Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

1 | Ekpere—“Na-akọrọnụ Ya Ihe Niile Na-echegbu Unu”

1 | Ekpere—“Na-akọrọnụ Ya Ihe Niile Na-echegbu Unu”

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Na-akọrọnụ [Chineke] ihe niile na-echegbu unu, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”​—1 PITA 5:7.

Ihe Ọ Pụtara

Jehova Chineke na-agwa anyị ka anyị kọọrọ ya ihe ọ bụla na-echegbu anyị ma ọ bụ na-echu anyị ụra. (Abụ Ọma 55:22) E nweghị nsogbu karịrị akarị ma ọ bụ dị obere ịkọsara ya Jehova. Ọ bụrụhaala na ọ na-enye anyị nsogbu, ọ gaghị eleghara ya anya. Ikpe ekpere kọsara ya Jehova bụ otu ihe dị mkpa ga-eme ka obi ruo anyị ala.​—Ndị Filipaị 4:6, 7.

Otú Ihe A Nwere Ike Isi Nyere Anyị Aka

Ọ bụrụ na isi akpakọchaghị anyị ọnụ, o nwere ike ịdị anyị ka e nweghị onye anyị nwere. Ọ bụghị mgbe niile ka ndị ọzọ na-aghọtacha ihe anyị na ya na-alụ. (Ilu 14:10) Ma, ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile kpee ekpere gwa Chineke otú o si dịrị anyị, ọ ga-ege anyị ntị nke ọma, ghọtakwa otú obi dị anyị. Jehova na-ahụ anyị, ọ ma nsogbu anyị niile, ọ chọkwara ka anyị kpee ekpere gwa ya ihe ọ bụla na-enye anyị nsogbu n’obi.​—2 Ihe E Mere 6:29, 30.

Ịgwa Jehova okwu n’ekpere na-eme ka obi sikwuo anyị ike na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi. Obi nwere ike ịdị anyị otú ọ dị otu ọbụ abụ, onye kpere ekpere, sị: “Ị hụla otú e si na-emesi m ike. Ị ma na m na-atagbu onwe m n’ahụhụ.” (Abụ Ọma 31:7) Naanị ịmata na Jehova na-ahụ ihe anyị na ya na-alụ nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ịda mbà n’oge nsogbu. Ma, ihe Jehova na-eme abụghị naanị ịhụ nsogbu anyị. Ọ na-aghọtakwa nsogbu ndị ahụ karịa onye ọ bụla ọzọ ma na-enyere anyị aka ka anyị nweta nkasi obi na agbamume si na Baịbụl.