Baịbụl Ga-agwa Gị Eziokwu
Kemgbe ụwa, ndị dị iche iche kweere na Baịbụl na-ekwu eziokwu. Taakwa, ọtụtụ nde mmadụ na-eme ihe ndị Baịbụl kwuru. Ma, ndị ọzọ na-ewere ya ka ihe na-abaghị uru ma ọ bụ akụkọ ifo. Gịnị ka i chere? Ì nwere ike isi na Baịbụl mata eziokwu?
IHE MERE Ị GA-EJI TỤKWASỊ BAỊBỤL OBI
Olee otú ị ga-esi amata ma ì kwesịrị ịtụkwasị Baịbụl obi? Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na otu enyi gị na-agwakarị gị eziokwu ruo ọtụtụ afọ, i nwere ike ịtụkwasị ya obi. Baịbụl ọ̀ na-ekwu eziokwu mgbe niile ka enyi gị ahụ? Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.
Ndị Dere Ya Kwuru Eziokwu
Ndị dere Baịbụl kwuru eziokwu, ha na-ekwukarịkwa ihe ndị ha mejọrọ. Dị ka ihe atụ, Jona onye amụma dere gbasara isi o nupụụrụ Chineke. (Jona 1:1-3) Ihe o jidị pịachie akwụkwọ Baịbụl o dere bụ mba Chineke baara ya. Ọ chọghị ka ndị mmadụ too ya, ọ bụ ya mere na o deghị otú o si gbanwee àgwà ya. (Jona 4:1, 4, 10, 11) Otú ndị dere Baịbụl si kwuo nnọọ eziokwu na-egosi na ha ejighị eziokwu egwu egwu.
Ihe Ndị O kwuru Na-aba Uru
Ihe ndị Baịbụl kwuru, hà na-aba uru mgbe niile? À na-ajụkwa ajụ? Dị ka ihe atụ, lee ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma. Ọ sịrị: “N’ihi ya, unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu. N’eziokwu, ọ bụ ya ka Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma na-akụzi.” (Matiu 7:12) Baịbụl kwukwara, sị: “Mmadụ na-akwụsị iwe iwe ma e wetuo obi zaa ya okwu, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.” (Ilu 15:1) N’eziokwu, eziokwu Baịbụl bara uru taa otú ahụ ha bara n’oge e dere ha.
Akụkọ Ndị Dị na Ya Mere Eme
Ọtụtụ ihe ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie chọpụtarala kemgbe ọtụtụ afọ gosiri na ndị mmadụ na obodo dị iche iche Baịbụl kọrọ akụkọ ha abụghị akụkọ ifo. Ha gosikwara na ihe ndị e kwuru mere na Baịbụl mere eme n’eziokwu. Dị ka ihe atụ, tụlee otu obere ihe e kwuru banyere ya na Baịbụl. Baịbụl kwuru na n’oge Nehemaya, ndị Taya (Ndị Finishia si Taya) bi na Jeruselem “na-ebubata azụ̀ na ụdị ngwá ahịa ọ bụla” na ya.—Nehemaya 13:16.
È nwere ihe gosiri na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu? Ee, e nwere. Ndị na-egwupụta ihe n’ala ahụla ngwá ahịa ụfọdụ si Finishia n’Izrel. Nke ahụ gosiri na mba abụọ a na-azụkọbu ahịa. Ihe ọzọkwa bụ na na Jeruselem, e gwupụtala ụfọdụ ogwu azụ̀ nke azụ̀ ndị e gbutere n’Osimiri Mediterenian n’oge ochie. Ndị ọkachamara na-egwupụta ihe n’ala kwuru na ọ bụ n’akụkụ osimiri a dị anya ka ndị ahịa si bubata ya na Jeruselem. Mgbe otu onye ọkà mmụta tụlechara ihe ndị a, o kwuru, sị: “Ihe e kwuru na Neh[emaya] 13:16 na ndị Taya na-ere azụ̀ na Jeruselem bụ eziokwu.”
Ihe O Kwuru Banyere Sayensi Bụ Eziokwu
Baịbụl bụ akwụkwọ na-akụziri anyị gbasara ofufe Chineke nakwa ihe ndị mere eme. Ma o kwuo gbasara sayensị, ihe ndị ọ na-ekwu bụ eziokwu. Ka anyị tụlee otu ihe atụ.
Ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga, Baịbụl kwuru na “e nweghịkwa ihe” e kokwasịrị ụwa na ya. (Job 26:7) Ihe a Baịbụl kwuru dị iche n’akụkọ na-abụghị eziokwu a na-akọ banyere ụwa n’oge mbụ. A na-ekwubu na ụwa na-ese n’elu mmiri ma ọ bụkwanụ na e nwere nnukwu mbe bu ụwa. Ihe dị ka otu puku afọ na otu narị e dechara akwụkwọ Job, ndị mmadụ ka na-ekwu na o nweghị otú ọ ga-esi bụrụ na e nweghị ihe e kokwasịrị ụwa na ya. Ha na-ekwu na ọ ga-enwerịrị ihe ọ nọ n’elu ya. Ma, ihe dị ka narị afọ atọ gara aga, n’afọ 1687, onye sayensị aha ya bụ Isaac Newton bipụtara akwụkwọ o dere nchọpụta o mere banyere ihe mere ihe a tụliri elu ji ada n’ala. O kwuru na ọ bụ ike a na-anaghị ahụ anya ji ụwa. Ihe a onye sayensị a chọpụtara gbara akaebe na ihe Baịbụl kwuru ihe karịrị puku afọ atọ tupu ya achọpụta ya bụ eziokwu.
Amụma Ndị O Buru Na-emezu
Amụma ndị e buru na Baịbụl, hà na-emezu otú e si buo ha? Iji zaa ajụjụ ahụ, ka anyị tụlee otu ihe atụ: Aịzaya buru amụma na a ga-ebibi obodo Babịlọn.
Amụma Ahụ: Ihe karịrị puku afọ abụọ na narị afọ asatọ gara aga, Aịzaya buru amụma na a ga-ebibi Babịlọn. Babịlọn mechara bụrụ mba chịrị ụwa n’oge ahụ. Aịzaya kwukwara na a gaghịzi ebi na ya. (Aịzaya 13:17-20) Aịzaya kwudịrị na ọ bụ Saịrọs ka a ga-esi n’aka ya mezuo amụma a. O kwukwara otú Saịrọs ga-esi eme ya. Ọ sịrị na ọ ga-eme ka osimiri “taa.” Aịzaya bukwara amụma na a gaghị emechi ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ emechi.—Aịzaya 44:27–45:1.
Mmezu Amụma Ahụ: Ihe dị ka narị afọ abụọ mgbe Aịzaya buchara amụma ahụ, otu eze ndị Peshia bịara ibibi obodo Babịlọn. Ònye ka ọ bụ? Ọ bụ Saịrọs. Ebe ọ bụ na ọ gaghị adị mfe ịbanye na Babịlọn, Saịrọs kpebiri isi n’Osimiri Yufretis, bụ́ nke gbara obodo ahụ gburugburu banye. Ndị agha ya gwuru ọwa mmiri iji chee osimiri ahụ ihu n’ebe ọzọ. Nke a mere ka mmiri ahụ talata ma na-eruzi ha n’ikpere, ya emee ka ọ dịrị Saịrọs na ndị agha ya mfe iji ụkwụ gafee osimiri ahụ ruo ná mgbidi obodo ahụ. Gịnị meziri? Ọ dị ịtụnanya na ndị Babịlọn ghewere ọnụ ụzọ ámá obodo ha nke chere ihu ná mmiri ahụ oghe. Saịrọs na ndị agha ya si na ya banye ma bibie obodo ahụ.
Ma, ọ ka nwere ihe fọrọnụ: Babịlọn ọ̀ ghọrọ ebe ndị mmadụ na-ebighịzi? Ndị mmadụ biri na Babịlọn ruo narị afọ ole na ole e bibichara ya. Ma taa, ebe Babịlọn oge ochie ahụ dịbu dị nso na Bagdad dị n’Ịrak. Ebe ahụ bụzi mkpọmkpọ ebe. Ihe a gosiri na amụma ahụ emezuchaala. N’eziokwu, anyị kwesịrị ịtụkwasị Baịbụl obi, ma mgbe ọ na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu.