Ọdịnihu Gị Dị Gị n’Aka
Ị̀ GA-EJILI AKA GỊ KPEBIE OTÚ ỌDỊNIHU GỊ GA-ADỊ? Ụfọdụ ndị kwetara na mmadụ agaghị ekwuli otú ọdịnihu ya ga-adị, kama na ọ dabeere n’akara aka onye ahụ. Ọ bụrụ na e nwee ihe ụfọdụ ha chọrọ ime ná ndụ, ma ó kweghị ha, ha asị na ebe ọ bụ na e nweghị ihe ha ga-emeli maka ya na ọ bụghị akara aka ha.
Ndị ọzọ na-abụ ha gbagide mbọ n’ụwa a mmegbu na ikpe na-ezighị ezi juru, ma ó nweghị isi, ike ụwa agwụ ha. O nwere ike ịbụ na ha agbaala mbọ ka ihe dịtụrụ ha mma. Mana, agha, mpụ, ọdachi ndị na-emere onwe ha, na ọrịa emeela ka mbọ ha ghara inwe isi ọtụtụ ugboro. Ihe a na-eme ka ha na-ajụzi onwe ha ma ọ̀ ka bara uru ịna-enye onwe ha nsogbu.
Ihe ụfọdụ nwere ike ịkpa atụmatụ mmadụ aka ọjọọ. (Ekliziastis 9:11) Ma, a bịa n’ihe banyere ịdị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu, ị ga-eji aka gị họrọ ma ị̀ chọrọ ya. Baịbụl gosiri na ihe ga-ekpebi ma ị ga-adị ndụ n’ọdịnihu bụ ihe ndị i kpebiri ime. Legodị ihe o kwuru.
Mgbe mba Izrel chọrọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, Mozis, onye Jehova si n’aka ya duo mba ahụ, gwara ha, sị: “Edebewo m ndụ na ọnwụ n’ihu unu, ngọzi na nkọcha; ị ga-ahọrọkwa ndụ ka i wee dịrị ndụ, gị na ụmụ gị, site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya, site n’ige ntị n’olu ya na site n’ịrapara ya n’ahụ́.”—Diuterọnọmi 30:15, 19, 20.
“Edebewo m ndụ na ọnwụ n’ihu unu, ngọzi na nkọcha; ị ga-ahọrọkwa ndụ.”—Diuterọnọmi 30:19
Chineke napụtara mba Izrel n’ohu ha na-agba n’Ijipt ma kwe ha nkwa ime ka ha baa n’Ala Nkwa ahụ. N’ebe ahụ, ha agaghịzi abụ ohu, ha ga na-enwekwa obi ụtọ. Ma, ngọzi ọma ndị a, agaghị anọkata bịara ha. Iji nweta ha, ha ‘ga-ahọrọ ndụ.’ Olee otú ha ga-esi eme ya? Ọ bụ ‘site n’ịhụ Chineke n’anya, site n’ige ntị n’olu ya na site n’ịrapara ya n’ahụ́.’
Taa ị ga-ekpebikwa nke ị ga-ahọrọ. Ihe ị họọrọ ime ga-ekpebi otú ọdịnihu gị ga-adị. Ọ bụrụ na ị họrọ ịhụ Chineke n’anya, ige ntị n’ihe ọ na-ekwu, na ịrapara ya n’ahụ́, ọ pụtara na ị na-ahọrọ ịdị ndụ ebighị ebi na paradaịs. Ma, gịnị ka ịhụ Chineke n’anya, ige ntị n’olu ya na ịrapara ya n’ahụ́ pụtara?
HỤ CHINEKE N’ANYA
Ịhụnanya bụ àgwà kachanụ Chineke nwere. Jọn onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ọ bụ ya mere na mgbe a jụrụ Jizọs iwu kacha iwu niile, ọ zara, sị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) Ihe mmadụ kwesịrị ime ka ya na Jehova Chineke dị ná mma bụ ịna-erubere ya isi n’ihi na ọ hụrụ Chineke n’anya, ọ bụghị n’ihi ụjọ. Oleekwanụ ihe mere anyị ji kwesị ịhụ ya n’anya?
