Ihe Ị Ga-eme Ka Ị Kwụsị Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị
Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, na-akpa ike. Ọ na-eme ka ndị mmadụ gbanwee kpawa àgwà ọma. (Ndị Hibru 4:12) Ihe Baịbụl kwuru emeela ka ọtụtụ ndị kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. Ka anyị leba anya n’ihe anọ Baịbụl kwuru nyeere ọtụtụ ndị aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị.