Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịṅụrị Ọṅụ n’Ime Chineke nke Nzọpụta Anyị

Ịṅụrị Ọṅụ n’Ime Chineke nke Nzọpụta Anyị

Ịṅụrị Ọṅụ n’Ime Chineke nke Nzọpụta Anyị

“M ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, m ga-etegharị egwú ọṅụ n’ime Chineke nke nzọpụta m.”—HABAKUK 3:18.

1. Gịnị ka Daniel hụrụ ọhụụ banyere ya tupu Babilọn adaa na 539 T.O.A.?

IHE Karịrị afọ iri tupu Babilọn adaa na 539 T.O.A., onye amụma ahụ meworo agadi bụ́ Daniel hụrụ ọhụụ na-akpali akpali. Ọhụụ ahụ mere ka a mara ihe ndị gaje ime n’ụwa, ndị ga-adịgide ruo kpọmkwem n’agha ahụ dị ịrịba ama nke ndị iro Jehova na Eze Ya ọ họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-alụ. Gịnị bụ mmeghachi omume Daniel? Ọ sịrị: “Ike gwụrụ m . . . ọhụụ ahụ jukwara m anya.”—Daniel 8:27.

2. Olee ọgụ Daniel hụrụ n’ọhụụ, oleekwa otú ịdị nso ya si emetụta gị?

2 Ànyị kwanụ? Anyị na-ebi nnọọ na mgbe oge gamiworo! Olee otú anyị si emeghachi omume mgbe anyị matara na ọgụ ahụ Daniel hụrụ n’ọhụụ—agha nke Chineke bụ́ Amagedọn—dị nnọọ nso? Olee otú anyị si emeghachi omume mgbe anyị chọpụtara na ajọ omume ahụ e kpughere n’amụma Habakuk jupụtara ebe nile nke na a ghaghị ibibi ndị iro Chineke? Ma eleghị anya, mmetụta anyị na-adị ka nke Habakuk n’onwe ya, dị ka e si kọwaa ha n’isi nke atọ nke akwụkwọ amụma ya.

Habakuk Ekpee Ekpere Maka Ebere Chineke

3. Ole ndị ka Habakuk na-ekpechitere ekpere, oleekwa otú ihe ndị o kwuru pụrụ isi metụta anyị?

3 Habakuk isi nke 3 bụ ekpere. Dị ka amaokwu nke 1 si kwuo, o kpere ya n’ụdị ákwá, abụ iru újú ma ọ bụ abụ ákwá. Onye amụma ahụ kpere ekpere ya dị ka a ga-asị na ọ na-ekpe ya maka onwe ya. Otú ọ dị, n’ezie, Habakuk na-ekpechitere mba Chineke họpụtara ekpere. Taa, ekpere ya nwere ọtụtụ ihe ọ pụtaara ndị Chineke, bụ́ ndị na-arụ ọrụ nkwusa Alaeze ahụ. Mgbe anyị bu nke a n’uche na-agụ Habakuk isi nke 3, ihe ndị e kwuru na ya na-eme ka anyị nwee mmetụta nke ihe ọjọọ na-abịanụ, ha na-emekwa ka anyị jupụta n’ọṅụ. Ekpere Habakuk, ma ọ bụ abụ ákwá ya, na-enye anyị ihe gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji na-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, bụ́ Chineke nke nzọpụta anyị.

