ka nke, na nke mbụ. Ọ ga-akacha mma ka i kwuchaa okwu gị n’oge kama ikwu ya ogologo oge. (1 Kọr. 9:​20-23) Ndị mmadụ hụ na anyị ma na ha ji ọrụ n’aka, ha nwere ike ịchọ ka anyị na ha kwurịta okwu mgbe ọzọ. Ọ bụrụ na anyị ana-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, n’eziokwu, anyị ga-abụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” Jehova nwedịrị ike iji anyị nyere mmadụ aka ịmụta eziokwu.​—⁠1 Kọr. 3:​6, 7, 9.

18. Ọ bụrụ na anyị ana-echebara ndị ọzọ echiche, olee ngọzi ndị anyị ga-enweta?

18 N’ihi ya, ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji gosi na anyị na-echebara ndị ọzọ echiche n’ezinụlọ, n’ọgbakọ, nakwa n’ozi ọma. Anyị mee otú a, Jehova ga-agọzi anyị mmaji kwuru mmaji ma ugbu a ma n’ọdịnihu. Abụ Ọma 41:​1, 2 sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe; Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ n’ụbọchị ọdachi. . . . A ga-akpọ ya onye obi ụtọ n’ụwa.”