Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Kraịst Merala Agadi Jehova Ji Ozi Unu Na-ejere Ya Kpọrọ Ihe

Ndị Kraịst Merala Agadi Jehova Ji Ozi Unu Na-ejere Ya Kpọrọ Ihe

N’ỤWA niile, ndị okenye ji ozi ha na-ejere ụmụnna ha kpọrọ ihe. Obi na-atọ anyị ụtọ maka ndị okenye Jehova nyere anyị. Ma n’oge na-adịbeghị anya, e nwere mgbanwe e mere ná nzukọ Jehova. A gwara ndị okenye merela agadi ka ha nyefee ndị okenye na-akatabeghị ahụ́ ụfọdụ nnukwu ọrụ ha na-arụ. Olee otú ha ga-esi eme ya?

Mgbanwe a e mere bụ na ndị nlekọta sekit ga-akwụsị ịrụ ọrụ ka ndị nlekọta sekit mgbe ha ruru afọ iri asaa, ma ndị nke na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ òtù na-achị isi na-ahazi. E kwukwara ka ndị okenye ruru afọ iri asatọ nyefee ndị okenye na-akatabeghị ahụ́ ụfọdụ ọrụ ha na-arụ ná nzukọ Jehova. Ọrụ ndị dị ka ịbụ onye na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ ma ọ bụ onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ. Olee ihe ndị okenye ndị a merela agadi anyị hụrụ n’anya mere banyere mgbanwe ndị a? Ha rubeere Jehova na nzukọ ya isi.

Otu nwanna aha ya bụ Ken, onye jerela ozi ka onye na-ahaziri Kọmitii Alaka ọrụ ruo ihe fọrọ obere ka o ruo afọ iri anọ na itoolu, kwuru otú obi dị ya. Ọ sịrị: “M ji obi m niile nabata mgbanwe a. Nke bụ́ eziokwu bụ na n’ụtụtụ ahụ m matara, ebula m ụzọ gwa Jehova na anyị kwesịrị inwe nwanna nwoke na-akatabeghị ahụ́ ga-abụ onye na-ahaziri Kọmitii Alaka anyị ọrụ.” Ihe a nwanna a kwuru ka ọtụtụ ndị okenye merela agadi n’ụwa niile kwuru. Ma, ebe ọ bụ na ozi ha na-ejere ụmụnna ha na-atọ ha ụtọ, mgbanwe a e mere wutere ha ná mmalite.

Otu nwanna na-ahaziri ndị okenye ọrụ aha ya bụ Esperandio kwuru na o wutetụrụ ya. N’agbanyeghị ya, ọ sịrị: “M chọkwuru oge m ga-eji na-elebara onwe m anya n’ihi na ọrịa m na-aka njọ.” Nwanna Esperandio ka ji obi ya niile na-ejere Jehova ozi ma na-enyekwara ọgbakọ ha aka.

Oleekwanụ banyere ndị nlekọta sekit jerela ozi ọtụtụ afọ ma ugbu a ha na-ejezi ozi ndị ọzọ e nwere ná nzukọ Jehova? Nwanna Allan, onye bụ́ onye nlekọta sekit ruo afọ iri atọ na asatọ kwuru, sị: “O riri m ọnụ mgbe m matara.” Ma, ọ ghọtara na ọ bara uru ka e nye ụmụnna na-akatabeghị ahụ́ ọzụzụ ka ha rụwa ọrụ a. Nwanna a ka ji obi ya niile na-ejere Jehova ozi.

Nwanna Russell, bụ́ onye rụrụ ma ọrụ sekit ma ịkụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ òtù na-achị isi na-ahazi ruo afọ iri anọ, kwuru na o wutere ya na nwunye ya ná mmalite. Ọ sịrị: “Ozi anyị na-eje na-atọ anyị ụtọ nke ukwuu, anyị chekwara na ike agwụbeghị anyị n’ọrụ a.” Nwanna a na nwunye ya ji ihe ndị ha mụtara mgbe ha na-eje ozi na-enyere ọgbakọ ha aka, obi na-atọkwa ụmụnna ha na ha nọ n’ọgbakọ ụtọ.

Ọ bụrụgodị na ọ dịtụbeghị gị otú ahụ ọ dị ụmụnna ndị a, ihe e kwuru na Samuel nke abụọ nwere ike inyere gị aka ịghọta otú obi dị ụmụnna ndị ahụ.

