Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

O Nweghị Onye Nwere Ike Ịgbanahụ Ọnwụ

O Nweghị Onye Nwere Ike Ịgbanahụ Ọnwụ

WEREGODỊ ya na ị na-ele fim na-akọ gbasara otu onye egwú a ma ama ihe ya na-amasị gị. Fim ahụ bidoro igosi mgbe ọ dị obere, mgbe ọ malitere ịmụ otú e si akpọ ngwá egwú, nakwa ọtụtụ ugboro ọ nọ na-amụgharị ya. Gị ahụzie ka ọ na-aga na-akụ egwú n’ebe dị iche iche n’ụwa, ghọzie onye a ma ama. O teghị aka, ya akawa nká, mechaa nwụọ. Fim ahụ agwụ.

Ihe e gosiri na fim ahụ abụghị ihe na-emeghị eme, kama, ọ bụ akụkọ banyere onye dịrị ndụ ma mechaa nwụọ. Ma onye e gosiri na fim ahụ ọ̀ bụ onye na-akụ egwú, onye sayensị, onye na-eme egwuregwu ma ọ bụkwanụ onye ọ bụla ọzọ a ma ama, otu ihe ahụ gakwaara eme ya. Onye ahụ nwere ike ọ rụzuru ọtụtụ ihe mgbe ọ dị ndụ, ma chegodị ihe ndị ọ gaara arụzu ma a si na o meghị agadi ma nwụọ.

Ọ na-agbawa obi ma anyị cheta na ọnwụ na-eche anyị niile ihu. (Ekliziastis 9:5) N’agbanyeghị mbọ niile anyị na-agba, anyị anaghị agbanahụ nká na ọnwụ. Ọrịa ma ọ bụ ihe mberede nwedịrị ike ime ka anyị gbabiri nwụọ. Baịbụl kwuru na anyị dị ka alụlụụ nke “na-apụta ruo nwa oge wee pụọ n’anya.”—Jems 4:14.

Ebe ọ bụ na anyị ejighị ndụ anyị n’aka, ụfọdụ ndị na-ebi ndụ “ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Ndị Kọrịnt 15:32) Ihe mere ndị mmadụ ji ebi ụdị ndụ a bụ n’ihi na ha ma na ha nwere ike ịnwụ mgbe ọ bụla, nakwa na ha enweghị olileanya ọ bụla maka ọdịnihu. O nwere mgbe ọ ga-eru, karịchaa mgbe onye ahụ nọ n’ezigbo nsogbu, o nwere ike ịna-ajụ onwe ya, sị: ‘Mmadụ nwụọ, nke ya ọ̀ gaala?’ Olee ebe i nwere ike inweta azịza ya?

Ọtụtụ ndị na-atụ anya na ndị sayensị ga-enwe ike ịza ajụjụ ahụ. Ndị sayensị na ndị dọkịta achọpụtala ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ dịkwuo ndụ ogologo. Ụfọdụ ndị sayensị na-agbakwa mbọ ịhụ na ndị mmadụ na-adị ogologo ndụ karịa. Ma hà mezuru ya ma ọ bụ na ha emezughị ya, ajụjụ ndị mmadụ ka na-ajụ bụ: Gịnị mere anyị ji aka nká ma na-anwụ anwụ? Ànyị nwere olileanya na onye iro anyị bụ ọnwụ ga-emecha kwụsị? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ndị a, zaakwa ajụjụ bụ́, Mmadụ nwụọ, nke ya ọ̀ gaala?