Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ihe A Na-achọsi Ike” Na-ejupụta n’Ụlọ Jehova

“Ihe A Na-achọsi Ike” Na-ejupụta n’Ụlọ Jehova

“Ihe A Na-achọsi Ike” Na-ejupụta n’Ụlọ Jehova

“M [Jehova] ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube.”—HAGAỊ 2:7.

1. N’oge ọnọdụ chọrọ ime ihe ngwa ngwa, n’ihi gịnị ka anyị ji ebu ụzọ eche banyere ndị anyị hụrụ n’anya?

IHE ndị dị aṅaa a na-achọsi ike jupụtara n’ụlọ gị? Ì nwere oche ndị oké ozu, kọmputa ọgbara ọhụrụ, ụgbọala ọhụrụ n’ebe ndọba ụgbọala gị? Ọ bụrụgodị na i nwere ihe ndị a nile, ị́ gaghị ekweta na ihe ndị kasị oké ọnụ ahịa n’ebe obibi gị bụ ndị mmadụ—ndị òtù ezinụlọ gị? Were ya na n’otu abalị isisi anwụrụ ọkụ metere gị n’ụra. Ọkụ abaala n’ụlọ gị, i nwekwara nanị minit ole na ole iji gbapụ! Gịnị bụ ihe mbụ ị ga-eche banyere ya? Ọ̀ bụ oche gị? Kọmputa gị? Ụgbọala gị? Kama nke ahụ, ọ́ bụghị ndị ị hụrụ n’anya ka ị ga-eche banyere ha? N’ezie ọ bụ ha, n’ihi na mmadụ dị oké ọnụ ahịa karịa ihe onwunwe.

2. Olee ókè ihe Jehova kere eke saruru na mbara, oleekwa akụkụ ya nke na-atọ Jisọs ụtọ karịsịa?

2 Ugbu a chee banyere Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Jehova bụ “Onye kere eluigwe na ala na oké osimiri, na ihe nile dị ha n’ime.” (Ọrụ 4:24) Ọkpara ya, bụ́ “onye ọkà,” bụ onye nnọchiteanya nke Jehova sitere n’aka ya mee ihe nile ọzọ. (Ilu 8:30, 31; Jọn 1:3; Ndị Kọlọsi 1:15-17) N’ezie ma Jehova ma Jisọs ji ihe nile e kere eke kpọrọ ihe. (Tụlee Jenesis 1:31.) Ma olee ihe e kere eke nke i chere ha ji kpọrọ ihe karịsịa—ihe dị iche iche ka ọ̀ bụ ndị mmadụ? N’ọnọdụ ya dị ka amamihe a kọwara ka a ga-asị na ọ bụ mmadụ, Jisọs na-ekwu, sị: “Ihe na-atọ m ụtọ dịkwa n’ebe ụmụ mmadụ nọ,” ma ọ bụ dị ka nsụgharị William F. Beck si kwuo ya, Jisọs “nwere obi ụtọ n’ebe ụmụ mmadụ nọ.”

3. Olee amụma Jehova buru site n’ọnụ Hagaị?

3 Obi abụọ adịghị ya na Jehova ji ụmụ mmadụ kpọrọ ihe nke ukwuu. A na-achọta otu ihe na-egosipụta nke a n’okwu amụma ndị ahụ o kwuru n’afọ 520 T.O.A. site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Hagaị. Jehova kwupụtara, sị: “M ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, M ga-emejukwa ụlọ a n’ebube. . . . Ebube ikpeazụ nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube mbụ.”—Hagaị 2:7, 9.

4, 5. (a) N’ihi gịnị ka ọ na-agaghị eji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na okwu ahụ bụ́ “ihe a na-achọsi ike” na-ezo aka n’ihe onwunwe ndị mara mma? (b) Olee otú ị ga-esi akọwa “ihe a na-achọsi ike,” n’ihi gịnịkwa?

