Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bịa-sheba—Ebe Olulu Mmiri Pụtara Ndụ

Bịa-sheba—Ebe Olulu Mmiri Pụtara Ndụ

Ihe Ndị A Hụrụ N’ala Nkwa Ahụ

Bịa-sheba—Ebe Olulu Mmiri Pụtara Ndụ

“SITE na Dan wee ruo Bịa-sheba.” Nke ahụ bụ ahịrị okwu ndị na-agụ Bible maara nke ọma. Ọ na-akọwa Israel nile, site na Dan, nke dị nso n’ókèala ebe ugwu, ruo Bịa-sheba, n’ebe ndịda. E si otú a see onyonyo udo nke ọchịchị Solomọn: “Juda na Israel wee biri ná ntụkwasị obi, nwoke ọ bụla n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya, site na Dan wee ruo Bịa-sheba, ụbọchị nile nke Solomọn.”​—⁠1 Ndị Eze 4:25; Ndị Ikpe 20:1.

Otú ọ dị, ọdịiche ndị dị n’etiti Dan na Bịa-sheba, gụnyere ihe karịrị ịdị anya ha pụọ n’ibe ha. Dị ka ihe atụ, Dan nwetara nnukwu mmiri ozuzo; mmiri sọrọ site n’ala ịbụ otu n’ime isi mmiri nke Osimiri Jọdan, dị ka a na-ahụ n’ihe osise dị n’aka nri. Lee ka Bịa-sheba si dị iche n’ihi na ọ dị n’ala ebe kpọrọ nkụ, n’agbata ikpere mmiri na akụkụ ebe ndịda nke Osimiri Nnu.

N’ógbè ebe Bịa-sheba dị, mmiri na-ezo kwa afọ bụ nanị site na 15 ruo 20 Sentimita. N’ịmara nke ahụ, rịba ama foto dị n’elu nke ugwu, ma ọ bụ mkputamkpu Bịa-sheba. * Ụcha akwụkwọ ndụ ị na-ahụ na-egosi na e sere foto ahụ mgbe obere mmiri oge oyi zosịrị, bụ́ mgbe ala ubi ndị dị gburugburu Bịa-sheba na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ ruo nwa oge. Ala dị larịị ndị dị ya nso dịbu​—⁠ma ka dị⁠—​mma maka mkpụrụ ọkụkụ.

N’ihi na ala ebe ahụ kpọrọ nkụ, ihe ndekọ Bible banyere Bịa-sheba na-emesi okwu ike banyere olulu mmiri na ọwa mmiri dị iche iche. Obodo ahụ dị nso n’okporo ụzọ ma ọ bụ ụzọ camel si aga nke gabigara ọzara ahụ gatụkwuo n’ebe ndịda. Dị ka ị pụrụ iche, ndị njem na-agafe ma ọ bụ na-akwụsị n’ebe a ga-achọ mmiri maka onwe ha na maka anụmanụ ha. Mmiri dị otú ahụ esighị n’ala agbapụta, dị ka ọ dị na Dan, kama a pụrụ ikute ha site n’olulu mmiri. N’ezie, okwu Hibru ahụ bụ beʼerʹ na-ezo aka n’ebe olulu ma ọ bụ ihe e gwuru n’ala iji nweta mmiri dị n’okpuru ala dị. Bịa-sheba pụtara “Olulu Mmiri nke Ịṅụ Iyi” ma ọ bụ, “Olulu Mmiri nke Asaa.”

Ruo ogologo oge, Abraham na ezinụlọ ya biri na Bịa-sheba na gburugburu ya, ha makwaara uru olulu mmiri bara. Mgbe ohu nwanyị Sera, bụ́ Hega gbapụrụ gbaga n’ọzara, ọ pụrụ ịbụworị na o mere atụmatụ inweta mmiri site n’olulu mmiri ma ọ bụ site n’aka ndị Bedouin ndị ji ha eme ihe​—⁠dị ka nwanyị Bedouin na-adọrọ mmiri na Sinai Peninsula onye nọ n’elu nke peji na-eso. Mgbe o mesịrị dị mkpa ka Abraham chụpụ Hega na nwa ya nwoke nke na-akparị mmadụ, o ji obi ebere nye ya mmiri. Gịnị mere ozugbo mmiri ahụ gwụrụ? “Chineke wee meghee anya ya abụọ, ọ hụ olulu mmiri; o wee jee, gbajuo karama akpụkpọ ya ná mmiri, mee ka nwa okoro ahụ ṅụọ.”​—⁠Jenesis 21:19.

Ebee ka Abraham si nweta mmiri o ji gbajuo karama mmiri Hega? Ma eleghị anya ọ bụ site n’olulu mmiri o gwuwororịị, bụ́ nke ọ kụrụ osisi tamarisk na nso ya. (Jenesis 21:​25-⁠33) A pụrụ ikwu na ndị ọkà mmụta sayensị ugbu a na-ahụ ikwesị ekwesị nke nhọrọ Abraham họọrọ osisi tamarisk, n’ihi na osisi nke a nwere akwụkwọ ndị dị nta na-ejigidekarị mmiri n’ime ha, ya mere ọ pụrụ ịnọgide na-adị ndụ n’agbanyeghị ala ebe kpọrọ nkụ ọ dị na ya.​—⁠Lee foto dị n’okpuru.

A kpọrọ ogwugwu Abraham gwuru olulu mmiri aha n’ihe metụtara esemokwu e nwere n’etiti ya na eze Filistịa. Olulu mmiri bụ ihe onwunwe bara oké uru n’ihi ụkọ mmiri e nwere na gburugburu ebe ahụ nile na oké ọrụ a chọrọ iji gwuo olulu mmiri dị omimi. N’ezie, laa azụ n’oge ahụ, ọ bụ iwere ihe onye ọzọ bụ́ ịga kuru mmiri n’olulu mmiri n’anataghị ike.​—⁠Tụlee Ọnụ Ọgụgụ 20:​17, 19.

Ọ bụrụ na ị gaa n’Ugwu Bịa-sheba, ị pụrụ ilebanye anya n’olulu mmiri e gwumiri egwumi ná mkpọda nke ebe ndịda ọwụwa anyanwụ. Ọ dịghị onye maara mgbe mbụ e gwuru ya gabiga oké nkume siri ike ma jiri okwute mee ka ebe elu elu ya (nke a na-ahụ n’okpuru) sie ike. Ndị ọkà nke oge a n’ihe mgbe ochie e gwutere n’ala kpocharuru ya 30 Mita banye n’ime ala n’erughị n’ebe o jedebere. Otu n’ime ha kwuru, sị: “Ọ bụ ihe na-adọ adọ ikwubi na olulu mmiri a bụ . . . ‘Olulu Mmiri nke Ịṅụ Iyi’ ebe Abraham na Abimelek gbara ndụ ha.”​—⁠Biblical Archaeology Review.

Ihe àmà na-egosi na Bịa-sheba buwanyere ibu n’ọdịnihu n’oge Bible, na-aghọ obodo e wusiri ike nke nwere nnukwu ọnụ ụzọ ámá. Ma ihe bụ isi n’ịdị adị ya na inwe ihe ịga nke ọma ya bụ mmiri dị mkpa nke sitere n’olulu mmiri ya ndị e gwumiri egwumi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Maka ịhụ Ugwu Bịa-sheba n’ụzọ ka buo ibu, lee 1993 Calendar of Jehovah’s Witnesses.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 25]

Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.