Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ̀ Bụ Eziokwu na Jizọs Nwụrụ n’Ihi M?

Ọ̀ Bụ Eziokwu na Jizọs Nwụrụ n’Ihi M?

NA BAỊBỤL, e nwere ọtụtụ ihe ndị “nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe” kwuru. (Jems 5:17) Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịdịrị anyị mfe ịghọta otú ọ dị Pọl mgbe o kwuru ihe dị ná Ndị Rom 7:21-24. Ebe ahụ sịrị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ. . . . Lee nhụsianya m nọ na ya!” Ọ bụrụ na anyị na ezughị okè alụwa, ihe a Pọl kwuru ga-akasi anyị obi n’ihi na o nwekwara mgbe ọ dị yanwa otú ahụ.

Pọl kwukwara ihe ndị ọzọ gosiri otú obi dị ya. Ná Ndị Galeshia 2:20, o kwuru na obi siri ya ike na Jizọs ‘hụrụ ya n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.’ Obi siri Pọl ike na ihe a bụ eziokwu. Obi ò sikwara gịnwa ike na Kraịst nyefere onwe ya maka gị? O nwere ike ọ bụghị mgbe niile.

Ọ bụrụ na mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga emee ka anyị na-eche na e nweghịzi uru anyị bara, o nwere ike ime ka o siere anyị ike ikweta na Jehova hụrụ anyị n’anya, nakwa na ọ gbagharala anyị mmehie anyị. O nwekwara ike ime ka o siere anyị ike ikweta na Jizọs nwụrụ maka anyị. Jizọs ọ̀ chọrọ ka o siere anyị ike ikweta na ọ nwụrụ maka anyị? Ọ bụrụ na Jizọs achọghị ya otú ahụ, gịnị ga-enyere anyị aka ikweta na ọ nwụrụ maka anyị? Ka anyị tụlee ajụjụ abụọ a.

OTÚ JIZỌS SI WERE ÀJÀ Ọ CHỤRỤ

Nke bụ́ eziokwu bụ na Jizọs chọrọ ka anyị kweta na ọ nwụrụ maka onye ọ bụla n’ime anyị. Olee otú anyị si mara? Weregodị ya na ị nọ mgbe ihe e dere na Luk 23:39-43 na-eme. E nwere otu nwoke a kpọgidere n’osisi n’akụkụ Jizọs. O kwetara na o mehiere. Ọ ga-abụrịrị na ihe o mere jọgburu onwe ya, n’ihi na ọ bụ ndị omekome mere ihe jọgburu onwe ya ka a na-esi otú a egbu. Ihe o mere na-enye ya nsogbu n’obi nke na ọ rịọrọ Jizọs, sị: “Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.”

Gịnị ka Jizọs mere? Chegodị ụdị ụfụ ọ fụrụ Jizọs mgbe ọ tụgharịrị olu ya lee nwoke ahụ. N’agbanyeghị na ọ nọ n’ihe mgbu, ọ mụmụụrụ nwoke ahụ ọnụ ọchị ma gwa ya, sị: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” Ọ bụrụ na Jizọs chọrọ, ọ gaara agwa nwoke ahụ na ‘nwa nke mmadụ bịara, . . . ka o nye mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Mat. 20:28) Ma, ị̀ chọpụtara na Jizọs medara obi gwa nwoke ahụ ihe mere ka o kweta na ọnwụ ọ na-aga ịnwụ ga-abara ya uru? Okwu bụ “mụ na gị” gosiri na Jizọs weere ya ka enyi ya. Jizọs mekwara ka ọ ghọta na ọ ga-ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs.

O doro anya na Jizọs chọrọ ka nwoke ahụ kweta na àjà o ji ndụ ya na-achụ ga-abara ya uru. Ọ bụrụ na Jizọs chọrọ ka onye omekome na-efeghị Chineke kweta na ọnwụ ya ga-abara ya uru, oleekwanụ maka Onye Kraịst na-efe Chineke e mere baptizim? Gịnị ga-enyere anyị aka ikweta n’eziokwu na Jizọs nwụrụ maka anyị n’agbanyeghị mmehie anyị mere n’oge gara aga?