4 “Ihe a na-achọsi ike” ndị dị aṅaa ga-ejupụta n’ụlọ Jehova ma wetara ya ebube a na-enwetụbeghị ụdị ya? Ọ̀ bụ oche ndị dị oké ọnụ ahịa na oké ihe ịchọ mma? Ọ̀ bụ ọlaedo, ọlaọcha, na nkume ndị dị oké ọnụ ahịa? Nke a agatụghị abụ ihe ezi uche dị na ya. Cheta, ụlọ nsọ mbụ ahụ, bụ́ nke a raara nye n’ihe dị ka narị afọ ise tupu mgbe ahụ, bụ ihe owuwu were ọtụtụ ijeri dollar! * N’ezie, Jehova agaghị atụ anya na ụlọ nsọ ahụ ìgwè nta nke ndị Juu ka si mba ọzọ lọta wuru, ga-aka ụlọ nsọ Solomọn mma n’ile anya!

5 Gịnịzi bụ “ihe a na-achọsi ike” ahụ bụ́ ndị ga-ejupụta n’ụlọ Jehova? N’ụzọ doro anya, ha aghaghị ịbụ ụmụ mmadụ. E kwuwerị, ihe na-eme ka obi Jehova ṅụrịa abụghị ọlaọcha na ọlaedo kama ọ bụ mmadụ ndị ji ịhụnanya na-ejere ya ozi. (Ilu 27:11; 1 Ndị Kọrint 10:26) Ee, Jehova ji ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị nile na-efe ya ofufe n’ụzọ ọ na-anara nke ọma kpọrọ ihe. (Jọn 4:23, 24) Ndị a bụ “ihe a na-achọsi ike,” ha dịkwa nnọọ oké ọnụ ahịa nye Jehova karịa ọmarịcha ihe ndị e ji chọọ ụlọ nsọ Solomọn mma.

6. Nzube dị aṅaa ka ụlọ nsọ oge ochie nke Chineke, mezuru?

6 N’agbanyeghị mmegide na-agawanye n’ihu, a rụchara ụlọ nsọ ahụ na 515 T.O.A. Ruo n’oge àjà Jisọs, ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem nọgidere bụrụ ebe ofufe dị ọcha hiwere isi nye ọtụtụ “ihe a na-achọsi ike,” bụ́ nke ndị Juu anụ ahụ na ndị Jentaịl na-eso ụzọ ndị Juu, mejupụtara. Ma ụlọ nsọ ahụ nọchiri anya ihe dị nnọọ ebube karị, dị ka anyị gaje ịhụ.

Mmezu E Nwere na Narị Afọ Mbụ

7. (a) Gịnị ka ụlọ nsọ oge ochie nke Chineke dị na Jerusalem sere onyinyo ya? (b) Kọwaa ihe ndị onyeisi nchụàjà na-eme n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie.

7 Ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem sere onyinyo ndokwa ka ukwuu maka ofufe. Ọ bụ ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke, bụ́ nke Jehova guzobere na 29 O.A, na-enwe Jisọs dị ka Onyeisi Nchụàjà ya. (Ndị Hibru 5:4-10; 9:11, 12) Tụlee myirịta dị n’etiti ọrụ nke onyeisi nchụàjà nke Israel na ihe ndị Jisọs mere. Kwa afọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie, onyeisi nchụàjà na-eje n’ebe nchụàjà dị n’ogige ụlọ nsọ ahụ ma chụọ otu oké ehi n’àjà iji kpuchie mmehie nke ndị nchụàjà. E mesịa, ọ na-eji ọbara nke oké ehi ahụ banye n’ụlọ nsọ ahụ, gafee ibo ndị kewapụrụ ogige ụlọ nsọ ahụ site n’Ebe Nsọ ahụ ma gafezie ákwà mgbochi na-ekewapụ Ebe Nsọ ahụ pụọ n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile. Ozugbo ọ banyere n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile ahụ, onyeisi nchụàjà ahụ na-efesasị ọbara ahụ n’ihu igbe ọgbụgba ndụ. E mesịa, n’ịgbaso otu usoro ahụ, ọ na-achụ otu ewu n’àjà iji kpuchie mmehie nke ebo 12 nke Israel na-abụghị ndị nchụàjà. (Levitikọs 16:5-15) Olee njikọ ememe a na ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke nwere?

8. (a) N’echiche dị aṅaa ka a chụrụ Jisọs n’àjà malite na 29 O.A.? (b) Mmekọrịta dị aṅaa pụrụ iche dị n’etiti Jisọs na Jehova n’oge nile o jere ozi n’elu ala?

8 N’ụzọ yiri nke ahụ, a chụrụ Jisọs n’àjà n’elu ebe ịchụàjà nke uche Chineke mgbe e mere ya baptism, werekwa mmụọ nsọ Chineke tee ya mmanụ na 29 O.A. (Luk 3:21, 22) N’ezie, ihe omume a kara akara mmalite nke ụzọ ndụ nke ịchụ àjà nye Jisọs bụ́ nke were afọ atọ na ọkara. (Ndị Hibru 10:5-10) N’oge ahụ, mmekọrịta dị n’etiti Jisọs na Chineke bụ nke onye e ji ike mmụọ nsọ mụọ. Ndị mmadụ ọzọ apụghị ịghọtazu ọnọdụ a pụrụ iche Jisọs nwere n’ebe Nna ya nke eluigwe nọ. Ọ dị ka a ga-asị na e nwere ihe ngebichi nọchiri anya nke nghọta ha, dị nnọọ ka ihe ngebichi mere ka ndị nọ n’ogige ụlọikwuu ahụ ghara ịhụ Ebe Nsọ ahụ.—Ọpụpụ 40:28.

9. N’ihi gịnị ka Jisọs na-apụghị iji banye n’eluigwe dị ka mmadụ, oleekwa otú e si dozie ọnọdụ a?

9 N’agbanyeghị na ọ bụ Ọkpara Chineke e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, nwoke ahụ bụ́ Jisọs apụghị inweta ndụ n’eluigwe. N’ihi gịnị? N’ihi na anụ ahụ na ọbara apụghị iketa Alaeze eluigwe nke Chineke. (1 Ndị Kọrint 15:44, 50) Ebe ọ bụ na anụ ahụ Jisọs dị ka mmadụ bụ ihe mgbochi, ákwà mgbochi ahụ nke kewara Ebe Nsọ ahụ pụọ n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile n’ụlọ nsọ ochie nke Chineke sere onyinyo ya nke ọma. (Ndị Hibru 10:20) Ma ụbọchị atọ mgbe ọ nwụsịrị, Chineke mere ka Jisọs si n’ọnwụ bilie dị ka mmụọ. (1 Pita 3:18) Mgbe ahụ, ọ pụrụ ịbanye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile nke ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke—eluigwe n’onwe ya. Nke a bụkwa kpọmkwem ihe merenụ. Pọl na-ede, sị: “Kraịst abaghị n’ebe nsọ [ihe àmà na-egosi na ọ na-ezo aka n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile] e ji aka mee, bụ́ ihe atụ yiri ebe nke bụ́ ebe nsọ n’ezie; kama Ọ bara n’eluigwe onwe ya, igosi Onwe ya n’ihu Chineke n’ihi anyị ugbu a.”—Ndị Hibru 9:24.

10. Gịnị ka Jisọs mere mgbe ọ laghachiri n’eluigwe?

10 N’eluigwe, Jisọs ‘fesasịrị ọbara’ nke àjà ya site n’igosi Jehova uru nke ọbara ndụ ya bara n’ịgbapụta mmadụ. Ma, Jisọs mere ihe ọzọ. N’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya, ọ gwara ụmụazụ ya, sị: “Ana m aga idoziri unu ebe. Ọ bụrụkwa na Mụ agaa idoziri unu ebe, agaje m ịbịa ọzọ, M ga-anarakwa unu nye Onwe m; ka unu onwe unu wee nọọkwa ebe Mụ onwe m nọ.” (Jọn 14:2, 3) Ya mere, site n’ịbanye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile, ma ọ bụ n’eluigwe, Jisọs megheere ndị ọzọ ụzọ. (Ndị Hibru 6:19, 20) Ndị a, bụ́ ndị ọnụ ọgụgụ ha ga-adị 144,000, ga-eje ozi dị ka ndị nchụàjà nọ n’okpuru ná ndokwa ụlọ nsọ ime mmụọ nke Chineke. (Mkpughe 7:4; 14:1; 20:6) Dị nnọọ ka onyeisi nchụàjà nke Israel na-ebu ụzọ were ọbara oké ehi ahụ banye n’Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile iji kpuchie mmehie nke ndị nchụàjà, ndị nchụàjà 144,000 a nọ n’okpuru bu ụzọ nweta uru nke ọbara Jisọs wụsịrị. *

“Ihe A Na-achọsi Ike” nke Oge A

11. Ọ̀ bụ maka ole ndị ka onye nchụàjà nke Israel na-achụ otu ewu n’àjà, gịnịkwa ka nke a na-ese onyinyo ya?

