Ibi Akwụkwọ Ọgụgụ Bible Mgbe A Nọ N’okpuru Mmachibido Iwu
Ibi Akwụkwọ Ọgụgụ Bible Mgbe A Nọ N’okpuru Mmachibido Iwu
DỊ KA MALCOLM G. VALE SI KỌỌ
“Bie akwụkwọ ahụ bụ Children.” M natara nduzi nke a dị ịtụnanya site n’aka onye nlekọta alaka nke Ndịàmà Jehova n’Australia n’oge Agha Ụwa nke Abụọ, obere oge mgbe e wepụtasịrị akwụkwọ ahụ ná mgbakọ St. Louis, Missouri, U.S.A., n’August 10, 1941. N’ihi gịnị ka nduzi nke a ji dị ịtụnanya?
AMACHIBIDOWO ọrụ nkwusa anyị iwu na January 1941, ya mere ịnọgide na-ebi akwụkwọ ọbụna n’ụzọ a kpaara ókè ga-abụ ihe ịma aka. E wezụga nke ahụ, Children bụ akwụkwọ dị 384 peji nke nwere ihe osise ndị tụrụ àgwà. Ígwè obibi akwụkwọ anyị chọrọ ka e tinye ya akụkụ ụfọdụ ndị dị ọhụrụ, akwụkwọ dị ụkọ, a zụghịkwa ndị ọrụ anyị maka ibi akwụkwọ ndị e kwesịrị mkpo ha ike.
Tupu m kọwaa otú anyị si nwee ihe ịga nke ọma n’ibi akwụkwọ mgbe anyị nọ n’okpuru mmachibido iwu, ka kọọrọ gị otú m si bịa ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Australia dị ka onye nlekọta ọrụ obibi akwụkwọ.
Mmalite M
Nna m nwere ụlọ ọrụ na-ebi akwụkwọ n’obodo ukwu na-enwe ihe ịga nke ọma bụ́ Ballarat, Victoria, bụ́ ebe a mụrụ m na 1914. Ya mere a mụrụ m ọrụ ibi akwụkwọ mgbe m na-arụ ọrụ n’ụlọ obibi akwụkwọ papa m. Aka m dịkwa n’ihe omume dị iche iche nke Chọọchị England, ịbụ abụ n’òtù ukwe chọọchị na ịkụ mgbịrịgba chọọchị. Ọbụna na e nwere m olileanya nke ịkụzi ihe na Sunday school, ma nke a mere ka ahụ ghara iru m ala.
Ihe kpatara ya bụ na m nwere ajụjụ ndị siri ike banyere ozizi dị iche iche nke chọọchị. Ndị a gụnyere Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, na anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, ọ dị
ghịkwa onye nyere m azịza na-eju afọ. O jukwara m anya na site n’oge ruo n’oge, onye ụkọchukwu anyị kwuru okwu n’iwe banyere otu òtù okpukpe dị nta nke kpọrọ onwe ha Ndịàmà Jehova. M tụgharịrị n’uche m ihe mere òtù nke a dị nta ga-eji kpatara obodo ukwu nke 40,000 ndị mmadụ nọ na ya nchegbu dị otú a.N’otu ụbọchị Sunday, m guzo n’èzí nke chọọchị ahụ ka e kpesịrị chọọchị uhuruchi mgbe otu ìgwè ụmụ agbọghọ si na Chọọchị Methodist dị nso bịara gafere. M malitere ọbụbụenyi n’ebe otu n’ime ha nọ. Aha ya bụ Lucy, ka oge na-agakwa, ọ kpọrọ m òkù ịbịa n’ụlọ iji hụ ndị mụrụ ya. Cheedị banyere aha ihe ịtụnanya ọ bụụrụ m mgbe m matara na nne ya, bụ́ Vera Clogan, bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova. Anyị nwere ọtụtụ mkparịta ụka na-ekpo ọkụ site na Bible, ihe o kwukwara kwere nghọta.
