Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịhụnanya na-eme ka anyị na-achọ ihe ndị ga-abara ndị ọzọ uru ọ bụghị ịchọ ihe ndị ga-abara naanị anyị uru

Otú Anyị Ga-esi Gosi na Anyị Hụrụ Mmadụ Ibe Anyị n’Anya

Otú Anyị Ga-esi Gosi na Anyị Hụrụ Mmadụ Ibe Anyị n’Anya

Ebe anyị bụ ụmụ Adam, bụ́ nwoke mbụ Chineke kere, anyị niile bụ otu ezinụlọ. N’agbanyeghị na a chọrọ ka mmadụ niile nọ n’ezinụlọ na-ahụ ibe ha n’anya ma na-akwanyere ibe ha ùgwù, ụdị ịhụnanya a kọrọ ụkọ taa. Ụdị ihe a abụghị ihe Chineke, onye hụrụ anyị n’anya chọrọ.

IHE AKWỤKWỌ NSỌ KWURU GBASARA ỊHỤNANYA

“Hụ mmadụ ibe gị n’anya dị ka onwe gị.”​—LEVITIKỌS 19:18.

“Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya.”​—MATIU 5:44.

IHE ỊHỤ MMADỤ IBE GỊ N’ANYA PỤTARA

Tụlee otú Chineke si kọwaa ịhụnanya n’Okwu ya ná 1 Ndị Kọrịnt 13:​4-7.

“Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma.”

Chegodị ihe a: Olee otú obi na-adị gị ma ndị ọzọ na-egosi gị obiọma, na-enwere gị ndidi ma ghara iji iwe na-emeso gị ihe mgbe i mejọrọ ihe?

“Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo.”

Chegodị ihe a: Olee otú obi na-adị gị ma ndị ọzọ na-enyokarị gị enyo ma ọ bụ na-enwere gị anyaụfụ?

Ịhụnanya ‘adịghị achọ ọdịmma nke ya.’

Chegodị ihe a: Olee otú obi na-adị gị ma ndị ọzọ jiri ihe ndị i kwuru kpọrọ ihe ma ghara ịchọkarị ka okwu bie ha n’ọnụ?

Ịhụnanaya ‘adịghị agụkọ ihe ọjọọ.’

Chegodị ihe a: Chineke dị njikere ịgbaghara ndị mere ihe ọjọọ ma ha chegharịa. “Ọ gaghị na-ahụta mmejọ mgbe niile, Ọ gaghịkwa anọgide na-ewe iwe.” (Abụ Ọma 103:9) Obi na-atọ anyị ụtọ ma onye anyị mejọrọ gbaghara anyị. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgbaghara ndị ọzọ ma ha mejọọ anyị.​—Abụ Ọma 86:5.

Ịhụnanya ‘adịghị aṅụrị ọnụ n’ihi ajọ omume.’

Chegodị ihe a: Ihe ọjọọ mee anyị, anyị anaghị achọ ka ndị ọzọ ṅụrịa ọṅụ n’ihi ahụhụ anyị na-ata. N’ihi ya, anyị anaghịkwa aṅụrị ọṅụ mgbe ndị ọzọ na-ata ahụhụ, ọ bụrụgodị na ha mere anyị ihe ọjọọ.

Anyị chọọ ka Chineke gọzie anyị, anyị ga-ahụrịrị ndị ọzọ n’anya n’agbanyeghị afọ ndụ ha, mba ha si ma ọ bụ okpukpe ha na-ekpe. Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ inyere ndị nọ ná mkpa aka.