Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Mmalite

Okwu Mmalite

N’ebe niile n’ụwa, e nwere ọtụtụ nde mmadụ isi na-akpakọchaghị ọnụ. Ụdị ọrịa a na-arịa ndị si n’agbụrụ dị iche iche na ndị na-ekpe okpukpe dị iche iche, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto, ma ndị nwere ego ma ndị na-enweghị ego, ma ndị gụrụ akwụkwọ ma ndị na-agụghị akwụkwọ. Olee mgbe e nwere ike ikwu na isi akpakọchaghị mmadụ ọnụ? Oleekwa otú ọrịa a si akpa ndị mmadụ aka ọjọọ? Magazin a ga-ekwu ihe mere o ji dị mkpa ka a gwọọ onye nwere ụdị ọrịa a otú kwesịrị ekwesị. Ọ ga-ekwukwa ụzọ dị iche iche Baịbụl nwere ike isi nyere ndị nwere ụdị nsogbu a ezigbo aka.