ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Julaị 2019

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite Septemba 2 ruo Septemba 29, 2019

Jikere Ugbu A Maka Mkpagbu

Olee ihe anyị ga-eme iji nwekwuo obi ike ma merie ma a kpagbuwe anyị?

Nọgide Na-efe Jehova Mgbe A Machiri Ọrụ Anyị

Gịnị ka anyị ga-eme ma ndị ọchịchị machie anyị ife Jehova?

“Gaanụ Mee . . . Ndị Na-eso Ụzọ”

Gịnị mere ime ndị na-eso ụzọ ji dị ezigbo mkpa, oleekwa ihe ndị ga-enyere anyị aka ime ya?

Otú Anyị Ga-esi Mee Ka Ozi Ọma Anyị Ruo n’Obi Ndị Na-enweghị Mmasị n’Okpukpe na Ndị Na-ekweghị na Chineke

Olee otú anyị ga-esi nyere ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe na ndị na-ekweghị na Chineke aka ka ha hụ Chineke n’anya ma bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst?

AKỤKỌ NDỤ

Jehova Gọziri M Otú M Na-atụghị Anya Ya

Ihe ndị mere mgbe Nwanna Manfred Tonak bụ onye ozi ala ọzọ n’Afrịka nyeere ya aka ịmụta ịna-enwe ndidi, ihe o nwere iju ya afọ na àgwà ndị ọzọ magburu onwe ha.

Ọ̀ Bụ Eziokwu na Jizọs Nwụrụ n’Ihi M?

Ò nwetụla mgbe i chere na o nweghị uru ị bara? Olee ihe nwere ike inyere gị aka?