ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 26
Nyere Ndị Ọzọ Aka Ka Ha Kwụsị Ịna-echegbu Onwe Ha
“Unu niile, nweenụ otu obi, ka ihe banyere onye ọzọ na-emetụ unu n’obi, nweenụ ịhụnanya ụmụnna, nweenụ obi ọmịiko, dịrịnụ umeala n’obi.”—1 PITA 3:8.
ABỤ NKE 107 Ṅomie Ịhụnanya Chineke
IHE ISIOKWU A NA-EKWU *
1. Olee otú anyị ga-esi eṅomi Jehova, bụ́ Nna anyị hụrụ anyị n’anya?
JEHOVA hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. (Jọn 3:16) Anyị kwesịrị iṅomi Nna anyị hụrụ anyị n’anya. Ọ bụ ya mere anyị ji agbalị ka ‘ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi, na-enwe ịhụnanya ụmụnna na obi ọmịiko’ n’ebe mmadụ niile nọ, ma karịchaa, n’ebe “ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.” (1 Pita 3:8; Gal. 6:10) Mgbe ụmụnna anyị nwere nsogbu, anyị na-agbalị inyere ha aka.
2. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu a?
2 Ndị niile chọrọ iso n’ezinụlọ Jehova ga-enwe mgbe ha na nsogbu ga na-alụ. (Mak 10:29, 30) Nsogbu anyị nwere ike ịka nkụ ka ọgwụgwụ ụwa a na-erukwu nso. Olee otú anyị ga-esi enyere ibe anyị aka? Ka anyị tụlee ihe anyị ga-amụta n’ihe Baịbụl kọrọ banyere Lọt, Job na Neomi. Anyị ga-atụlekwa ụfọdụ nsogbu ụmụnna anyị na-enwe n’oge a nakwa otú anyị ga-esi enyere ha aka idi ya.
NA-ENWE NDIDI
3. Dị ka e kwuru na 2 Pita 2:7, 8, olee mkpebi na-adịghị mma Lọt mere, oleekwa ihe ọ kpataara ya?
3 Lọt mere mkpebi na-adịghị mma mgbe ọ họọrọ ịga biri na Sọdọm, bụ́ ebe ndị mmadụ na-ebi ndụ rụrụ arụ. (Gụọ 2 Pita 2:7, 8.) Obodo Sọdọm bara ọgaranya, ma ọtụtụ nsogbu bịaara Lọt n’ihi ịga biri n’ebe ahụ. (Jen. 13:8-13; 14:12) O yiri ka obodo ahụ na ndị bi na ya ọ̀ bịara masị nwunye ya nke ukwuu, nke na o nupụụrụ Jehova isi. Ọ nwụrụ mgbe Chineke ji ọkụ na sọlfọ bibie obodo ahụ. Chegodị banyere ụmụ Lọt ndị nwaanyị abụọ. Ndị kwere nkwa ịlụ ha nwụrụ mgbe e bibiri Sọdọm. Ụlọ Lọt na ihe niile o nwere lara n’iyi. Ma nke kacha njọ bụ na nwunye ya nwụkwara. (Jen. 19:12-14, 17, 26) N’oge ndị a nsogbu juru Lọt ahụ́, Jehova ò wesoro ya iwe? Mba.
4. Olee otú Jehova si nweere Lọt ndidi? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)
4 N’agbanyeghị na ọ bụ Lọt kpebiri ịga biri na Sọdọm, Jehova meteere ya ebere ma ziga ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa napụta ya na ezinụlọ ya. Ma, kama Lọt ga-ege ndị mmụọ ozi ahụ ntị ma gbapụ na Sọdọm ozugbo, ọ “nọ na-egbu oge.” Ndị mmụọ ozi ahụ jidere ya n’aka ma kpọrọ ya na ndị ezinụlọ ya gbapụ n’obodo ahụ. (Jen. 19:15, 16) Ha gwara ya ka ọ gbaga n’ebe ugwu. Kama ime ihe Jehova kwuru, Lọt rịọrọ ka ọ gbaga n’otu obodo dị nso. (Jen. 19:17-20) Jehova ji ndidi gee ya ntị ma kwe ka ọ gbaga n’obodo ahụ. Ụjọ ibi n’obodo ahụ mechara jide Lọt, ya akwaga n’ebe ugwu ahụ Jehova gwara ya gbaga na mbụ. (Jen. 19:30) Jehova nweere Lọt ezigbo ndidi. Olee otú anyị ga-esi eṅomi Jehova?
