Ndị Kraịst Mbụ Na Ụwa
Ndị Kraịst Mbụ Na Ụwa
IHE dị ka puku afọ abụọ gara aga, ihe omume kachasị dị ebube mere n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. E si n’ebe obibi ya nke dị n’eluigwe zite Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya ibi nwa oge n’ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ. Olee otú ihe ka ọtụtụ n’ihe a kpọrọ mmadụ si meghachi omume? Jọn onyeozi na-aza, sị: “Ọ [Jisọs] nọrịị n’ụwa, e kekwara ụwa site n’aka ya, ụwa amaghịkwa ya. Ọ bịakwutere ihe nke aka ya [Israel], ma ndị nke aka ya akpọbataghị ya.”—Jọn 1:10, 11.
Ụwa anabataghị Jisọs, bụ́ Ọkpara Chineke ma ọlị. N’ihi gịnị? Jisọs kọwara otú ihe kpatara ya mgbe ọ sịrị: “Ụwa . . . na-akpọ mụ onwe m asị, n’ihi na mụ onwe m na-agbara ya àmà, na ọrụ ya nile jọrọ njọ.” (Jọn 7:7) N’ikpeazụ, otu ụwa nke a—nke ụfọdụ ndị ndú okpukpe Juu, eze ndị Edọm, na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Rom nọchịrị anya ya—gburu Jisọs. (Luk 22:66–23:25; Ọrụ 3:14, 15; 4:24-28) Olee banyere ndị na-eso ụzọ Jisọs? Ụwa ọ̀ ga-adị njikere karị ịnabata ha? Ee e. Nwa oge tupu ọnwụ ya, Jisọs dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na unu sitere n’ụwa, ụwa ga-ahụ ihe nke aka ya n’anya: ma n’ihi na unu esiteghị n’ụwa, kama mụ onwe m họpụtara unu n’ime ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị̀.”—Jọn 15:19.
N’oge Ndị Ozi
Okwu Jisọs ghọrọ eziokwu. Nanị izu ole na ole mgbe ọ nwụsịrị, e jidere ndị ozi ya, yie ha egwu, tiekwa ha ihe. (Ọrụ 4:1-3; 5:17, 18, 40) Nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị, a kpụpụrụ Stifen nke na-anụ ọkụ n’obi n’ihu Sanhedrin ndị Juu ma tụgbuo ya na nkume. (Ọrụ 6:8-12; 7:54, 57, 58) Ka oge na-aga, Eze Herọd Agrịpa nke Mbụ gburu Jemes onyeozi. (Ọrụ 12:1, 2) N’oge njem ozi ala ọzọ ya, a kpagburu Pọl n’ihi mkpali nke ndị Juu bi na Diaspora.—Ọrụ 13:50; 14:2, 19.
Olee otú ndị Kraịst oge mbụ si meghachi omume ná mkpagbu dị otú ahụ? N’oge ochie, mgbe ndị isi okpukpe machibidoro ndị ozi iwu ime nkwusa n’aha Jisọs, ndị ozi ahụ kwuru, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karị mmadụ.” (Ọrụ 4:19, 20; 5:29) Nke a nọgidere na-abụ àgwà ha mgbe ọ bụla mmegide bilitere. Otú o sina dị, Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst nọ na Rom ọdụ ka ha “doo onwe ha n’okpuru ndị [ọchịchị] na-achị isi.” Ọ dụkwara ha ọdụ, sị: “A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ndị Rom 12:18; 13:1) N’ihi ya, ọ dị ndị Kraịst oge mbụ mkpa inwe ezi nguzo nke siri ike. Ha rubeere Chineke isi dị ka Onye Ọchịchị ha bụ isi. N’otu mgbe ahụkwa, ha nọkwa n’okpuru ọchịchị nke mba dị iche iche ma gbalịakwa isoro mmadụ nile bikọọ ọnụ n’udo.
