Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-echenụ Nche”

“Na-echenụ Nche”

“Na-echenụ Nche”

“Ya mere, na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.”—MATIU 24:42.

1. Olee mmetụta ndị ohu Jehova bụ́ ndị jeteworo ozi aka na-enwe banyere ọtụtụ afọ nke ije ozi ha raara nye? Hota otu ihe atụ.

ỌTỤTỤ ndị ohu Jehova bụ́ ndị jeteworo ozi aka natara eziokwu ahụ mgbe ha bụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa. Dị ka onye ahịa ahụ hụrụ pearl dị oké ọnụ ahịa wee ree ihe nile o nwere iji zụta ya, ndị mmụta Bible ahụ na-anụ ọkụ n’obi jụrụ onwe ha ma rara ndụ ha nye Jehova. (Matiu 13:45, 46; Mak 8:34) Olee otú obi dị ha ichere karịa otú ha pụrụ ịtụwo anya ya iji hụ mmezu nke nzube Chineke banyere ụwa? Ha adịghị akwa ụta ọ bụla! Ha kwenyeere Nwanna A. H. Macmillan, bụ́ onye, mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 60 nke ije ozi a raara nye Chineke gasịrị, kwuru, sị: “Ekpebisiwo m ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ijisi okwukwe m ike. O mewo ka ndụ m nwee isi. Ọ ka na-enyere m aka ilepụ anya n’ọdịnihu n’atụghị ụjọ.”

2. (a) Ndụmọdụ dị aṅaa bịara n’ezi oge ka Jisọs nyere ụmụazụ ya? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Gịnị banyere gị onwe gị? N’agbanyeghị afọ ndụ gị, tụlee okwu Jisọs bụ́: “Ya mere, na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” (Matiu 24:42) Okwu ahụ dị mfe bu eziokwu miri emi. Anyị amaghị ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa ime ihe e kpere n’ikpe megide ajọ usoro a, ọ dịghịkwa anyị mkpa ịma. Ma ọ dị anyị mkpa ibi ndụ n’ụzọ ọ ga-abụ na mgbe ọ ga-abịa, anyị agaghị akwa ụta ọ bụla. N’akụkụ a, olee ihe atụ ndị anyị na-ahụ na Bible ndị ga-enyere anyị aka ịnọ na-eche nche? Olee otú Jisọs si kọwaa mkpa a? Oleekwa ihe àmà anyị nwere taa nke na-egosi na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ nke ụwa a na-adịghị asọpụrụ Chineke?

Ihe Atụ Ịdọ Aka ná Ntị

3. Olee otú ọtụtụ ndị taa si yie ndị oge Noa?

3 N’ọtụtụ ụzọ, ndị mmadụ taa dị ka ndị ikom na ndị inyom dịrị ndụ n’oge Noa. N’oge ahụ, ime ihe ike jupụtara n’ụwa, nchepụta echiche nke obi mmadụ bụkwa “nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.” (Jenesis 6:5) Ihe ka ọtụtụ mikpuru onwe ha n’ihe omume ndị a na-eme kwa ụbọchị ná ndụ. Otú ọ dị, tupu Jehova eweta oké Iju Mmiri ahụ, o nyere ndị mmadụ ohere ichegharị. O nyere Noa ọrụ ime nkwusa, Noa rubekwara isi—na-eje ozi dị ka “onye na-ekwusa ezi omume” ikekwe ruo afọ 40 ma ọ bụ 50 ma ọ bụ karịa. (2 Pita 2:5) Otú ọ dị, ndị ahụ leghaara ozi ịdọ aka ná ntị Noa anya. Ha anọghị na-eche nche. Ya mere, n’ikpeazụ, nanị Noa na ezinụlọ ya lanarịrị mmezu nke ikpe Jehova.—Matiu 24:37-39.

4. N’echiche dị aṅaa ka a pụrụ ikwu na ozi Noa nwere ihe ịga nke ọma, oleekwa otú a pụrụ isi kwuo otu ihe ahụ banyere ọrụ nkwusa gị?