5-6. Ka anyị na-agbalị iṅomi Chineke, olee otú anyị ga-esi eme ihe e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:14?
5 Dị ka Lọt, nwanna anyị nwere ike ime mkpebi na-adịghị mma, ya akpatara ya ezigbo nsogbu. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, gịnị ka anyị ga-eme? O nwere ike ịdị anyị ka anyị gwa ya ọ na-aghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ, nke bụkwanụ eziokwu. (Gal. 6:7) Ma, o nwere ihe ka mma anyị nwere ike ime. Anyị nwere ike iṅomi otú Jehova si nyere Lọt aka. Olee otú anyị ga-esi eme ya?
6 Ihe mere Jehova ji ziga ndị mmụọ ozi abụghị naanị iji gwa Lọt na a ga-ebibi Sọdọm, kamakwa, iji nyere ya aka ịgbapụ. Anyị hụ na ihe nwanna anyị na-eme nwere ike ịkpatara ya nsogbu, anyị nwekwara ike ịgwa ya. Ma anyị kwesịkwara inyere ya aka. Ọ bụrụgodị na ọ na-esitụrụ ya ike ime ihe Baịbụl kwuru, anyị kwesịrị inwere ya ndidi. Anyị kwesịrị ime ka ndị mmụọ ozi abụọ ahụ. Anyị ekwesịghị iji iwe hapụ ya, kama, anyị kwesịrị ịchọ ụzọ anyị ga-esi nyere ya aka, ọ bụghị naanị ịgwa ya okwu. (1 Jọn 3:18) Anyị nwere ike inyere ya aka ime ihe o kwesịrị ime.—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:14.
7. Olee otú anyị ga-esi eṅomi otú Jehova si leghara mmejọ Lọt anya?
7 Ọ bụrụ na Jehova chọrọ, ọ gaara elekwasị anya n’ihe Lọt mejọrọ. Kama ime otú ahụ, o mechara jiri mmụọ nsọ ya mee ka Pita onyeozi kpọọ Lọt, onye ezi omume. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Jehova na-eleghara mmejọ anyị anya. (Ọma 130:3) Ànyị nwere ike iṅomi Jehova n’otú o si leghara mmejọ Lọt anya? Ọ bụrụ na anyị ana-elekwasị anya n’àgwà ọma ụmụnna anyị, anyị ga na-enwekwuru ha ndidi. Ọ ga-emekwa ka ọ dịrị ha mfe ikwe ka anyị nyere ha aka.
NA-EMETERE NDỊ MMADỤ EBERE
8. Olee ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị na-emetere mmadụ ebere?
8 Job emeghị mkpebi na-adịghị mma ka Lọt. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ọdachi dakwasịrị ya. Ihe niile o nwere lara n’iyi, ndị mmadụ ana-ele ya anya ọjọọ, ezigbo ọrịa ejidekwa ya. Nke kadị njọ bụ na ụmụ ya niile nwụrụ. Ndị enyi ya atọ boro ya ebubo na ọ bụ onye ọjọọ. Gịnị mere ndị enyi ya a emetereghị
ya ebere? Ha lekwasịrị anya naanị n’ihe ha na-ahụ anya. O meziri ka ha kwuo ihe na-adịghị mma banyere ya. Olee otú anyị ga-esi zere ime ụdị ihe a? Anyị kwesịrị ịghọta na ọ bụ naanị Jehova ma ihe niile gbasara ọnọdụ onye ọ bụla nọ na ya. Mmadụ kọwara gị nsogbu ya, jiri ndidi gee ya ntị nke ọma. Gosi ya na ihe na-eme ya na-ewute gị. Ọ bụ naanị mgbe ahụ ka ị ga-emetere ya ebere.9. Gịnị ka anyị na-agaghị eme ma ọ bụrụ na anyị na-emetere ndị mmadụ ebere, n’ihi gịnịkwa?