4. N’ihi gịnị ka Habakuk ji tụọ egwu, gịnị kwa ka anyị pụrụ ijide n’aka na Chineke ga-eji ike ya mee?

4 Dị ka anyị chọpụtaworo n’isiokwu abụọ ndị bu ụzọ, ọnọdụ dị nnọọ njọ n’ala Juda n’oge Habakuk. Ma Chineke agaghị ekwe ka ọnọdụ a dịgide. Jehova ga-eme ihe, dị ka o mere n’oge gara aga. Ka a sịkwa ihe mere onye amụma ahụ ji tie mkpu, sị: “Jehova, anụwo m ihe a nụrụ banyere Gị, m tụọ egwu”! Gịnị ka o bu n’uche? ‘Ihe a nụrụ banyere Jehova’ bụ akụkọ ihe mere eme e dekọrọ banyere oké ọrụ dị iche iche nke Chineke, dị ka nke ọ rụrụ n’Osimiri Uhie, n’ọzara, nakwa na Jeriko. Habakuk maara ọrụ ndị a nke ọma, ha mekwara ka ọ tụọ egwu n’ihi na ọ maara na Jehova ga-ejikwa oké ike ya mee ihe ọzọ megide ndị iro ya. Ka anyị na-ahụ ajọ omume nke ihe a kpọrọ mmadụ taa, anyị onwe anyị kwa maara na Jehova ga-eme ihe dị ka o mere n’oge ochie. Nke ahụ ọ̀ na-emenye anyị egwu? Eenụ! Otú o sina dị, anyị na-ekpe ekpere dị ka Habakuk kpere, sị: “Tụtee ọrụ Gị n’etiti afọ nile, n’etiti afọ nile ka Ị ga-eme ka a mara ya; n’oké iwe cheta obi ebere.” (Habakuk 3:2) N’oge nke Chineke, “n’etiti afọ nile,” ya jiri ike ọrụ ebube ya mee ihe. N’oge ahụ kwa, ya cheta meere ndị hụrụ ya n’anya ebere!

Jehova Azọlie Ije!

5. Olee otú ‘Chineke si siri na Timan na-abịa,’ gịnịkwa ka nke a na-egosi banyere Amagedọn?

5 Gịnị ga-eme mgbe Jehova nụrụ ekpere anyị maka ebere? Anyị na-achọta azịza ya na Habakuk 3:3, 4. Nke mbụ, onye amụma ahụ na-asị: “Chineke si na Timan na-abịa, Onye Nsọ sikwa n’ugwu Peran.” Laa azụ n’oge Mosis onye amụma, Timan na Peran dịcha n’ụzọ ụmụ Israel si gafere mgbe ha si n’ọzara na-aga Kenean. Ka mba Israel ahụ bara ụba ji ụkwụ na-aga, Jehova n’onwe ya yiri ka ọ nọ na-aga ije, ọ dịghịkwa ihe pụrụ ịkwụsị ya. Ntakịrị oge tupu Mosis anwụọ, o kwuru, sị: “Jehova siri na Saịnaị bịa, sikwa na Sia walitere ha; O siri n’ugwu Peran nwupụta, O sikwara ná ndị nsọ a na-apụghị ịgụta ọnụ [nke ndị mmụọ ozi] bịa.” (Deuterọnọmi 33:2) Mgbe Jehova mere ihe megide ndị iro ya n’Amagedọn, a ga-enwe ngosipụta yiri nke ahụ nke ike ya a na-apụghị iguzogide eguzogide.

6. Tụkwasị n’ebube Chineke, gịnị ka ndị Kraịst nwere nghọta na-ahụ?

6 Habakuk na-ekwukwa, sị:“Ebube [Jehova] ekpuchiwo eluigwe nile, otuto Ya jupụtakwara ụwa. Onwunwu Ya dị ka ìhè.” Lee ngosipụta dị ebube ọ bụ! N’eziokwu, ụmụ mmadụ apụghị ilegide Jehova Chineke anya ma dị ndụ. (Ọpụpụ 33:20) Otú ọ dị, nye ndị ohu Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi, oké ìhè na-achakwasị n’anya nke obi ha mgbe ha na-atụgharị uche n’ịdị ebube ya. (Ndị Efesọs 1:18) Ndị Kraịst nwere nghọta na-ahụkwa ihe ọzọ na-abụghị nanị ebube Jehova. Habakuk 3:4 na-ekwubi, sị: “Ìhè na-enwupụta n’aka Ya: ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ebe nzuzo nke ike Ya dị.” Ee, anyị na-ahụ na Jehova dị njikere ime ihe, na-eji aka nri ya nke ume na ike eme ihe.

7. Gịnị ka njem mmeri nke Chineke pụtara nye ndị na-enupụrụ ya isi?

7 Njem mmeri nke Chineke pụtara ọdachi nye ndị na-enupụrụ ya isi. Habakuk 3:5 na-ekwu, sị: “N’ihu Ya ka ajọ ọrịa nke na-efe efe na-aga, nruru ọkụ sikwa n’ụkwụ Ya abụọ na-apụta.” Mgbe ụmụ Israel nọ nso n’ókèala nke Ala Nkwa ahụ na 1473 T.O.A., ọtụtụ n’ime ha nupụrụ isi, mee omume rụrụ arụ ma kpeere arụsị. N’ihi ya, ihe karịrị nnọọ mmadụ 20,000 nwụrụ n’ihi ajọ ọrịa na-efe efe nke Chineke zitere. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9) N’ọdịnihu dị nso, mgbe Jehova ga-azọrọ ije gaa ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile,’ ndị na-enupụrụ ya isi ga-atakwa ahụhụ n’otu aka ahụ maka mmehie ha. Ụfọdụ pụrụ ọbụna ịnwụ n’ihi ajọ ọrịa na-efe efe nkịtị.—Mkpughe 16:14, 16.