Ndị Kraịst n’Ụwa nke Oge ndị Rom
Laa azụ n’ụwa narị afọ mbụ nke ndị Alaeze Ukwu Rome, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị Kraịst ritere uru site na Pax Romana ma ọ bụ Udo Ndị Rom, bụ́ nke òtù agha ndị Rom mere ka ọ dịrị. Ụkpụrụ iwu na usoro, okporo ụzọ ndị dị mma, na njem ụgbọ mmiri na-adịghị ize ndụ ma e jiri ya tụnyere oge ndị ọzọ, mere ka e nwee ọnọdụ nke dị mma nye mgbasa nke Iso Ụzọ Kraịst. O doro anya na ndị Kraịst oge mbụ matara ụgwọ ha ji usoro ọha mmadụ ma rube isi n’iwu Jisọs ka ha ‘nyeghachi Siza ihe nke Siza’ (Mak 12:17) Mgbe ọ na-edegara onye ọchịchị alaeze ukwu Rom bụ́ Antoninus Pius (138-161 O.A.) akwụkwọ ozi, Justin Martyr zọọrọ na ndị Kraịst “karịa ndị ọzọ nile,” tụrụ ụtụ isi ha. (First Apology, isi nke 17) Na 197 O.A., Tertullian gwara ndị ọchịchị Rom na ndị ọna ụtụ ha ji “ndị Kraịst ụgwọ ekele” maka ụzọ ime ihe n’ezi akọ na uche nke ha ji atụ ụtụ isi ha. (Apology, isi nke 42) Nke a bụ otu ụzọ ha si gbasoo ndụmọdụ Pọl na ha kwesịrị ido onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi.
Ọzọkwa, ruo ókè ụkpụrụ ha nke ndị Kraịst ga-ekwe ha mee, ndị Kraịst mbụ gbalịrị isoro ndị agbata obi ha bikọọ n’udo. Ma nke a adịghị mfe. Ụwa nke dị ha gburugburu na-eme omume rụrụ arụ nke ukwuu ma bamie abami n’ikpere arụsị nke ndị Grik na Rom, bụ́ nke a ka gbakwunyere ofufe nke onye ọchịchị alaeze ukwu na ya n’oge na-adịbeghị anya. Okpukpe ọgọ mmụọ nke ndị Rom bụ n’ụzọ bụ isi okpukpe nke Obodo, ya mere a pụrụ ile ọjụjụ ọ bụla mmadụ jụrụ itinye aka na ya anya dị ka ibuso Obodo iro. Olee ọnọdụ nke a tinyere ndị Kraịst na ya?
Onye prọfesọ n’ụlọ akwụkwọ Oxford, bụ́ E. G. Hardy dere, sị: “Tertullian kọrọ ọtụtụ ihe ndị na-apụghị ikwe omume nye onye Kraịst nwere ezi akọ na uche, dị ka ndị gụnyere ikpere arụsị: dị ka ihe atụ, ịṅụ iyi nke
a na-enwekarị ná nkwekọrịta; ịmụnye oriọna n’ọnụ ụzọ n’oge ememe, na ndị ọzọ; ememe nile nke okpukpe ndị Ọgọ Mmụọ; egwuregwu na ihe nkiri circus; aka ọrụ nke ịkụzi nkà ịgụ akwụkwọ [ndị ọgọ mmụọ] ụwa; ije ozi agha; ịrụ ọrụ n’ọfịs obodo.”—Christianity and the Roman Government.Ee, o siri ike ibi n’ụwa nke ndị Rom n’agbahapụghị okwukwe ndị Kraịst. Onye Katọlik bụ onye French nke na-ede akwụkwọ, bụ́ A Hamman na-ede, sị: “Ọ bụ ihe na-ekweghị omume ime ihe ọ bụla n’ezuteghị otu chi. Nguzo nke onye Kraịst wetaara ya nsogbu kwa ụbọchị; ọ na-anọpụ iche n’usoro ihe omume ọha mmadụ . . . Ọ na-eche nsogbu ndị na-ebiliteghachi ihu n’ebe obibi, n’okporo ámá, n’ahịa . . . N’okporo ámá, ma ọ bụ nwa amaala Rom ma ọ bụ na ọ bụghị, onye Kraịst kwesịrị iyipụ ihe ọ bụla o yi n’isi mgbe ọ na-agafe ụlọ nsọ ma ọ bụ ihe a kpụrụ akpụ. Olee otú ọ ga-esi ghara ime otú ahụ n’akpalighị ile ya anya n’ụzọ a na-enyo enyo, ma olee otú ọ pụrụ isi kwenye n’emeghị omume nke na-egosi nkwado? Ọ bụrụ na ọ na-azụ ahịa ma nwee mkpa nke ibiri ego, ọ ghaghị ịṅụrụ onye ahụ na-ebinye ego iyi n’aha nke chi dị iche iche. . . . Ọ bụrụ na ọ nakwere ịrụrụ obodo ọrụ, a tụrụ anya ka ọ chụọ àjà. Ọ bụrụ na e denye aha ya n’òtù agha, olee otú ọ ga-esi zere ịṅụ iyi na ikere òkè n’ememe nke ije ozi agha?”—La vie quotidienne des premiers chrétiens (95-197) (Ndụ A Na-adị Kwa Ụbọchị n’Etiti Ndị Kraịst Mbụ, 95-197 O.A.).