NWOKE DỊ UMEALA N’OBI MA MARA IHE Ọ GA-EMELI

Cheta ihe mere mgbe Absalọm nwa Eze Devid chọrọ ịkwatu ya n’ọchịchị. Devid si Jeruselem gbaga Mahaneyim, nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. N’oge ahụ, ihe ndị e ji enyere ndụ aka dị Devid na ndị ya na ha so gbapụ ezigbo mkpa. Ì chetara ihe merenụ?

Mmadụ atọ bi ebe ahụ wetaara ha àkwà, ụdị nri dị iche iche, nakwa arịa ndị ọzọ. Otu n’ime ndị a wetaara Devid ihe bụ Bazilai. (2 Sam. 17:​27-29) Ozugbo nkata ahụ Absalọm kpara kụrụ afọ n’ala, Devid laghachiwara Jeruselem, Bazilai dukwa ya ruo Jọdan. Devid gwara ya ka o soro ya gaa biri na Jeruselem. Ọ gwakwara Bazilai na ya ga na-enye ya nri. Ma, Bazilaị bụ “nnukwu mmadụ,” nri ndị ahụ Devid chọrọ inye ya adịghị ya mkpa. (2 Sam. 19:​31-33) Ọ ga-abụ na àgwà Bazilaị nwere masịrị Devid, nakwa na aro ọ bụla o nwere ike ịtụrụ ya ga-abara ya uru. Ọ gaara amagbu onwe ya ma Bazilai biri n’obí eze ma na-arụ ọrụ n’ebe ahụ.

Ebe ọ bụ na Bazilai dị umeala n’obi ma mara ihe ndị ọ ga-emeli, o kwuru na ya dị afọ iri asatọ. O kwukwara, sị: “M̀ pụrụ ịma ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ?” Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? Ọ ga-abụ na o nwetala amamihe n’ogologo oge o birila ndụ. Ọ ka nwekwara ike inye ezigbo ndụmọdụ otú ahụ “ndị okenye” mechara nye Eze Rehoboam. (1 Eze 12:​6, 7; Ọma 92:​12-14; Ilu 16:31) N’ihi ya, ihe mere Bazilai ji kwuo gbasara ịma ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ nwere ike ịbụ n’ihi nsogbu ndị nká kpataara ya. O kwuru na nká emeela ka ya ghara ịna-anụcha ihe na ịna-anụcha ụtọ ihe. (Ekli. 12:​4, 5) N’ihi ya, ọ gwara Devid ka ọ kpọrọ nwa okorobịa aha ya bụ Kimham gaa Jeruselem. O nwere ike ịbụ na Kimham bụ nwa ya.​—⁠2 Sam. 19:​35-40.

ỊKWADEBE MAKA ỌDỊNIHU

Mgbanwe ahụ nzukọ Jehova mere n’ihi afọ ndụ yiri ihe ahụ Bazilai mere. O doro anya na n’oge anyị a, ihe e kwesịrị ịtụle abụghị naanị ọnọdụ mmadụ na ihe onye ahụ nwere ike imeli otú ahụ Bazilai mere. E kwesịrị ịtụle ihe ga-akacha baara ndị okenye ji obi ha niile eje ozi n’ụwa niile uru.

Ndị okenye ndị a merela agadi ma dịrị umeala n’obi ghọtara na ha nyefee ụmụnna ndị na-akatabeghị ahụ́ ọrụ ndị ahụ ha rụrụla ọtụtụ afọ, nzukọ Jehova ga-esikwu ike maka ọtụtụ ndị ga-abata na ya n’ọdịnihu. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ ụmụnna ndị a merela agadi zụrụ ndị a na-akatabeghị ahụ́, otú ahụ ọ ga-abụ na Bazilai zụrụ nwa ya nwoke nakwa otú ahụ Pọl onyeozi zụrụ Timoti. (1 Kọr. 4:17; Fil. 2:​20-22) Ụmụnna ndị a na-akatabeghị ahụ́ egosila na ha bụzi “onyinye n’ụdị mmadụ,” ndị na-enye aka ‘ewuli ahụ́ nke Kraịst elu.’​—⁠Efe. 4:​8-12; tụlee Ọnụ Ọgụgụ 11:​16, 17, 29.

ỤZỌ DỊ ICHE ICHE ANYỊ GA-ESI ENYE AKA

Ọtụtụ ụmụnna nọ n’ọgbakọ dị iche iche n’ụwa niile, bụ́ ndị nyeferela ọrụ ụfọdụ ha na-arụ ejirila ohere ahụ na-arụ ọrụ ndị ọzọ e nwere ná nzukọ Jehova.

