Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Otú I Si Ele Onwe Gị Anya?

Olee Otú I Si Ele Onwe Gị Anya?

Olee Otú I Si Ele Onwe Gị Anya?

Ọ BỤ nwoke dị nganga. N’ịbụ onye e buliworo n’ọkwá ọchịchị dị elu, onwe ya juru ya afọ n’ihi okwu ire ụtọ a na-agwa ya na ùgwù a na-akwanyere ya. Ma n’ụzọ were ya oké iwe, onye ọzọ nọ n’ọkwá ọchịchị jụrụ inye ya nsọpụrụ dị otú ahụ. N’ịbọ ọ́bọ̀, onye ọchịchị ahụ dị mpako kpara nkata ibibi ndị nile nọ n’alaeze ukwu ahụ bụ́ ndị ha na onye ahụ kpasuru ya iwe si n’otu agbụrụ. Lee echiche gbagọrọ agbagọ nke ịdị mkpa n’anya onwe onye nke ahụ bụ!

Onye kpara nkata ahụ bụ Heman, bụ́ onye nọ n’ọkwá dị elu n’obí Eze Ahasuerọs nke Peasia. Ònyekwanụ ka ọ na-ebuso iro? Ọ bụ onye Juu aha ya bụ Mọdekaị. Ọ bụ ezie na mmeghachi omume Heman bụ́ igbuchapụ agbụrụ bụ nke gabigara ókè, ọ na-egosi ihe ize ndụ dị na nganga na ihe ndị dị nnọọ mwute ọ na-arụpụta. Ọ bụghị nanị na àgwà mpako ya kpataara ndị ọzọ ọgba aghara kama o dugakwara ná mweda e wedara ya n’ala n’ihu ọha nakwa n’ọnwụ ya n’ikpeazụ.—Esta 3:1-9; 5:8-14; 6:4-10; 7:1-10.

Ndị Na-efe Ezi Ofufe Abụghị Ndị Nganga Na-adịghị Emetụta

Jehova na-achọ ka anyị jiri ‘obi umeala soro Chineke anyị na-eje ije.’ (Maịka 6:8) Bible nwere ihe ndekọ dị iche iche banyere mmadụ ndị jụrụ ịnọgide na-ele onwe ha anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Nke a wetaara ha nsogbu na iru újú. Ịtụle ụfọdụ n’ime ihe atụ ndị a pụrụ inyere anyị aka ịhụ nzuzu na ihe ize ndụ dị n’inwe echiche na-ezighị ezi.

Echiche nke onye amụma Chineke bụ́ Jona ghọrọ ihe na-ezitụghị ezi nke na ọ nwara ịgbalaga mgbe Chineke nyere ya ọrụ ịga dọọ ndị Nineve na-eme ihe ọjọọ aka ná ntị banyere ikpe Jehova megide ha. (Jona 1:1-3) N’ikpeazụ, mgbe ọrụ nkwusa ya nwere ihe ịga nke ọma n’ime ka ndị Nineve chegharịa, Jona were iwe. O chere nnọọ banyere aha ọma ya dị ka onye amụma nke na ndụ ọtụtụ puku ndị Nineve adịghị ihe ọ bụ nye ya. (Jona 4:1-3) Ọ bụrụ na anyị ejiri mpako na-eche banyere onwe anyị gabiga ókè, ọ pụrụ isiri anyị ike inwe echiche ziri ezi banyere ndị mmadụ na ihe omume ndị gbara anyị gburugburu.

Tụleekwa Ụzaịa, bụ́ onye bụworo ezigbo eze nke Juda. Mgbe o nwere echiche na-ezighị ezi, o ji mpako gbalịa iweghara ọrụ ụfọdụ nke ndị nchụàjà. N’ihi mpako na oké nganga ya, ọ dara ọrịa, ihe ya adịghịzikwa Chineke mma.—2 Ihe E Mere 26:3, 16-21.

Ọ fọrọ nke nta ka ndị na-eso ụzọ Jisọs daba n’ọnyà nke inwe echiche na-ezighị ezi. Ha nwere nnọọ nchegbu banyere otuto na ike onwe onye. Mgbe oge oké ule ruru, ha gbahapụrụ Jisọs ma gbalaga. (Matiu 18:1; 20:20-28; 26:56; Mak 9:33, 34; Luk 22:24) Enweghị obi umeala ha na echiche ha nwere nke ịbụ ndị dị mkpa n’anya onwe ha fọrọ nke nta ka o mee ka ha leghara nzube Jehova nakwa ọrụ ha n’ihe metụtara uche ya, anya.

