Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Gbasara Ekpere

Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Gbasara Ekpere

“Ọ na-abụ m na-ekpe ekpere, ọ na-adị m ka Chineke ọ̀ nọ m n’akụkụ, jide m n’aka ma na-eduzi m mgbe m na-amaghị ihe m ga-eme.”—MARÍA.

“Nwunye m rịara ọrịa kansa afọ iri na atọ, mechaa nwụọ. M chetara n’oge ahụ na m kpere ekpere kwa ụbọchị, amakwa m na Chineke nọ na-anụ arịrịọ m na-arịọ ya n’ihi nsogbu m nọ na ya. O mere ka obi ruo m ala.”—RAÚL.

“Ekpere bụ ezigbo onyinye Chineke nyere ụmụ mmadụ.”—ARNE.

Ị jụọ María, Raúl, Arne na ọtụtụ ndị ọzọ, ha ga-agwa gị na ekpere bụ onyinye pụrụ iche. Ha weere ekpere ka otú ha ga-esi agwa Chineke okwu, kelee ya ma rịọ ya maka enyemaka. Ha ji obi ha niile kweta na ihe Baịbụl kwuru gbasara ikpegara Chineke ekpere bụ eziokwu. Baịbụl sịrị: “Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.”—1 Jọn 5:14.

Ma, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta n’ihe Baịbụl kwuru gbasara ekpere. Otu nwoke aha ya bụ Steve kwuru otú yanwa si ele ekpere anya. Ọ sịrị: “Mgbe m dị afọ iri na asaa, ndị enyi m atọ nwụrụ n’ihe mberede. Onye nke mbụ nwụrụ n’ihe mberede okporo ụzọ, mmiri erie abụọ ndị nke ọzọ.” Gịnị ka Steve mere? Ọ sịrị: “M jụrụ Chineke n’ekpere ihe mere ihe ndị a ji mee, ma ọ zaghị m ihe ọ bụla. N’ihi ya, m jụrụ onwe m, sị: ‘È nwekwaranụ uru ekpere bara?’” Ọtụtụ ndị chere na ọ baghị uru ịna-ekpe ekpere ebe ọ bụ na ọ dị ha ka Chineke azaghị ndị nke ha kpere ekpe.

E nwekwara ihe ndị ọzọ mere ụfọdụ ndị ji eche na ikpe ekpere abaghị uru. Ha na-asị na ebe ọ bụ na Chineke ma ihe niile, ọ pụtara na ọ ma ihe ndị dị anyị mkpa na nsogbu anyị, n’ihi ya, ọ baghị uru ikpewe ekpere.

Ndị ọzọ chere na Chineke achọghị ịnụ ekpere ha n’ihi ihe ọjọọ ndị ha mere n’oge gara aga. Otu nwaanyị aha ya bụ Jenny kwuru, sị: “Nsogbu kachanụ m nwere bụ na m na-eche na enweghị uru m bara. Ihe ọjọọ ndị m mere n’oge gara aga na-ewute m. N’ihi ya, m gwara onwe m na erughị m eru Chineke ịza ekpere m.”

Olee otú gịnwa si were ikpe ekpere? Ọ bụrụ na e nwetụla mgbe ọ dị gị ka e nweghị uru ikpe ekpere bara, ka obi sie gị ike na Baịbụl ga-azali ajụjụ ọ bụla i nwere gbasara ekpere. Obi kwesịrị isi anyị ike na ihe ọ bụla Baịbụl kwuru gbasara ekpere * bụ eziokwu. Baịbụl nwekwara ike inyere gị aka ịmata azịza ajụjụ ndị a:

  • Chineke ọ̀ na-anụ ekpere anyị n’eziokwu?

  • Gịnị mere Chineke anaghị aza ekpere ụfọdụ?

  • Olee otú ị ga-esi ekpe ekpere ka Chineke nụ ya?

  • Olee otú ekpere ga-esi enyere gị aka?

^ par. 9 E dere ekpere ọtụtụ ndị ohu Chineke kpere na Baịbụl, ma ndị nke Jizọs Kraịst kpere. E nwere ekpere karịrị otu narị na iri ise n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke a na-akpọkarị, Agba Ochie.