Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ime ka mkpụrụ ndụ maliteghachi imepụta ndị ọhụrụ, ò meela ka mmadụ na-adị ogologo ndụ?

Mbọ Ndị Mmadụ Na-agba Ka Mmadụ Na-adị Ogologo Ndụ

Mbọ Ndị Mmadụ Na-agba Ka Mmadụ Na-adị Ogologo Ndụ

“Ahụwo m ọrụ Chineke nyeworo ụmụ mmadụ nke ha ga na-arụ. O mewo ka ihe ọ bụla maa mma n’oge ya. O tinyewo ọbụna mgbe ebighị ebi n’obi ha.”—Ekliziastis 3:10, 11.

IHE ndị ahụ Eze Sọlọmọn maara ihe kwuru n’oge ochie gosiri ihe ndị mmadụ na-achọ. Ebe ọ bụ na ndụ dị mkpụmkpụ, anyị enweghịkwa ike ịgbanahụ ọnwụ, kemgbe ụwa, ndị mmadụ na-achọsi ike ịdị ogologo ndụ. Kemgbe ọtụtụ puku afọ, ndị mmadụ achọọla otú ha ga-esi adị ogologo ndụ.

Dị ka ihe atụ, e nwere eze ndị Sumeria a na-akpọ Gilgamesh. E nwere ọtụtụ akụkọ ifo a kọrọ banyere ndụ ya. Otu n’ime ya bụ nke e dere n’akwụkwọ a kpọrọ Akụkọ Gilgamesh. Akụkọ ahụ kwuru na Gilgamesh mere njem nwere ike ịta isi ya iji chọpụta ihe ọ ga-eme ka ọ ghara ịnwụ anwụ. Ma, mbọ ya kụrụ afọ n’ala.

Ebe otu onye oge ochie na-emepụta ọgwụ nọ n’ebe ọ na-emepụta ọgwụ

Ihe karịrị puku afọ abụọ gara aga, ndị na-emepụta ọgwụ na Chaịna mepụtara ọgwụ ha sịrị na o nwere ike ime ka mmadụ na-adị ogologo ndụ. Ha tinyetụrụ ya mekuri na asenik. A na-eche na ọ bụ ọgwụ a gburu ọtụtụ ndị eze Chaịna. Na Yurop oge ochie, ụfọdụ ndị na-emepụta ọgwụ gbalịrị ka ha gbarie ọlaedo ka ndị mmadụ nwee ike ịṅụ ya aṅụ. Ha chere na ebe ọ bụ na ọlaedo anaghị emebi emebi, na o nwere ike ime ka ndị mmadụ na-adị ogologo ndụ.

Taa, ụfọdụ ndị sayensị na-agba mbọ ka ha chọpụta ihe mere anyị ji aka nká. Nke a gosiri na ọ ka na-agụsi ndị mmadụ agụụ ike ịchọpụta ihe ga-eme ka anyị ghara ịka nká ma nwụọ. Ma, olee ihe ha chọpụtarala?

CHINEKE TINYERE “MGBE EBIGHỊ EBI N’OBI HA.”—EKLIZIASTIS 3:10, 11

ỊCHỌ ỊMATA IHE MERE ANYỊ JI AKA NKÁ TAA

Ndị sayensị na-amụ banyere mkpụrụ ndụ dị n’ahụ́ mmadụ ekwuola ihe dị iche iche karịrị narị atọ ha chere mere ndị mmadụ ji aka nká ma na-anwụ anwụ. N’oge ndị na-adịbeghị anya, ha emeela ka mkpụrụ ndụ ndị dị n’ahụ́ mmadụ na anụmanụ ditekwuo ndụ aka. Ihe a ndị sayensị a mere emeela ka ụfọdụ ndị aka ji akụ̀ na-enye ha ego ka ha nwee ike ịchọpụta “ihe mere anyị ji anwụ anwụ.” Gịnị ka ha merela?

Ịgbalị ịgbatikwu ndụ. Ụfọdụ ndị sayensị kwuru na otu ihe na-akpata ịka nká bụ ihe dị n’ebe ngwụcha mkpụrụ ndụ. Ihe ahụ na-eme ka ihe dị ná mkpụrụ ndụ ghara ịgbanwe mgbe ha na-emepụta ndị ọhụrụ. Ma mgbe ọ bụla ha na-emepụta ndị ọhụrụ, ihe ahụ na-ebelata. Ka oge na-aga, mkpụrụ ndụ na-akwụsị imepụta ndị ọhụrụ, nká ebidozie.