8. Dị ka Habakuk 3:6 si kwuo, gịnị na-echere ndị iro Chineke?

8 Ugbu a nụrụ nkọwa doro anya nke onye amụma ahụ kọwara usuu ndị agha Jehova nọ n’ọrụ. Na Habakuk 3:6, anyị na-agụ, sị: “O [Jehova Chineke] guzoro, wee tụọ ụwa; O lere anya, wee mee ka mba nile kụja: e wee tipịa ugwu nile dị mgbe ebighị ebi, ugwu nta ebighị ebi nile huuru ala; ojije nile nke mgbe ebighị ebi gara aga bụ nke Ya.” Nke mbụ, Jehova “guzoro,” dị ka ọchịagha nke na-enyocha ọgbọ agha. Ndị iro ya mara jijiji n’ụjọ. Ha hụrụ onye bụ́ onye iro ha ma kụja, malie elu n’egwu. Jisọs buru amụma banyere oge “ebo nile nke ụwa [ga-eti] aka n’obi.” (Matiu 24:30) Ha ga-achọpụta mgbe oge gafeworo na ọ dịghị onye pụrụ iguzogide Jehova. Òtù ụmụ mmadụ—ọbụna ndị yiri ka ha na-adịgide adịgide dị ka “ugwu nile dị mgbe ebighị ebi” na “ugwu nta ebighị ebi nile”—ga-adakpọ. Ọ ga-adịzi ka “ojije nile nke mgbe ebighị ebi gara aga” nke Chineke, dị ka o mere n’oge ochie.

9, 10. Gịnị ka Habakuk 3:7-11 na-echetara anyị?

9 Jehova “[na-ewe] oké iwe” megide ndị iro ya. Ma olee ngwá agha ọ ga-eji eme ihe n’agha ukwu ya? Gee ntị ka onye amụma ahụ na-akọwa ha, na-asị: “A gbabasịrị ụta Gị ọtọ; iyi nile a ṅụụrụ ebo Gị nile bụ okwu ọnụ kwesịrị ntụkwasị obi. Ị na-eji osimiri gbawaa ala. Ugwu nile hụrụ Gị, wee na-agbali; oké mmiri ozuzo gabigara: ogbu mmiri mere ka olu ya daa, chịlie aka ya elu. Anyanwụ na ọnwa guzoro n’ebe obibi ha; n’ìhè akụ́ Gị nile mgbe ha na-aga, n’onwunwu nke ubè Gị na-egbupụ àmụ̀mà.”—Habakuk 3:7-11.

10 N’oge Joshua, Jehova mere ka anyanwụ na ọnwa guzoro otu ebe n’oké ngosipụta nke ike. (Joshua 10:12-14) Amụma Habakuk na-echetara anyị na Jehova ga-eji otu ike a mee ihe n’Amagedọn. Na 1513 T.O.A., Jehova gosiri nchịkwa ọ na-achịkwa ogbu mmiri nke ụwa mgbe o ji Osimiri Uhie bibie usuu ndị agha Fero. Iri afọ anọ ka e mesịrị, osimiri Jọdan nke tojuru nnọọ etoju abụghị ihe mgbochi nye njem mmeri ndị Israel zọọrọ banye n’Ala Nkwa ahụ. (Joshua 3:15-17) N’oge onye amụma nwanyị bụ́ Debora, oké mmiri ozuzo bupụrụ ụgbọ ịnyịnya agha nke onye iro ndị Israel bụ́ Sisera. (Ndị Ikpe 5:21) Jehova ga-ejikwa ike idei, oké mmiri ozuzo, na ogbu mmiri ndị a mee ihe n’Amagedọn. Égbè eluigwe na àmụ̀mà dịkwa ya n’aka, dị ka ubè ma ọ bụ akpa akụ́ nke jupụtara n’akụ́.

11. Gịnị ga-eme mgbe Jehova ga-eji ike ukwu ya mee ihe?

11 N’eziokwu, ọ ga-abụ ihe na-emenye ụjọ mgbe Jehova ga-eji ike ukwu ya mee ihe. Ihe Habakuk kwuru na-enye echiche na abalị ga-aghọ ehihie, ehihie ga-achapụkwa karịa otú anyanwụ pụrụ ime ka ọ chapụ. Ma nkọwa amụma a sitere n’ike mmụọ nsọ banyere Amagedọn ọ̀ ga-emezu n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ n’ụzọ ihe atụ, otu ihe doro anya—Jehova ga-emeri, n’ekweghị ka onye iro ọ bụla gbapụ.

Nzọpụta Bụ Ihe Ndị Chineke Ji n’Aka!

12. Gịnị ka Chineke ga-eme ndị iro ya, ma olee ndị a ga-azọpụta?

12 Onye amụma ahụ gara n’ihu ịkọwa ihe ndị Jehova ga-eme n’ibibi ndị iro Ya. Na Habakuk 3:12, anyị na-agụ, sị: “N’oké iwe ka Ị na-azọ ije n’ala, n’iwe ka Ị na-azọcha mba dị iche iche dị ka ọka.” N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova agaghị ebibi ndị mmadụ n’ajụghị ase. A ga-azọpụta ụmụ mmadụ ụfọdụ. “Ị pụtawo ìhè ịzọpụta ndị Gị, Ịzọpụta onye Gị e tere mmanụ,” ka Habakuk 3:13 na-ekwu. Ee, Jehova ga-azọpụta ndị ohu ya e tere mmanụ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Mgbe ahụ mbibi nke Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ga-ezu ezu. Otú ọ dị, taa, mba dị iche iche na-agbalị ikpochapụ ofufe dị ọcha. N’isi nso, ndị agha Gọg nke Megọg ga-awakpo ndị ohu Jehova. (Ezikiel 38:1–39:13; Mkpughe 17:1-5, 16-18) Mwakpo ahụ Setan ga-eme ọ̀ ga-agaziri ya? Ee e! Mgbe ahụ Jehova ga-eji iwe gwepịa ndị iro ya, na-azọcha ha dị ka ọka n’ebe nzọcha ọka. Ma ọ ga-azọpụta ndị na-efe ya n’ime mmụọ na eziokwu.—Jọn 4:24.

13. Olee otú a ga-esi emezu Habakuk 3:13?

13 E buru amụma banyere mbibi zuru ezu nke ndị ajọ omume n’okwu ndị a: “Ị [Jehova] mabipụwo isi n’ụlọ ndị na-emebi iwu, gbawa ntọala ya ọtọ ruo olu.” (Habakuk 3:13) ‘Ụlọ’ a bụ ajọ usoro ihe a e wulitere n’okpuru nchịkwa nke Setan bụ́ Ekwensu. A ga-ebibi ya. A ga-egwepịa “isi,” ma ọ bụ ndị ndú na-emegide Chineke. A ga-ebibi ihe owuwu ahụ nile, ruo na ntọala ya. Ọ gakwaghị adị. Lee ahụ efe magburu onwe ya nke ahụ ga-abụ!

14-16. Dị ka Habakuk 3:14, 15 si kwuo, gịnị ga-eme ndị Jehova nakwa ndị iro ha?

14 N’Amagedọn, a ga-eme ka ndị na-agbalị ibibi ‘onye e tere mmanụ’ nke Jehova nọrọ n’ọgba aghara. Dị ka Habakuk 3:14, 15 si kwuo, onye amụma ahụ na-agwa Chineke, sị: “I jiwo mkpanaka ya dụpuo ndị agha ya isi: bụ́ ndị na-abịa dị ka oké ifufe ifesa m: obi ụtọ ha dị ka a ga-asị na ha gaje iripịa onye e wedara n’ala n’ebe nzuzo. Ị chịrịwo ịnyịnya Gị zọọ ije n’oké osimiri, bụ́ obo nke ọtụtụ mmiri.”

15 Mgbe Habakuk sịrị “ndị agha . . . na-abịa dị ka ifufe ifesa m,” onye amụma ahụ na-ekwuchitere ndị ohu Jehova e tere mmanụ. Dị ka ndị ohi chechiri ndị njem n’ụzọ, mba dị iche iche ga-amapụta makwasị ndị na-efe Jehova ofufe iji bibie ha. Ndị a bụ́ ndị iro nke Chineke na nke ndị ya, ga-enwe “obi ụtọ,” na-enwe obi ike na ha enweela ihe ịga nke ọma. Ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi ga-eyi ndị na-adịghị ike, dị ka “onye e wedara n’ala.” Ma mgbe ndị ahụ na-emegide Chineke mere mwakpo ha, Jehova ga-eme ka ha tụgharịa ngwá agha ha megide onwe ha. Ha ga-eji ngwá agha ha, ma ọ bụ “mkpanaka” ha megide ndị dike ha.

