Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 30

Otú Anyị Ga-esi Mee Ka Ozi Ọma Anyị Ruo n’Obi Ndị Na-enweghị Mmasị n’Okpukpe na Ndị Na-ekweghị na Chineke

Otú Anyị Ga-esi Mee Ka Ozi Ọma Anyị Ruo n’Obi Ndị Na-enweghị Mmasị n’Okpukpe na Ndị Na-ekweghị na Chineke

“Aghọwo m ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ, ka m wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị.”—1 KỌR. 9:22.

ABỤ NKE 82 “Meenụ Ka Ìhè Unu Na-enwu”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe gbanwerela n’ebe ụfọdụ n’ime afọ ole na ole gara aga?

RUO ọtụtụ puku afọ, ọtụtụ ndị n’ụwa nwere okpukpe ha na-ekpe. Ma, kemgbe afọ ole na ole ugbu a, egwú adagharịala. Ọtụtụ ndị enweghịzi okpukpe ha na-ekpe. Nke bụ́ eziokwu bụ na ná mba ụfọdụ, e nwere ọtụtụ ndị na-ekwu na ha abụghị ndị okpukpe. *Mat. 24:12.

2. Olee ihe ndị o nwere ike ịbụ ha mere na ụfọdụ abụghị ndị okpukpe?

2 Gịnị mere ọtụtụ ndị ji na-asị na ha abụghị ndị okpukpe? O nwere ike ịbụ na ihe ụtọ nke ụwa ma ọ bụ nchegbu nke ụwa na-emegharị ufọdụ anya. (Luk 8:14) Ụfọdụ ndị bụ́bu ndị okpukpe ekweghịzi na Chineke. Ndị ọzọ kweere na Chineke, ma ha chere na okpukpe bụ ihe mgbe ochie na-enweghịzi uru ọ bara, na ya na sayensị anaghị ekwu otu ihe, nakwa na o nweghị ezigbo ihe mere e kwesịrị iji kweta na ya. Ha nwere ike ịna-anụ ka ndị enyi ha, ndị nkụzi ha, na ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-ekwu na ihe ndị dị ndụ nọkatara dịrị. Ma, ha anaghị anụkarị ezigbo ihe mere ha ga-eji kwere na Chineke. E nwekwara ndị na-anaghị achọ iji ntị anụ gbasara ndị ụkọchukwu ego na-anaghị eju eju, ndị na-achọ ịbụ ndị a ma ama. N’ebe ụfọdụ, ndị ọchịchị na-amachi ndị okpukpe ime ihe ụfọdụ.

3. Gịnị ka isiokwu a ga-enyere anyị aka ime?

3 Jizọs nyere anyị iwu ka anyị “mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ” ya. (Mat. 28:19) Olee otú anyị ga-esi nyere ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe ma ọ bụ ndị na-ekweghị na Chineke aka ịhụ Chineke n’anya na ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst? Anyị kwesịrị ịmata na ebe mmadụ nọ too nwere ike ime ka o gee anyị ntị ma ọ bụ ka ọ ghara ige anyị ntị. Dị ka ihe atụ, otú ndị toro na Yurop ga-esi gee anyị ntị nwere ike ịdị iche n’otú ndị toro n’Eshia ga-esi gee anyị ntị. N’ihi gịnị? N’ihi na ọtụtụ ndị Yurop ma gbasara Baịbụl. Ha anụtụkwala na ọ bụ Chineke kere ihe niile. Ma n’Eshia, ọtụtụ ndị amaghị ihe ọ bụla gbasara Baịbụl. O nwekwara ike ịbụ na ha ekweghị na e nwere Onye Okike. Isiokwu a ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi mee ka ihe anyị na-ekwu ruo ndị niile anyị hụrụ n’ozi ọma n’obi n’agbanyeghị ebe ha si ma ọ bụ ihe ha kweere.

ECHELA NA HA AGAGHỊ EGE NTỊ

4. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee olileanya?

4 Nwee Olileanya. Kwa afọ, e nwere ndị na-abụghị ndị okpukpe na ndị na-ekweghị na Chineke na-aghọ Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị kpọrọ omume ọjọọ asị na ndị omume ihu abụọ ndị okpukpe na-agbakasị ahụ́. E nwere ndị nke ihe ọjọọ na-anaghị asọ oyi, ọtụtụ n’ime ha nwekwara àgwà ọjọọ ndị ha kwesịrị ịhapụ. Obi siri anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ịchọta ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi.”—Ọrụ 13:48; 1 Tim. 2:3, 4.