9 Ọ bụrụ na anyị na-emetere ụmụnna anyị ebere, anyị agaghị eji nsogbu ha nọ na ya na-agba asịrị. Onye na-agba asịrị anaghị eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, ọ na-etisa ya. (Ilu 20:19; Rom 14:19) Ọ naghị achọ ịma otú ihe o kwuru ga-esi emetụta onye ọzọ, ihe o kwuru nwekwara ike ịgbawakwu onye na-ata ahụhụ obi. (Ilu 12:18; Efe. 4:31, 32) N’ihi ya, ọ dị mma ka anyị na-achọpụta ebe ụmụnna anyị na-eme nke ọma ma na-eche otú anyị nwere ike isi nyere ha aka idi nsogbu ha.
10. Gịnị ka ihe Job kwuru na Job 6:2, 3 na-eme ka anyị ghọta?
10 Gụọ Job 6:2, 3. O nwere oge ndị Job kwuru “okwu nzuzu.” Ma, o mechara kweta na ihe o kwuru ezighị ezi. (Job 42:6) Taakwa, onye nwere nsogbu na-echegbu ya nwere ike ikwu okwu nzuzu ka Job, mechaakwa kwaara ya mmakwaara. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ụdị ihe a mee? Kama ịkatọwa ya, anyị kwesịrị inwere ya ọmịiko. Cheta na Jehova achọghị ka onye ọ bụla n’ime anyị nwee nsogbu na ihe ndị na-echegbu anyị taa. Ọ bụ ya mere na ọ naghị eju anyị anya ma onye na-efe Jehova kwuo okwu n’echeghị echiche ma e nwee ihe na-echegbu ya. Ọ bụrụgodị na o kwuo ihe na-adịghị mma banyere Jehova ma ọ bụ anyịnwa, anyị ekwesịghị iwewara ya iwe ma ọ bụ were ya ka onye ọjọọ.—Ilu 19:11.
11. Olee otú ndị okenye ga-esi eme ka Elaịhu ma ha chọọ inye mmadụ ndụmọdụ?
11 Mgbe ụfọdụ, ọ na-adịkwa mkpa ka a gbazie onye na-echegbu onwe ya. (Gal. 6:1) Olee otú ndị okenye ga-esi eme ya? Ha kwesịrị iṅomi otú Elaịhu si medaa obi gee Job ntị. (Job 33:6, 7) Ọ bụ mgbe Elaịhu gechara Job ntị, ghọta ihe ọ na-eche, ka o nyere ya ndụmọdụ. Ndị okenye kwesịrị ime ka Elaịhu ma buru ụzọ gee onye nwere nsogbu ntị nke ọma ma gbalịa ịghọta ọnọdụ ya. Ha mechazie nye onye ahụ ndụmọdụ, ọ ga-eme ka o ruo ya n’obi.
NA-AGỤGỤ HA OBI
12. Olee otú ọnwụ di Neomi na nke ụmụ ya abụọ si kpaa ya aka?
12 Neomi bụ ezigbo nwaanyị hụrụ Jehova n’anya. Ma mgbe di ya na ụmụ ya ndị nwoke abụọ nwụrụ, ọ chọrọ ịgbanwe aha ya zawa “Mera,” nke pụtara “Obi Ilu.” (Rut 1:3, 5, 20, 21) Nwunye nwa ya bụ́ Rut ahapụghị ya n’oge ahụ nsogbu bịaara ya. Ọ bụghị naanị na Rut nyeere ya aka, kamakwa, ọ gwara ya okwu kasiri ya obi. Rut gwara Neomi ihe gosiri na ọ hụrụ ya n’anya nakwa na ọ ga-akwado ya.—Rut 1:16, 17.
13. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nyere ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ aka?
