Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Jehova Gọziri M Otú M Na-atụghị Anya Ya

Jehova Gọziri M Otú M Na-atụghị Anya Ya

‘M KWESỊRỊ ịbụ onye ọsụ ụzọ. Ma, ịsụ ụzọ ọ̀ ga-atọkwanụ m ụtọ?’ Ọrụ m na-arụ na Jamanị na-atọ m ezigbo ụtọ. Ọ bụ ịhụ na e bugara akpa ntụ ọka ebe dị iche iche n’Afrịka, ebe ndị dị ka Daresalam, Elisabetvil, na Asmara. E nwetụdịghị mgbe m chere na e nwere mgbe m ga-emecha jee ozi oge niile n’obodo ndị a nakwa n’ọtụtụ obodo ndị ọzọ dị n’Afrịka.

Mgbe m mechara kata obi bido ịsụ ụzọ, ndụ m gbanwere otú m na-atụghị anya ya. (Efe. 3:20) Ma, unu nwere ike ịna-eche otú nke a si mee. Ka m bido n’isi kọọ ihe merenụ.

A mụrụ m na Belin dị na Jamanị n’afọ 1939, mgbe ọnwa ole na ole gachara Agha Ụwa nke Abụọ malitere. Ka agha ahụ na-achọ ịkwụsị n’afọ 1945, bọmbụ bidoro ịna-ada aghara aghara na Belin. O nwere otu mgbe bọmbụ dara n’okporo ámá ebe anyị bi, ezinụlọ anyị agbaga n’otu ebe a rụrụ maka izere bọmbụ. Anyị mechakwara gbaga Efọt bụ́ ebe a mụrụ mama m.

Ebe mụ na nne m na nna m na nwanne m nwaanyị nọ na Jamanị n’ihe dị ka afọ 1950

Mama m bidoro chọwa ịmata eziokwu banyere Chineke. Ọ gụrụ ọtụtụ akwụkwọ ndị ọkà mmụta dere, nyochaakwa ihe ọtụtụ okpukpe na-akụzi, ma o nweghị nke juru ya afọ. N’ihe dị ka afọ 1948, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ anyị. Mama m nabatara ha ma jụọ ha ọtụtụ ajụjụ. Ka ihe na-erughị otu awa gachara, ọ gwara mụ na nwanne m nwaanyị, sị: “Achọtala m eziokwu.” Ọ dịghị anya, mụnwa, mama m na nwanne m nwaanyị malitere ịga ọmụmụ ihe n’Efọt.

N’afọ 1950, anyị laghachiri Belin. N’ebe ahụ, anyị sooro ọgbakọ Berlin-Kreuzberg na-amụ ihe. Mgbe anyị kwafere ebe ọzọ n’otu Belin ahụ, anyị banyere n’ọgbakọ Berlin-Tempelhof. Ka oge na-aga, e mere mama m baptizim, ma m nọ na-egbu oge. N’ihi gịnị?

OTÚ M SI KWỤSỊ IME IHERE

Ihere mere ka o siere m ike ịgba mbọ n’ozi Jehova. N’agbanyeghị na mụ na ndị ọzọ so gaa ozi ọma afọ abụọ, o nweghị onye m ziri ozi ọma. Ihe gbanwere mgbe m matara ọtụtụ ụmụnna ndị katara obi ma jiri obi ha niile na-efe Jehova. Ụfọdụ n’ime ha so ná ndị a tụrụ mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi ma ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ ndị dị n’ebe Ọwụwa Anyanwụ Jamani. Ndị ọzọ na-ezoro ezoro buga akwụkwọ anyị na Jamanị nke Ebe Ọwụwa Anyanwụ n’agbanyeghị na o nwere ike itinye ha ná nsogbu. Ihe ha mere masịrị m nke ọma. M gwara onwe m na ebe ọ bụ na ụmụnna ndị a katara obi mee ihe ndị gaara ata isi ha ma ọ bụ mee ka a tụọ ha mkpọrọ n’ihi Jehova na ụmụnna ha, m ga-agbalị kwụsị ihere a m na-eme.