Ezi Ụmụ Amaala, Ma A Na-akpọ Ha Aha Ọjọọ
N’ihe dị ka 60 ma ọ bụ 61 O.A., mgbe Pọl nọ na Rom na-eche ka Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu, bụ́ Nero kpee ya ikpe, ndị Juu a ma ama kwuru banyere ndị Kraịst mbụ, sị: “Ihe banyere ịrọ òtù a, anyị mazuru na a na-ekwugide ya ebe nile.“ (Ọrụ 28:22) Ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme ahụ na-akwado na e kwugidere ndị Kraịst—kama ọ bụ n’ụzọ na-ezighị ezi. N’akwụkwọ ya bụ́ The Rise of Christianity, E. W. Barnes na-akọ, sị: “N’ihe ndekọ ya ndị mbụ nke a nabatara, e gosiri òtù ndị Kraịst n’ụzọ bụ isi dị ka ndị na-eme omume dị ọcha na ndị na-erube isi n’iwu. Ndị òtù ya chọsiri ike ịbụ ezi ụmụ amaala na ndị na-eguzosi ike n’ihe n’okpuru ọchịchị. Ha jụrụ agazighị agazi na arụrụala dị iche iche nke ịgọ mmụọ. Ná ndụ nke onwe ha, ha chọrọ ịbụ ndị agbata obi na-adị n’udo na ndị enyi a pụrụ ịtụkwasị obi. A kụziiri ha inwe anya udo, ịrụsi ọrụ ike na ibi ndụ ịdị ọcha. N’etiti mmerụ na ndụ ịla n’iyi nke jubigara ókè gburugburu ha, ha guzosiri ike n’ụkpụrụ ha, na-eme ihe n’eziokwu ma na-ekwu eziokwu. Ụkpụrụ ha n’ihe banyere mmekọahụ dị elu: a sọpụụrụ njikọ alụmdi na nwunye, ndụ ezinụlọ dịkwa ọcha. N’ịbụ ndị nwere àgwà ọma ndị a, mmadụ ga-echeworị na ha agaghị abụ ụmụ amaala na-akpata nsogbu. Ma ruo ogologo oge, ha bụ ndị a kọchara, kpọọ aha ọjọọ ma kpọọ asị.”
Dị nnọọ ka ụwa oge ochie na-aghọtaghị Jisọs, ọ ghọtaghị ndị Kraịst, n’ihi ya kwa ọ kpọrọ ha asị. Ebe ọ bụ na ha jụrụ ife onye ọchịchị alaeze ukwu na chi arụsi dị iche iche ofufe, e boro ha ebubo na ha bụ ndị na-ekweghị na Chineke. Ọ bụrụ na e nwee ọdachi, a na-ata ha ụta n’ihi ịkpasu chi dị iche iche iwe. N’ihi na ha ejeghị ihe nkiri ndị rụrụ arụ ma ọ bụ ihe ngosi ndị a na-awụfu ọbara dị ukwuu na ha, e weere ha dị ka ndị na-adịghị eso ndị ọzọ akpakọrịta, ọbụna ‘ndị kpọrọ agbụrụ mmadụ asị.’ Ndị iro ha sịrị na “ịrọ òtù” ndị Kraịst na-ekewasị ezinụlọ, wee si otú a bụrụ ihe ize ndụ ná nguzosi ike nke usoro ọha mmadụ. Tertullian kwuru okwu banyere ndị ọgọ mmụọ bụ di, ndị họọrọ ka nwunye ha kwaa iko karịa ịghọ ndị Kraịst.
