“Ndị Dị Umeala n’Obi Ga-enweta Ụwa”
Ọtụtụ n’ime anyị ahụtụla ka a na-agbagọ ikpe nakwa ka ndị ọjọọ na-emegbu ndị aka ha dị ọcha. È nwere mgbe ikpe na-ezighị ezi na mmegbu na-agaghịzi adị?
Abụ Ọma 37 zara ajụjụ a. O kwukwara ihe ndị ga-enyere anyị aka taa. Legodị otú o si zaa ajụjụ ndị a.
Olee otú anyị kwesịrị isi mesoo ndị na-emegbu anyị?—Amaokwu nke mbụ na nke abụọ.
Gịnị ga-eme ndị ọjọọ?—Amaokwu nke iri.
Gịnị ga-eme ndị ezi omume n’ọdịnihu?—Amaokwu nke iri na otu na nke iri abụọ na itoolu.
Gịnị ka anyị kwesịrị ime ugbu a?—Amaokwu nke iri atọ na anọ.
Abụ Ọma nke 37 mere ka o doo anya na ihe ga-adịrị ndị ‘nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ma na-edebe ụzọ ya’ mma n’ọdịnihu. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ka gị na ha mụwa Baịbụl. Ọ ga-enyere gị aka ịmụta otú gị na ndị ezinụlọ gị ga-esi soro ná ndị ga-enweta ndụ n’ọdịnihu.