M malitere ịkwụsị ime ihere mgbe m so mee otu mkpọsa pụrụ iche e mere n’afọ 1955. N’otu akwụkwọ ozi gbara n’akwụkwọ anyị a na-akpọ Informant, * Nwanna Nathan Knorr kwuru na mkpọsa ahụ so ná mkpọsa kachanụ nzukọ a hazitụrụla. O kwuru na “ọ bụrụ na ndị nkwusa niile esoro mee ya, ọ ga-abụ ọnwa a kacha kwusaa ozi ọma na ya kemgbe ụwa.” Ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu. O teghị aka e mechara mkpọsa a mụ enyefee Jehova onwe m. N’afọ 1956, e mere mụnwa, papa m na nwanne m nwaanyị baptizim otu mgbe. Ma, otu ihe dị ezigbo mkpa m kwesịrị ikpebi dapụtakwara.

Kemgbe ọtụtụ afọ, ama m na m kwesịrị ibido sụwa ụzọ, ma m nọ na-egbu oge ibido ya. M kpebiri ibu ụzọ gaa mụọ otú e si ebupụ ngwá ahịa mba ọzọ na otú e si atụbata ngwá ahịa na Belin. Mgbe m mụchara ahịa ahụ, m kpebiri ịzụtụ ya ka aka sie m ike na ya tupu mụ ebido ịsụ ụzọ. N’ihi ya, n’afọ 1961, m malitere ọrụ na Hambọg, bụ́ obodo e nwere ọdụ ụgbọ mmiri kachanụ na Jamanị. Ka m na-arụkwu ọrụ ahụ, ka m na-eyigharịkwu oge m ga-amalite ịsụ ụzọ. Olee ihe m ga-eme?

Obi dị m ụtọ na Jehova ji ụmụnna ndị hụrụ m n’anya nyere m aka ịmata na ijere ya ozi kwesịrị ịbụ ihe mbụ ná ndụ m. Ọtụtụ n’ime ndị enyi m ebidolarị ịsụ ụzọ, ha na-emekwa nke ọma. Agbamume Nwanna Erich Mundt, onye nọburu n’ogige ịta ahụhụ, nyere m mere ka m tụkwasịkwuo Jehova obi. Ọ sịrị na n’ogige ịta ahụhụ, ụmụnna ndị tụkwasịrị onwe ha obi mechara lawa azụ, ma ndị nke tụkwasịrị Jehova obi nọgidere na-efe ya, mechaakwa na-enyere ụmụnna ha aka n’ọgbakọ.

Mgbe m malitere ịsụ ụzọ n’afọ 1963

Nwanna Martin Poetzinger, onye mechara soro n’Òtù Na-achị Isi, nọgidekwara na-agba anyị niile ume. Ọ sịrị: “Ịkata obi bụ ihe kacha aba uru ná ndụ.” Mgbe m tụgharịchara uche n’ihe o kwuru, m kwụsịrị ọrụ m ma bido ịsụ ụzọ na Jun afọ 1963. O nweghị ihe ọzọ ka mma m gaara ekpebi ime mgbe ahụ. Mgbe ọnwa abụọ gachara, tupu mụ ebido ịchọ ọrụ ọhụrụ, m ghọrọ ọsụ ụzọ pụrụ iche. Mgbe afọ ole na ole gachara, Jehova gọziri m otú m na-atụghị anya ya. A kpọrọ m ka m soro na klas nke iri anọ na anọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied.