Gbanwee otú i si ezi ozi ọma mgbe ị na-ezi ndị na-ekweghị na Baịbụl ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5 na nke 6) *

5. Olee ihe na-emekarị ka ndị mmadụ gee anyị ntị?

5 Dịrị Obiọma, Dịrịkwa Akọ. Ọtụtụ mgbe, ihe mere ndị mmadụ ji ege anyị ntị bụ otú anyị si gwa ha okwu, ọ bụghị ihe anyị kwuru. Obi na-adị ha ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obịọma na akọ gwa ha okwu, na-egosikwa ha na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ. Anyị anaghị amanye ha ige anyị ntị. Kama, anyị na-agbalị ịghọta ihe mere na ha enweghị mmasị n’okpukpe. Dị ka ihe atụ, anyị chọpụtara na ụfọdụ ndị anaghị achọ ka ha na ndị ha na-amaghị kwuo gbasara okpukpe. Ndị ọzọ chere na mmadụ ekwesịghị ịjụ ibe ya ihe o chere banyere Chineke. E nwekwara ndị ihere na-eme ma ndị ọzọ hụ ha ebe ha na-agụ Baịbụl, karịchaa ma ọ bụrụ ha na ndị Ndịàmà Jehova. Nke ọ bụla ọ bụ, anyị na-agbalị ịghọta ha.—2 Tim. 2:24.

6. Olee otú Pọl onyeozi si gbanwetụ otú o si ekwu ihe ụfọdụ, oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ka ya?

6 Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na o yie ka onye anyị na-agwa okwu achọghị ịnụ ihe ndị dị ka “Baịbụl,” “na e kere ihe eke,” “Chineke” ma ọ bụ “okpukpe”? Anyị nwere ike ime ka Pọl onyeozi ma gbanwetụ otú anyị si ekwu ihe ụfọdụ. Mgbe Pọl na-agwa ndị Juu okwu, o ji ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ mee ka ihe ọ na-ekwu doo ha anya. Ma, mgbe ọ na-agwa ndị ọkà mmụta Grik okwu n’Ariopagọs, o kwughị na ihe ọ na-agwa ha si na Baịbụl. (Ọrụ 17:2, 3, 22-31) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka Pọl? Ị chọpụta na onye ị na-ezi ozi ọma ekweghị na Baịbụl, o nwere ike ịkacha mma ka ị ghara ịkpọtụ Baịbụl aha. Ọ bụrụ na ị chọpụta na o nwere ike ime mmadụ ihere ma ọ bụru na ndị ọzọ ahụ ebe gị na ya na-agụ Baịbụl, i nwere ike ime ya otú ahụ́ ga-erutụ ya ala, dị ka, gị na ya ịgụ nke dị n’ekwentị.

7. Olee ihe anyị nwere ike ime iji ṅomie ihe Pọl mere e dere ná 1 Ndị Kọrịnt 9:20-23?

7 Ghọta Ha ma Na-ege Ha Ntị. Anyị kwesịrị ịgbalị ghọta ihe mere ndị mmadụ ji eche echiche otú ha si eche. (Ilu 20:5) Ka anyị leba anya ọzọ n’ihe Pọl mere. O toro n’etiti ndị Juu. O doro anya na ọ gbalịrị ime ka ozi ọma ya masị ndị Jentaịl, n’ihi na ha amaghị ihe ọ bụla banyere Jehova na Akwụkwọ Nsọ. Anyị nwere ike ime nchọnchọ ma ọ bụ jụọ ndị nọterela aka n’ọgbakọ ihe ụfọdụ iji nwee ike ịghọtakwu ndị bi n’ókèala anyị nke ọma.—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 9:20-23.

8. Olee otu ụzọ e nwere ike isi malite ịgwa mmadụ gbasara Baịbụl?

8 Ihe bụ́ mkpa anyị bụ ịchọta ndị “kwesịrị ekwesị.” (Mat. 10:11) Iji nwee ike ime ya nke ọma, anyị kwesịrị ịjụ ndị mmadụ ihe ha chere ma gee ha ntị nke ọma. Otu nwanna bi n’Ịngland na-ajụkarị ndị mmadụ ihe ha chere banyere otú e nwere ike isi mee ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ, otú e si azụ ụmụaka, na otú e si edi mmegbu. O gechaa azịza ha, ọ na-ajụ ha, sị: “Olee ihe i chere banyere ndụmọdụ a e dere ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga?” N’akpọghị Baịbụl aha, ọ na-esi n’ekwentị ya gosi ha amaokwu Baịbụl dabara adaba.