4 Ozi Noa ò nwere ihe ịga nke ọma? Enyela echiche gị dabere ná mmadụ ole na ole ahụ nabatara ya. N’ezie, nkwusa Noa mere mezuru nzube e ji mee ya n’agbanyeghị otú e si nabata ya. N’ihi gịnị? N’ihi na o nyere ndị mmadụ ohere zuru ezu ịhọrọ ma hà ga-ejere Jehova ozi ma ọ bụ na ha agaghị ejere ya. Gịnị banyere ókèala ị na-eme nkwusa na ya? Ọ bụrụgodị na ị na-ahụ obere mmeghachi omume dị mma, ị na-enwe ihe ịga nke ọma dị ukwuu. N’ihi gịnị? N’ihi na site n’ime nkwusa, ị na-ekwupụta ịdọ aka ná ntị Chineke, i sikwa otú ahụ arụzu ọrụ ahụ Jisọs nyere ụmụazụ ya ịrụ.—Matiu 24:14; 28:19, 20.

Ileghara Ndị Amụma Chineke Anya

5. (a) Ọnọdụ ndị dị aṅaa jupụtara na Juda n’oge Habakuk, oleekwa otú ndị ahụ si meghachi omume n’ebe ozi amụma ya dị? (b) Olee otú ndị Juda si busoo ndị amụma Jehova iro?

5 Ọtụtụ narị afọ mgbe Iju Mmiri ahụ gasịrị, alaeze Juda chere ọnọdụ siri ike ihu. Ikpere arụsị, ikpe na-ezighị ezi, mmegbu, na ọbụna igbu ọchụ jupụtara ebe nile. Jehova mere ka Habakuk bilie iji dọọ ndị ahụ aka ná ntị na ọ bụrụ na ha echegharịghị, ọdachi ga-abịakwasị ha site n’aka ndị Kaldea, ma ọ bụ ndị Babilọn. (Habakuk 1:5-7) Ma ndị ahụ jụrụ ige ntị. Ikekwe ha chere, sị, ‘Leenụ, ihe karịrị otu narị afọ gara aga, Aịsaịa onye amụma kwupụtara ịdọ aka ná ntị yiri nke ahụ, ma ọ dịbeghị ihe merenụ!’ (Aịsaịa 39:6, 7) Ọ bụghị nanị na ọtụtụ n’ime ndị ọchịchị nke Juda ejighị ozi ahụ kpọrọ ihe kamakwa ha busoro ndị na-ezi ya iro. N’otu oge, ha nwara igbu Jeremaịa onye amụma, ha gakwaara igbu ya ma a sị na Ahaịkam emeghị ihe. N’ịbụ onye ozi amụma ọzọ were iwe, eze Jehoiakim mere ka e gbuo Urai[j]a onye amụma.—Jeremaịa 26:21-24.

6. Olee otú Jehova si wusie Habakuk ike?

6 Ozi Habakuk bụkwa nke e ji obi ike zie, bụrụkwa nke e lere anya ọjọọ dị ka nke Jeremaịa, bụ́ onye e ji ike mmụọ nsọ Chineke kpalie ibu amụma banyere ịtọgbọrọ n’efu Juda bụ́ nke ga-adịru afọ 70. (Jeremaịa 25:8-11) Ya mere, anyị pụrụ ịghọta obi erughị ala Habakuk nwere ka ọ na-eti mkpu, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-etiku Gị, ma Ị dịghị anụ? m na-etiku Gị mkpu, sị, Ihe ike! ma Ị dịghị azọpụta.” (Habakuk 1:2) Jehova ji amara were okwu ndị a na-ewusi okwukwe ike zaghachi Habakuk: “Ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakuk 2:3) Ya mere Jehova nwere “mgbe a kara aka” maka iweta ikpe na-ezighị ezi na mmegbu ná njedebe. O yie ka a na-egbu oge, Habakuk agaghị enwe nkụda mmụọ, ọ gaghịkwa akụda aka. Kama nke ahụ, ọ ‘ga-echere,’ na-eji echiche nke ịdị ngwa na-adị ndụ kwa ụbọchị. Ụbọchị Jehova agaghị anọ ọdụ!