N’oge na-adịghị anya, mụ na Lucy lụrụ di na nwunye, na 1939 kwa, anyị malitere ibi na Melbourne, bụ́ isi obodo Victoria. Ọ bụ eziokwu na Lucy aghọwo otu n’ime Ndịàmà Jehova, ekpebibeghị m ruo n’oge ahụ. Otú ọ dị, mgbe Agha Ụwa nke Abụọ tiwapụrụ na September nke afọ ahụ, amalitere m ichesi echiche ike banyere ihe m mụtaworo site n’Akwụkwọ Nsọ. Mmachibido nke ọrụ Ndịàmà Jehova na January 1941 nyeere m nnọọ aka ime mkpebi. M raara ndụ m nye Jehova Chineke, e mekwara m baptism nwa oge mgbe nke a gasịrị.
Mgbanwe Ndị Dị Ịrịba Ama ná Ndụ Anyị
N’oge ahụ, anyị nwere ụlọ obibi dị nnọọ mma anyị na-akwụ ụgwọ na ya na Melbourne. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, a kpọrọ anyị ka anyị kwaba n’ụlọ ọtụtụ Ndịàmà ndị ọzọ bi na ya. Anyị rere arịa ụlọ anyị nile e wezụgakwa arịa dị n’ụlọ ihi ụra anyị ma kwaba n’ihe a kpọrọ ụlọ ndị ọsụ ụzọ. Anọgidere m na-arụ ọrụ dị ka onye na-ebi akwụkwọ wee si otú a nwee ike ịtụnye ụtụ n’ego ọ na-ewe iji lekọta ụlọ ahụ. Ndị ọzọ bụkwa di mere otu ihe ahụ. N’ihi ya, ndị nwunye anyị pụrụ ikere ókè n’ọrụ nkwusa oge nile, anyị bụ́ ndị ikom sonyekwaara ha n’ọrụ nkwusa ahụ nakwa ná nzukọ ndị Kraịst n’oge uhuruchi na n’ọgwụgwụ izu.
Oge nta mgbe nke ahụ gasịrị, mụ na nwunye m natara akwụkwọ ozi site n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society nke na-akpọ anyị òkù ịbịa Sydney. Anyị rere arịa nke ụlọ ihi ụra anyị ma kwụpụ ụgwọ ụfọdụ anyị ji, ma iji nweta ego maka ụgwọ ụgbọ okporo ígwè garuo Sydney, anyị rere mgbaaka nkwekọrịta alụmdi na nwunye nke Lucy!
N’ihi iwu ndị a na-ama n’oge agha na mmachibido iwu e guzobere n’oge na-adịbeghị anya, ọ dịghị Bible ma ọ bụ akwụkwọ ọgụgụ Bible a pụrụ iwebata site ná mba ofesi. N’ihi nke a, alaka ụlọ ọrụ Australia kpebiri iguzobe ọrụ ibi akwụkwọ na nzuzo iji hụ na a nọgidere na-enwe nri ime mmụọ, a kpọkwara m ilekọta ọrụ ahụ. Enwere m ihe ùgwù nke ije ozi n’okpuru onye Scotland, bụ́ George Gibb, onye jeworo ozi n’alaka obibi akwụkwọ nke Australia ruo 60 afọ. * Ọ bụ mgbe ahụ ka m natara nduzi ahụ bụ́: “Bie akwụkwọ ahụ bụ́ Children.”
Inwetaghachi ígwè Obibi Akwụkwọ
Ahụmahụ ndị na-akpali akpali, ndị na-atụ ụjọ anyị nwere n’afọ ndị ahụ nke ịlụ agha dị
ọtụtụ. Dị ka ihe atụ, iji malite obibi akwụkwọ anyị, ígwè ọrụ dị anyị mkpa. Ndị ọrụ gọọmenti ejichiwo ihe anyị jibu ebi akwụkwọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ a kpaara ókè n’afọ ndị bu agha ahụ ụzọ, ugbu a kwa, a kpọchiwo obere ebe obibi akwụkwọ Society ma na-eche ya nche. Olee otú anyị pụrụ isi bupụ ígwè ọrụ ahụ gaa n’ebe kwesịrị ekwesị maka ibi akwụkwọ na nzuzo?Ndị nche ji ngwa agha, ndị na-eme onye rụtụ ibe ya agbanwee ya, na-eledo ihe onwunwe Society 24 hour kwa ụbọchị. Otú ọ dị, otu n’ime mgbidi ndị dị n’azụ ụlọ dị nnọọ nso otu ụzọ ụgbọ okporo ígwè a na-ejikebeghị eme ihe. Ya mere n’abalị, n’ime ihe n’ụzọ na-echetara anyị Ezikiel 12:5-7, ụfọdụ ndị ọrụ Betel obi kara si ná mgbidi ahụ gafere site n’iwepụ blọk ụfọdụ. Ozugbo ha banyere, ha tinyeghachiri blọk ndị ahụ ha wepụrụ ka a ghara ịchọpụta. Site n’ime mwakpo oge abalị ndị a ruo ihe dị ka izu abụọ, ha ji nlezianya tụkasịa otu obere ígwè obibi akwụkwọ, bụ́ Linotype, na ígwè ọrụ ole na ole ndị ọzọ. Mgbe ahụ ha ji nwayọọ bupụsịa akụkụ ndị ahụ ọbụna n’agbanyeghị na ndị ahụ na-eche nche nọ n’ebe ahụ!
Ka oge na-aga anyị nwetakwuru ígwè ọrụ site n’ebe ndị ọzọ, ọrụ ibi akwụkwọ anyị na nzuzo na-agakwa n’ihu n’ike n’ike n’akụkụ dị iche iche nke Sydney. Otú a, anyị nwere ike ibi na ikwenye ná mkpo, ọ bụghị nanị akwụkwọ Children, kamakwa akwụkwọ ndị ahụ zuru ezu bụ́ The New World, “The Truth Shall Make You Free,” na The Kingdom Is At Hand, tinyekwara Yearbook of Jehovah’s Witnesses maka 1942, 1943, 1944, na 1945. Tụkwasịkwa, n’oge mmachibido nke afọ agha ndị ahụ, ọ dịghị mbipụta ọ bụla nke Ụlọ Nche nke Ndịàmà Jehova n’Australia nile n’enwetaghị. Nke a mesiri anyị obi ike n’onwe anyị na aka Jehova adịghị mkpụmkpụ mgbe ọ bụla.—Aịsaịa 59:1.
Ịnagide Nleta Ndị A Na-eyighị Eyi
N’oge oké ime nledo nke oge agha, ndị ọrụ gọọmenti, bụ́ ndị na-enyocha ihe a na-ebi na-abịa nleta a na-eyighị eyi mgbe mgbe n’ụlọ ọrụ ndị na-ebi akwụkwọ maka orire. Ya mere, otu n’ime ebe obibi akwụkwọ nzuzo anyị nwere ígwè na-agba àmà, nke nwere bọtin n’ala ebe ọ ga-adịrị onye na-anabata ndị ọbịa mfe irute ebe ọ dị. Mgbe onye ọ bụla ọ na-amataghị onye ọ bụ ma ọ bụ onye ọ na-enyo enyo ịbụ onye nnyocha gbagoro ebe e si arị elu ụlọ ahụ, ọ ga-apị bọtin ahụ.
Mgbe a pịrị bọtin ahụ, ọ bụ ihe na-akpali nkiri ịhụ ka mmadụ si na window na-amapụsị n’akụkụ nile! Ndị ọrụ e depụtara aha ha dị ka ndị e were n’ọrụ na-anọrọ iji kpuchite ngwa ngwa, ibe akwụkwọ magazin Ụlọ Nche ọ bụla e biworo ebi ma ọ bụ akwụkwọ ọgụgụ Bible ndị ọzọ a na-arụ ọrụ na ha. Iji mee nke a, ha ga-eji ibe akwụkwọ e biri ebi hà ka mbipụta ndị ahụ a na-ebiri ndị ahịa ga-akwụta ụgwọ, mee ihe.
