Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Mmalite

Okwu Mmalite

Ọtụtụ ndị n’ụwa taa kpọrọ ibe ha asị. E nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-eme na-egosi na ha kpọrọ ndị ọzọ asị. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị na-akpa ókè, ndị na-amaja ibe ha, ndị na-akparị ibe ha, nakwa ndị na-eti ibe ha ihe. È nwere mgbe ịkpọasị ga-akwụsị? Isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a kwuru otú Baịbụl ga-esi nyere anyị aka ka anyị kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. E kwukwara na Chineke kwere nkwa ime ka ịkpọasị kwụsị kpamkpam.