Otu nwaanyị aha ya bụ Elizabeth Blackburn nwetara nnukwu ihe nrite n’afọ 2009 n’ihi ihe ndị ọ rụzurula na sayensị. Ya na ndị òtù ya chọpụtara ihe dị n’ahụ́ mmadụ nke na-eme ka ihe ahụ dị ná ngwụcha mkpụrụ ndụ ghara iji ike na-ebelata, meekwa ka mkpụrụ ndụ ghara ịka nká ngwa ngwa. Ma, ha kwuru na ihe ahụ na-adị ná ngwụcha mkpụrụ ndụ “anaghị eme ka mmadụ dịkwuo ogologo ndụ.”

Ime ka mkpụrụ ndụ maliteghachi imepụta ndị ọhụrụ bụ mbọ ọzọ ndị sayensị na-agba iji mee ka mmadụ ghara ịna-aka nká. Mgbe mkpụrụ ndụ anyị na-enwezighị ike imepụta ndị ọhụrụ n’ihi nká, ha nwere ike ịkpa mkpụrụ ndụ na-alụso ọrịa ọgụ aka ọjọọ, ya akpatara anyị ahụ́ ọzịza, ezigbo ahụ́ mgbu nakwa ọrịa ndị ọzọ. Na nso nso a, ndị sayensị nọ na Frans weere mkpụrụ ndụ n’ahụ́ ndị agadi, mee ka ha maliteghachi ịmepụta ndị ọhụrụ. Ụfọdụ n’ime ndị agadi a akarịala otu narị afọ. Onye isi ndị sayensị ahụ aha ya bụ Prọfesọ Jean-Marc Lemaître kwuru na ihe a ha mere gosiri na e nwere ike ime ka mkpụrụ ndụ karala nká “maliteghachi imepụta ndị ọhụru.”

NDỊ SAYENSỊ HÀ NWERE IKE IME KA ANYỊ NA-ADỊKWU OGOLOGO NDỤ?

Ọ bụghị ndị sayensị niile kwetara na ọgwụ ndị na-egbochi ịka nká ngwa ngwa ga-eme ka ndị mmadụ na-adị ogologo ndụ karịa ka ha na-adị. N’eziokwu, kemgbe ihe dị ka narị afọ abụọ gara aga, ndị mmadụ na-adịkwu ogologo ndụ karịa ka ha na-adịbu. Ihe kpatara ya bụ na ndị mmadụ na-adịkwu ọcha, e nweekwala ọgwụ ndị e ji agwọ ọrịa nakwa ndị e ji egbochi ọrịa. Ụfọdụ ndị na-amụ banyere ahụ́ mmadụ kwuru na ụmụ mmadụ agaghị adị ndụ ogologo karịa ka ha na-adị taa.

N’ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga, otu onye so dee Baịbụl, aha ya bụ Mozis, kwuru, sị: “Afọ ndụ anyị na-adị afọ iri asaa; ọ bụrụkwa na anyị enwee ike pụrụ iche, ha na-adị afọ iri asatọ, ma ha jupụtara ná nsogbu na ihe ọjọọ; n’ihi na ha ga-agafe ngwa ngwa, anyị ewee ghara ịnọkwa.” (Abụ Ọma 90:10) N’agbanyeghị mbọ ndị mmadụ na-agba iji mee ka anyị na-adị ogologo ndụ, afọ ndụ anyị ka na-adị otú ahụ Mozis kwuru.

Ma, e nwere ihe ndị bi ná mmiri na-anọfe narị afọ abụọ, nweekwa osisi ndị na-anọ ọtụtụ puku afọ. Ọ bụrụ na anyị ejiri afọ ole anyị na-adị ndụ tụnyere nke ihe ndị a na ihe ndị ọzọ dị ndụ, anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ndụ a anyị na-adị afọ iri asaa ma ọ bụ iri asatọ nwụọ, ọ̀ bụ ebe okwu biri?’