13 Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye nwanna anyị anwụọ, anyị kwesịrị inyere ya aka. E nwere ike iji di na nwunye tụnyere osisi abụọ toro n’akụkụ ibe ha. Ka afọ na-aga, mgbọrọgwụ osisi abụọ ahụ na-ahịkọta. Ọ bụrụ na otu anwụọ, o nwere ike ịkpa nke ọzọ aka ọjọọ. Otú ahụ ka o nwekwara ike ịdị onye di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụnahụrụ. Obi nwere ike ịgbawa ya ruo ogologo oge. Di otu nwaanyị aha ya bụ Paula * gbabiiri nwụọ. Paula kwuru, sị: “Ihe niile bịara ghasasịa ná ndụ m. Ike ụwa gwụrụ m. Ezigbo enyi m anwụnahụla m. M na-akọrọ di m ihe niile. Ọ na-eso m aṅụrị ọṅụ ma m ṅụrịwa ọṅụ, na-enyekwara m aka ma m nwee nsogbu. Ọ na-ege m ntị mgbe ọ bụla m na-akọsara ya ihe na-echegbu m. Ọnwụ di m gbawara m obi.”
14-15. Olee otú anyị ga-esi akasi onye di ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ obi?
14 Olee otú anyị ga-esi akasi onye di ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ obi? Ihe mbụ dị mkpa anyị kwesịrị ime bụ iso ya kwurịta okwu, ọ bụrụgodị na ọ na-esiri anyị ike ma ọ bụ na anyị amaghị ihe anyị ga-ekwu ya adị ya mma. Paula anyị kwuburu banyere ya kwuru, sị: “Ama m na ọ na-esiri ndị mmadụ ike ịma ihe ha ga-agwa onye mmadụ nwụnahụrụ. Ụfọdụ na-atụ ụjọ ikwu ihe ga-akpasu onye ahụ iwe. Ma nke ka njọ bụ ma onye bịara ịkasi gị obi gbachi gị nkịtị, na-ele gị sọ anya.” Onye mmadụ nwụnahụrụ anaghị atụ anya na anyị ga-abịa kwuwa ọtụtụ ihe. Paula kwuru, sị: “Ọ na-amasị m ma ndị mmadụ sị m naanị ‘ndo.’”
15 Nwunye otu nwoke aha ya bụ William nwụrụ afọ ole na ole gara aga. William kwuru, sị: “Obi na-adị m ụtọ ma ndị bịara ịkasi m obi na-akọ akụkọ ọma banyere nwunye m. Ọ na-emesi m obi ike na ha hụrụ ya n’anya, jirikwa ya kpọrọ ihe. Ihe a nyeere m ezigbo aka idi ọnwụ ya. Ihe ha na-agwa m na-akasi m obi n’ihi na ejighị m nwunye m egwu
egwu, mụ na ya dịkwa ka nnu na mmanụ.” Otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ aha ya bụ́ Bianca kwuru, sị: “Obi na-eru m ala ma ụmụnna bịara ileta m kpeere m ekpere ma gụọrọ m otu ebe ma ọ bụ abụọ na Baịbụl. Obi na-adịkwa m ụtọ ma ha na-akọ banyere di m ma na-egekwa m ntị mgbe m na-akọ banyere ya.”16. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị imere onye mmadụ nwụnahụrụ? (b) Olee ọrụ Jems 1:27 kwuru na anyị nwere?
16 Anyị kwesịrị ịnọgide na-enyere ndị mmadụ nwụnahụrụ aka otú ahụ Rut meere Neomi. Paula kwukwara, sị: “Ozugbo di m nwụrụ, ọtụtụ ndị bịara nyere m aka ma kasie m obi. Ma ka oge na-aga, onye ọ bụla agawara mkpa ya. Ọnwụ di m malitekwara inye m nsogbu n’obi ọzọ. Ọ ga-adị mma ma ndị mmadụ ghọta na onye mmadụ nwụnahụrụ ka chọrọ enyemaka ha ma ọnwa ole na ole ma ọ bụdị afọ ole na ole onye ahụ nwụrụ gachaa.” O doro anya na mmadụ niile abụghị otu. Ọ na-adịrị ụfọdụ mfe inweta onwe ha ngwa ngwa. Ma, o nwere ndị obi na-agbawa mgbe ọ bụla naanị ha mewere ihe ha na onye ha nwụrụ anwụ na-emekọbu. Otú onye ọ bụla si eru uju dị iche. Ka anyị cheta na Jehova nyere anyị ọrụ ilekọta ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ.—Gụọ Jems 1:27.
17. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nyere ndị di ma ọ bụ nwunye ha hapụrụ aka?
17 Obi na-agbawa ụfọdụ ndị ma di ha ma ọ bụ nwunye ha hapụ ha. Di otu
nwaanyị aha ya bụ Joyce hapụrụ ya gaa lụrụ nwaanyị ọzọ. Joyce kwuru, sị: “Alụkwaghịm di m gbara m gbawara m obi karịa otú ọ gaara esi agbawa m ma a sị na ọ nwụrụ anwụ. A sị na ọ nwụrụ n’ihe mberede ma ọ bụ na ọrịa gburu ya, m gaara ama na o sighị ya n’aka. Ma na nke a, di m ji aka ya gbaa m alụkwaghịm. Ọ dị m ka abaghịzi m uru ọ bụla.”18. Gịnị ka anyị ga-eme iji nyere ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ ma ọ bụ hapụrụ aka?
18 Ọ bụrụ na anyị emeere ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ ma ọ bụ hapụrụ ihe ọma, anyị na-eme ka ha ghọta na anyị hụrụ ha n’anya n’eziokwu. Ọ bụ n’oge a naanị ha nọzi ka ezigbo ndị enyi dị ha ezigbo mkpa. (Ilu 17:17) Olee otú ị ga-esi egosi na ị bụ ezigbo enyi ha? I nwere ike ịkpọ ha ka ha bịa rie nri na nke gị. I nwekwara ike ịgwa ha ka gị na ha gaa tụrụ ndụ ma ọ bụ rụọ n’ozi ọma. Ihe ọzọ i nwekwara ike ime bụ ịkpọ ha mgbe ụfọdụ ka ha soro unu n’ofufe ezinụlọ unu. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, obi ga-adị Jehova ụtọ, n’ihi na “ọ nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso,” bụrụkwa “onyeikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ.”—Ọma 34:18; 68:5.
19. N’iburu ihe e kwuru na 1 Pita 3:8 n’uche, gịnị ka i kpebisiri ike ime?
19 N’oge na-adịghị anya, mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, anyị “ga-echefu ahụhụ niile.” Anyị na-atụsi anya ike ịhụ mgbe ‘a na-agaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.’ (Aịza. 65:16, 17) Tupu mgbe ahụ, ka anyị na-enyere ụmụnna anyị aka, jirikwa okwu na omume anyị na-egosi ụmụnna anyị niile na anyị hụrụ ha n’anya.—Gụọ 1 Pita 3:8.
ABỤ NKE 111 Ihe Mere Anyị Ji Enwe Ọṅụ
^ par. 5 Lọt, Job na Neomi ji obi ha niile fee Jehova, ma o nwekwara mgbe nsogbu ndị siri ike bịaara ha. Isiokwu a ga-atụle ihe anyị ga-amụta n’akụkọ ha. Ọ kọwakwara ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-enwere ụmụnna anyị ndidi na ọmịiko mgbe ha nwere nsogbu, nakwa ka anyị na-agụgụ ha obi.
^ par. 13 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.
^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-ekwu ihe na-adịghị mma n’ihi na iwe ji ya, otu okenye ejiri ndidi na-ege ya ntị. Mgbe obi mechara jụrụ nwanna ahụ, okenye ahụ ejiri obiọma na-enye ya ndụmọdụ.
^ par. 59 NKỌWA FOTO: Ebe otu di na nwunye na-akatabeghị ahụ́ gara ileta otu nwanna nwoke nwunye ya ka nwụrụ. Ha na-ekwu ihe ọma banyere nwunye ya mgbe ha na-ele foto ya.