E nwere ike iji otú Jehova si hụ ụmụ mmadụ n’anya tụnyere otú nne na nna si hụ ụmụ ha n’anya. Ọ bụ eziokwu na nne na nna ezughị okè, ma ha na-akụziri ụmụ ha ihe, na-agba ha ume, na-akwado ha, na-adọkwa ha aka ná ntị. Ihe mere ha ji eme ihe a niile bụ na ha chọrọ ka ihe gaziere ụmụ ha, chọọkwa ka ha na-enwe obi ụtọ. Ma, gịnị ka ha ga-achọ ka ụmụ ha mee? Ha ga-achọ ka ụmụ ha hụkwa ha n’anya ma mee ihe ndị ahụ ga-abara ha uru, ha kụziiri ha. Ọ̀ bụ na Nna anyị nke eluigwe ekwesịghị ịtụ
anya ka anyị hụ ya n’anya iji gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe niile o meere anyị?GEE NTỊ N’OLU YA
N’asụsụ mbụ e ji dee Baịbụl, okwu ahụ bụ́ “ige ntị” pụtakwara “irube isi.” Ọ bụrụ na anyị asị nwatakịrị “gee nne na nna gị ntị,” ihe anyị na-agwa ya bụ ka o rubere ha isi, ọ́ bụghị ya? N’ihi ya, ige ntị n’olu Chineke pụtara ịmata ihe ọ na-ekwu na irubere ya isi. Ebe ọ bụ na anyị anaghị anụ olu Chineke taa, otú anyị si ege ntị n’olu ya bụ ịgụ Okwu ya bụ́ Baịbụl na ime ihe ndị anyị mụtara na ya.—1 Jọn 5:3.
E nwere ihe Jizọs kwuru gosiri uru ige ntị n’olu Chineke bara. Ọ sịrị: “Ọ bụghị naanị achịcha ga-eme ka mmadụ dị ndụ, kama ọ bụ okwu niile nke na-esi n’ọnụ Jehova pụta.” (Matiu 4:4) Iri nri dị anyị ezigbo mkpa. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ịmụ banyere Chineke dị mkpa karịa nri. N’ihi gịnị? Eze Sọlọmọn kwuru, sị: “Amamihe bụ ihe nchebe, dịkwa ka ego bụ ihe nchebe; ma ihe ihe ọmụma ji ka mma bụ na amamihe na-echebe ndị nwe ya ndụ.” (Ekliziastis 7:12) Amamihe si n’aka Chineke nwere ike ichebe anyị taa ma nyere anyị aka ime mkpebi ndị ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.
RAPARA YA N’AHỤ́
Ọ̀ kwa i chetara ihe atụ ahụ Jizọs mere e kwuru banyere ya n’isiokwu bu nke a ụzọ? Ọ sịrị: “Ọnụ ụzọ ámá nke na-eduba ná ndụ dị warara, okporo ụzọ ya dịkwa mkpagide, ndị na-achọta ya dịkwa ole na ole.” (Matiu 7:13, 14) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịga ije n’okporo ụzọ ahụ, rutekwa ebe anyị na-aga, ya bụ, ndụ ebighị ebi, ọ ga-adị mma ka anyị na-esochi onye ma ụzọ ahụ anya. Ọ bụ ihe a mere anyị ji kwesị ịnọ Chineke nso. (Abụ Ọma 16:8) Oleekwanụ otú anyị ga-esi eme ya?
Kwa ụbọchị, e nwere ọtụtụ ihe anyị ga-emerịrị, nweekwa ọtụtụ ihe anyị ga-achọ ime. Ihe ndị ahụ nwere ike ime ka anyị ghara inwe oge chebara ihe ndị Chineke chọrọ ka anyị mee echiche. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị, sị: “Na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) Otú anyị si anọ Chineke nso bụ ime ka adịm ná mma anyị na ya bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ.—Matiu 6:33.
Ọ DỊ GỊ N’AKA IKPEBI IHE Ị GA-EME
Ọ bụ eziokwu na e nweghị ihe ị ga-emeli iji gbanwee ihe ndị merela eme, ma e nwere ihe ndị i nwere ike ime ka ọdịnihu gị na nke ndị ị hụrụ n’anya dị mma. Baịbụl gosiri na Jehova Chineke, Nna anyị nke eluigwe, hụrụ anyị n’anya nakwa na ọ na-eme ka anyị mata ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme. Legodị ihe Maịka onye amụma kwuru.
Ọ sịrị: “Gị mmadụ, ọ gwawo gị ihe dị mma. Gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị ma ọ́ bụghị ime ihe n’ikpe ziri ezi na ịhụ obiọma n’anya nakwa iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”—Maịka 6:8.
Ị̀ ga-eso Jehova na-eje ije otú ahụ ọ gwara anyị mee ma nweta ngọzi ebighị ebi o kwere ndị mere otú a ná nkwa? Ọ dị gị n’aka ikpebi ihe ị ga-eme.