7. N’ihi gịnị ka e ji kaa Jerusalem akara maka mbibi ọzọ na narị afọ mbụ O.A.?

7 N’ihe dị ka afọ 20 mgbe Jehova gwasịrị Habakuk okwu, e bibiri isi obodo Juda, bụ́ Jerusalem. Mgbe e mesịrị, e wughachiri ya, e dozikwara ọtụtụ n’ime ihe na-ezighị ezi bụ́ ndị wetaara nnọọ Habakuk ahụ erughị ala. Otú ọ dị, na narị afọ mbụ O.A., a kakwara obodo ahụ akara ọzọ maka mbibi n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi nke ndị bi na ya. N’ụzọ obi ebere, Jehova mere ndokwa maka ndị obi ha ziri ezi ịlanarị. N’oge a, o ji onye amụma kasịnụ bụ́ Jisọs Kraịst mee ihe izi ozi ahụ. Na 33 O.A., Jisọs gwara ụmụazụ ya, sị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso. Mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu.”—Luk 21:20, 21.

8. (a) Gịnị pụrụ imewo ụfọdụ ndị Kraịst ka oge na-agafe mgbe Jisọs nwụsịrị? (b) Olee otú e si mezuo okwu amụma Jisọs banyere Jerusalem?

8 Ka ọtụtụ afọ na-agafe, ụfọdụ ndị Kraịst nọ na Jerusalem pụrụ icheworị echiche mgbe amụma Jisọs ga-emezu kpọmkwem. E kwuwerị, leenụ àjà ndị obi abụọ na-adịghị ya na ụfọdụ n’ime ha chụworo. Ikekwe ha ajụwo achụmnta ego ndị na-adọrọ adọrọ n’ihi mkpebi ha ịnọ na-eche nche. Ka oge na-aga, ike ọ̀ gwụrụ ha? Hà kwubiri na ha na-egbu oge ha, na-eche na okwu Jisọs metụtara ọgbọ na-abịa n’ihu, ọ bụghị nke ha? Na 66 O.A., a malitere imezu amụma Jisọs mgbe usuu ndị agha Rom gbara Jerusalem gburugburu. Ndị nọ na-eche nche ghọtara ihe àmà ahụ, si n’obodo ahụ gbapụ, e chebekwara ha pụọ n’inweta mbibi nke Jerusalem.

Inye Ihe Atụ Banyere Mkpa Ọ Dị Ịnọ Na-eche Nche

9, 10. (a) Olee otú ị ga-esi achịkọta ilu Jisọs banyere ndị ohu bụ́ ndị cheere nna ha ukwu ka o si n’oriri ọlụlụ nwunye ya lọta? (b) N’ihi gịnị ka ichere nna ha ukwu pụrụ ijiwo bụrụ ihe siiri ndị ohu ahụ ike? (ch) N’ihi gịnị ka o ji baa uru ka ndị ohu ahụ nwee ndidi?

9 N’imesi mkpa ọ dị ịnọ na-eche nche ike, Jisọs ji ndị na-eso ụzọ ya tụnyere ndị ohu na-eche nna ha ukwu ka o si n’oriri ọlụlụ nwunye ya lọta. Ha maara abalị nke ọ ga-alọta kpọmkwem—ma olee oge awa ọ ga-abụ? Ọ̀ bụ n’oge nche mbụ nke abalị? Nke abụọ? Nke atọ? Ha amaghị. Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na [nna ukwu ahụ] ga-abịa na nche nke abụọ, ọ bụrụkwa na nke atọ, hụkwa ha otú a [ka ha na-eche nche], ngọzi na-adịrị ndị ohu ahụ.” (Luk 12:35-38) Cheedị banyere atụmanya ndị ohu a. Ụda ọ bụla, onyinyo ọ bụla ga-akpali atụmanya ha n’ezie: ‘Ọ̀ pụrụ ịbụ nna anyị ukwu?’

10 Gịnị ma nna ha ukwu lọta n’oge nche nke abụọ nke abalị, bụ́ nke na-amalite n’ihe dị ka elekere itoolu ruo n’etiti abalị? Ndị ohu ahụ nile, gụnyere ndị rụsiworo ọrụ ike kemgbe isi ụtụtụ, hà ga-adị njikere ịnabata ya, ka ụfọdụ hà ga-anọ n’ụra? Gịnị ma ọ bụrụ na nna ukwu ahụ alọta n’oge nche nke atọ nke abalị—site n’etiti abalị ruo n’ihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ? Ụfọdụ n’ime ndị ohu ahụ hà ga-enwewo nkụda mmụọ, ọbụna wewa iwe n’ihi ọdụ o yiri ka nna ha ukwu ọ̀ na-anọ? * Ọ bụ nanị ndị a hụrụ ka ha na-eche nche mgbe nna ha ukwu lọrutere ka a ga-akpọ ndị ngọzi dịịrị. N’ezie, okwu nke Ilu 13:12 ga-emetụta ha: “Nchere a na-echere ogologo mgbe dị anya na-eme ka obi na-arịa ọrịa: ma osisi nke na-enye ndụ ka ihe a na-achọsi ike bụ, mgbe ọ bịaruworo.”

11. Olee otú ekpere pụrụ isi nyere anyị aka ịnọ na-eche nche?

11 Mgbe o yiri ka a na-egbu oge, gịnị ga-enyere ụmụazụ Jisọs aka ịnọ na-eche nche? Mgbe ha nọ n’ogige Getsemane obere oge tupu e jide ya, Jisọs gwara mmadụ atọ n’ime ndị ozi ya, sị: “Na-echenụ nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka unu wee ghara ịba n’ọnwụnwa.” (Matiu 26:41) Ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, Pita, bụ́ onye nọ ya n’oge ahụ, nyere ndị Kraịst ibe ya ndụmọdụ yiri nke ahụ. O dere, sị: “Ọgwụgwụ ihe nile dị nso: ya mere nweenụ uche zuru okè, nweekwanụ anya udo ka unu wee kpee ekpere.” (1 Pita 4:7) N’ụzọ doro anya, ikpesi ekpere ike kwesịrị ịbụ akụkụ nke ihe anyị na-eme mgbe dum dị ka ndị Kraịst. N’ezie, ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ịnọ na-eche nche.—Ndị Rom 12:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:17.

12. Gịnị bụ ihe dị iche n’etiti ịkọ nkọ na ịnọ na-eche nche?

12 Rịba ama na Pita kwukwara, sị: “Ọgwụgwụ ihe nile dị nso.” Ruo ókè hà aṅaa ka ọ dịruru nso? Ọ dịghị ụzọ ndị mmadụ ga-esi mara ụbọchị ma ọ bụ awa ahụ kpọmkwem. (Matiu 24:36) Ma e nwere ihe dị iche n’ịdị na-akọ nkọ, bụ́ nke Bible na-akwadoghị, na ichere mgbe ọgwụgwụ, bụ́ nke ọ kwadoro. (Tụlee 2 Timoti 4:3, 4; Taịtọs 3:9.) Olee otu ụzọ anyị pụrụ isi chere mgbe ọgwụgwụ? Ọ bụ site n’ịrịba ihe àmà ahụ na-egosi na ọgwụgwụ dị nso ama nke ọma. Ya mere ka anyị tụleghachi usoro ihe àmà isii ndị na-egosi na anyị na-ebi na mgbe ọgwụgwụ nke ụwa a na-adịghị asọpụrụ Chineke.

Usoro Ihe Àmà Isii Ndị Na-emesi Obi Ike

13. Olee otú amụma Pọl e dekọrọ na 2 Timoti isi nke 3 si eme ka i kwenyesie ike na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ”?

13 Nke mbụ, anyị na-ahụ n’ụzọ doro anya mmezu nke amụma Pọl onyeozi banyere “mgbe ikpeazụ.” Pọl dere, sị: “Ma mara nke a, na oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya: gị gbakụtakwa ndị a azụ. Ma ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ, na-eduhie ndị ọzọ, a na-eduhiekwa ha.” (2 Timoti 3:1-5, 13) Ọ̀ bụ na anyị adịghị ahụ ka a na-emezu amụma a n’oge anyị? Ọ bụ nanị ndị na-eleghara eziokwu anya pụrụ ịgọnahụ ya! *

14. Olee otú ihe Mkpughe 12:9 kwuru banyere Ekwensu si emezu taa, gịnịkwa ga-eme ya n’oge na-adịghị anya?

14 Nke abụọ, anyị na-ahụ mmetụta nke nchụpụ a chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe, ná mmezu nke Mkpughe 12:9. Anyị na-agụ n’ebe ahụ, sị: “E wee chụda dragọn ukwu ahụ, bụ́ agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi; a chụdara ya n’ụwa, chụdaakwa ndị mmụọ ozi ya, ha na ya.” Nke a arụpụtaworo ụwa oké ahụhụ. N’ezie, ihe a kpọrọ mmadụ enwewo ahụhụ dị ukwuu, karịsịa kemgbe 1914. Ma amụma ahụ dị ná Mkpughe na-agbakwụnye na mgbe a chụdara Ekwensu n’ụwa, ọ matara na “o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:12) N’oge a, Setan na-ebuso ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ agha. (Mkpughe 12:17) N’ezie anyị ahụwo mmetụta nke mwakpo ya n’oge anyị. * Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, a ga-akpọchi Setan n’abyss ka “o wee ghara iduhie mba nile ọzọ.”—Mkpughe 20:1-3.

15. Olee otú Mkpughe 17:9-11 si enye ihe àmà na anyị na-ebi na mgbe ọgwụgwụ?

15 Nke atọ, anyị na-ebi n’oge nke “eze” nke asatọ nakwa nke ikpeazụ ahụ a kpọtụrụ aha n’amụma ahụ e dekọrọ ná Mkpughe 17:9-11. N’ebe a Jọn onyeozi na-akpọtụ uche n’ebe ndị eze asaa nọ, bụ́ ndị na-anọchi anya ike ọchịchị ụwa asaa—Ijipt, Asiria, Babilọn, Medo-Peasia, Gris, Rom, na ike ọchịchị ụwa Anglo-America bụ́ nke mba abụọ mejupụtara. Ọ na-ahụkwa ‘eze nke asatọ’ nke “sikwa n’asaa ahụ pụta.” Eze nke asatọ a—nke ikpeazụ Jọn hụrụ n’ọhụụ—na-anọchizi anya Mba Ndị Dị n’Otu. Jọn na-ekwu na eze nke asatọ a “na-alakwa n’iyi,” ọ dịghịkwa eze ụwa ọzọ a kpọtụrụ aha mgbe nke ahụ gasịrị. *

16. Olee otú ihe ndị bụ́ eziokwu ná mmezu nke onyinyo ahụ Nebukadneza rọrọ ná nrọ si egosi na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ?

16 Nke anọ, anyị na-ebi n’oge nke ụkwụ nke onyinyo ahụ Nebukadneza rọrọ ná nrọ nọchiri anya ya. Daniel onye amụma kọrọ isi nrọ a dị omimi banyere otu nnukwute onyinyo a kpụrụ n’ụdị mmadụ. (Daniel 2:36-43) Akụkụ anọ bụ́ ígwè nke onyinyo ahụ na-anọchite anya ike ọchịchị ụwa dị iche iche, na-amalite n’isi ya (Alaeze Ukwu Babilọn) ma gbadaa ruo n’ụkwụ na mkpịsị ụkwụ ya (ọchịchị ndị na-achị taa). Ike ọchịchị ụwa ahụ nile e sere onyinyo ha n’onyinyo ahụ apụtawo. Anyị na-ebi n’oge nke ụkwụ onyinyo ahụ sere onyinyo ya. E kwughị banyere ike ọchịchị ndị ọzọ ga-abịanụ. *

17. Olee otú ọrụ nkwusa Alaeze anyị si enyekwu ihe àmà na anyị na-ebi na mgbe ọgwụgwụ?

17 Nke ise, anyị na-ahụ ka a na-arụzu ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ, bụ́ nke Jisọs sịrị ga-ewere ọnọdụ kpọmkwem tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe a. Jisọs kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Taa, amụma ahụ na-emezu n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-enwetụbeghị ụdị ya. N’eziokwu, a ka nwere ókèala ndị a na-akpabeghị aka, ọ pụkwara ịbụ na n’oge Jehova kara aka, nnukwu ọnụ ụzọ na-eduga n’ọrụ ka ukwuu ga-emeghe. (1 Ndị Kọrint 16:9) Otú o sina dị, Bible adịghị ekwu na Jehova ga-echere ruo mgbe a gbaara onye ọ bụla nọ n’ụwa àmà. Kama nke ahụ, a ghaghị ikwusa ozi ọma ahụ ruo otú ọ dị Jehova mma. Mgbe ahụ ọgwụgwụ ihe nile ga-eru.—Tụlee Matiu 10:23.

18. Dị ka ihe àmà na-egosi, gịnị ga-abụ eziokwu banyere ụfọdụ n’ime ndị e tere mmanụ mgbe mkpagbu ukwu ahụ ga-amalite, oleekwa otú a pụrụ isi chọpụta nke a?

18 Nke isii, ọnụ ọgụgụ nke ezigbo ndị e tere mmanụ na-eso ụzọ Kraịst na-ebelata ebelata, ọ bụ ezie na ihe àmà na-egosi na ụfọdụ ha ka ga-anọ n’ụwa mgbe mkpagbu ukwu ahụ ga-amalite. Ihe ka ọtụtụ n’ime ihe ahụ fọdụrụnụ emeela nnọọ agadi, ọnụ ọgụgụ nke ndị e tere mmanụ n’ezie anọwokwa na-ebelata ka afọ na-agafe. Ma, n’izo aka ná mkpagbu ukwu ahụ, Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na e meghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.” (Matiu 24:21, 22) Mgbe ahụ, ihe àmà na-egosi na ụfọdụ n’ime “ndị [Kraịst] họpụtara” ka ga-anọ n’ụwa mgbe mkpagbu ukwu ahụ ga-amalite. *

Gịnị Dị n’Ihu?

19, 20. N’ihi gịnị ka o ji dị ngwa ugbu a karịa ka ọ dịtụworo mgbe ọ bụla nye anyị ịmụrụ anya ma na-eche nche?

19 Gịnị ka ọdịnihu ga-abụrụ anyị? Oge ndị mara mma ka ga-abịa. Pọl dọrọ aka ná ntị na “dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke Onyenwe anyị na-abịa.” N’izo aka n’ebe mmadụ ndị na-eyi ka ha wara anya n’ụzọ nke ụwa nọ, o kwuru, sị: “Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha.” N’ihi ya, Pọl gbara ndị na-agụ akwụkwọ ya ume, sị: “Ka anyị ghara ịrahụ ụra, dị ka ndị fọdụrụ, kama ka anyị na-eche nche nweekwa anya udo.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3, 6) N’eziokwu, ndị na-elegara ụlọ ọrụ mmadụ anya iweta udo na ịnọ ná nchebe na-eleghara ihe ndị na-eme eme anya. Ndị dị otú ahụ nọ n’oké ụra!

20 Mbibi nke usoro ihe a ga-abịa na mberede n’ụzọ dị ịrịba ama. Ya mere, chere ụbọchị Jehova. Chineke n’onwe ya gwara Habakuk, sị: “Ọ gaghị anọ ọdụ”! N’ezie, ọ dịtụbeghị ngwa otú ọ dị ugbu a nye anyị ịnọ na-eche nche.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 10 Nna ukwu ahụ na ndị ohu ya eyighị àgbà ọ bụla. N’ihi ya, ọ dịghị ya mkpa ịkọrọ ndị ohu ya mbata na ọpụpụ ya nile, iwu ejighịkwa ya ịkọwara ndị ohu ya ihe mere o ji yie ka ọ nọrọ ọdụ.

^ par. 13 Iji nweta nkọwa zuru ezu nke amụma a, lee isi nke 11 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

^ par. 14 Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee peji nke 180-186 nke akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

^ par. 15 Lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, peji nke 251-254.

^ par. 16 Lee isi nke anọ nke akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

^ par. 18 N’ilu atụrụ na ụmụ ewu ahụ, Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube ya n’oge mkpagbu ukwu ahụ ma nọdụ ala ikpe ikpe. Ọ ga-ekpe ndị mmadụ ikpe ná ndabere nke ma hà kwadoro ụmụnna Kraịst e tere mmanụ. Iji ụkpụrụ a kpee ikpe agaghị enwe isi ma ọ bụrụ na n’oge a ga-ekpe ikpe ahụ, ụmụnna Kraịst nile anwụchapụlarị n’ụwa.—Matthew 25:31-46.

Ị̀ Na-echeta?

Ihe nlereanya ndị dị aṅaa dabeere n’Akwụkwọ Nsọ pụrụ inyere anyị aka ịnọ na-eche nche?

Olee otú Jisọs si nye ihe atụ banyere mkpa ọ dị ịnọ na-eche nche?

Usoro ihe àmà isii ndị dị aṅaa na-egosi na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 9]

A. H. Macmillan jeere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ iri isii

[Foto dị na peeji nke 10]

Jisọs ji ụmụazụ ya tụnyere ndị ohu bụ́ ndị nọ na-eche nche