IHE NYEERE PỌL AKA

Ọrụ ikwusa ozi ọma Jizọs nyere Pọl mere ka o kweta na Jizọs nwụrụ maka ya n’eziokwu. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? O kwuru, sị: “Ana m ekele Kraịst Jizọs Onyenwe anyị, onye nyere m ike, n’ihi na ọ gụrụ m n’onye kwesịrị ntụkwasị obi site n’ikenye m ozi, ọ bụ ezie na n’oge gara aga, abụ m onye nkwulu na onye mkpagbu na onye na-akparị mmadụ.” (1 Tim. 1:12-14) Ọrụ a Jizọs nyere Pọl n’agbanyeghị ihe ọjọọ niile Pọl mere mere ka obi sie ya ike na Jizọs meere ya ebere, hụ ya n’anya ma tụkwasị ya obi. Jizọs nyekwara onye ọ bụla n’ime anyị ọrụ a. (Mat. 28:19, 20) Ọrụ a ọ̀ ga-emekwa ka obi sie anyị ike na Jizọs nwụrụ maka anyị?

E nwere otu nwanna aha ya bụ Albert. Ọ dịbeghị anya ọ lọghachiri n’ọgbakọ kemgbe ihe fọrọ obere ka o ruo iri afọ atọ na anọ a chụrụ ya n’ọgbakọ. O kwuru, sị: “Mmehie m dị n’ihu m mgbe niile. Ma, mgbe ọ bụla m nọ n’ozi ọma, ọ na-adị m otú ahụ ọ dị Pọl onyeozi. Ọ na-eme ka obi na-atọkwu m ụtọ, na-eme ka m na-echefutụ ihe ndị ahụ, na-emekwa ka m mata na ọdịnihu ga-aka mma.”—Ọma 51:3.

Mgbe ị na-akụziri ụdị mmadụ niile Baịbụl, mee ka ha mata na Jizọs hụrụ ha n’anya ma na-emetere ha ebere

Tupu otu nwanna aha ya bụ Allan aghọọ Onyeàmà Jehova, ọ na-emebu mpụ na ihe ike. O kwuru, sị: “M ka na-echeta ihe ọjọọ niile m mere ndị mmadụ. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eme ka obi jọwa m ezigbo njọ. Ma, m na-ekele Jehova na o kwere ka onye mmehie dị ka m na-ezisara ndị mmadụ ozi ọma. M hụ ka ndị mmadụ na-ege ntị n’ozi ọma, ọ na-echetara m otú Jehova si hụ ndị mmadụ n’anya. Ahụla m na Jehova ji m na-enyere ndị na-ebi ụdị ndụ m biburu aka.”

Anyị nọrọ n’ozi ọma, anyị na-eme ihe ọma, na-echekwa echiche ọma. Ọ na-eme ka obi sie anyị ike na Jizọs na-emere anyị ebere, hụ anyị n’anya, tụkwasịkwa anyị obi.

JEHOVA KARỊRỊ ECHICHE ANYỊ

Tupu e bibie ụwa Ekwensu a, obi anyị ka nwere ike ịna-ama anyị ikpe n’ihi ihe ọjọọ ndị anyị mere n’oge gara aga. Gịnị ga-enyere anyị aka?

Obi otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Jean na-amakarị ya ikpe n’ihi ndụ ihu abụọ o biri n’oge ọ na-eto eto. O kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ na ‘Chineke karịrị obi anyị.’ ” (1 Jọn 3:19, 20) Ịmata na Jehova na Jizọs ma na anyị bụ ndị mmehie kwesịkwara ime ka obi ruo anyị ala. Cheta na ihe mgbapụta ahụ abụghị maka ụmụ mmadụ zuru okè, kama, ọ bụ maka ndị mmehie chegharịrị echegharị.—1 Tim. 1:15.

Ọ bụrụ na i chee echiche banyere otú Jizọs si mesoo ụmụ mmadụ na-ezughị okè ihe, kpee ekpere maka ya, na-emekwa ike gị niile n’ozi ọma, ọ ga-eme ka obi sie gị ike na Jizọs nwụrụ maka gị. Ọ bụrụ na anyị ana-eme otú ahụ, anyị nwere ike ikwu ka Pọl, sị: Jizọs “hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya maka m.”