Ikwu Ihe Ga-eme n’Ọdịnihu
Ì chetụla otú ihe ga-adịrị gị na ezinụlọ gị n’ọdịnihu? Ihe ọ̀ ga-adịrị unu mma ka ihe ọ̀ ga-esiri unu ike? Udo ọ̀ ga-adị n’ụlọ unu ka ọ̀ bụ na ọ gaghị adị? Ị̀ ga-aka nká, ka ị̀ ga-anwụchu ọnwụ? Ndị mmadụ echeela gbasara ajụjụ ndị a kemgbe ọtụtụ puku afọ.
Taa, ndị ọkachamara na-amụ otú ihe si eme n’ụwa, jiri ya na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ihe ha kwuru na-emezu ma ụfọdụ na-akụ afọ n’ala. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwoke aha ya bụ Guglielmo Marconi mepụtara telegram nke na-enweghị waya n’afọ 1912, a sị na o kwuru, sị: “Mwepụta a e wepụtara ihe ndị e ji ezirịta ozi ndị na-enweghị waya ga-eme ka a gharazie ịna-alụ agha.” Otu onye na-arụ n’otu ụlọ ọrụ a na-akpọ Decca Record Company jụrụ imepụtara ndị òtù egwú a na-akpọ the Beatles egwú ha n’afọ 1962. Ihe mere o ji jụ bụ na o chere na ọ gaghịzi ara ahụ́ ndị na-eji ụbọ akpọ egwú akwụsị iwu ewu.
Ọtụtụ ndị na-agakwuru ndị mmụọ ọjọọ iji mata ọdịnihu, ụfọdụ ana-agakwuru ndị na-agụ kpakpando. Ọtụtụ magazin na akwụkwọ akụkọ na-ekwukwa gbasara ịgụ kpakpando. Ndị ọzọ na-agakwuru ndị na-akọ ọdịnihu ma ọ bụ ndị na-eme anwansi, bụ́ ndị na-ekwu na ha ga-ejili enyo, nrọ ma ọ bụ akara aka mata otú ihe ga-adị n’ọdịnihu.
Ụfọdụ ndị n’oge ochie na-agakwuru dibịa afa iji mata ọdịnihu, dibịa afa ahụ agwa ha ihe chi ya kwuru. Dị ka ihe atụ, e kwuru na Eze na-achị Lidia aha ya bụ Krosus zigaara arụsị dị na Delfi, nke dị na Gris, onyinye dị oké ọnụ ahịa ka o nwee ike ịgwa ya ihe ga-eme ma ọ gaa ịlụso Saịrọs bụ́ eze Peshia agha. Dibịa afa ahụ gwara Krosus na ọ ga-ebibi “Alaeze ukwu” ma ọ gaa ịlụso Saịrọs agha. Krosus ji obi ike na ya ga-emeri gawazie ịlụso ya agha. Ma, alaeze ukwu e bibiziri n’agha ahụ bụ nke Krosus.
E nweghị ndị ọ gaara abụ ha merie n’agha ahụ, ya abụrụ na ihe o kwuru emeghị. Ma, amụma ahụ e buuru ya edoghị anya, n’ihi ya o nweghị uru ọ bara. Ihe niile Krosus nwere funahụrụ ya n’ihi ọdachi ozi a na-edoghị anya kpataara ya. Ihe ọ̀ na-agaziri ndị na-aga ka e si n’ụzọ ndị a e nwere taa gwa ha ihe ga-eme n’ọdịnihu?