Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

3 | Wepụ Ịkpọasị n’Obi Gị

3 | Wepụ Ịkpọasị n’Obi Gị

Ihe Baịbụl Kwuru:

“Gbanweenụ ụdị mmadụ unu bụ. Otú unu ga-esi eme ya bụ ịgbanwe otú unu si eche echiche, ka unu wee chọpụta ihe bụ́ uche Chineke, nke dị mma, nke zuru okè, nke na-emekwa ya obi ụtọ.”​NDỊ ROM 12:2.

Ihe Ọ Pụtara:

Ihe ndị anyị na-eche n’echiche gbasara Chineke. (Jeremaya 17:10) O doro anya na anyị ekwesịghị ikwu ma ọ bụ ime ihe gosiri na anyị kpọrọ ndị ọzọ asị. Ma, e nwere ihe ọzọ anyị kwesịrị ime. Ebe ọ bụ ihe dị mmadụ n’obi na ihe ndị ọ na-eche n’echiche na-eme ka ọ kpọọ ndị ọzọ asị, ọ dị mkpa ka anyị wepụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị kpọọ ndị ọzọ asị n’obi anyị, kwụsịkwa iche banyere ya. Ọ bụ mgbe anyị mere ya ka à ga-asị na anyị ‘agbanweela ụdị mmadụ anyị bụ’ ma kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị.

Ihe I Nwere Ike Ime:

Chebara onwe gị ezigbo echiche ka ị mata otú i si ele ndị ọzọ anya, karịchaa, ndị gị na ha na-esighị n’otu obodo. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m si were ha? Ihe mere m ji were ha otú ahụ ọ̀ bụ maka ihe doro m anya m ma gbasara ha? Ka ọ̀ bụ maka na ihe ha anaghị amasị m?’ Elekwala ma ọ bụ gụọ ihe ndị nwere ike ime ka ị kpọọ ndị mmadụ asị ma ọ bụkwanụ mee ka ị kwado tigbuo zọgbuo. Zerekwa ịga n’ebe ndị mmadụ na-ekwurịta ihe ndị nwere ike ime ka ị kpọọ ndị ọzọ asị n’Ịntanet.

Okwu Chineke nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị ịkpọ ndị mmadụ asị n’obi anyị.

Ọ naghị adịchara anyị mfe ịgwa onwe anyị eziokwu ma anyị leruwe ihe ndị anyị na-eche n’echiche anya. Ma, Okwu Chineke ga-enyeliri anyị aka ‘ịchọpụta ihe anyị na-eche na ihe anyị bu n’obi.’ (Ndị Hibru 4:12) N’ihi ya, na-amụ Baịbụl. Jiri ihe ndị ị na-amụta na ya na-eleru otú i si eche echiche anya. Gbalịakwa ka ị gbanwee otú i si eche echiche ka ọ daba n’ihe Baịbụl kwuru. Ọ bụrụ na ịkpọasị “gbanyesiri mgbọrọgwụ ike” n’obi anyị, Okwu Chineke nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị ya.​—2 Ndị Kọrịnt 10:​4, 5.