Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nkwa Ndị Ga-emezu n’Ọdịnihu

Nkwa Ndị Ga-emezu n’Ọdịnihu

A na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile, otú ahụ Jizọs buru n’amụma. (Matiu 24:14) Akwụkwọ Daniel gwara anyị na Alaeze a bụ ọchịchị Chineke. N’isi ya nke abụọ, e buru amụma gbasara mba ndị ga-achị ụwa malite n’ọchịchị Babịlọn ruo n’oge anyị a. Amaokwu nke iri anọ na anọ kwuru ihe ga-emecha mee. Ọ sịrị:

“Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”

Amụma a na amụma ndị ọzọ dị na Baịbụl kwuru na Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ ma mee ka ndị bi n’ụwa nwee udo na ahụ́ iru ala. Olee otú ihe ga-adị ma Alaeze Chineke chịwa? Lee nkwa ụfọdụ mara ezigbo mma ga-emezu n’oge na-adịghị anya.

  • AGHA AGAGHỊZI ADỊ

    Abụ Ọma 46:9: “[Chineke] na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube; Ọ na-agbakwa ụgbọ agha ọkụ.”

    Chegodị otú ụwa ga-adị ma ọ bụrụ na e jiri ego na nkà niile a na-etinye n’ịkpụpụta ngwá agha na-eme ihe ndị ga-abara ndị mmadụ uru kama iji ha na-eme ihe ndị ga-egbu ha. A ga-emezu nkwa a ma Alaeze Chineke chịwa.

  • ỌRỊA AGAGHỊZI ADỊ

    Aịzaya 33:24: “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’”

    Chegodị otú ụwa ga-adị ma ọ bụrụ na e nweghịzi onye na-arịa ọrịa obi, ọrịa kansa, ịba ma ọ bụ ọrịa ọ bụla ọzọ. Ụlọ ọgwụ na ọgwụ agaghịzi adị mkpa. Ahụ́ ga-esi ndị niile bi n’ụwa n’oge ahụ ike.

  • ỤKỌ NRI AGAGHỊZI ADỊ

    Abụ Ọma 72:16: “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; Ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.”

    Ala ga na-emepụta nri ga-ezuru onye ọ bụla. Nri ga na-erukwa onye ọ bụla aka. Agụụ na erighị nri na-edozi ahụ́ agaghịzi adị.

  • IHE MGBU, IRU UJU NA ỌNWỤ AGAGHỊZI ADỊ

    Mkpughe 21:4: “[Chineke] ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”

    Ihe ọ pụtara bụ na mmadụ ga-ezu okè, dịkwa ndụ ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ. Ọ bụ ihe Jehova Chineke, onye hụrụ anyị n’anya, kwere ná nkwa.

“Ọ GA-EMEZUKWA”

Ihe a niile hà yiri ihe na-agaghị ekwe omume? Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị kwetara na ndụ ga-adị ezigbo ụtọ mgbe nkwa ndị a ga-emezu, ma ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ikweta na mmadụ ga-adị ndụ ebighị. O kwesịghị iju anyị anya n’ihi na o nwebeghị mmadụ dịtụrụla ndụ ebighị ebi ga-agwa anyị otú ịdị ndụ ebighị ebi na-adị.

Kemgbe ọtụtụ afọ, ihe mgbu, mmehie na ọnwụ emenyụọla ndị mmadụ anya. Ọtụtụ ndị ataala ahụhụ ọtụtụ afọ, ya emee ka ọ dịzie ha ka o nweghị ihe ọ bụ. Ma, ihe ndị a abụtụdịghị ihe Jehova Chineke, onye kere anyị, bu n’obi kee anyị.

Iji mee ka anyị mata na ihe niile Chineke kwere ná nkwa ga-emezu, Chineke kwuru hoo haa, sị: “Ọ gaghị agba aka lọghachikwute m, kama ọ ga-eme ihe na-atọ m ụtọ, ọ ga-emezukwa ihe m zigara ya ka o mee.”—Aịzaya 55:11.

Na Baịbụl, a kpọrọ Jehova Chineke “onye na-apụghị ịgha ụgha.” (Taịtọs 1:2) Ebe ọ bụ na o kwere anyị nkwa ndị a mara ezigbo mma n’ọdịnihu, ọ ga-adị mma ka anyị jụọ onwe anyị, sị: Mmadụ ọ̀ ga-adịli ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs? Olee ihe anyị ga-eme ka anyị nwee ike irite uru ná nkwa ndị Chineke kwere anyị? Ị ga-ahụ azịza ajụjụ ndị a n’isiokwu ndị na-esonụ.