AMỤTARA M IHE NDỊ BAARA M URU NA GILIED

Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ m mụtara na Gilied n’aka Nwanna Nathan Knorr na Nwanna Lyman Swingle bụ: “Emela ngwa ngwa ịhapụ ozi gị.” Ha gbara anyị ume ịnọgide n’ozi anyị n’agbanyeghị ihe isi ike. Nwanna Knorr kwuru, sị: “Olee ihe ị ga-elekwasị anya na ya? Ọ̀ bụ otú ebe ahụ si ruo unyi, ka ọ̀ bụ chịnchị ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-ata ata, ka ọ̀ bụ ndị dara ogbenye, na otú ihe si sie ike n’ebe ahụ? Ka ị̀ ga-ewepụta oge na-ekiri osisi, okooko osisi, na ndị obi na-atọ ụtọ? Mụta ịhụ ndị mmadụ n’anya. Otu ụbọchị, ka Nwanna Swingle na-akọrọ anyị ihe mere ụfọdụ ụmụnna ji ghara ịnọte aka n’ozi ha, anya mmiri bidoro ịgba ya, ya akwụsị ikwu okwu ruo mgbe o nwetara onwe ya. Ihe a metụrụ m n’ahụ́, mụ ekpebie na o nweghị ihe ga-eme ka m mee ihe ga-ewute ma Jizọs ma ụmụnna ya kwesịrị ntụkwasị obi.—Mat. 25:40.

Mụnwa, Nwanna Claude, na Nwanna Heinrich, mgbe anyị nọ n’ozi ala ọzọ na Lubumbashi dị na Kongo n’afọ 1967

Mgbe e nyechara anyị akwụkwọ gosiri ebe anyị ga-ejewe ozi, ụfọdụ ndị Betel jụrụ anyị ebe e zigara anyị. Ha nọ na-ekwu okwu ọma gbasara ebe ndị e zigara ụmụ akwụkwọ ibe m ruo mgbe m gwara ha na e zigara m Kongo Kinshasa. Ebe niile dara jii, naanị ihe ha kwuru bụ: “Ị̀ sị Kongo? Jehova nọnyere gị.” N’oge ahụ, akụkọ a na-anụkarị na Kongo Kinshasa bụ akụkọ agha na ndị na-egburịta ibe ha. Ma, m tinyere uche m n’ihe ndị m mụtara. Obere oge anyị gụchara akwụkwọ na Septemba afọ 1967, mụnwa, Nwanna Heinrich Dehnbostel, na Nwanna Claude Lindsay gawara n’isi obodo Kongo bụ́ Kinshasa.

IHE NDỊ ANYỊ MỤTARA N’AFRỊKA

Mgbe anyị ruru Kinshasa, anyị mụrụ asụsụ French ọnwa atọ. Anyị mechara jiri ụgbọelu gaa Lubumbashi, nke a na-akpọbu Elisabetvil. Ọ dị nso n’ókè Zambia na ebe ndịda Kongo. Anyị gara biri n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ dị n’ebe ahụ.

E zibeghị ozi ọma n’ọtụtụ ebe na Lubumbashi. N’ihi ya, obi dị anyị ụtọ ịbụ ndị mbụ ziri ọtụtụ ndị ebe ahụ ozi ọma. O teghị aka anyị enwee ọtụtụ ndị anyị na-amụrụ ihe nke na oge anaghị ezuru anyị ịga mụọrọ ha niile ihe. Anyị zikwara ndị na-arụrụ ndị gọọmenti ọrụ ma ọ bụ ndị uwe ojii ozi ọma. Ọtụtụ n’ime ha ji Baịbụl na ozi ọma anyị kpọrọ ihe. Asụsụ ndị ebe ahụ kacha asụ bụ Swahili. N’ihi ya, mụ na Nwanna Claude Lindsay gakwara mụọ ya. O teghị aka e ziga anyị n’ọgbakọ na-eji asụsụ Swahili amụ ihe.

Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ihe mere n’ozi anyị tọrọ anyị ezigbo ụtọ, ma, anyị nwekwara ihe isi ike ụfọdụ. Ihe anyị na-edikarị bụ ndị amị mmanya na-egbu, ndị na-ebu égbè ma ọ bụ ndị uwe ojii na-enye nsogbu, ndị na-abịa ebo anyị ebubo ụgha. O nwere otu mgbe ọtụtụ ndị uwe ojii ji égbè kwobatara n’ụlọ ndị ozi ala ọzọ ebe anyị nọ na-amụ ihe kpụrụ anyị gaa n’isi ụlọ ọrụ ha. N’ebe ahụ, ha mere ka anyị nọdụ n’ala nkịtị ruo n’elekere iri nke abalị mgbe ha ji hapụ anyị.

