ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE Ị GA-EME MA MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ
Ihe Ga-enyere Gị Aka Idi Ọnwụ Onye Nwụnahụrụ Gị
Ndị mmadụ ekwuola ọtụtụ ihe ha chere ga-enyere mmadụ aka idi ọnwụ onye nwụnahụrụ ya. Ma, ọ bụghị ha niile na-enyere mmadụ aka. O nwere ike ịbụ na ị nụtụla ebe a na-agwa onye mmadụ nwụnahụrụ ka ọ ghara ibe ákwá ma ọ bụ ime ka ọnwụ ahụ ọ̀ na-ewute ya. O nwekwara ndị nke na-asị onye ahụ besiwe ákwá ike, sịkwa ya mee ihe niile ga-egosi na ihe merenụ na-ewute ya. Ma, Baịbụl kwuru ihe dabara adaba, nke ndị ọkachamara taa chọpụtakwarala na ọ na-enye aka.
N’ebe ụfọdụ, a na-ekwu na nwoke ekwesịghị ibe ákwá. Ma, mmadụ ò kwesịdịrị ime ihere ibe ákwá ma mgbe naanị ya nọ ma n’ihu ọha? Ndị dọkịta kwuru na ọ dịghị njọ ma onye mmadụ nwụnahụrụ bee ákwá. Mgbe ụfọdụ, ọ na-enyere onye ahụ aka inwetatụ onwe ya, ya emewekwa ihe ndị ọzọ o kwesịrị ime. Ma, onye ahụ na-akpachi ákwá na-agụ ya, o nwere ike ịkpatara ya nsogbu. Baịbụl akwadoghị na ọ dị njọ ibe ákwá ma ọ bụkwanụ na nwoke ekwesịghị ibe ákwá. Ka anyị legodị ihe Jizọs mere n’otu oge. Mgbe Lazarọs enyi ya nwoke nwụrụ, o bere ákwá n’ihu ọha n’agbanyeghị na o nwere ike ịkpọlite ya.—Jọn 11:33-35.
O nwere ndị na-ewe ezigbo iwe ma mmadụ nwụnahụ ha, karịchaa, ma ọ bụrụ na onye ahụ nwụrụ na mberede. Ọtụtụ ihe nwere ike ịkpasu onye mmadụ nwụnahụrụ iwe. O nwere ike ịbụ na onye ọ na-akwanyere ùgwù kwuru okwu gbawara ya obi. Otu nwoke onye Saụt Afrịka aha ya bụ Mike kwuru ihe mere mgbe papa ya nwụrụ. Ọ sịrị: “Adị m naanị afọ iri na anọ mgbe papa m nwụrụ. Mgbe a na-eli ya, onye ụkọchukwu Anglịkan kwuru na Chineke chọrọ ndị ezi mmadụ nakwa na ọ na-akpọrọ ha ngwa ngwa. * Ihe a o kwuru were m ezigbo iwe n’ihi na papa anyị dị anyị ezigbo mkpa. O ruola afọ iri isii na atọ ihe a mere, ma ọ ka na-ewute m.”
Ụfọdụ ndị mmadụ nwụnahụrụ na-ata onwe ha ụta, karịchaa, ma ọ bụrụ na onye ahụ nwụrụ na mberede. Ha nwere ike ịna-eche na á sị na ha mere nke a ma ọ bụ nke ọzọ na onye ahụ agaraghị anwụ. O nwekwara ndị na-akwa ezigbo ụta ma ha cheta na mgbe ikpeazụ ha na onye ahụ kwuru okwu, ha barịtara mba.
Ọ bụrụ na ị na-ewe iwe ma ọ bụ na-ata onwe gị ụta maka ihe merenụ, kọọrọ ya otu enyi gị ga-ege gị ntị ma nyere gị aka ịghọta na otú ọ dị gị ka ọ na-adị ọtụtụ ndị mmadụ nwụnahụrụ. Baịbụl gwara anyị, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”—Ilu 17:17.
Enyi kacha mma onye mmadụ nwụnahụrụ nwere ike ịkọrọ otú obi dị ya bụ Onye kere anyị, bụ́ Jehova. Kpee ekpere, kọọrọ ya otú obi dị gị n’ihi na ‘ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) O kwere nkwa na ọ ga-eji “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile” mee ka obi ruo gị ala ma ị kọọrọ ya ihe na-enye gị nsogbu n’obi. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ihe ọzọ ọ ga-eji kasie gị obi bụ Baịbụl. Gbalịsie ike na-agụ ya. Depụta amaokwu ndị nwere ike ịkasi gị obi. (Gụọ ihe dị n’ igbe dị n’isiokwu a.) I nwedịrị ike ibu ụfọdụ n’ime ha n’isi. Icheta ihe amaokwu ndị ahụ kwuru ga-enyere gị aka, karịchaa, n’abalị naanị gị nọ, ụra na-ekweghịkwa atụ gị.—Aịzaya 57:15.
O nwere otu nwoke dị́ afọ iri anọ anyị ga-akpọ Jack. Ọrịa kansa gburu nwunye ya n’oge na-adịbeghị anya. Jack sịrị na owu na-achọ ịmagbu ya mgbe ụfọdụ. Ma, ekpere nyeere ya aka. Ọ sịrị: “M kpee ekpere, Jehova na-eme ka owu kwụsị ịma m. Ọ na-abụ ụra pụọ m n’anya n’ime abalị, mụ ebilie, gụọ ebe ụfọdụ na Baịbụl, chebara ihe m gụrụ echiche, gwakwa Jehova ihe na-enye m nsogbu n’obi. Obi na-eruzi m ala, ụra atụwakwa m ọzọ.”
Mama otu nwaanyị aha ya bụ Vanessa rịagidere ọrịa nwụọ. Vanessa achọpụtakwala na ekpere na-akpa ike dị egwu. Ọ sịrị: “Ọ na-abụ obi jọwa m njọ n’ihi ihe a mere m, mụ akpọkuo Chineke, bewekwa ezigbo ákwá. Jehova na-enyekwa m ike idi ya.”
Ụfọdụ ndị gụrụ gbasara inye ndị mmadụ nwụnahụrụ ndụmọdụ na-agwa ndị ọ na-esiri ike idi ọnwụ onye nwụnahụrụ ha ka ha na-enyere ndị ọzọ aka ma ọ bụ na-arụ ụfọdụ ọrụ ga-abara obodo ha uru. Ha na-eme ha, obi ga na-adị ha ụtọ, ha ana-enwetatụkwa onwe ha. (Ọrụ Ndịozi 20:35) Ọtụtụ Ndị Kraịst mmadụ nwụnahụrụ achọpụtakwala na inyere ndị ọzọ aka na-akasi ha obi.—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.
^ para. 5 Ihe a abụghị ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl gwara anyị ihe atọ mere mmadụ ji anwụ anwụ.—Ekliziastis 9:11; Jọn 8:44; Ndị Rom 5:12.