Ndị Kraịst Na Ọha Mmadụ Nke Oge A
Ndị Kraịst Na Ọha Mmadụ Nke Oge A
“Mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.”—MATIU 24:9.
1. Gịnị bụ akara kwesịrị isetịpụ Iso Ụzọ Kraịst iche?
ỊDỊ iche site n’ụwa bụ akara setịpụrụ ndị Kraịst mbụ iche. N’ekpere nye Nna ya nke eluigwe, bụ́ Jehova, Kraịst kwuru banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mụ onwe m enyewo ha okwu gị; ụwa kpọkwara ha asị, n’ihi na ha esiteghị n’ụwa, dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:14) Mgbe a kpọrọ ya n’ihu Pọntiọs Paịlet, Jisọs kwuru, sị: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a.” (Jọn 18:36) Ịdị iche nke Iso Ụzọ Kraịst oge gboo bụ nke Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst na ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme gbara aka ebe ya.
2. (a) À ga-enwe mgbanwe ọ bụla ná mmekọrịta dị n’etiti ndị na-eso ụzọ Jisọs na ụwa ka oge na-aga? (b) È dokwara Alaeze Jisọs ịbịa site ná ntọghata nke ụwa nile?
2 Jisọs ọ̀ mesịri kpughee na a ga-enwe mgbanwe ná mmekọrịta dị n’etiti ndị na-eso ụzọ ya na ụwa nakwa na Alaeze ya ga-abịa site ná ntọghata nke ụwa bịa n’Iso Ụzọ Kraịst? Ee e. Ọbụna na ọ dịghị ihe ọ bụla mmụọ nsọ nyere ndị na-eso ụzọ ya ike ide mgbe ọ nwụsịrị nke gositụrụ ihe dị otú ahụ. (Jemes 4:4 [nke e dere nwa oge tupu 62 O.A.]; 1 Jọn 2:15-17; 5:19 [nke e dere n’ihe dị ka 98 O.A.]) N’ụzọ megidere nke ahụ, Bible na-ejikọ “ọnụnọ” Jisọs na “ọbịbịa” na-esochi ya n’ike Alaeze na “ọgwụgwụ nke usoro ihe dị iche iche,” bụ́ nke ga-eduje ‘n’ọgwụgwụ,’ ma ọ bụ mbibi. (Matiu 24:3, 14, 29, 30, NW; Daniel 2:44; 7:13, 14) N’ihe ịrịba ama ahụ Jisọs nyere banyere pa·rou·siʹa, ma ọ bụ ọnụnọ ya, o kwuru banyere ezi ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mgbe ahụ ka ha ga-arara unu nye ná mkpagbu, ha ga-egbukwa unu: mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.”—Matiu 24:9.
Ezi Ndị Kraịst Taa
3, 4. (a) Olee otú akwụkwọ nkà ihe ọmụma ndị Katọlik si kọwaa ndị Kraịst mbụ? (b) Okwu ndị dị aṅaa yiri ibe ha ka e ji kọwaa Ndịàmà Jehova na ndị Kraịst mbụ?
3 Olee òtù okpukpe taa nke mewooro onwe ya aha nke ikwesị ntụkwasị obi nye ụkpụrụ ndị Kraịst na ịdị iche site n’ụwa nke a, nke a kpọrọ ndị òtù ya asị ma na-akpagbu ha? Ọ dị mma, olee òtù ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ nke kwekọrọ n’akụkụ nile ná nkọwa ndị ahụ akụkọ ihe mere eme nyere banyere ndị Kraịst mbụ? Banyere ndị a, akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-asị: “Òtù ndị Kraịst oge gboo, ọ bụ ezie na e lere ya anya ná mmalite dị ka nanị ịrọ òtù ọzọ na gburugburu ndị Juu, gosiri onwe ya ịdị iche n’ozizi nkà mmụta okpukpe ya, na karịsịakwa n’ịnụ ọkụ n’obi nke ndị òtù ya, bụ́ ndị jere ozi dị ka ndị àmà Kraịst ‘na Judia na Sameria nile, ọbụna ruo ná nsọtụ ụwa’ (Ọrụ 1.8).”—Mpịakọta nke 3, peji nke 694.
4 Rịba ama okwu ahụ bụ “e lere ya anya . . . dị ka nanị ịrọ òtù ọzọ,” “ịdị iche n’ozizi . . . ya,” ‘ịnụ ọkụ n’obi . . . dị ka ndị àmà.’ Ugbu a kwa, lee otú otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ si kọwaa Ndịàmà Jehova: “Ịrọ òtù . . . Ndịàmà kwenyesiri ike na ọgwụgwụ ụwa ga-abịa n’ime afọ ole na ole. Nkwenye nke a doro anya yiri ka ọ bụ ihe kasị sie ike na-akwali ịnụ ọkụ n’obi ha nke na-adịghị ada mba. . . . Ibu ọrụ bụ isi nke onye òtù ọ bụla nke ịrọ òtù nke a bụ ịgbara Jehova àmà site n’ịkpọsa Alaeze Ya nke na-abịanụ. . . . Ha weere Bible dị ka nanị isi iyi nke ihe ha kwere na ya na ụkpụrụ nke omume . . . Iji bụrụ ezi Onyeàmà, mmadụ aghaghị ime nkwusa dị ìrè n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ.”—Mpịakọta nke 7, peji nke 864-865.
5. (a) N’akụkụ dịgasị aṅaa ka ozizi Ndịàmà Jehova si dị iche? (b) Nye ihe atụ ndị na-egosi na ihe Ndịàmà Jehova kwere na ha kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ.
5 N’akụkụ dịgasị aṅaa ka ozizi Ndịàmà Jehova dị iche? Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia na-akpọtụ ụzọ ole na ole aha: “Ha [Ndịàmà Jehvoa] na-akatọ Atọ n’Ime Otu dị ka ikpere arụsị nke ndị ọgọ mmụọ . . . Ha na-ewe Jisọs dị ka onye kachasị n’etiti Ndịàmà Jehova, ‘chi’ (otú a ka ha si asụgharị Jọn 1:1), na-adịghị ala n’ebe onye ọ bụla ọzọ nọ ma ọ́ bụghị Jehova. . . . Ọ nwụrụ dị ka mmadụ ma bụrụ onye a kpọlitere dị ka Ọkpara bụ mmụọ nke na-adịghị anwụ anwụ. Ahụhụ na ọnwụ ya bụ ụgwọ ọ kwụrụ iji nwetaghachiri ihe a kpọrọ mmadụ ikike nke ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala. N’ezie, ‘oké ìgwè mmadụ’ (Ap 7.9) nke ezi Ndịàmà nwere olileanya Paradaịs elu ala; nanị 144,000 ndị na-ekwesị ntụkwasị obi (Ap 7.4; 14.1, 4) pụrụ isonyere Kraịst n’ebube nke eluigwe. A ga-ebibi ndị mmebi iwu kpam kpam. . . . Baptism—nke Ndịàmà na-eme site n’imikpu ná mmiri . . . [bụ] ihe ngosi a na-ahụ anya nke nraranye ha n’ijere Jehova Chineke ozi. . . . Ndịàmà Jehova adọtawo oké mkpọsa site n’ịjụ mmịnye ọbara . . . Omume alụmdi na nwunye na mmekọahụ ha bụ nke guzosiri nnọọ ike.” Ndịàmà Jehova pụrụ ịdị iche n’akụkụ ndị a, ma nguzo ha n’ihe ndị a nile bụ nke dabesiiri ike na Bible.—Abụ Ọma 37:29; Matiu 3:16; 6:10; Ọrụ 15:28, 29; Ndị Rom 6:23; 1 Ndị Kọrint 6:9, 10; 8:6; Mkpughe 1:5.
6. Nguzo dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova jigidesiri ike? N’ihi Gịnị?
6 Akwụkwọ nke a nke ndị Roman Katọlik kwukwara na 1965 (nke ihe àmà na-egosi na ọ bụ mgbe e dere isiokwu ahụ) “Ndịàmà ahụ Jọn 17:16.
ekwetabeghị na ha bụ akụkụ nke ọha mmadụ ha bi na ya.” O yiri ka onye dere isiokwu ahụ ò chere na ka oge na-aga Ndịàmà Jehova wee na-ehikwa nne n’ọnụ ọgụgụ ma “na-adịwanye ka chọọchị kama ịbụ ịrọ òtù,” ha ga-aghọ akụkụ nke ụwa. Ma nke ahụ emebeghị. Taa, mgbe e nwere ọnụ ọgụgụ ji okpukpu anọ karịa Ndịàmà e nwere na 1965, Ndịàmà Jehova anọgidewo ná nguzo ha n’ihe banyere ụwa a. “Ha esiteghị n’ụwa,” dị ka Jisọs “na-esiteghị n’ụwa.”—Ha Dị Iche Ma Ha Adịghị Ebu Iro
7, 8. Dị ka ọ dị n’etiti ndị Kraịst mbụ, gịnị bụ eziokwu n’etiti Ndịàmà Jehova taa?
7 N’izo aka ná nzachite nke onye nkwado okwukwe narị afọ nke abụọ bụ́ Justin Martyr zachiteere ndị Kraịst, Robert M. Grant dere n’akwụkwọ ya bụ́ Early Christianity and Society, sị: “Ọ bụrụ na Ndị Kraịst bụ ndị nkwatu ọchịchị, ha ga-anọgide na-ezo ezo iji wee ruo ihe mgbaru ọsọ ha. . . . Ha bụ ndị ha na onye ọchịchị alaeze ukwu kasị emekọrịta ihe maka inweta udo na ezi ịdị n’usoro.” N’otu aka ahụ, a maara Ndịàmà Jehova n’ụwa nile taa ịbụ ụmụ amaala na-ahụ udo n’anya na ndị na-eme ihe n’usoro. Ụdị gọọmenti ọ bụla maara na ọ dịghị ihe ọ bụla ha nwere ịtụ egwu ya banyere Ndịàmà Jehova.
8 Otu onye ebe Ugwu America nke na-ede uche akwụkwọ akụkọ dere, sị: “Ọ na-ewe echiche ịkpọasị na nke ịtụ egwu na-enweghị isi iji kwere na Ndịàmà Jehova na-akpata ụdị iyi egwu ọ bụla nye ịchịisi ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọ bụla; ha bụ nnọọ ndị na-adịghị akwatu ọchịchị na ndị na-ahụ udo n’anya dị nnọọ ka a pụrụ ịtụ anya ya n’aka òtù okpukpe.” N’akwụkwọ ya bụ L’objection de conscience (Ijụ Ihe n’Ihi Akọ na Uche), Jean-Pierre Cattelain na-ede, sị: “Ndịàmà bụ ndị na-edo onwe ha nnọọ nke ọma n’okpuru ndị na-achị isi ma na-erubekarị isi n’iwu; ha na-atụ ụtụ isi ha, ha adịghịkwa achọ ịma gọọmenti aka, ịgbanwe ya, ma ọ bụ ibibi ya, n’ihi na ha adịghị etinye onwe ha n’ihe ndị metụtara ụwa nke a.” Cattelain gara n’ihu ikwukwa na ọ gwụla ma Obodo ọ̀ chọrọ ndụ ha, bụ́ nke ha rarawooro nye Chineke kpam kpam, ka Ndịàmà Jehova na-ajụ irube isi. Na nke a ha yiri nnọọ ndị Kraịst mbụ.—Mak 12:17; Ọrụ 5:29.
Ndị Na-achị Achị Ghọtahiere Ha
9. Banyere ịdị iche site n’ụwa, gịnị bụ ọdịiche pụtara ìhè dị n’etiti ndị Kraịst mbụ na ndị Katọlik nke oge a?
9 Ihe ka ọtụtụ ná ndị ọchịchị alaeze ukwu Rom ghọtahiere ndị Kraịst mbụ ma kpagbuo ha. N’igosi ihe kpatara ya, akwụkwọ bụ́ The Epistle to Diognetus, nke ụfọdụ ndị chere na e dere na narị afọ nke abụọ O.A., na-ekwu, sị: “Ndị Kraịst bi n’ụwa, ma ha abụghị akụkụ nke ụwa.” N’aka nke ọzọ, Kansụl Vatican nke Abụọ, n’Ụkpụrụ Ozizi nke E Kwusịa Ọ Gwụ ya banyere Chọọchị ahụ, kwuru na ndị Katọlik kwesịrị “ịchọ Alaeze Chineke site n’itinye aka n’ihe omume dị iche iche nke ụwa” na “ịrụ ọrụ n’ime onwe ha maka ido ụwa nsọ.”
10. (a) Olee otú ndị na-achị achị si lee ndị Kraịst mbụ anya? (b) Olee otú e si elekarị Ndịàmà Jehova anya, gịnịkwa bụ mmeghachi omume ha?
10 Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ E. G. Hardy kwuru na ndị ọchịchị alaeze ukwu Rom lere ndị Kraịst mbụ anya ịbụ “ndị na-anụsi ọkụ ike n’obi e kwesịtụrụ ileda anya.” Onye France na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Étienne Trocmé na-ekwu banyere “nleda anya nke ndị ọrụ ọchịchị Grik na Rom gụrụ akwụkwọ ledara ihe ha lere anya dị ka ịrọ òtù [ndị Kraịst] a na-ahụtụbeghị mbụ nke si Ebe Ọwụwa Anyanwụ.” Akwụkwọ ozi Pliny nke Nta, onye Rom na-achị Bitinịa, na Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Trajan derịtara na-egosi na ndị na-achị achị n’ozuzu ha amaghị ihe Iso Ụzọ Kraịst bụ n’ezie. N’otu aka ahụ taa, ndị ọchịchị ụwa na-aghọtahiekarị Ndịàmà Jehova ma na-eleda ha anya. Otú ọ dị, nke a adịghị abụrụ Ndịàmà ahụ ihe ịtụnanya ma ọ bụ ihe nkụda aka.—Ọrụ 4:13; 1 Pita 4:12, 13.
“A Na-ekwugide Ya Ebe Nile”
11. (a) Olee ihe ndị e kwuru banyere ndị Kraịst mbụ, gịnịkwa ka e kwuworo banyere Ndịàmà Jehova? (b) N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova na-ejighị ekere òkè na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?
11 Banyere ndị Kraịst mbụ e kwuru, sị: “Ihe banyere ịrọ òtù a, anyị mazuru na a na-ekwugide ya ebe nile.” (Ọrụ 28:22) Na narị afọ nke abụọ O.A., Celsus nke na-ekpere arụsị kwuru na Iso Ụzọ Kraịst kpaliri mmasị nke nanị ndị na-abaghị uru n’usoro ọha mmadụ. N’otu aka ahụ, e kwuwo banyere Ndịàmà Jehova na “n’ókè ka ukwuu, a na-adọta ha site n’etiti ndị ihe na-esiri ike n’ọha mmadụ anyị.” Onye ọkọ akụkọ ihe mere eme chọọchị, bụ́ Augustus Neander kọrọ na “e gosiri ndị Kraịst dị ka ndị nwụrụ anwụ n’ebe ụwa dị, na ndị na-abaghị uru n’ihe omume nile nke ndụ; . . . a jụkwara, sị, gịnị ga-eme ihe nile metụtara ịdị ndụ ma ọ bụrụ na mmadụ dị ka ha?” N’ihi na Ndịàmà Jehova na-ezere itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, a na-akpọ ha osisi kpọrọ nkụ n’ime ọha mmadụ. Ma olee otú ha ga-esi bụrụ ndị na-etinyesi ọnụ ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma n’otu mgbe ahụ bụrụkwa ndị na-akwado Alaeze Chineke dị ka nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ? Ndịàmà Jehova na-eburu n’uche, okwu ndị ahụ nke Pọl onyeozi: “Kere òkè n’ịta ahụhụ dị ka ezi onye agha nke Kraịst Jisọs. Ọ dịghị onye ọ bụla nọ n’ozi agha nke na-ekekọta onwe ya ná nchụso nke ndị nkịtị, ebe nzube ya bụ ime ka afọ ju onye nke were ya n’ọrụ.”—2 Timoti 2:3, 4, Revised Standard Version, Mbipụta nke Okpukpe Dị Iche Iche Jikọrọ Aka Mee.
12. N’akụkụ dị aṅaa nke dị mkpa banyere ịdị iche ka Ndịàmà Jehova yiri ndị Kraịst mbụ?
12 N’akwụkwọ ya bụ́ A History of Christianity, Professor K. S. Latourette na-ede, sị: “Otu n’isiokwu ndị Kraịst mbụ na ụwa nke ndị Grik na Rom na-ekwekọtaghị na ya bụ ikere ókè n’agha. Ruo narị afọ atọ ndị bu ụzọ, ọ dịghị ihe odide ọ bụla nke ndị Kraịst bụ́ nke lanarịworo ruo oge anyị nke kwadoro nkere òkè ndị Kraịst n’agha.” Akwụkwọ Edward Gibbon bụ́ The History of the Decline and Fall of the Roman Empire na-asị: “Ọ bụ ihe na-ekweghị omume na ndị Kraịst, pụrụ iwere ọrụ nke ndị agha, ndị ọkà ikpe, ma ọ bụ ndị ọchịchị, n’ajụghị ibu ọrụ nke dị nsọ karị.” Ndịàmà Jehova n’otu aka ahụ na-ewere nguzo nke ịnọpụ iche kpam kpam ma na-agbaso ụkpụrụ Bible ndị e depụtara n’Aịsaịa 2:2-4 na Matiu 26:52.
13. Ebubo dị aṅaa ka e boro Ndịàmà Jehova, ma gịnị ka eziokwu na-egosi?
13 Ndị iro Ndịàmà Jehova na-ebo ha ebubo na ha na-ekewasị ezinụlọ. N’ezie, e nwewo ọnọdụ ụfọdụ nke ezinụlọ ndị kewara mgbe otu ma ọ bụ karị nke ndị òtù ha ghọrọ Ndịàmà Jehova. Jisọs buru amụma na nke a ga-eme. (Luk 12:51-53) Otú ọ dị, ndekọ ọnụ ọgụgụ na-egosi na alụmdi na nwunye ndị kewara n’ihi nke a dị ole na ole. Dị ka ihe atụ, n’etiti Ndịàmà Jehova na France, 1 di na nwunye n’ime 3 gụnyere di ma ọ bụ nwunye nke na-abụghị Onyeàmà. Ma, ọ̀tụ̀tụ̀ ịgba alụkwaghịm n’etiti alụmdi na nwunye ndị a nke Ndịàmà na ndị na-abụghị Ndịàmà adịghị elu karịa nkezi e nwere ná mba ahụ. N’ihi gịnị? Ndị ozi bụ́ Pọl na Pita nyere ndị Kraịst lụrụ ndị na-ekweghị ekwe ndụmọdụ amamihe na nke sitere n’ike mmụọ nsọ, Ndịàmà Jehova na-agbalịkwa ịgbaso okwu ya. (1 Ndị Kọrint 7:12-16; 1 Pita 3:1-4) Ọ bụrụ na alụmdi na nwunye Onyeàmà na onye na-abụghị ekewaa, ọ na-afọ nke nta ka ọ bụrụ na ọ bụ onye nke na-abụghị Onyeàmà na-ebute ụzọ na ya mgbe nile. N’aka nke ọzọ, e chebewo ọtụtụ puku alụmdi na nwunye n’ihi na ndị nọ n’alụmdi na nwunye ahụ ghọrọ Ndịàmà Jehova ma malite itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha.
Ndị Kraịst, Ọ Bụghị Ndị Atọ n’Ime Otu
14. Ebubo dị aṅaa ka e boro ndị Kraịst mbụ, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji sie ike ịghọta?
14 Ọ bụ ihe siri ike ịghọta na n’Alaeze Ukwu nke Rom, otu n’ime ebubo e boro ndị Kraịst mbụ bụ na ha bụ ndị na-ekweghị na Chineke. Aịsaịa 37:19.
Dr. Augustus Neander na-ede, sị: “Ndị na-agọnahụ chi arụsị, ndị na-ekweghị na Chineke, . . . bụ aha e jikarị mara ndị Kraịst n’etiti ụmụ mmadụ.” Lee ihe mgbagwoju anya ọ bụ na ndị ọgọ mmmụọ na-efe ‘ihe na-adịghị chi ha bụ, kama ha bụ ọrụ aka mmadụ, bụ́ osisi na nkume,’ ga-akpọ ndị Kraịst, bụ́ ndị na-efe Onye Okike ahụ dị ndụ, ọ bụghịkwa ìgwè chi dị iche iche, ndị na-ekweghị na Chineke.—15, 16. (a) Gịnị ka ụfọdụ ndị okpukpe kwuworo banyere Ndịàmà Jehova, ma ajụjụ dị aṅaa ka nke a na-ewelite? (b) Gịnị na-egosi na Ndịàmà Jehova bụ ndị Kraịst n’ezie?
15 Ọ bụkwa ihe siri ike ịghọta na taa, ụfọdụ ndị isi na Krisendọm na-asị na Ndịàmà Jehova abụghị ndị Kraịst. N’ihi gịnị? N’ihi na Ndịàmà na-ajụ ikwenye n’Atọ n’Ime Otu. Dị ka nkọwa na-ezighị ezi nke ndị Krisendọm si dị, “ndị Kraịst bụ ndị nabatara Kraịst dị ka Chineke.” N’ụzọ megidere nke a, otu akwụkwọ ọkọwa okwu ọgbara ọhụrụ kọwara mkpọaha ahụ bụ “Onye Kraịst” dị ka “onye kweere na Jisọs Kraịst ma na-eso ozizi ya,” kọwaakwa “Iso Ụzọ Kraịst” dị ka “okpukpe nke dabeere n’ozizi nke Jisọs Kraịst na nkwenye na ọ bụ Ọkpara Chineke.” Olee ndị kwekọrọ ná nkọwa nke a nke ọma karị?
16 Ndịàmà Jehova na-anabata àmà Jisọs n’onwe ya banyere onye ọ bụ. O kwuru, sị: “Abụ m Ọkpara Chineke,” ọ bụghị, “Abụ Chineke Ọkpara.” (Jọn 10:36; tụlee Jọn 20:31.) Ha na-anabata okwu ahụ Pọl onyeozi kwuru n’ike mmụọ nsọ banyere Kraịst, sị: “Onye, n’ịdị n’ụdị nke Chineke, eleghị ịha ka Chineke anya dị ka ihe a ga-achụsosi ike.” * (Ndị Filipaị 2:6, The New Jerusalem Bible) Akwụkwọ bụ́ The Paganism in Our Christianity na-asị: “Jisọs Kraịst adịghị mgbe o kwuru ihe dị otú ahụ [Atọ n’Ime Otu hà nhata], ọ dịghịkwa ebe ọ bụla n’ime Agba Ọhụrụ okwu ahụ bụ ‘Atọ n’Ime Otu’ pụtara. Ọ bụ nanị na Chọọchị nabatara echiche ahụ narị afọ atọ mgbe Onyenwe anyị nwụsịrị; mmalite nke echiche ahụ sitekwara kpam kpam n’aka ndị ọgọ mmụọ.” Ndịàmà Jehova na-anabata ihe Bible na-ezi banyere Kraịst. Ha bụ ndị Kraịst, ọ bụghị ndị Atọ n’Ime Otu.
E Nweghị Njikọ Òtù Okpukpe
17. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova na-ejighị akwado ihe omume nke njikọ aka, na ngwakọrịta okpukpe?
17 Mkpesa abụọ ndị ọzọ a na-eme megide Ndịàmà Jehova bụ na ha na-ajụ ikere òkè n’ihe omume njikọ okpukpe nakwa na ha na-eme ihe a kpọrọ “ime ntọghata aka ike.” Nkọcha abụọ ndị a bụcha ndị e ji mee ihe n’ebe ndị Kraịst mbụ nọ. Krisendọm, ya na akụkụ mejupụtara ya ndị bụ Katọlik, Orthodox, na Protestant, bụ akụkụ ụwa nke a n’ụzọ a na-apụghị ịgọpụ agọpụ. Dị ka Jisọs, Ndịàmà Jehova “esiteghị n’ụwa.” (Jọn 17:14) Olee otú ha pụrụ isi site n’ihe omume dị iche iche nke ngwakọrịta okpukpe jikọọ onwe ha n’ebe òtù okpukpe ndị na-akwalite àgwà na nkwenkwe ndị na-abụghị nke ndị Kraịst nọ?