Otu nwanna aha ya bụ Marco rụrụla ọrụ sekit afọ iri na itoolu kwuru, sị: “N’ọgbakọ anyị, e nwere ụmụnna nwaanyị di ha na-anọghị n’ọgbakọ. Ihe anyị na-eme ugbu a bụ inyere ndị di ha aka.”

Nwanna aha ya bụ Geraldo rụrụ ọrụ sekit ruo afọ iri abụọ na asatọ. O kwuru, sị: “Ihe ụfọdụ anyị na-eme ugbu a bụ inyere ndị na-anaghị ejekwa ozi aka nakwa iduzi ọtụtụ ọmụmụ Baịbụl.” O kwukwara na ka ọ dị ugbu a, na ya na nwunye ya na-eduziri mmadụ iri na ise ọmụmụ Baịbụl, nakwa na ọtụtụ ndị na-anaghị ejekwa ozi na-abịazi ọmụmụ ihe.

Nwanna Allan anyị kwurula banyere ya kwukwara, sị: “Ugbu a, anyị na-ejizi oge buru ibu ekwusa ozi ọma. Ozi ọma anyị na-ezi n’ebe ọhaneze na-anọ, n’ebe a na-azụ ahịa, nakwa ndị agbata obi anyị na-atọ anyị ụtọ. Mmadụ abụọ n’ime ndị agbata obi anyị abịala ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.”

Ọ bụrụ na i so n’ụmụnna ndị ahụ merela agadi na-arụzi ọrụ ndị ọzọ e nwere ná nzukọ Jehova, e nwere ụzọ ọzọ pụrụ iche i nwere ike isi na-enyekwa aka n’ọgbakọ. Otú ị ga-esi eme ya bụ iji ihe ndị ị ma na-azụ ụmụ okorobịa nọ n’ọgbakọ. Nwanna Russell anyị kwuburu banyere ya sịrị: “Jehova na-azụ ezigbo ụmụ okorobịa ụbụrụ na-aghọ nkọ ma na-eji ha arụ ọrụ n’ọgbakọ. Ụmụnna anyị na-erite uru n’otú ha si eji ịnụ ọkụ n’obi na-ezi ihe ma na-eleta ụmụnna ha.”​—⁠Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Nyere Ụmụ Okorobịa Aka Ka Ha Na-emekwu nke Ọma n’Ọgbakọ.”

JEHOVA EJIGHỊ OZI UNU JI OBI UNU NIILE NA-EJE EGWU EGWU

Ọ bụrụ na ọ dịbeghị anya ị malitere ịrụ ọrụ ndị ọzọ a na-arụ ná nzukọ Jehova, ike agwụla gị. I nyerela ọtụtụ ụmụnna aka n’ozi i ji obi gị niile jeere Jehova ma nọgide na-ejere ya. Ụmụnna gị hụrụ gị n’anya, nọgidekwa na-ahụ gị n’anya.

Ihe ọzọ ka mkpa bụ na ọrụ unu rụrụ ga-adịgide n’obi Jehova. Ọ gaghị ‘echefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma ka na-eje ozi.’ (Hib. 6:10) Ihe a Baịbụl kwuru na-eme ka obi sie anyị ike na ọ bụghị naanị ozi anyị jere n’oge gara aga ka Chineke ga-echeta. Unu dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova. Ọ gaghị echefu ozi unu jeere ya n’oge gara aga, nakwa nke unu ka na-ejere ya iji mee ihe dị ya mma.

Ọ bụrụkwanụ na a gbanwebeghịrị gị ọrụ otú ahụ a gbanweere ụmụnna ndị ahụ anyị kwuru banyere ha? Okwu a nwekwara ike ịgbasa gị. Olee otú o nwere ike isi agbasa gị?

E nwee nwanna merela agadi a gbanwerela ọrụ, ya abụrụ na gị na ya na-emekọrịta ihe ugbu a, ihe ndị ọ mụtara n’ọtụtụ afọ o jerela Jehova ozi nwekwara ike ịbara gị uru. Gwa ya ka o nye gị ndụmọdụ nakwa ka ọ tụọrọ gị aro. Leruo anya ka ị mata otú o si eji ihe ndị ahụ ọ mụtara na-arụ ọrụ ya ugbu a.

Ma ì so n’ụmụnna ndị a merela agadi a gbanweere ọrụ, ma ị̀ bụ nwanna nwoke ma ọ bụ nwanna nwaanyị nwere ike ịmụta ihe n’aka ndị agadi, cheta na Jehova anaghị eji ozi ụmụnna jeere ya ọtụtụ afọ ma nọgide na-ejere ya egwu egwu.