N’afọ 1969, e mere m onye nlekọta sekit. M gawa ileta ọgbakọ, m na-eji ụkwụ gaa ọtụtụ kilomita n’ụzọ ọhịa ndị bụ́ apịtị apịtị. Ụdị ihe ndị a juru eju n’Afrịka. N’otu obodo m gara, ọkụkọ chị ụmụ nọ na-ehi n’okpuru àkwà m n’abalị. Agaghị m echefu otú o si eji mkpu ọ na-eti emete m n’ụra mgbe chi na-abọbeghị. Ọ na-abụ m cheta mgbe mụ na ụmụnna na-anọ na-anya ọkụ ma na-ekwu banyere Chineke, obi ana-atọ m ụtọ.

Otu n’ime nsogbu ndị kachanụ e nwere n’oge ahụ bụ ụmụnna ụgha ndị na-akwado ndị òtù Kitawala. * Ụfọdụ n’ime ha batara n’ọgbakọ mee baptizim, ghọọkwa ndị okenye. N’agbanyeghị na ha zochiri ndị ha bụ, ụmụnna chọpụtara ndị ha bụ n’eziokwu. (Jud 12) E mechakwara Jehova ewepụ ha, si otú ahụ mee ka ọgbakọ ya dị ọcha. Mgbe nke a mechara, ọtụtụ ndị batara n’ọgbakọ.

N’afọ 1971, a gwara m ka m gaa rụwa ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kinshasa. Arụrụ m ọrụ n’ebe dị iche iche, dị ka, n’ebe a na-ezipụ akwụkwọ ozi, ebe a na-ahụ maka ọda ụmụnna tụrụ, nakwa ná ngalaba ije ozi. N’ebe ahụ, m mụtara otú e si ahazi ọrụ ná mba a buru ibu a na-enweghị ezigbo ụzọ, ọkụ eletrik, ugbọala na ihe ndị ọzọ e ji eme njem. Mgbe ụfọdụ, ọ na-ewe ọtụtụ ọnwa tupu akwụkwọ ozi anyị eruo ọgbakọ dị iche iche. A na-esi n’ụgbọelu butuo ha ma buba ha n’ụgbọ mmiri. Otu ahịhịa na-asachi elu osimiri na-emecha mee ka ụgbọ mmiri ahụ tọ ruo ọtụtụ izu. N’agbanyeghị nsogbu ndị a na ndị ọzọ, anyị rụchara ọrụ anyị.

Ọ tụrụ m n’anya ịhụ otú ụmụnna ndị ebe ahụ si ahazi mgbakọ buru ibu n’agbanyeghị na ha enweghị nnukwu ego. Ha rụrụ ebe a na-anọ ekwu okwu n’elu mkpu, jiri ahịhịa achara gbaa ogige, jirikwa ya rụọ oche. Ha na-eji osisi achara rụọ ụlọ, jiri ute rụọ elu ya, jirikwa ya rụọ tebụl. Ha pịrị azụ osisi, jiri ya jikọta ha. Ịhụ otú ụmụnna ndị a si jiri amamihe ha na nkà ha merie nsogbu ndị ha nwere tọgburu m atọgbu. O mere ka m hụkwuo ha n’anya. O wutere m mgbe e zigara m ebe ọzọ.

OZI M JERE NA KENYA

N’afọ 1974, a gwara m gaa rụwa n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Nairobi, Kenya. Ọrụ dị ebe ahụ buru ibu, n’ihi na alaka ụlọ ọrụ ahụ na-elekọta ozi ọma anyị ná mba iri ndị dị ya nso. A machiri ọrụ anyị n’ụfọdụ n’ime ha. Ọtụtụ mgbe ka e zigara m ná mba ndị ahụ, karịchaa n’Itiopia, ebe a kpagburu ụmụnna anyị. E mekpọrọ ọtụtụ n’ime ha ọnụ ma ọ bụ tụọ ha mkpọrọ. E gbudịrị ụfọdụ n’ime ha. Ma, ha diri mkpagbu ndị a niile n’ihi na ha hụrụ Jehova na ụmụnna ha n’anya.

