Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Amụma nke Chineke Na-enye Olileanya Maka Ọdịnihu

Okwu Amụma nke Chineke Na-enye Olileanya Maka Ọdịnihu

Okwu Amụma nke Chineke Na-enye Olileanya Maka Ọdịnihu

N’IHI Okwu Chineke, bụ́ Bible Nsọ, ezi ndị Kraịst na-eji okwukwe, olileanya, na nchekwube ele ọdịnihu anya. N’ịbụ ndị nwere nchebe ná mmekọrịta ha na Jehova Chineke, ha na-atụ anya ọdịnihu. Dị ka okwu mmeghe ná Mgbakọ Distrikti “Okwu Amụma nke Chineke” si kọwaa, Ndịàmà Jehova abụwo ndị ji ịdị uchu na-amụ amụma Bible eri ọtụtụ afọ. Ya mere, gịnị ka Jehova nwere inye ndị ya ná mgbakọ ndị a? N’ịbụ ndị kpa Bible n’aka, ọ dị ndị nile gere ntị ọkụ n’obi ịchọpụta. E depụtara isiokwu maka ụbọchị nke ọ bụla nke mgbakọ ahụ dị ka isiokwu nta nọọrọ onwe ya.

ỤBỌCHỊ MBỤ: Ije Ije n’Ìhè nke Okwu Chineke

Okwu bụ́ “Okwu Chineke Eduwo Anyị,” kọwara na ndị Jehova yiri nwoke malitere njem n’ọchịchịrị nke abalị. Ka chi na-abọtụ, ọ na-ahụ inyoghi inyoghi, ma mgbe chi bọchara, ọ na-ahụ ụzọ nke ọma. Dị ka e buru ya n’amụma n’Ilu 4:18, ndị Jehova ahụziela ụzọ ha site n’ìhè anyanwụ na-etisi ike nke eziokwu sitere n’okwu amụma nke Chineke. A hapụghị ha ka ha na-adagharị n’ọchịchịrị ime mmụọ.

Okwu bụ́ isi bụ́, “Ṅaa Ntị n’Okwu Amụma Chineke,” chetaara ndị na-ege ntị na a na-echebe ndị na-elegara Jehova anya pụọ ná mmechu ihu na ná ndakpọ olileanya nke ndị na-agbaso ndị mesaịa ụgha na ndị amụma ụgha na-enweta. N’ụzọ dị nnọọ iche, e nwere ihe àmà dị ukwuu na-egosi iru eru nke ezi Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst! Dị ka ihe atụ, nnwogha Jisọs nwoghara n’ụzọ ọrụ ebube mere ka a mata ya dị ka Eze e mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze nke Alaeze Chineke. Kemgbe o nwetara ike Alaeze na 1914, Jisọs bụkwa “kpakpando chi ọbụbọ” ahụ a kpọrọ aha na 2 Pita 1:19. “Dị ka Kpakpando Chi Ọbụbọ bụ́ Mesaịa, ọ ga-apụta tupu ụbọchị, ma ọ bụ oge ọhụrụ, nke ga-abọrọ ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi,” ka ọkà okwu ahụ kwuru.

N’ịmalite usoro ihe omume nke ehihie, okwu bụ́ “Inwu Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè,” kọwara Ndị Efesọs 5:8 n’ụzọ sara mbara, bụ́ ebe Pọl onyeozi na-adụ anyị ọdụ ‘ijegharị dị ka ụmụ nke ìhè.’ Ndị Kraịst bụ ndị na-enye ìhè, ọ bụghị nanị site n’iso ndị ọzọ na-ekerịta Okwu Chineke kamakwa site n’itinye Bible n’ọrụ ná ndụ ha dị ka Jisọs mere.

Iji bụrụ ndị na-enye ìhè dị otú a, anyị aghaghị ime “Ka Ịgụ Okwu Chineke Na-atọ [Anyị] Ụtọ.” E wulitere isiokwu a n’usoro isiokwu nwere akụkụ atọ. Mgbe o hotasịrị Abraham Lincoln, bụ́ onye kpọrọ Bible “onyinye kasị mma Chineke nyeworo mmadụ,” ọkà okwu mbụ jụrụ ndị na-ege ntị ihe àgwà ịgụ ihe ha kpughere banyere otú ekele ha nwere maka Okwu Jehova haruru. A gbara ndị na-ege ntị ume iji nlezianya na-agụ Bible, na-ewepụta oge iji anya nke uche ha hụ ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ na ijikọta isi ihe ọhụrụ na ihe ndị ha mabu.