A katọrọ ndị Kraịst n’ihi na ha na-eguzogide nsikwopụ ime, bụ́ nke a na-eme n’ebe nile mgbe ahụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị iro ha boro ha ebubo na ha na-egbu ụmụntakịrị. E kwuru na ná nzukọ ha dị iche iche, ha ṅụrụ ọbara ụmụntakịrị a chụrụ n’àjà. N’otu oge ahụ, ndị iro ha nwara ịrụgide ha iri achịcha e ji ọbara mee, ebe ha maara na nke a megidere akọ na uche ha. Otú a, ndị mmegide ndị
a gosiri na ebubo ha bụ ụgha.—Tertullian, Apology, isi nke 9.E Ledara Ha Anya Dị Ka Ịrọ Òtù Ọhụrụ
Onye ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Kenneth Scott Latourette dere, sị: “Okwu ịta ụta ndị ọzọkwa kwara Iso Ụzọ Kraịst emo n’ihi ịbụ nke mmalite ya na-etebeghị aka ma gosi ọdịiche dị n’etiti ya na ịdị ochie nke okpukpe ndị ha na ya na-amarịta aka [okpukpe ndị Juu na okpukpe ndị ọgọ mmụọ nke ndị Grik na Rom].” (A History of the Expansion of Christianity, Mpịakọta nke 1, peji nke 131) Ná mmalite narị afọ nke abụọ O.A., onye Rom na-akọ akụkọ ihe mere bụ́ Suetonius kpọrọ Iso Ụzọ Kraịst “nkwenkwe na-enweghị isi nke dị ọhụrụ ma dị arụrụala.” Tertullian gbara aka ebe na a kpọrọ aha ahụ bụ́ Kristian n’onwe ya asị nakwa na ndị Kraịst bụ ịrọ òtù a kpọrọ asị. N’ikwu okwu banyere otú ndị isi nke Alaeze Ukwu Rom si lee ndị Kraịst anya na narị afọ nke abụọ, Robert M. Grant dere, sị: “Echiche bụ isi e nwere bụ na Iso Ụzọ Kraịst bụ nanị okpukpe na-adịghị mkpa, eleghị anya nke na-emerụ ahụ.”—Early Christianity and Society.
E Boro Ha Ebubo Iji Aka Ike Na-eme Ntọghata
N’akwụkwọ ya bụ́ Les premiers siècles de l’Eglise (Narị Afọ Ndị Mbụ nke Chọọchị Ahụ), Onye prọfesọ nke mahadum Sorbonne bụ́ Jean Bernardi dere, sị: “[Ndị Kraịst] kwesịrị ịpụ gaa kwuo okwu n’ebe nile nakwa gwa onye ọ bụla. N’okporo ụzọ awara awara na n’obodo ukwu dị iche iche, n’ámá na n’ebe obibi dị iche iche. Ma à nabatara ha ma ọ bụ na a nabataghị ha. Nye ndị ogbenye, nakwa nye ndị ọgaranya bụ́ ndị ihe onwunwe ha bụụrụ ihe mgbochi. Nye ndị nta na ndị ọchịchị ógbè dị iche iche nke Rom . . . Ọ dịrị mkpa ka ha mee njem okporo ụzọ, gbaa ụgbọ mmiri, ma gaa ná nsọtụ dị iche iche nke ụwa.”
Hà mere nke a? Ihe àmà na-egosi na ha mere. Professor Léon Homo na-akọ na echiche ọha na eze megidere ndị Kraịst mbụ n’ihi “ntọghata siri ike” ha na-eme. Professor Latourette na-ekwu na ebe ndị Juu enwekwaghị ịnụ ọkụ n’obi ha maka ịtọghata ndị ọhụrụ. “n’aka nke ọzọ, ndị Kraịst, bụ ndị ozi ala ọzọ na-ejesi ozi ike, n’ihi ya kwa, ha kpaliri ịkpọasị.”
Na narị afọ nke abụọ O.A., onye Rom bụ onye ọkà ihe ọmụma, bụ́ Celsus kọchara ụkpụrụ ime nkwusa nke ndị Kraịst. O kwuru na Iso Ụzọ Kraịst bụ maka ndị na-agụghị akwụkwọ nakwa na ọ pụrụ ‘ime ka nanị ndị nzuzu, ndị ohu, ndị inyom, na ụmụntakịrị kwenye.’ O boro ndị Kraịst ebubo na ha ji nkwenkwe ha na-aghọgbute “ndị dị mfe nghọgbu,” na-eme ka ha “kwere n’echeghị ezi echiche.” O kwuru na ha gwara ndị na-eso ụzọ ha metere ọhụrụ, sị: “Unu ajụla ajụjụ; nanị kwerenụ.” Ma, dị ka Origen si kwuo, Celsus n’onwe ya kwetara na “ọ bụghị nanị ndị nkịtị ka e ji nkwenkwe Jisọs duje n’ịnabata okpukpe Ya.”