11 O yiri ka mgbe ọ na-erule afọ 1935, a chịkọbatachara ndị nile e tere mmanụ. * Ma Jehova agọzichabeghị ụlọ ya. Ee e, “ihe a na-achọsi ike” ka ga-abata n’ime ya. Cheta na onyeisi nchụàjà ahụ nọ n’Israel chụrụ anụmanụ abụọ n’àjà—otu oké ehi maka mmehie nke ndị nchụàjà na otu ewu maka mmehie nke ebo ndị na-abụghị ndị nchụàjà. Ebe ọ bụ na ndị nchụàjà ahụ sere onyinyo ndị e tere mmanụ bụ́ ndị ha na Jisọs ga-anọ n’Alaeze eluigwe, ole ndị ka ebo ndị ahụ na-abụghị ndị nchụàjà na-anọchi anya ha? A na-achọta azịza ya n’okwu Jisọs e dekọrọ na Jọn 10:16: “Atụrụ ọzọ ka M nwekwara, ndị na-esiteghị n’ogige atụrụ nke a: aghaghị m idutekwa ndị ahụ, ha ga-anụkwa olu m; otu ìgwè atụrụ ga-adịkwa, otu Onye ọzụzụ atụrụ.” N’ihi ya, ọbara Jisọs wụsịrị na-abara ìgwè mmadụ abụọ uru—nke mbụ, ndị Kraịst ahụ olileanya ha bụ iso Jisọs chịa achị n’eluigwe nakwa nke abụọ, ndị ahụ na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs. Ihe àmà na-egosi na ọ bụ ìgwè nke abụọ a ka “ihe a na-achọsi ike” ahụ e buru n’amụma Hagaị na-ese onyinyo ya.—Maịka 4:1, 2; 1 Jọn 2:1, 2.

12. Olee otú e si adọta ọtụtụ “ihe a na-achọsi ike” n’ụlọ Chineke taa?

12 “Ihe a na-achọsi ike” ndị a ka na-ejupụta n’ụlọ Jehova. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, e wepụwo mmachibido iwu n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, n’akụkụ ụfọdụ nke Africa, na n’ala ndị ọzọ, na-eme ka e kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke n’ókèala ndị a na-akpabeghị aka ruo mgbe ahụ. Ka ihe a na-achọsi ike na-abata ná ndokwa ụlọ nsọ Chineke, ha onwe ha kwa na-agbalịsi ike imekwu ndị na-eso ụzọ, ná nrubeisi nye iwu Jisọs. (Matiu 28:19, 20) Ka ha na-eme otú ahụ, ha na-ezute ọtụtụ mmadụ, ma ndị na-eto eto ma ndị agadi, bụ́ ndị nwere ike ịghọ “ihe a na-achọsi ike” bụ́ ndị ga-eme ka ụlọ Jehova dị ebube. Tụlee nanị ihe atụ ole na ole nke otú nke a si ewere ọnọdụ.

13. Olee otú otu nwatakịrị nwanyị nọ na Bolivia siworo gosipụta ịnụ ọkụ n’obi ya maka ịgbasa ozi Alaeze ahụ?

13 Na Bolivia, otu nwatakịrị nwanyị dị afọ ise onye nne na nna ya bụ́ Ndịàmà na-azụlite, naara onye nkụzi ya ikike ịghara ịga akwụkwọ n’izu nleta nke onye nlekọta sekit. N’ihi gịnị? Ọ chọrọ ikere òkè n’ozi n’izu a dum nke ihe omume pụrụ iche. Nke a juru nne na nna ya anya, ma ha nwere obi ụtọ na o nwere àgwà ọma dị otú ahụ. Nwatakịrị nwanyị ahụ na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi ise ugbu a, ụfọdụ n’ime ndị a ọ na-amụrụ ihe na-abịakwa nzukọ ndị Kraịst. Ọ kpọtawo ọbụna onye nkụzi ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ikekwe ka oge na-aga, ụfọdụ n’ime ndị ọ na-amụrụ Bible ga-egosi onwe ha ịbụ “ihe a na-achọsi ike” bụ́ ndị ga-eme ka ụlọ Jehova dị ebube.

14. Na Korea, olee otú e si nyeghachi nnọgidesi ike n’ihe nke otu nwanna nwanyị n’ebe onye o yiri ka o nweghị mmasị nọ, ụgwọ ọrụ?

14 Ka ọ nọ na-echere n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, otu nwanyị bụ́ onye Kraịst nọ na Korea jekwuuru otu nwa akwụkwọ nke nọ na-ege egwú na redio ya a na-akwụnye ná ntị. “Ì nwere okpukpe ị na-ekpe?” ka ọ jụrụ. “Enweghị m mmasị n’okpukpe ọ bụla,” ka nwa akwụkwọ ahụ zaghachiri. Obi adaghị nwanna nwanyị ahụ mbà. “Ka oge na-aga,” ka ọ gara n’ihu ikwu, “mmadụ pụrụ ịchọ ịhọrọ okpukpe ọ ga na-ekpe. Ma ọ bụrụ na o nweghị ihe ọmụma ọ bụla banyere okpukpe, ọ pụrụ ịhọrọ nke na-ezighị ezi.” Mmeghachi omume nke nwa akwụkwọ ahụ gbanwere, o jikwa mmasị malite ige nwanna anyị nwanyị ahụ ntị. O nyefere ya akwụkwọ bụ́ Is There a Creator Who Cares About You? ma kwuo na akwụkwọ a ga-enyere ya aka nke ukwuu mgbe o ruru oge ọ ga-ahọrọ okpukpe. Ọ naara akwụkwọ ahụ n’egbughị oge. N’izu sochirinụ, ọ malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ugbu a kwa, ọ na-agazu nzukọ ọgbakọ.

15. Olee otú otu nwata nwanyị nọ na Japan si amalite ọmụmụ Bible, oleekwa otú e siworo nyeghachi mgbalị ya ụgwọ ọrụ?

15 Na Japan, Megumi nke dị afọ 12 weere ụlọ akwụkwọ ya dị ka ubi dị mma maka ime nkwusa na izi ihe. Ọbụna o nwewo ike ịmalite ọtụtụ ọmụmụ Bible. Olee otú Megumi si eme ya? Ebe ọ bụ na ọ na-agụ Bible ma ọ bụ na-akwadebe maka nzukọ n’oge nkwụsịtụ maka nri ehihie, ụmụ klas ya na-ajụkarị ya ihe ọ na-eme. Ụfọdụ na-ajụ Megumi ihe mere na ọ dịghị ekere òkè n’ihe omume ụfọdụ nke ụlọ akwụkwọ. Megumi na-aza ajụjụ ha ma na-agwa ha na Chineke nwere aha. Nke a na-akpalikarị mmasị nke ndị na-ege ya ntị. Mgbe ahụ ọ ga-atụ aro ka ha na ya na-amụ Bible. Megumi na-eduzi ọmụmụ ihe 20 ugbu a—18 n’ime ha bụ ndị ọ na-eduziri ụmụ klas ya.

16. Olee otú otu nwanna nwoke nọ na Cameroon si nwee ike ịmalitere ụfọdụ n’ime ndị so n’otu ìgwè na-akwa emo, ọmụmụ Bible?

16 Na Cameroon, otu ìgwè nke ndị ikom asatọ mejupụtara bụ́ ndị nọ na-arụ ọrụ n’otu ebe, kpọrọ otu nwanna nwoke nke nọ na-enyefe ndị na-agafe agafe akwụkwọ ndị dabeere na Bible. N’ịbụ ndị chọrọ ịkwa nwanna ahụ emo, ha jụrụ ya ihe mere na o kweghị n’Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, ma ọ bụ n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. N’iji Bible mee ihe, nwanna anyị nwoke zara ajụjụ ha. N’ihi ya, mmadụ atọ n’ime ndị ikom ahụ nakweere ọmụmụ Bible. Otu n’ime ha, bụ́ Daniel, malitere ịga nzukọ, ọbụnakwa o bibiri ihe onwunwe ya nile metụtara mgbaasị. (Mkpughe 21:8) N’ihe na-erughị otu afọ, e mere ya baptism.

17. Olee otú ụmụnna ụfọdụ nọ na El Salvador si jiri nkà mee ihe iji kwusaara otu nwoke na-achọbughị ịnụ ozi Alaeze ahụ, ozi ọma?

17 Na El Salvador, otu nwoke na-ekedo nkịta ya na-akpa ike n’ihu ọnụ ụzọ ya mgbe ọ bụla ọ hụrụ na Ndịàmà Jehova nọ nso. Nwoke ahụ ga-echere ka Ndịàmà ahụ gafee, e mesịa ọ ga-akpọbaghachi nkịta ahụ n’ụlọ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ụmụnna ahụ nwere ike ịgwa nwoke ahụ okwu. Ya mere otu ụbọchị ha kpebiri ịnwale ụzọ dị iche. Ebe ha maara na nwoke ahụ pụrụ ịnụ ihe ha na-ekwu, ha kpebiri ikwusara nkịta ahụ ozi ọma. Ha bịara n’ụlọ ahụ, kelee nkịta ahụ, ma kwuo na ha nwere obi ụtọ maka ohere ha nwere ịgwa ya okwu. Ha kwuru banyere mgbe a ga-enwe paradaịs n’ụwa, mgbe iwe na-agaghị ewe onye ọ bụla—ee, mgbe ọbụna ụmụ anụmanụ ga-adị n’udo. Ha jiri nkwanye ùgwù sị nkịta ahụ nọdụ nke ọma ma gawa nke ha. N’ụzọ juru ha nnọọ anya, nwoke ahụ si n’ụlọ ya pụta ma rịọ mgbaghara maka na ya enyetụbeghị Ndịàmà ahụ ohere ịgwa ya okwu. Ọ naara magazin ha nyere ya, a malitekwaara ya ọmụmụ Bible. Nwoke a bụ nwanna anyị nwoke ugbu a—otu n’ime “ihe a na-achọsi ike”!

“Atụla Egwu”

18. Ihe ịma aka ndị dị aṅaa ka ọtụtụ ndị Kraịst na-eche ihu, ma olee otú Jehova si ele ndị na-efe ya anya?

18 Ị̀ na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ ahụ dị mkpa? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ihe ùgwù n’ezie. N’ezie, ọ bụ site n’ọrụ a ka Jehova na-akpọbata “ihe a na-achọsi ike” n’ụlọ ya. (Jọn 6:44) N’eziokwu, n’oge ụfọdụ ị pụrụ inwetụ ike ọgwụgwụ ma ọ bụ nkụda mmụọ. Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị—ọbụna n’etiti ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi—na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị na-abaghị n’ihe. Ma adala mbà! Jehova na-ele onye nke ọ bụla n’ime ndị na-efe ya anya dị ka ihe a na-achọsi ike, o nwekwara mmasị dị ukwuu ná nzọpụta gị.—2 Pita 3:9.

19. Ihe mmesi obi ike dị aṅaa ka Jehova nyere site n’ọnụ Hagaị, oleekwa otú okwu ndị a pụrụ isi bụrụ ihe na-enye anyị ume?

19 Mgbe anyị nwere nkụda mmụọ, ma ọ bụ n’ihi mmegide ma ọ bụ n’ihi ọnọdụ ndị ọzọ na-adịghị mma, okwu Jehova gwara ndị Juu ahụ si mba ọzọ lọta pụrụ ịbụ ihe na-enye ume. Na Hagaị 2:4-6, anyị na-agụ, sị: “Ma ugbu a, dị ike, Zerubabel, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta); dị ike, Joshua, nwa Jehozadak, bụ́ onyeisi nchụàjà; dị ike, unu ndị nile nke ala nke a, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), rụọnụ ọrụ: n’ihi na Mụ onwe m nọnyeere unu, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova nke usuu nile nke ndị agha pụta), dị ka okwu ahụ si dị nke Mụ na unu gbara n’ọgbụgba ndụ mgbe unu siri n’Ijipt pụta, Mmụọ m na-eguzokwa n’etiti unu: unu atụla egwu. N’ihi na otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ọ fọdụrụ otu ugbo, nwa mgbe nta ka ọ bụ, Mụ onwe m gaje ime ka eluigwe na ụwa na oké osimiri na ala kpọrọ nkụ mee mkpatụ.” Rịba ama na ọ bụghị nanị na Jehova na-agba anyị ume ịdị ike kama ọ na-ezikwa anyị ụzọ anyị ga-esi nweta ume. N’ụzọ dị aṅaa? Rịba okwu ndị a na-emesi obi ike ama: “Mụ onwe m nọnyeere unu.” Lee ihe na-ewusi okwukwe ike ọ bụ ịghọta na n’agbanyeghị ihe mgbochi ọ bụla anyị na-eche ihu, Jehova nọnyeere anyị!—Ndị Rom 8:31.