Akụkụ sochirinụ n’usoro isiokwu ahụ mesiri ike mkpa ọmụmụ ihe, ọ bụghị ọgụgụ ihe nkịtị, dị ma ọ bụrụ na anyị gaje iloda “nri siri ike.” (Ndị Hibru 5:13, 14) Ọmụmụ ihe na-ewuli elu karịsịa, ka ọkà okwu ahụ kwuru, ma ọ bụrụ na anyị na-ebu ụzọ ‘edozi obi anyị,’ dị ka onye nchụàjà Israel bụ́ Ezra mere. (Ezra 7:10) Ma n’ihi gịnị ka ọmụmụ ihe ji dị nnọọ mkpa? Ọ bụ n’ihi na o nwere kpọmkwem ihe jikọtara ya na mmekọrịta anyị na Jehova. N’ihi ya, ọmụmụ Bible kwesịrị ịbụ ihe dị oké ọnụ ahịa, ihe na-atọ ụtọ, na ihe na-enye ume ọhụrụ, ọ bụ ezie na ọ na-agụnye ọzụzụ nke uche na itinye mgbalị. Olee otú anyị si ewepụtara ọmụmụ ihe bara uru oge? Ọ bụ site n’isi n’ihe omume ndị na-adịchaghị mkpa ‘na-azụchapụta oge,’ ka ọkà okwu ikpeazụ nke usoro isiokwu ahụ kwuru. (Ndị Efesọs 5:16) Ee, isi ihe na-eduga n’iwepụta oge bụ iji oge anyị nwere na-eme ihe n’ụzọ kasị mma.

Okwu bụ́ “Chineke Na-enye Onye Ike Gwụrụ Ume” kwetara na ike gwụrụ ọtụtụ ndị n’ụbọchị ndị a. Ka anyị wee nwee ike inweta “ọkịka nke ike” maka ozi ndị Kraịst, ọ dị anyị mkpa ịdabere n’ebe Jehova, bụ́ “Onye na-enye onye dara mbà ike,” nọ. (2 Ndị Kọrint 4:7; Aịsaịa 40:29) Ihe enyemaka na-ewusi ike na-agụnye Okwu Chineke, ekpere, ọgbakọ ndị Kraịst, ikere òkè n’ozi mgbe nile, ndị Kraịst bụ́ ndị nlekọta, na ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi nke ndị ọzọ. Isiokwu bụ́ “Bụrụnụ Ndị Ozizi n’Ihi Oge,” mere ka mkpa ọ dị ndị Kraịst ịbụ ndị ozizi nakwa ndị nkwusa na ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ iji zụlite “nkà izi ihe,” pụta ìhè.—2 Timoti 4:2, NW.

Okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ bụ́, “Ndị Na-alụso Chineke Ọ̇gụ Agaghị Enwe Ihe Ịga nke Ọma,” hotara mgbalị ndị na-eduhie eduhie e mere n’ala ụfọdụ n’oge na-adịbeghị anya iji mee ka a na-ele Ndịàmà Jehova anya dị ka òtù nzuzo dị ize ndụ. Ma ọ dịghị anyị mkpa ịtụ egwu, n’ihi na Aịsaịa 54:17 na-ekwu, sị: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma: ọzọ, ire ọ bụla nke ga-ebili imegide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe. Nke a bụ ihe nketa nke ndị ohu Jehova, ezi omume ha na-esite na m: ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.”

ỤBỌCHỊ NKE ABỤỌ: Ihe Ndị E Mere Ka A Mara Site n’Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Bụ́ Amụma

Mgbe a tụlesịrị ihe mmụta dịịrị ụbọchị ahụ, ndị ahụ gbakọtaranụ nụrụ ụtọ usoro isiokwu nke abụọ nke mgbakọ ahụ, nke isiokwu ya bụ “Inye Jehova Otuto Dị Ka Ndị Na-enye Ìhè.” Okwu nke mbụ gosipụtara na ihe mgbaru ọsọ onye Kraịst bụ inye Jehova otuto site n’ime nkwusa n’ebe ọ bụla. Akụkụ sochirinụ kwuru banyere mkpa ọ dị idute ndị ṅara ntị ná nzukọ Chineke. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’iwepụta minit ise ma ọ bụ iri tupu ma ọ bụ mgbe ọmụmụ Bible ebe obibi nke ọ bụla gasịrị iji gosi otú nzukọ Chineke si arụ ọrụ. Okwu nke atọ nke usoro isiokwu a mesiri ike mkpa ọ dị inye Chineke otuto site n’ọrụ ọma.

Okwu bụ́ “Hụ Ihe Ncheta Jehova n’Anya nke Ukwuu,” tụlere amaokwu ndị e si n’Abụ Ọma nke 119 họta. N’ezie, ihe ncheta dị anyị mkpa, n’ihi na anyị nile na-echezọkarị ihe. Mgbe ahụ, lee ka o si dị mkpa ka anyị zụlite ịhụnanya maka ihe ncheta Jehova, dị nnọọ ka ọbụ abụ ahụ mere.

Ihe sochizirinụ bụ isiokwu pụrụ iche—okwu baptism nke isiokwu ya bụ “Ịṅa Ntị n’Okwu Amụma ahụ Na-eduje na Baptism.” E chetaara ndị a na-aga ime baptism na ha na-eṅomi Kraịst ọ bụghị nanị site n’ịbụ ndị e mere baptism kamakwa site n’iso ijeụkwụ ya nile. (1 Pita 2:21) Lee ihe ùgwù ndị ọhụrụ a nwere ikere òkè ná mmezu nke Jọn 10:16, bụ́ ebe Jisọs buru n’amụma na ya ga-achịkọta “atụrụ ọzọ” iso ndị na-eso ụzọ ya e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na-eje ozi ụkwụ na ụkwụ!

N’ịmalite usoro ihe omume nke ehihie, okwu bụ́ “Nụrụ Ihe Mmụọ Nsọ Nwere Ikwu,” kọwara na mmụọ Jehova na-agwa anyị okwu site na Bible, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” nakwa site n’akọ na uche anyị e ji Bible zụọ. (Matiu 24:45) N’ihi ya, ọ dịghị ndị Kraịst mkpa ịnụ olu nkịtị sitere n’eluigwe iji mara otú ha ga-esi na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ. Okwu sochirinụ bụ́, “Iguzosi Ike Maka Ozizi nke Kwekọrọ ná Nsopụrụ Chineke,” gbara ndị Kraịst ume ka ha ghara inyoba anya n’echiche ndị na-emebi omume ọma bụ́ nke ụwa a na-akpọsa. N’ezie, ịchọ ịmata ihe n’ụzọ a na-akparaghị ókè pụrụ ime ka anyị nweta ihe ọmụma na-emerụ ahụ bụ́ nke sitere n’aka ndị si n’ezi ofufe dapụ na ndị ọzọ Setan ji arụ arụ. Lee ka o si ka mma ịgụchi Bible nakwa isiokwu nile dị n’Ụlọ Nche na Teta! anya.

N’ịbụ nke isiokwu ya bụ “Jigide Usoro nke Okwu Na-enye Ezi Ndụ,” okwu sochirinụ mesiri ike mkpa ọ dị ịmara “usoro,” ma ọ bụ ụkpụrụ nke eziokwu dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke ọma. (2 Timoti 1:13, NW ) Ịghọta usoro a bụ mkpịsị ugodi na-eduga ọ bụghị nanị n’inwe nsọpụrụ Chineke kamakwa n’ịmata ihe na-ekwekọghị n’eziokwu.

Cheedị banyere ịbụ onye Jehova lere anya dị ka ihe a na-achọsi ike. Lee ihe ùgwù ọ bụ! N’ịbụ nke dabeere n’amụma Hagaị, okwu bụ́ “‘Ihe A Na-achọsi Ike’ Na-ejupụta n’Ụlọ Jehova,” kasị agba ume n’ihi na o mesiri ndị gere ntị obi ike na onye nke ọ bụla n’ime “oké ìgwè mmadụ” ahụ bụụrụ Jehova ihe a na-achọsi ike n’ezie. (Mkpughe 7:9) N’ihi ya, Jehova ga-echebe ha mgbe ọ ga-eme ka mba nile “mee mkpatụ” ikpeazụ n’oge “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịanụ. (Hagaị 2:7, 21, 22; Matiu 24:21 ) Otú ọ dị, ka ọ dị ugbu a, ndị Jehova aghaghị ịnọ na-eche nche n’ụzọ ime mmụọ, dị ka a kọwara n’isiokwu bụ́ “Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Bụ́ Amụma Na-adọ Anyị Aka ná Ntị Ịnọ na Nche.” Ọkà okwu ahụ hotara okwu Jisọs bụ́: “Ya mere, na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” (Matiu 24:42) Olee otú anyị si anọgide na-eche nche n’ụzọ ime mmụọ? Ọ bụ site n’iji ọrụ n’aka n’ozi Jehova, ikpe ekpere n’esepụghị aka, na ịnọgide na-atụ anya oké ụbọchị Jehova.

Isiokwu okwu ikpeazụ nke ụbọchị ahụ bụ “Okwu Amụma ahụ na Mgbe Ọgwụgwụ.” A ga na-echeta ya ruo ọtụtụ afọ n’ihu. N’ihi gịnị? N’ihi na ọkà okwu ahụ mara ọkwa mwepụta nke akwụkwọ ọhụrụ—Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! “Akwụkwọ a nwere ihe osise ndị mara mma, nke dị peji 320, tụlere akụkụ nile nke akwụkwọ Daniel,” ka ọkà okwu ahụ kwuru. Lee ihe àmà na-ewusi okwukwe ike nke na-egosi na Jehova na-amụkwasị ìhè n’Okwu amụma ya, nke a bụ!

ỤBỌCHỊ NKE ATỌ: Okwu Amụma nke Chineke Adịghị Ada Ada

Ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ ji usoro isiokwu bụ́ “Okwu Amụma Maka Oge A Kara Aka,” malite. Akụkụ atọ ahụ nyochara nkwupụta okwu atọ nke Habakuk banyere ikpe mbibi nke Jehova. Nke mbụ bụ megide Juda na-enupụ isi, nke abụọ bụkwa megide Babilọn dị aka ike. Nke ikpeazụ, nke a na-emezubeghị, na-ezo aka ná mbibi a ga-ebibi ndị ajọ omume nile n’isi nso. N’ikwu banyere Amagedọn, nwanna ikpeazụ kwuru okwu n’usoro isiokwu ahụ kpaliri ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke egwu nsọpụrụ Chineke n’ahụ ndị gere ya ntị mgbe o kwuru, sị: “N’eziokwu, ọ ga-abụ ihe na-emenye ụjọ mgbe Jehova jiri ike ya nile mee ihe.”

“Inwe Ekele Maka Ihe Nketa Ime Mmụọ Anyị” bụ isiokwu nke ihe nkiri Bible na-akpali akpali nke mgbakọ ahụ. Ihe nkiri a na-enyocha akọ na uche tụlere ọdịiche dị n’etiti àgwà Jekọb na nke Isọ n’ebe ihe ime mmụọ dị. Isọ ledara ihe nketa ime mmụọ ya anya, nke mere na e weere ya nye Jekọb, bụ́ onye ji ya kpọrọ ihe. “[Olee ihe nketa ime mmụọ] Jehova nyeworo anyị?” ka a jụrụ ndị bịara mgbakọ. “Eziokwu nke Okwu ya, bụ́ Bible; olileanya nke ndụ ebighị ebi; na ihe ùgwù nke ịnọchịte anya ya dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ,” ka ọkà okwu ahụ zara.

Isiokwu nke okwu sochirinụ bụ “Gịnị Ka Ihe Nketa Anyị Dị Oké Ọnụ Ahịa Pụtara Nye Gị?” Anyị na-egosipụta àgwà ziri ezi n’ebe ihe nketa ime mmụọ anyị dị site n’ibute ozi Jehova na ihe ùgwù ime mmụọ dị iche iche ụzọ karịa ọdịmma onwe onye ma ọ bụ nke ihe onwunwe. N’ụzọ dị otú a, anyị na-eme ka ndụ anyị dabere n’ebe mmekọrịta anyị na Jehova dị, n’ụzọ dị nnọọ iche n’ihe Adam, Isọ, na ndị Israel na-ekwesịghị ntụkwasị obi mere.

Okwu ihu ọha bụ́, “Ime Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ—Dị Ka E Buru n’Amụma,” jikọtara amụma anọ bụ́ isi banyere “eluigwe ọhụrụ” na “ụwa ọhụrụ,” ọnụ. (Aịsaịa 65:17-25; 66:22-24; 2 Pita 3:13; Mkpughe 21:1, 3-5) N’ụzọ doro anya, Jehova bu n’uche mmezu ka ukwuu nke amụma ndị a karịa ka o mezuru n’ahụ ndị ya e weghachiri eweghachi na 537 T.O.A. Ee, o bu n’uche ọchịchị Alaeze ya (“eluigwe ọhụrụ”) na ndị ọ ga-achị n’ụwa (“ụwa ọhụrụ”), bụ́ ndị ga-ebi na paradaịs dị ebube nke zuru ụwa ọnụ.

Okwu bụ́ “Atụmanya Anyị Ka Okwu Chineke Na-edu Anyị,” wetara mgbakọ ahụ ná njedebe n’ụzọ na-akpali akpali. O chetaara mmadụ nile na “e mewo ka oge” maka imetọpụ mkpọsa Alaeze ahụ “dị mkpụmkpụ.” (1 Ndị Kọrint 7:29) Ee, anyị na-eguzo n’ọnụ ọnụ mmezu nke ikpe Jehova megide Setan na ajọ usoro ihe ya nile. Ka anyị nwee mmetụta ọbụ abụ ahụ nwere bụ́ onye bụrụ, sị: “Mkpụrụ obi anyị echerewo Jehova: inyeaka anyị na ọta anyị ka Ọ bụ.” (Abụ Ọma 33:20) Lee olileanya dị ebube na-echere ndị atụmanya ha dabeere n’okwu amụma Chineke!

[Foto dị na peeji nke 7]

Ihe nkiri na-akpali akpali mụbara ekele ndị ohu Jehova nwere maka ihe nketa ime mmụọ ha

[Foto dị na peeji nke 7]

E mere ọtụtụ ndị ṅara ntị n’okwu amụma nke Chineke baptism