N’afọ 1980, ihe obi ụtọ mere ná ndụ m bụ na m lụrụ Nwanna Nwaanyị Gail Matheson, bụ́ onye Kanada. Mụ na ya gụkọrọ akwụkwọ na Gilied. Anyị nọ na-ederịta akwụkwọ ozi. Ọ nọ Bolivia na-eje ozi ala ọzọ ya. Mgbe afọ iri na abụọ gachara, mụ na ya hụrụ na Niu Yọk. O teghị aka, anyị agbaa akwụkwọ na Kenya. Obi dị m ụtọ na Gail bụ onye na-ele ihe anya otú Jehova si ele ya, bụrụkwa onye ihe o nwere na-eju afọ. Ọ nọgidela na-akwado m kemgbe ahụ, na-egosikwa m ịhụnanya.

N’afọ 1986, a gwara m ka m bụrụzie onye nlekọta distrikti ma sorokwa na Kọmitii Alaka. Anyị na-aga eleta ọtụtụ n’ime mba ndị ahụ alaka ụlọ ọrụ Kenya na-elekọta.

Mgbe m na-ekwu okwu ná mgbakọ ukwu e nwere n’Asmara, n’afọ 1992

M ka na-echeta otú anyị si kwadebe maka mgbakọ ukwu e nwere n’afọ 1992 n’Asmara (dị n’Eritria). Mgbe ahụ, a machighị ọrụ anyị n’obodo ahụ. Naanị ebe anyị nwetaliri bụ ọba na-adịghị mma ma ị nọrọ n’èzí lee ya. Ị bazie n’ime, ya aka njọ. N’ụbọchị mgbakọ ahụ, o juru m anya ịhụ otú ụmụnna anyị si mezie ya, ya amaa ezigbo mma ịnọ fee Jehova. Ọtụtụ ezinụlọ wetara ákwà e ji achọ ihe mma, jiri ya sachie ebe ndị na-adịghị mma ile anya. Mgbakọ ahụ tọrọ anyị ezigbo ụtọ. Ndị bịara ya dị otu puku, narị abụọ na iri asaa na itoolu.

Ọrụ onye nlekọta ahụ adịcharaghị anyị mfe n’ihi na anyị na-agbanwe ebe obibi kwa izu. O nwere mgbe anyị nọrọ n’ụlọ ndị oké ozu a rụrụ n’akụkụ osimiri, nweekwa mgbe anyị nọrọ n’ụlọ e ji gbamgbam kụọ. Ebe ụlọ mposi ya dị karịrị otu narị mita ma e si n’ụlọ ahụ gawa ya. Ma n’agbanyeghị ebe anyị gara, ihe kacha eme anyị obi ụtọ bụ ozi anyị na ndị ọsụ ụzọ na ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi jere n’ebe ndị ahụ. Mgbe e zigara anyị ebe ọzọ, o wutere anyị na anyị hapụrụ ọtụtụ ndị enyi anyị hụrụ n’anya.

NGỌZI NDỊ ANYỊ NWETARA N’ITIOPIA

N’agbata afọ 1987 na afọ 1992, anyị nwetara ikike ịrụ ọrụ anyị n’ụfọdụ mba ndị ahụ alaka ụlọ ọrụ Kenya na-elekọta. N’ihi ya, e mepeere mba ndị ahụ alaka ụlọ ọrụ na ọfis. N’afọ 1993, a gwara anyị gaa rụwazie n’ọfis anyị dị n’Addis Ababa dị n’Itiopia. Anyị nọrọ ebe ahụ ọtụtụ afọ na-eje ozi anyị na nzuzo. Ma ugbu a, ụmụnna anyị enwerela onwe ha n’Itiopia.