20. N’ụzọ dị aṅaa ka ebube a na-enwetụbeghị ụdị ya si ejupụta n’ụlọ Jehova ugbu a?

20 N’ezie Jehova egosiwo na ọ nọnyeere ndị ya. N’ezie, ọ dị nnọọ dị ka o kwuru site n’ọnụ Hagaị, sị: “Ebube ikpeazụ nke ụlọ a ga-adị ukwuu karịa ebube mbụ . . . ọ bụkwa n’ebe a ka M ga-enye udo.” (Hagaị 2:9) N’eziokwu, ebube kasịnụ taa dị n’ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova. Leenụ, ọtụtụ narị puku ndị mmadụ na-enuga n’ezi ofufe kwa afọ. A na-enyeju ndị a afọ n’ụzọ ime mmụọ, ọbụnakwa n’ụwa a nọ n’oké ọgba aghara, ha na-enwe udo nke nanị ụdị ahụ a ga-enwe n’ụwa ọhụrụ Chineke ga-akarị.—Aịsaịa 9:6, 7; Luk 12:42.

21. Gịnị kwesịrị ịbụ mkpebi anyị?

21 Mkpatụ Jehova ga-eme ka mba nile mee n’Amegedọn dị nnọọ nso. (Mkpughe 16:14, 16) Ya mere ka anyị jiri oge fọdụrụnụ mee ihe iji nye aka ịzọpụtakwu ndụ. Ka anyị dị ike ma nwee ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ. Ka ọ bụrụ mkpebi anyị ịnọgide na-efe ofufe ná nnukwu ụlọ nsọ ime mmụọ ya, jirikwuo “ihe a na-achọsi ike” na-emejupụta ya ruo mgbe Jehova ga-asị na anyị arụzuwo ọrụ anyị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 Ihe e nyere n’onyinye maka owuwu nke ụlọ nsọ Solomọn ga-abụ ihe fọrọ nke nta ka o ruo ijeri dollar 40 n’ọnụ ahịa nke oge a. E tinyere ihe ọ bụla na-abanyeghị n’ọrụ ihe owuwu ahụ n’ebe ndebe akụ̀ nke ụlọ nsọ ahụ.—1 Ndị Eze 7:51.

^ par. 10 N’adịghị ka onyeisi nchụàjà nke Israel, Jisọs enweghị mmehie ọ bụla nke chọrọ mkpuchi. Otú ọ dị, ndị nchụàjà ibe ya nwere mmehie n’ihi na e si n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie gbata ha.—Mkpughe 5:9, 10.

^ par. 11 Lee Ụlọ Nche, February 15, 1998, peji nke 17-22.

Ị̀ Na-echeta?

Gịnị dị oké ọnụ ahịa nye Jehova karịa ihe onwunwe?

Olee ìgwè abụọ ndị ọbara Jisọs wụsịrị na-abara uru?

Ole ndị bụ “ihe a na-achọsi ike” bụ́ ndị ga-emejupụta ụlọ Jehova n’ebube?

Ihe àmà dị aṅaa ka anyị nwere na a na-emezu amụma Hagaị taa?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Ihe Osise dị na peeji nke 16]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ị̀ maara ihe ụlọ nsọ oge ochie nke Jehova na-anọchi anya ya?

Ebe Nsọ Kachasị Ebe Nsọ Nile

Ákwà Mgbochi

Ebe Nsọ

Ogige Dị n’Èzí

Ebe Ịchụàjà

Ogige

[Foto dị na peeji nke 17]

Onyeisi nchụàjà chụrụ otu oké ehi n’àjà maka mmehie ndị nchụàjà na otu ewu maka mmehie ebo Israel ndị na-abụghị ndị nchụàjà

[Foto dị na peeji nke 18]

Ọrụ nkwusa Alaeze ahụ a na-arụ n’ụwa nile na-akpọta ìgwè mmadụ n’ụlọ Jehova