Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Olileanya Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ?

Olee Olileanya Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ?

Ọnwụ na-emetụta mmadụ niile. Ma mmadụ nwụọ, nke ya ọ̀ gwụla? È chefuola ndị nwụrụ anwụ kpamkpam? È nwere olileanya dịịrị ndị nwụrụ anwụ?

LEGODỊ IHE BAỊBỤL KWURU GBASARA YA:

E CHEFUBEGHỊ NDỊ NWỤRỤ ANWỤ

‘Ndị niile nọ n’ili ncheta ga-apụta.’—Jọn 5:28, 29.

Chineke na-echeta ndị nwụrụ anwụ. Ọ ga-akpọlite ndị ọ chọrọ ịkpọlite n’ọnwụ.

A GA-ENWE MBILITE N’ỌNWỤ N’ỤWA

“A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ Ndịozi 24:15.

A ga-akpọlite ọtụtụ ijeri ndị nwụrụ anwụ. Ha ga-enwekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi mgbe udo ga-eju ebe niile.

E NWERE IHE MERE OBI JI KWESỊ ISI ANYỊ IKE NA A GA-ENWE MBILITE N’ỌNWỤ

“[Chineke] na-agụ kpakpando niile ọnụ; ọ na-akpọ ha niile aha ha.”—Abụ Ọma 147:4.

Ebe ọ bụ na Chineke nwere ike ịkpọ kpakpando niile aha ha, ọ gaghị esiri ya ike icheta ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ.