Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Izi Ozi Nkasi Obi n’Itali

Izi Ozi Nkasi Obi n’Itali

Anyị Dị N’etiti Ndị Kwere Ekwe

Izi Ozi Nkasi Obi n’Itali

JEHOVA bụ “Chineke nke nkasi obi nile.” Site n’ịmụta iṅomi ya, ndị ohu ya ‘pụrụ ịkasi ndị ahụ obi, ndị nọ ná mkpagbu ọ bụla.’ (2 Ndị Kọrint 1:3, 4; Ndị Efesọs 5:1) Nke a bụ otu n’ime nzube ndị bụ́ isi nke ọrụ nkwusa ahụ Ndịàmà Jehova na-arụ.

Inyere Otu Nwanyị Nọ ná Mkpa Aka

Karịsịa, n’afọ ndị na-adịbeghị anya, ịda ogbenye, agha, na ọchịchọ nke ibi ndụ ka mma akwaliwo ọtụtụ ndị ịkwaga ná mba ndị bara ọgaranya karị. Ma ọ naghị adị mfe ikwekọ na gburugburu ebe obibi ọhụrụ. Manjola soro ndị Albania ibe ya biri na Borgomanero. Ebe ọ bụ na o bi n’Itali n’ụzọ iwu na-akwadoghị, obi akaghị ya isoro Wanda, onye bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova kwurịta okwu. Ka o sina dị, Wanda na Manjola mesịrị yie oge, Manjola gosiri oké mmasị n’ịmụ Okwu Chineke, ọ bụ ezie na ihe mgbochi nke asụsụ mere ka nke a sie ike. Otú ọ dị, mgbe Wanda mesịrị nleta ole na ole, ọ pụghịzi ịhụ onye ọ bụla n’ụlọ ahụ. Gịnị meworo? Wanda nụrụ na ndị nile bi n’ụlọ ahụ eriela mbọ mbọ n’ihi na a na-achọ otu n’ime ha—enyi nwoke Manjola—achọ n’ihi igbu mmadụ!

Ọnwa anọ mgbe e mesịrị, Wanda hụrụ Manjola ọzọ. “N’ịbụ onye ihu ya na-agbachapụghị agbachapụ na onye tara ahụ, o yiri onye ihe siiri nnọọ ike,” ka Wanda na-echeta. Manjola kọwara na onye bụbu enyi ya nwoke nọ n’ụlọ mkpọrọ nakwa na ndị enyi ya ya chigharịkwuuru maka enyemaka mechuru ya ihu n’ụzọ dị ilu. N’enweghịzi olileanya, o kpekuuru Chineke ekpere maka enyemaka. Mgbe ahụ, o chetara Wanda, bụ́ onye gwaworo ya okwu banyere Bible. Lee obi ụtọ Manjola nwere ịhụ ya ọzọ!

Ha maliteghachiri ọmụmụ Bible, n’oge na-adịghịkwa anya Manjola malitere ịga nzukọ ndị Kraịst. O nwere ihe ịga nke ọma n’inweta nkwado iwu ịnọgide n’Itali. Mgbe otu afọ gasịrị, Manjola ghọrọ Onyeàmà e mere baptism. N’ịbụ onye nkwa dị iche iche nke Chineke kasiri obi, ọ laghachiwo n’Albania iji soro ndị obodo ya kerịta ozi nkasi obi sitere na Bible.

Ịgba Àmà n’Ógbè nke Ndị Si Mba Ọzọ Kwabata

Ọtụtụ ọgbakọ dị n’Itali emewo ndokwa ịgbara ndị si mba ọzọ kwabata dị ka Manjola, àmà. Dị ka ihe atụ, otu ọgbakọ dị na Florence mere ndokwa iletachi otu ógbè nke ndị si mba ọzọ kwabata, anya. Ndị bi n’ógbè ahụ—ọtụtụ ndị si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, Masedonia, na Kosovo—nọ na-enwe ihe isi ike dị iche iche. Ụfọdụ nwere nsogbu ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ mmanya na-aba n’anya. Ọtụtụ ndị nwetara ihe ha ji bie ndụ site n’ime aka ntụtụ.

Ime nkwusa n’ógbè a bụ ihe ịma aka. Otú ọ dị, onye na-ezisa ozi ọma oge nile nke aha ya bụ́ Paola mesịrị kpọtụrụ Jaklina, bụ́ nwaada si Masedonia. Mgbe ha nwesịrị nkwurịta okwu ugboro ole na ole, Jaklina gbara enyi ya bụ́ Susanna ume inyocha Bible. N’aka nke ya, Susanna sooro ndị ikwu ya ndị ọzọ kwurịta okwu. N’oge na-adịghị anya, mmadụ ise n’ime ndị ezinụlọ ahụ nọ na-amụchi Bible anya, na-agachi nzukọ ndị Kraịst anya, na-etinyekwa ihe ha na-amụta n’ọrụ. N’agbanyeghị nsogbu ndị ha na-aghaghị iche ihu, ha nwetara nkasi obi site n’aka Jehova na Okwu ya.

Onye Nọn Anabata Nkasi Obi Sitere n’Aka Jehova

N’obodo bụ́ Formia, otu onye na-ezisa ozi ọma oge nile nke aha ya bụ Assunta gwara otu nwanyị ji ndọlị na-aga ije okwu. Nwanyị ahụ bụ onye nọn nke nọ n’otu òtù okpukpe na-enyere ndị ọrịa na ndị ahụ na-adịkwaghị ike aka ma n’ụlọ ọgwụ ma n’ebe obibi.

Assunta gwara nọn ahụ, sị: “Gị onwe gi kwa na-ata ahụhụ, ọ́ bụghị ya? N’ụzọ dị mwute, anyị nile nwere nsogbu ndị anyị ga-anagide.” Ka o kwuru nke ahụ, onye nọn ahụ malitere ibe ákwá ma kọwaa na ya nwere nsogbu ahụ ike dị njọ. Assunta gbara ya ume, na-ekwu na Chineke nke Bible pụrụ ịkasi ya obi. Onye nọn ahụ naara magazin ndị dabeere na Bible bụ́ ndị Assunta nyefere ya.

Ná nkwurịta okwu ha ọzọ, onye nọn ahụ, nke aha ya bụ Palmira, kwetara na ya na-ata ahụhụ nke ukwuu. Ruo ogologo oge o biwo n’ebe ndị nọn na-elekọta. Mgbe ọ na-aghaghị ịhapụ ebe ahụ nwa oge n’ihi ihe ndị metụtara ahụ ike, e kweghị ka ọ lọghachi. Ka o sina dị, Palmira nwere mmetụta nke ịbụ onye ji Chineke ụgwọ n’ihi nkwa ndị o kwere dị ka onye nọn. O chigharịkwuuru ndị na-agwọ ọrịa maka “ọgwụgwọ” ma ahụmahụ ahụ kpasasịrị ya uche. Palmira kwetara ịmụ Bible, ọ gakwara nzukọ ndị Kraịst ruo otu afọ. E mesịa, ọ kwagara n’ebe ọzọ, Onyeàmà ahụ amaghịkwa ebe ọ nọ. Afọ abụọ gafere tupu Assunta ahụ ya ọzọ. Palmira nwetara mmegide dị ukwuu site n’aka ndị ezinụlọ ya na ndị ụkọchukwu. Ka o sina dị, ọ maliteghachiri ọmụmụ Bible ya, nwee ọganihu ime mmụọ, e meekwa ya baptism dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova.

Ee, ozi nke ‘Chineke nke nkasi obi’ na-agba ọtụtụ ndị ume. (Ndị Rom 15:4, 5) N’ihi ya, Ndịàmà Jehova nọ n’Itali kpebisiri ike ịnọgide na-eṅomi Chineke site n’izi ndị ọzọ ozi nkasi obi ya dị ebube.