18. (a) N’ihi gịnị ka a na-apụghị iji katọọ Ndịàmà Jehova n’ihi ịsị na ọ bụ nanị ha na-ekpe ezi okpukpe ahụ? (b) Ọ bụ ezie na ha kweere na ha nwere ezi okpukpe, gịnị ka ndị Roman Katọlik na-enweghị?
18 Olee onye pụrụ izi ezi n’ịkatọ Ndịàmà Jehova n’ihi ikwere, dị ka ndị Kraịst mbụ mere, na ọ bụ nanị ha na-ekpe ezi okpukpe ahụ? Ọbụna Chọọchị Katọlik, ebe ha na-eji ihu abụọ na-asị na ha na-akwado ihe omume njikọ okpukpe, na-ekwupụta, sị: “Anyị kweere na nanị otu ezi okpukpe nke a anọgidewo na-adị n’ime Katọlik na Chọọchị Ndị Ozi, bụ́ nke Onyenwe anyị Jisọs nyere ọrụ nke ikesa ya n’etiti mmadụ nile mgbe ọ gwara ndị ozi ahụ, sị: ‘Ya mere gaanụ mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.’” (Kansụl Vatican nke Abụọ, “Mkpọsa Banyere Nnwere Onwe nke Ikpe Okpukpe”) Otú ọ dị, o doro anya na nkwenkwe dị otú ahụ ezughị ezu iji kụbanye n’ime ndị Katọlik, ịnụ ọkụ n’obi ike na-adịghị ada mba n’ịpụ gaa mee ndị na-eso ụzọ.
19. (a) Gịnị ka Ndịàmà Jehova kpebisiri ike ime, gịnịkwa bụ ebumnuche ha? (b) Gịnị ka a ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?
19 Ndịàmà Jehova nwere ụdị ịnụ ọkụ n’obi dị otú ahụ. Ha kpebisiri ike ịga n’ihu na-agba àmà ruo oge nile Chineke chọrọ ka ha mee otú ahụ. (Matiu 24:14) Ịgba àmà ha bụ nke ịnụ ọkụ n’obi ma ọ bụghị nke aka ike. Ọ bụ ịhụnanya maka onye agbata obi na-akpali ya, ọ bụghị ịkpọ agbụrụ mmadụ asị. Ha nwere olileanya na a ga-azọpụta ọtụtụ mmadụ ruo otú o kwere mee. (1 Timoti 4:16) Dị ka ndị Kraịst mbụ, ha na-agbalisi ike ka ha “na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ndị Rom 12:18) Otú ha si eme nke a ka a ga-akọ n’isiokwu na-eso.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 16 Maka nkwurịta okwu nke akụkụ okwu a n’ihe metụtara nkwenkwe Atọ n’Ime Otu, lee Ụlọ Nche (Bekee), June 15, 1971, peji nke 355-356.
Iji Tụgharịa Uche
□ Gịnị ka e ji mara ndị Kraịst mbụ, oleekwa otú Ndịàmà Jehova si yie ha?
□ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova si egosi na ha bụ ezi ụmụ amaala?
□ Olee otú ndị na-achị achị si lee ndị Kraịst mbụ anya, ọ̀ dịkwa ihe ọ bụla dị iche taa?
□ Gịnị ka nkwenye Ndịàmà ahụ kwenyesiri ike na ha nwere eziokwu na-akwali ha ime?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto dị na peeji nke 12]
Ndịàmà Jehova kpebisiri ike ịga n’ihu na-agba àmà ruo oge nile Chineke chọrọ ka ha mee otú ahụ
[Foto dị na peeji nke 17]
Paịlet sịrị: “Lee! Nwoke ahụ”—Onye ahụ nke na-abụghị akụkụ nke ụwa.—Jọn 19:5
[Ebe E Si Nweta Foto]
“Ecce Homo” site n’aka A. Ciseri: Florence, Galleria d’Arte Moderna / Alinari/Art Resource, N.Y.