E Nweghị Njikọ Òtù Okpukpe
A kọchara ndị Kraịst mbụ gaa n’ihu n’ihi na ha sịrị na ha nwere eziokwu nke otu ezi Chineke ahụ. Ha anabataghị njikọ òtù okpukpe dị iche iche, ma ọ bụ ngwakọrịta okpukpe. Latourette dere, sị: “N’adịghị ka ọtụtụ n’ime okwukwe ndị e nwere na mgbe ahụ, ha [ndị Kraịst] emesoghị okpukpe ndị ọzọ dị ka enyi. . . . N’ụzọ megidere nnakwerịta satụrụ mbara nke e ji mara òtù ndị ọzọ, ha kwupụtara na ha nwere eziokwu a na-apụghị ịrụ ụka.”
N’afọ 202 O.A., Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Septimius Severus nyere iwu nke machi
bidoro ndị Kraịst ime ntọghata. Otú ọ dị, nke a akwụsịghị ha ịgba àmà banyere okwukwe ha. Latourette kọwara ihe si na ya pụta, na-asị: “N’ọjụjụ ọ jụrụ ikwenyere n’ikpere arụsị nke e nwere na mgbe ahụ na ọtụtụ n’ime ọdịnala nke mmekọrịta mmadụ na ibe ya na ihe ndị metụtara omume ọma ndị e nwere n’oge ahụ, [ndị Kraịst mbụ] wulitere ịdị n’otu na nzukọ nke doro ya megide usoro ọha mmadụ. Mgbanwe ahụ a chọrọ iji sonyere ya nyere ndị na-agbaso ya nkwenye siri ike bụ́ nke ghọrọ ebe ha si nweta ikike nke iguzogide mkpagbu nakwa ịnụ ọkụ n’obi n’ime ntọghata.”Ya mere, ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme ahụ doro anya. N’akụkụ ka ukwuu, ndị Kraịst mbụ, ebe ọ bụ eziokwu na ha na-agbalị ịbụ ezi ụmụ amaala na isoro mmadụ nile bie n’udo, jụrụ ịghọ “akụkụ nke ụwa.” (Jọn 15:19, NW) Ha sọpụụrụ ndị na-achị isi. Ma mgbe Siza machibidoro ha iwu ime nkwusa, ha enweghị ihe ọzọ ha ga-eme ma ọ bụghị ịnọgide na-eme nkwusa. Ha gbalịrị isoro mmadụ nile bikọọ n’udo ma jụ imebi ụkpụrụ omume ha na ikwenyere ikpere arụsị ndị ọgọ mmụọ. N’ihi ihe ndị a nile, a na-akọcha ha, kpọọ ha aha ọjọọ, kpọọ ha asị, ma kpagbuo ha, ọbụna dị ka Kraịst buworo n’amụma na a ga-eme ha.—Jọn 16:33.
Ịdị iche ha site n’ụwa ọ̀ dịgidere? Ka oge na-aga, ndị ahụ sịrị na ha bụ ndị Kraịst hà gbanwere omume ha n’akụkụ nke a?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
“Nguzo nke onye Kraịst wetaara ya nsogbu kwa ụbọchị; ọ na-anọpụ iche n’usoro ihe omume ọha mmadụ”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
“Iso Ụzọ Kraịst [bụ nke a kwara] emo n’ihi ịbụ nke mmalite ya na-adịbeghị anya ma gosi ọdịiche . . . n’etiti ya na ịdị ochie nke okpukpe ndị ha na ya na-amarịta aka”
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
Cover: Alinari/Art Resource, N.Y.
[Foto dị na peeji nke 3]
N’ihi na ndị Kraịst jụrụ ife onye ọchịchị alaeze ukwu ndị Rom na chi dị iche iche nke ndị ọgọ mmụọ ofufe, e boro ha ebubo ịbụ ndị na-ekweghị na Chineke
[Ebe E Si Nweta Foto]
Museo della Civiltà Romana, Roma
[Foto dị na peeji nke 7]
A maara ndị Kraịst narị afọ mbụ dị ka ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi nke Alaeze ahụ