N’oge otu nleta dị otú ahụ, ndị ọrụ nnyocha abụọ nọdụrụ ala n’elu akwụkwọ egwuregwu, bụ́ ndị ka dị n’ibe akwụkwọ dị obosara, ma ihe dị n’okpuru ha bụ ibe akwụkwọ dị iche iche nke magazin Ụlọ Nche ndị e biworo n’abalị ya. N’ebe obibi akwụkwọ dị n’akụkụ ọzọ nke obodo ukwu ahụ, anyị na-ebi akwụkwọ maka ego n’ehihie ma na-ebi akwụkwọ dị iche iche nke Ụlọ Nche n’abalị na n’ọgwụgwụ izu.
Inweta Akwụkwọ Ndị Dị Anyị Mkpa
Inweta akwụkwọ e ji ebi akwụkwọ bụ nsogbu bụ isi. Otú ọ dị, ụfọdụ nnukwu ụlọ ọrụ obibi akwụkwọ ndị ókè akwụkwọ ha na-enweta na-adịghị mkpa n’ihi ọrụ e mere ka ọ dị ala n’oge agha dị njikere iresị anyị ndị fọdụrụ—n’ọnụ ahịa dị oké elu mgbe nile n’ezie. Otú ọ dị, n’otu mgbe ahụ, anyị nwetara akwụkwọ site n’ebe ọzọ.
Ụgbọ mmiri na-ebu ibu na-abịa Australia bu ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke akwụkwọ na-acha nchara nchara, ma ụgbọ mmiri ahụ mebiri n’oké osimiri, mmiri wee rubanye n’akụkụ ka ukwuu nke akwụkwọ ahụ. E bupụtara akwụkwọ ahụ nile maka igbu ná ntụ, ọ bụkwaara
anyị ihe ịtụ n’anya na ọ bụ nanị anyị bụ ndị bịara ịzụ ya. Nke a mere ka anyị zụọ ya n’ọnụ ahịa dị ala nke ukwuu. Anyị gbara akwụkwọ ahụ n’anwụ, si otú a na-echebe ihe ka ọtụtụ na ya, mgbe ahụkwa, anyị chawasịrị ya n’ibe n’ibe otú kwesịrị ìgwè obibi akwụkwọ anyị.Olee otú anyị ga-esi jiri akwụkwọ nchara nchara ahụ mee ihe? Anyị chere, ma zie ezi iche otú ahụ, na ndị na-agụ akwụkwọ egwuregwu ka ga-enweta ọṅụ n’ịgụ ihe egwuregwu ha n’elu akwụkwọ chanwụrụ achanwụ. Otú a, anyị ji akwụkwọ e wepụtaworo maka ibi ihe ọgụgụ egwuregwu bie Ụlọ Nche na akwụkwọ ndị ọzọ nke Society.
Ọrụ Dị Mkpa nke Ndị Inyom
N’afọ ndị ahụ nke agha, ọtụtụ ndị inyom bụ ndị Kraịst na Australia mụrụ otú e si ekwenye akwụkwọ mkpo. N’otu ehihie na-ekpobiga ọkụ ókè nke oge okpomọkụ, ụfọdụ n’ime ha nọ na-arụ ọrụ nanị ha n’otu ụlọ dị nta a na-edozi ụgbọ ala nke anyị nwetara n’okporo ámá dị ná mpụga Sydney. Maka iji nọrọ ná nchebe, ha mechiri windo na ọnụ ụzọ nile. Ite e ji esi ihe e ji anyagide akwụkwọ wepụtara ikuku dị ọkụ nke na-esi ísì, okpomọkụ dị n’ebe ahụ gabigakwara ókè. Ya mere ha yipụsịrị uwe ha na-ahapụ nanị uwe ime ha.
Na mberede, a kụrụ aka n’ụzọ. Ụmụnna ndị inyom ahụ bụ́ ndị Kraịst kwupụtara okwu na-ajụ onye nọ n’ebe ahụ, otu onye ọrụ gọọmenti zakwara. O sitere n’ụlọ ọrụ nke e nyere ike n’oge agha iduzi ndị mmadụ gaa n’ebe ọ bụla a chọrọ ndị ọrụ. Ụmụnna ndị inyom ahụ zaghachiri n’olu dara ụda na ha agaghị ekwe ka ọ bata ozugbo ahụ maka na ha na-edozi uwe ime ha n’ihi okpomọkụ dịnụ.
Onye ọrụ ahụ gbara nkịtị nwa oge; mgbe ahụ o ji olu dị elu kwuo na ya nwere ebe ọzọ a na-atụ anya ya n’ógbè ahụ. Ọ sịrị na ya ga-abịa echi ya ịbịa mee nnyocha ya. Ozugbo ahụ ụmụnna nwanyị ndị a bụ́ ndị Kraịst kpọrọ anyị na telifon, anyị zipụkwara gwongworo n’abalị ahụ ibukọta ihe nile a na-arụ ọrụ na ha n’ebe ahụ, na-ebuga ya n’ebe ọzọ.
Ihe ka ọtụtụ ná ndị so n’ibi akwụkwọ nzuzo anyị enwebughị ahụmahụ ọrụ ọ bụla n’ọrụ obibi akwụkwọ, ya mere enweghị m ihe ịrụ ụka ọ bụla n’uche m na ọ bụ mmụọ Jehova nyere enyemaka na nduzi a chọrọ n’ihe ndị a rụzuru. Ọ bụụrụ mụ na nwunye m bụ́ Lucy, onye rụrụ ọrụ n’ebe ahụ a na-ekwenye
akwụkwọ mkpo, ihe ùgwù ịbụ akụkụ nke ihe ndị a nile.Olee otú e si lekọta ọrụ anyị n’oge ule ndị ahụ? Onye ahụ na-ejegodi ozi dị ka onye nlekọta alaka nke Ndịàmà Jehova anatawo iwu mmachibido n’aka gọọmenti, nke chọrọ ka o biri n’obodo dị ihe dị ka 100 km ná mpụga nke Sydney. Iwu ahụ machibidoro ya ịgabiga 8 km na gburugburu site n’etiti obodo ahụ. E kere mmanụ ụgbọ ala eke ịbụ 4 Lita maka otu ụgbọ ala kwa ọnwa. Ma ụmụnna chepụtara otu ọkpọka ígwè ọrụ a maara dị ka ihe na-emepụta úzù ọkụ—bụ́ ihe e ji ígwè rụọ nke yiri ogidi nke ịdị arọ ya bụ ihe dị ka ọkara otu tọn, bụ́ nke a rụnyere n’azụ ụgbọ ala. A na-esure icheku n’ime nke a, na-emepụta ikuku ọjọọ bụ́ carbon monoxide dị ka ihe e ji akwọ ụgbọ ala. Ọtụtụ abalị kwa izu, mụ na ụmụnna ndị ọzọ nwere ibu ọrụ na-eji ụzọ dị otú a garuo ịhụ onye nlekọta ahụ n’otu ọwara mmiri takọrọ atakọ nke dị nso n’obodo ahụ a chụgara ya. Otú a, anyị na-ekwurịta ọtụtụ ihe tupu anyị akwanye ọkụ ọzọ n’ihe na-emepụtara anyị úzù ọkụ ma laghachi Sydney n’isi ụtụtụ.
N’ikpeazụ, mmachibido ahụ a machibidoro Ndịàmà Jehova iwu pụtara n’Ụlọ Ikpe Dị Elu nke Australia. Onye ọkà ikpe ahụ kwupụtara na mmachibido iwu ahụ bụ “ikpe na-ezighị ezi, ịgbaso ọchịchọ otu ndị, bụrụkwa mmegbu” ma tọhapụ Ndịàmà Jehova kpam kpam na ọ dịghị ihe omume ha ọ bụla nke na-akpọsa nnupụisi megide ọchịchị. Ụlọ Ikpe ahụ nile kwadoro mkpebi nke a, nke mere na anyị nwere ike ịpụta ìhè iji nọgide n’ọrụ Alaeze anyị nke iwu kwadoro.
Òkè Ọrụ na Ngọzi Ndị Ọzọ
Mgbe agha ahụ gasịrị ọtụtụ ndị rụworo ọrụ n’obibi akwụkwọ nzuzo anyị banyere ozi ọsụ ụzọ. Ụfọdụ n’ime ha mesịrị gaa n’ihu ịbanye ụlọ akwụkwọ Watchtower Bible School of Gilead na New York. Mụ na Lucy bukwa ihe mgbaru ọsọ ahụ n’uche, ma mgbe ahụ anyị mụrụ nwa nwanyị, m wee kpebiekwa ịlaghachi n’ọrụ obibi akwụkwọ. Anyị kpere ekpere ka Jehova nyere anyị aka itinye ọdịmma Alaeze n’ọnọdụ mbụ mgbe nile, o mewokwa otú ahụ. Abanyekwara m n’ije ozi ọzọ n’ụzọ na-esonụ.
M natara òkù telifon site n’aka Lloyd Barry, onye na-eje ozi ugbu a dị ka onye so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Mgbe ahụ ọ bụ onye nleta na-ejegharị ejegharị na Sydney. Ọ jụrụ ma m maara ụbọchị anyị ga-enwe mgbakọ anyị ọzọ. M zaghachiri na m maara, o wee sị: “Anyị chọrọ ka ị hụ maka ndokwa banyere nri.”
N’ịbụ onye ọ tụrụ n’anya ruo nwa oge, m kwuru n’olu na-adịghị ike, sị: “Ma emetụbeghị m ihe dị otú ahụ ná ndụ m.”
“Emm, Nwanna,” ka ọ zara n’ụzọ na-egositụ iwe “ọ bụ oge kwesịrị ekwesị ka ị mụọ ya!” M mụtakwara ya, ma nọgide na-enwe ihe ùgwù nke ilekọta ozi nri, ọbụna ná mgbakọ ukwu, ruo ihe karịrị 40 afọ.
Eri ọtụtụ afọ, ụlọ ọrụ obibi akwụkwọ anyị nke e ji akpata ego buwanyere ibu, ma mee ka ọ dị mkpa ime ọtụtụ njem azụmahịa ofesi. M na-ahazi nke a mgbe nile ka ọ daba n’oge mgbakọ mba nile na New York City na n’ebe ndị ọzọ na United States. Nke a nyere m ohere iwepụta oge soro ndị na-elekọta ngalaba dị iche iche nke mgbakọ nọkọọ, karịsịa ozi ihe oriri. Otú a, laghachi n’Australia, m nwere ike ịhụ maka mkpa dị iche iche nke mgbakọ anyị.
Ka anyị na-emewanye okenye, mụ na Lucy na-eche mgbe ụfọdụ ma ànyị pụrụ ịrụzuworị ihe ka ukwuu a sị na a mụrụ anyị n’oge nta n’ihu site na mgbe a mụrụ anyị. N’aka nke ọzọ, n’ịbụ ndị a mụrụ na 1916 na 1914 n’otu n’otu, anyị weere ya dị ka oké ihe ùgwù ịhụworị amụma Bible ka ha na-emezu n’ihu anya anyị. Anyị na-ekelekwa Jehova maka ngọzi anyị nweworo n’ịmụrụ ọtụtụ ndị ihe na inyere ha aka ịmata eziokwu na ịhụ ha ugbu a ka ha na-ejere ya ozi dị ka ndị ozi e mere baptism. Ekpere anyị bụ na anyị ga-anọgide na-ejere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi, na-amata ya ruo ebighị ebi dị ka Ọkaaka Onye Ọchịchị nke eluigwe na ala.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 14 Lee Ụlọ Nche March 15, 1979, peji nke 14-17.
[Foto ndị dị na peeji nke 29]
Ụlọ obibi akwụkwọ Betel dị na Strathfield, 1929-1973
George Gibb ka ọ na-eguzo n’akụkụ otu n’ime ígwè obibi akwụkwọ ndị e bupụrụ n’ebe obibi akwụkwọ site ná mgbidi dị n’azụ ụlọ