MEE KA OZI ỌMA GỊ NA-ERU N’OBI NDỊ MMADỤ

9. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị na-anaghị achọ ikwu gbasara Chineke aka?

9 Anyị nwere ike ikwu ihe ga-eru n’obi ndị na-anaghị achọ ikwu banyere Chineke ma ọ bụrụ na anyị agwa ihe na-amasị ha. Dị ka ihe atụ, ihe ndị e kere eke na-atụ ọtụtụ ndị n’anya. N’ihi ya, anyị nwere ike ikwu ihe dị ka: “O nwere ike ịbụ na ị maara ọtụtụ ihe ndị sayensị leere anya n’ihe ndị e kere eke mepụta. Dị ka ihe atụ, ndị mepụtara maịkrofon mụrụ otú ntị si arụ ọrụ tupu ha emepụta ya, ndị mepụtara kamera amụọ otú anya si arụ ọrụ tupu ha emepụta ya. Olee ihe na-agbata gị n’obi ma i lewe ihe ndị dị n’ụwa? Ì chere na ha nọkatara dịrị, ka è nwere ihe ọzọ mere ha ji dịrị? Anyị gechaa onye ahụ ntị nke ọma, anyị nwere ike ịsị ya: “Mgbe ndị njinia mụrụ otú anya ná ntị si arụ ọrụ mepụta ihe, ònye ka ha si n’aka ya mụta ihe ndị ahụ n’eziokwu? E nwere ihe otu onye na-ede abụ n’oge ochie dere masịrị m nke ọma. O dere, sị: ‘Onye ahụ nke kere ntị, ọ́ pụghị ịnụ ihe? Ma ọ bụ, Onye ahụ nke kere anya, ọ́ pụghị ịhụ ụzọ? . . . [Ọ bụ] Onye na-akụziri ndị mmadụ ihe.’ Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị kwetara ihe a, kwetakwa na e kere ihe niile eke.” (Ọma 94:9, 10) Anyị nwekwara ike igosi onye ahụ otu vidio na-agba n’isiokwu bụ “Ihe Ndị Mmadụ Kwuru Mere Ha Ji Kwere na Chineke Dị.” Ọ dị na jw.org® n’ebe e dere “Ajụjụ Ọnụ.” (Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa VIDIO.) Ma ọ bụkwanụ anyị enye ya broshọ bụ́ Was Life Created? ma ọ bụ The Origin of Life—Five Questions Worth Asking.

10. Olee otú ọzọ anyị nwere ike isi malite izi onye na-anaghị achọ ikwu gbasara Chineke ozi ọma?

10 Ọtụtụ ndị chọrọ ka ihe ka mma n’ọdịnihu. Ma, ọtụtụ na-atụ egwu na a ga-ebibi ụwa a ma ọ bụkwanụ mee ka ọ ghara ikwe obibi. Otu onye nlekọta sekit na Nọọwee kwuru na ndị na-anaghị achọ ikwu gbasara Chineke na-enwe mmasị ikwu gbasara ihe ndị na-eme n’ụwa. Ihe ọ na-eme bụ ya kelechaa mmadụ, ya asị ya: “Olee ndị i chere ga-eme ka ihe dị mma n’ọdịnihu? Ọ̀ bụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ọkà mmụta sayensị, ka ọ̀ bụkwanụ onye ọzọ? O gechaa onye ahụ ntị nke ọma, ya agụọrọ ya ma ọ bụ gwa ya ebe Baịbụl kwuru na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ọ na-amasị ụfọdụ ndị ịnụ na Baịbụl kwuru na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi, nakwa na ndị ezi omume ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi.—Ọma 37:29; Ekli. 1:4.

11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-agbalị isi n’ụzọ dị iche iche amalite ozi ọma anyị? Oleekwa otú anyị nwere isi ṅomie ihe Pọl mere e dere ná Ndị Rom 1:14-16?

11 Anyị kwesịrị isi n’ụzọ dị iche iche na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. N’ihi gịnị? N’ihi na ndị mmadụ dị iche iche. Ihe na-amasị otu onye nwere ike ghara ịmasị ibe ya. Ụfọdụ ndị na-enwe mmasị ikwu banyere Chineke ma ọ bụ Baịbụl, ndị ọzọ ana-enwe mmasị ikwu banyere ihe ndị ọzọ. Nke ọ bụla ọ bụ, anyị kwesịrị iji ohere ọ bụla zie ụdị mmadụ ọ bụla ozi ọma. (Gụọ Ndị Rom 1:14-16) Anyị kwesịkwara icheta na ọ bụ Jehova na-eme ka eziokwu anyị kụnyere n’obi ndị chọrọ ime ihe dị mma too.—1 Kọr. 3:6, 7.

OTÚ ANYỊ GA-ESI EZI NDỊ ESHIA OZI ỌMA

Ebe ụmụnna anyị na-egosi ndị si mba ọzọ na-abụghị Ndị Kraịst mmasị ma na-ezi ha ozi ọma si na Baịbụl (A ga-akọwa ya na paragraf nke 12 na nke 13)

12. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji mee ka ihe anyị na-ekwu ruo n’obi ndị Eshia na-echetụbeghị echiche ma Chineke ọ̀ dị ma ọ bụ na ọ dịghị?

12 N’ebe niile n’ụwa, ụmụnna anyị na-ahụ ndị Eshia ma ha nọrọ n’ozi ọma, ma ndị nke si ná mba ndị a machiri Ndịàmà Jehova ime ihe ụfọdụ. Ná mba ụfọdụ n’Eshia, ọtụtụ ndị echetụbeghịdị echiche ma Chineke ọ̀ dị ma ọ bụ na ọ dịghị. Ụfọdụ n’ime ha chọrọ ịmata ihe ọhụrụ. Ha na-ekwe ka a mụwara ha Baịbụl. Ma ná mmalite, ndị ọzọ anaghị achọ ịmata ihe ọhụrụ. Olee ihe anyị nwere ike ime iji nyere ha aka? Ụfọdụ ndị nkwusa bụ́ aka ochie na-ekwu ihe ga-eru ndị mmadụ n’obi ma ha buru ụzọ na-akpanyere ha ụka ma gosi ha na ha nwere mmasị n’ebe ha nọ. Mgbe ọ bụla ọ dabaziri, ndị nkwusa ahụ nwere ike kọọrọ ha otú ime ihe ndị Baịbụl kwuru si mee ka ndụ ha ka mma.

13. Olee ihe nwere ike ime ka ndị mmadụ nwee mmasị na Baịbụl? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a)

13 Ihe na-ebu ụzọ amasị ọtụtụ ndị bụ ihe ndị Baịbụl kwuru ga-abara ha uru. (Ekli. 7:12) Na Niu Yọk, e nwere otu nwanna nwaanyị na-aga ezi ndị na-asụ asụsụ Chaịniiz ozi ọma. O kwuru, sị: “M na-agbalị igosi ndị mmadụ na m nwere mmasị n’ebe ha nọ, na-egekwa ha ntị. M chọpụta na ha si mba ọzọ bịa ọhụrụ, m na-ajụ ha, sị: ‘Olee otú ihe si kwụrụ? Ùnu achọtala ọrụ? Ndị ebe a hà na-elekọtakwa unu nke ọma?’ ” Mgbe ụfọdụ, ime otú a na-enyere ya aka ịmalite ịgwa mmadụ ihe Baịbụl kwuru. Mgbe ọ dabara adaba, nwanna nwaanyị ahụ na-ajụkwa onye ahụ, sị: “Olee ihe i chere kacha mkpa anyị ga-eme ka anyị na ndị ọzọ nwee ike ịna-adị ná mma? Ka m gositụ gị otu ilu dị na Baịbụl. Ọ sịrị: ‘Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ; ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.’ Ì chere na ndụmọdụ a ga-enyere anyị aka ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma?” (Ilu 17:14) Ụdị mkparịta ụka a ga-enyere anyị aka ịmata ndị ga-achọ ka anyị bịaghachi.

14. Olee otú otu nwanna nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia si enyere ndị sịrị na ha ekweghị na Chineke aka?

14 Olee ihe anyị nwere ike ịgwa ndị na-ekweghị na Chineke? Otu nwanna bụ́ aka ochie n’izi ndị si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia na-ekweghị na Chineke ozi ọma kwuru, sị: “Ọ bụrụ na onye ebe a agwa gị na ya ekweghị na Chineke, ihe ọ na-ekwu bụ na ya ekweghị n’ife chi ọtụtụ ndị nọ n’obodo ha na-efe. Ihe m na-emezi bụ isoro ha kweta na ọ bụ mmadụ kpụrụ ọtụtụ chi ndị ahụ, nakwa na ha abụghị ezi chi. Ọtụtụ mgbe, m na-agụrụ ha Jeremaya 16:20, ebe sịrị: ‘Mmadụ ọ̀ pụrụ imere onwe ya chi dị iche iche mgbe ha na-abụghị chi?’ Mụ ajụzie ha, sị: “Olee otú anyị ga-esi amata nke bụ́ ezi chi na nke mmadụ kpụrụ?” M na-ege onye ahụ ntị nke ọma ma gụọrọ ya Aịzaya 41:23, ebe sịrị: ‘Kọọnụ ihe ndị gaje ime mgbe e mesịrị, ka anyị wee mata na unu bụ chi.’ Mụ egosizie ya otu ebe Jehova kwuru ihe ga-eme n’ọdịnihu, ya emechaa mezuo.”

15. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe otu nwanna nọ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia na-eme?

15 E nwere ihe nwanna ọzọ nọkwa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia kwuru ọ na-eme ma ọ gaa nletaghachi. Ọ sịrị: “M na-egosi ha ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru na-abara anyị uru, amụma Baịbụl ndị mezurulanụ, nakwa iwu ndị na-achịkwa ihe ndị dị ka kpakpando na ihe ndị ọzọ dị na mbara igwe. M na-agwazi ha otú ihe ndị a si egosi na e nwere Onye Okike nwere amamihe. Ọ bụrụ na mmadụ ekweta na o nwere ike ịbụ na Chineke dị, m na-amalite igosi ya ihe Baịbụl kwuru gbasara Jehova.”

16. Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 11:6, gịnị mere ndị anyị na-amụrụ ihe ji kwesị ịtụkwasị Chineke na Baịbụl obi, oleekwa otú anyị ga-esi nyere ha aka ime ya?

16 Mgbe ọ bụla anyị na ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe ma ọ bụ ndị na-ekweghị na Chineke na-amụ Baịbụl, anyị kwesịrị ịnọgide na-eme ka obi sie ha ike na Chineke dị. (Gụọ Ndị Hibru 11:6) Anyị kwesịkwara inyere ha aka mee ka ha tụkwasị Baịbụl obi. O nwere ike ịpụta na anyị ga-agwa ha ụfọdụ ihe ọtụtụ ugboro. Mgbe ọ bụla anyị na ha na-amụ ihe, anyị nwere ike ịtụle ihe ndị gosiri na Baịbụl bụ Okwu Chineke, dị ka, amụma Baịbụl ndị mezurulanụ, ihe ndị gosiri na ihe ndị Baịbụl kwuru gbasara sayensị bụ eziokwu, na ihe gosiri na akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl mere eme, nakwa na ihe ndị Baịbụl kwuru na-abara anyị uru kwa ụbọchị.

17. Olee ihe ịhụnanya anyị gosiri ndị mmadụ nwere ike ime ka ha mee?

17 Anyị na-enyere ndị mmadụ aka ịbụ ndị na-eso ụzọ Kraịst ma ọ bụrụ na anyị egosi ha ịhụnanya ma hà kweere na Chineke ma ọ bụ na ha ekweghị. (1 Kọr. 13:1) Ihe anyị ga-ebu n’obi na-akụziri ha ihe bụ ka ha mata na Chineke hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị hụ ya n’anya. Kwa afọ, ọtụtụ ndị na-enwebughị mmasị n’okpukpe na-eme baptizim n’ihi na ha amụtala ịhụ Chineke n’anya. N’ihi ya, nwee olileanya ma na-egosi mmasị n’ebe ụdị mmadụ niile nọ. Na-ege ha ntị. Gbalịa ghọta ihe mere ha ji kwere ihe ndị ha kweere. Si n’ihe ndị ị na-agwa ha na otú i si akpa àgwà nyere ha aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst.

ABỤ NKE 76 Olee Otú Ọ Na-adị Gị?

^ par. 5 Anyị nwere ike ịhụ ndị na-enweghị mmasị n’okpukpe ma ọ bụ ndị na-ekweghị na Chineke n’ozi ọma ugbu a karịa na mbụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị nwere ike isi kụziere ha Baịbụl na otú anyị nwere ike isi nyere ha aka ikweta ihe Baịbụl kwuru na ịtụkwasị Jehova Chineke obi.

^ par. 1 Nchọpụta ndị e mere gosiri na ụfọdụ mba ndị ahụ bụ: Albenia, Ayaland, Azebaịjan, Briten, Chaịna, Chek Ripọblik, Denmak, Frans, Họng Kọng, Izrel, Jamanị, Japan, Kanada, Nedalandz, Nọọwee, Ọstrelia, Ọstria, Saụt Koria, Spen, Swidin, Swizaland, na Vietnam.

^ par. 53 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-ezi onye ọrụ ibe ya ozi ọma n’ụlọ ọgwụ ha na-arụ ọrụ, onye ọrụ ibe ya ahụ emechaa gaa na jw.org.