Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ọ̀ bụ mmadụ malitere okpukpe?

ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU na ọ bụ ndị mmadụ malitere okpukpe; ndị ọzọ chere na ọ bụ Chineke malitere ya iji nyere ndị mmadụ aka ka ha bịaruo ya nso. Gịnị ka i chere?

IHE BAỊBỤL KWURU

E nwere “okpukpe Chineke nke dị ọcha nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị bụ́ Nna anyị.” (Jems 1:27, Bible Nsọ nke Union Version) Ọ bụ Chineke malitere okpukpe dị́ ọcha ma ọ bụ ezigbo okpukpe.

IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL

  • Okpukpe dị́ Chineke mma bụ nke na-akụzi eziokwu dị́ na Baịbụl.—Jọn 4:23, 24.

  • Okpukpe ndị na-akụzi ihe ndị mmadụ chepụtara na-efe Chineke n’efu.—Mak 7:7, 8.

Mmadụ ò kwesịrị inwe okpukpe ọ na-ekpe?

Ị̀ GA-ASỊ . . .

  • Ee?

  • Mba?

  • Ma onye ahụ chọọ?

IHE BAỊBỤL KWURU

“Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-ezukọta efe ya.

IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL

  • Ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-ekwu otu ihe.—1 Ndị Kọrịnt 1:10, 11.

  • Ndị niile nọ́ n’okpukpe dị́ Chineke mma bụ ụmụnna n’agbanyeghị ebe ha bi n’ụwa. —1 Pita 2:17.