Mmetụta Ndị Na-emerụ Ahụ nke Ịdị Mkpa n’Anya Onwe Onye

Inwe echiche na-ezighị ezi banyere onwe anyị pụrụ iweta ihe mgbu, ọ pụkwara imebi mmekọrịta anyị na ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, anyị pụrụ ịnọdụ ala n’otu ọnụ ụlọ ma hụ otu di na nwunye ka ha na-agbanyere onwe ha izu ma na-achị ọchị. Ọ bụrụ na anyị na-eche nanị banyere onwe anyị, anyị pụrụ iwere ya n’ụzọ na-ezighị ezi na ha ji anyị eme ihe ọchị n’ihi na ha ji olu dị ala na-ekwu okwu. Uche anyị nwere ike ghara ikwe ka anyị tụlee ihe ọ bụla ọzọ pụrụ ime ka ha mee otú ahụ. E kwuwerị, olee onye ọzọ ha pụrụ ịdị na-ekwu banyere ya? Anyị pụrụ iwe iwe ma kpebie na anyị agaghị eghe di na nwunye ahụ ọnụ ọzọ ma ọlị. N’ụzọ dị otú ahụ, inwe echiche na-ezighị ezi banyere ókè anyị dịruru ná mkpa pụrụ ime ka anyị na ndị enyi, ndị òtù ezinụlọ, na ndị ọzọ nwee nghọtahie, mebiekwa mmekọrịta anyị na ha.

Ndị na-eche banyere onwe ha gabiga ókè pụrụ ịghọ ndị na-etu ọnụ, na-etu ọnụ mgbe nile banyere ihe ha weere dị ka nkà, ọrụ, ma ọ bụ ihe onwunwe dị ukwuu. Ma ọ bụ, ha pụrụ iweghara mkparịta ụka, na-ekwu banyere onwe ha mgbe nile. Okwu dị otú ahụ na-egosi enweghị ezi ịhụnanya, ọ pụkwara ịdị na-akpasu nnọọ iwe. N’ihi ya, ndị mpako na-ekewapụkarị onwe ha n’ebe ndị ọzọ nọ.—1 Ndị Kọrint 13:4.

Dị ka Ndịàmà Jehova, a pụrụ ịkwa anyị emo ma jụ anyị n’ozi ihu ọha anyị. Ọ dị anyị mkpa icheta na ọ bụghị anyị onwe anyị ka a na-emegide otú ahụ, kama ọ bụ Jehova, bụ́ Isi Iyi nke ozi anyị. Otú ọ dị, inwe echiche na-ezighị ezi banyere ókè anyị dịruru ná mkpa pụrụ ịrụpụta ihe ndị dị njọ. Ọtụtụ afọ gara aga, otu nwanna nwoke weere okwu ọjọọ onye nwe ụlọ kwuru dị ka mkparị nye ya, ọ gwagwakwaara ya. (Ndị Efesọs 4:29) Mgbe nke ahụ gasịrị, nwanna nwoke ahụ ekereghịkwa òkè ọzọ ma ọlị n’ozi ọnụ ụzọ ruo n’ọnụ ụzọ. Ee, nganga pụrụ ime ka anyị ghara ịchịkwa iwe anyị mgbe anyị na-eme nkwusa. Ka anyị gbalịsie ike ịghara ikwe ka nke ahụ mee mgbe ọ bụla. Kama nke ahụ, ka anyị jiri obi umeala na-achọ enyemaka Jehova iji nọgide na-enwe ekele kwesịrị ekwesị maka ihe ùgwù nke ikere òkè n’ozi ndị Kraịst.—2 Ndị Kọrint 4:1, 7; 10:4, 5.

Inwe àgwà nke ịdị mkpa n’anya onwe onye pụkwara igbochi anyị ịnakwere ndụmọdụ ndị dị anyị mkpa. Ụfọdụ afọ gara aga, n’otu mba dị na Kọntinent Ebe Etiti America, otu nwa okoro nọ n’afọ iri na ụma mere ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’ọgbakọ ndị Kraịst. Mgbe onye nlekọta ụlọ akwụkwọ nyere ya ndụmọdụ n’ezoghị ọnụ, nwa okoro ahụ iwe ji tụrụ Bible ya n’ala ma zọrọ kpim kpim si n’Ụlọ Nzukọ Alaeze pụọ, n’enweghị nzube nke ịlọghachi ma ọlị. Ma mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ọ hapụrụ nganga ya, soro onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ahụ kpezie, ma jiri obi umeala nakwere ndụmọdụ ya. Ka oge na-aga, nwa okoro a tolitere ghọọ onye Kraịst tozuru okè.

Ịdị mpako na iche echiche banyere onwe anyị gabiga ókè pụrụ iduga ná mmebi nke mmekọrịta anyị na Chineke. Ilu 16:5 na-adọ aka ná ntị, sị: “Ihe arụ n’anya Jehova ka onye ọ bụla bụ nke obi ya dị elu.”

Echiche Ziri Ezi Banyere Onwe Anyị

N’ụzọ doro anya, anyị ekwesịghị iche banyere onwe anyị gabiga ókè. N’ezie, nke a apụtaghị na anyị ekwesịghị iji ihe anyị na-eme ma ọ bụ na-ekwu kpọrọ ihe. Bible na-egosi na ndị nlekọta, ndị ohu na-eje ozi—n’ezie, ndị nile nọ n’ọgbakọ—kwesịrị ịbụ ndị ji ihe akpọrọ ihe. (1 Timoti 3:4, 8, 11; Taịtọs 2:2) Ya mere, olee otú ndị Kraịst pụrụ isi zụlite ma nọgide na-enwe echiche dị mma, nke ziri ezi, na nke kwesịrị ekwesị banyere onwe ha?

Bible na-enye ọtụtụ ihe atụ na-agba ume banyere mmadụ ndị nwere echiche ziri ezi banyere onwe ha. Nke pụtara ìhè bụ ihe nlereanya nke ịdị umeala n’obi Jisọs Kraịst. Iji mee uche Nna ya na iji wetara ihe a kpọrọ mmadụ nzọpụta, Ọkpara Chineke ji ọchịchọ obi ya hapụ ọkwá ya dị ebube n’eluigwe ma ghọọ mmadụ dị ala n’ụwa. N’agbanyeghị mkparị, nkwutọ, na ọnwụ ihere, ọ nọgidere na-enwe njide onwe onye na ùgwù. (Matiu 20:28; Ndị Filipaị 2:5-8; 1 Pita 2:23, 24) Olee otú Jisọs si nwee ike ime nke a? Ọ dabeere kpam kpam n’ebe Jehova nọ ma kpebisie ike ime uche Ya. Jisọs ji ịdị uchu mụọ Okwu Chineke, kpesie ekpere ike, ma dọgbuo onwe ya n’ọrụ n’ozi. (Matiu 4:1-10; 26:36-44; Luk 8:1; Jọn 4:34; 8:28; Ndị Hibru 5:7) Ịgbaso ihe nlereanya Jisọs pụrụ inyere anyị aka ịzụlite na ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi banyere onwe anyị.—1 Pita 2:21.

Tụleekwa ezi ihe nlereanya nke ọkpara Eze Sọl bụ́ Jonatan. N’ihi nnupụisi nke nna ya, ohere nke ịnọchi Sọl dị ka eze funahụrụ Jonatan. (1 Samuel 15:10-29) Jonatan ò nwere obi ilu maka ihe funahụrụ ya? Ò kwosoro Devid, bụ́ nwa okoro nke gaje ịchị n’ọnọdụ ya, ekworo? Ọ bụ ezie na Jonatan tọrọ nnọọ Devid atọ, ikekwe nweekwa ahụmahụ karịa ya, o wedara onwe ya ala ma jiri obi umeala kwenye ná ndokwa Jehova ma jiri iguzosi ike n’ihe kwadoo Devid. (1 Samuel 23:16-18) Inwe echiche doro anya banyere uche Chineke na ịdị njikere ime ya ga-enyere anyị aka ‘ịghara ịtụkwasị uche n’onwe anyị karịa nke anyị kwesịrị ịtụkwasị uche.’—Ndị Rom 12:3.

Jisọs kụziri uru dị n’iweda onwe onye ala na igosipụta obi umeala. O gosipụtara nke a site n’ịsị na mgbe ndị na-eso ụzọ ya nọ n’oriri ọlụlụ nwunye, ha ekwesịghị ịnọ “n’isi ọnọdụ” n’ihi na onye ka ha ná nsọpụrụ pụrụ ịbịa, ha pụkwara inweta mweda n’ala nke ịbụ ndị na-aghaghị ịga n’ọnọdụ ikpeazụ. N’ime ka ihe mmụta ahụ doo nnọọ anya, Jisọs gbakwụnyere, sị: “N’ihi na onye ọ bụla nke na-eweli onwe ya elu, a ga-eweda ya; ọzọ, onye na-eweda onwe ya, a ga-eweli ya elu.” (Luk 14:7-11) Anyị ga-abụ ndị amamihe ịṅa ntị na ndụmọdụ Jisọs na ‘iyikwasị obi dị umeala.’—Ndị Kọlọsi 3:12; 1 Ndị Kọrint 1:31.

Ngọzi Ndị Na-esite n’Echiche Ziri Ezi

Inwe àgwà nke iweda onwe onye n’ala na nke ịdị umeala n’obi na-enyere ndị ohu Jehova aka ịchọta ezi ọṅụ n’ozi ha. Ndị okenye na-abụ ndị a pụrụ ịbịaru nso karị mgbe ha ji obi umeala ‘na-emere ìgwè atụrụ ebere.’ (Ọrụ 20:28, 29) Mgbe ahụ, ndị nile nọ n’ọgbakọ na-aka enwe ahụ iru ala ịgwa ha okwu na ịchọ enyemaka ha. N’ụzọ dị otú a, a pụrụ ime ka ọgbakọ dịrị n’otu ná mmụọ nke ịhụnanya, ikpo ọkụ, na ntụkwasị obi.

Echeghị echiche banyere onwe anyị gabiga ókè na-eme ka anyị nwee ike imeta ezi ndị enyi. Obi umeala na ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị ghara ịzụlite mmụọ asọmpi na ịnwa ịka ndị ọzọ n’ihe omume ma ọ bụ n’ihe onwunwe. Àgwà nsọpụrụ Chineke ndị a ga-enyere anyị aka ichebara ndị ọzọ echiche karị, anyị ga-esikwa otú a nọrọ n’ọnọdụ ka mma ịkasi ndị nọ ná mkpa obi na ịkwado ha. (Ndị Filipaị 2:3, 4) Mgbe e mesoro ndị mmadụ ihe n’ịhụnanya na obiọma, ha na-emeghachikarị omume n’ụzọ dị mma. Mmekọrịta nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị dị otú ahụ ọ́ dịghị aghọ ntọala nke a na-ewukwasị ọbụbụenyi siri ike na ya? Lee ngọzi na-esite n’ejighị mpako na-eche banyere onwe anyị gabiga ókè nke ahụ bụ!—Ndị Rom 12:10.

Inwe echiche ziri ezi banyere onwe anyị na-emekwa ka ọ dịrị anyị mfe ịnakwere mmejọ anyị mgbe anyị mejọrọ mmadụ. (Matiu 5:23, 24) Nke a na-arụpụta mmekọrịta ka mma, na-enye ohere maka mkpezi na nkwanyerịta ùgwù. Ọ bụrụ na ha wedara onwe ha ala ma nwee obi umeala, ndị nọ n’ọnọdụ nlekọta, dị ka ndị Kraịst bụ́ ndị okenye, nwere ohere nke imere ndị ọzọ ọtụtụ ezi ihe. (Ilu 3:27; Matiu 11:29) Ọ ga-akakwa adịrị onye dị obi umeala mfe ịgbaghara ndị ọzọ bụ́ ndị mehiere megide ya. (Matiu 6:12-15) Ọ gaghị emeghachi omume gabiga ókè n’ihe o lere anya dị ka nlelị, ọ ga-atụkwasịkwa Jehova obi idozi okwu ndị a na-apụghị idozi n’ụzọ ọ bụla ọzọ.—Abụ Ọma 37:5; Ilu 3:5, 6.

Inweta ihu ọma na nnwapụta Jehova bụ ngọzi kasị ukwuu a na-enweta site n’ile onwe anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị na n’obi umeala. “Chineke na-edo Onwe ya imegide ndị mpako, ma Ọ na-enye ndị dị umeala n’obi amara.” (1 Pita 5:5) Ka anyị ghara ma ọlị ịdaba n’ọnyà nke iche na anyị dị mma karịa ókè anyị dịruru n’ezie. Kama nke ahụ, ka anyị jiri obi umeala mata ọnọdụ anyị ná ndokwa Jehova. Ngọzi dị ukwuu na-echere ndị nile mezuru ihe ọ na-achọ n’aka ha bụ́ ‘iji obi umeala soro Chineke na-eje ije.’

[Foto dị na peeji nke 22]

Jonatan ji obi umeala kwadoo Devid