Mgbe m bụ onye nlekọta distrikti n’Itiopia, n’afọ 1996

Jehova gọziri ọrụ anyị n’Itiopia. Ọtụtụ ụmụnna malitere ịsụ ụzọ oge niile. Kemgbe afọ 2012, e kee ndị nkwusa nọ n’obodo a ụzọ iri, ihe karịrị ụzọ abụọ n’ime ha na-asụ ụzọ oge niile kwa afọ. Ihe ọzọkwa bụ na ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova azụọla ọtụtụ ndị, a rụọkwala ihe karịrị otu narị Ụlọ Nzukọ Alaeze na iri abụọ n’ebe ahụ. N’afọ 2004, ezinụlọ Betel kwabara n’ụlọ ọhụrụ a rụụrụ ha. Ụlọ Mgbakọ dị n’otu ebe ahụ na-abakwara ụmụnna anyị niile uru.

N’ime afọ ndị a, mụ na Gail nwunye m na ụmụnna ndị Itiopia abụrụla ezigbo enyi. Anyị hụrụ ha n’anya n’ihi otú ha si dị obiọma ma hụ anyị n’anya. N’oge ndị a, ọ bụzi ọrịa ka anyị na ya na-alụ. Ọrịa ahụ mere ka e ziga anyị n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Jamanị. A na-elekọta anyị nke ọma n’ebe ahụ, ma ọ na-ewute anyị na anyị hapụrụ ụmụnna anyị ndị nọ n’Itiopia.

JEHOVA MERE KA O TOO

Anyị hụrụ otú Jehova si mee ka ọrụ ya too. (1 Kọr. 3:6, 9) Dị ka ihe atụ, mgbe mbụ m ziri ndị Rụwanda bịara igwu ọla kọpa na Kongo ozi ọma, e nweghị onye nkwusa ọ bụla na Rụwanda. Ma ugbu a, e nwere ihe karịrị puku ndị nkwusa iri atọ ná mba ahụ. N’afọ 1967, ndị nkwusa nọ na Kongo (Kinshasa) dị puku isii. Ma ugbu a, ha dị ihe dị ka narị puku ndị nkwusa abụọ na puku iri atọ. N’afọ 2018, ihe karịrị otu nde mmadụ bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ndị nkwusa nọ ná mba niile ndị ahụ alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Kenya na-elekọtabu akarịala otu narị puku.

Ihe karịrị afọ iri ise gara aga, Jehova ji ọtụtụ ụmụnna nyere m aka ịbanye n’ozi oge niile. Ọ bụ eziokwu na m ka na-eme ihere, amụtara m ịtụkwasị Jehova obi kpamkpam. Ihe ndị m mụtara n’Afrịka enyerela m aka inwe ndidi na ime ka ihe m nwere ju m afọ. Obi dị mụ na nwunye m ụtọ maka ụmụnna ndị ahụ na-ele ọbịa nke ọma, na-edi ọtụtụ nsogbu ma na-atụkwasị Jehova obi. Obi dịkwa m ezigbo ụtọ maka amara Jehova meere anyị. N’eziokwu, Jehova gọziri m otú m na-atụghị anya ya.—Ọma 37:4.

^ par. 11 E mechara kpọwa ya Ozi Alaeze Anyị. E jizi Usoro Ihe Omume ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ dochie ya.

^ par. 23 “Kitawala” si n’okwu Swahili nke pụtara “ịtụrụ mmadụ ụka, iduzi ya, ma ọ bụ ịchị ya.” Ha bụ òtù chọrọ inwere onwe ha n’aka ndị Beljọm na-achị ha mgbe ahụ. Ha na-ewere akwụkwọ Ndịàmà Jehova, mụọ ya, ma na-ekesara ya ndị mmadụ. Ha na-asụgharị Baịbụl isi iji kwado ebumnobi ha, nkwenkwe ụgha ha, na ndụ ọjọọ ha.