16 Ma ihe karịrị nke ahụ ga-eme. Jehova ga-eji ndị agha ya bụ́ ndị mmụọ karịrị mmadụ ike mee ihe iji bibichaa ndị iro ya. N’iji “ịnyịnya” nke usuu ndị agha ya nke eluigwe mee ihe n’okpuru Jisọs Kraịst, ọ ga-aga n’ihu n’inwe mmeri gabiga ‘n’oké osimiri’ na “obo nke ọtụtụ mmiri,” ya bụ, oké ìgwè ụmụ mmadụ bụ́ ndị iro ya. (Mkpughe 19:11-21) A ga-ekpochapụ ndị ajọ omume n’ụwa mgbe ahụ. Lee ngosipụta dị ike nke ike na ikpe ziri ezi nke Chineke nke a bụ!

Ụbọchị Jehova Na-abịa!

17. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike ná mmezu nke ihe Habakuk kwuru? (b) Olee otú anyị pụrụ isi yie Habakuk ka anyị na-echere oké ụbọchị Jehova?

17 Anyị pụrụ ijide n’aka na ihe Habakuk kwuru ga-emezu n’isi nso. Ha agaghị anọ ọdụ. Olee otú i si emeghachi omume n’ọmụma a ị maara tupu oge eruo? Cheta na Habakuk nọ na-ede akwụkwọ ya n’ike mmụọ nsọ Chineke. Jehova ga-eme ihe, a ga-enwekwa oké mbibi n’ụwa mgbe nke ahụ mere. Ọ bụghị ihe ijuanya na onye amụma ahụ dere, sị: “Anụrụ m, afọ m wee maa jijiji, n’olu ahụ egbugbere ọnụ m abụọ na-akụkọta; ire ure na-aba n’ọkpụkpụ m nile, ọ bụkwa n’ọnọdụ m ka m na-ama jijiji: ka m wee zuo ike ruo ụbọchị ahụhụ, mgbe ọ na-arịgota imegide ndị ahụ nke na-emegide ya n’usuu ndị na-apụnara mmadụ ihe.” (Habakuk 3:16) Habakuk mara jijiji nke ukwuu—o kwekwara nghọta. Ma okwukwe ya ọ̀ mara jijiji? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ dị njikere idere duu chere ụbọchị Jehova. (2 Pita 3:11, 12) Nke ahụ ọ́ bụghị àgwà anyị kwa? N’ezie ọ bụ! Anyị nwere okwukwe zuru ezu na amụma Habakuk ga-emezu. Otú ọ dị, ruo mgbe o mezuru, anyị ga-eji ndidi chere.

18. Ọ bụ ezie na Habakuk tụrụ anya ihe isi ike, olee àgwà o nwere?

18 Agha na-akpata ihe isi ike mgbe nile, ọbụna nye ndị mesịrị merie. Ihe oriri pụrụ ịdị ụkọ. A pụrụ ibibi ngwongwo. Ọnọdụ ibi ndụ pụrụ ịdalata. Ọ bụrụ na nke ahụ emee anyị, gịnị ka anyị ga-eme? Habakuk nwere àgwà kwesịrị nṅomi, n’ihi na o kwuru, sị: “A sị na osisi fig adịghị ama ifuru, na ọ dịghị ihe omume dị n’osisi vine; na ihe a rụpụtara n’osisi olive ebelatawo, na ubi nile emeghị ihe oriri; na e bipụwo ìgwè ewu na atụrụ n’ogige ewu na atụrụ, na ọ dịghị ìgwè ehi dị n’ụlọ ehi: ma mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, m ga-etegharị egwú ọṅụ n’ime Chineke nke nzọpụta m.” (Habakuk 3:17, 18) N’ụzọ ezi uche dị na ya, Habakuk tụrụ anya ihe isi ike, ikekwe ụnwụ nri. Ma, ọ dịghị mgbe ọ kwụsịrị inwe ọṅụ n’ime Jehova, bụ́ onye zọpụtara ya.

19. Olee ihe isi ike ọtụtụ ndị Kraịst na-enwe, ma gịnị ka anyị pụrụ ijide n’aka ma ọ bụrụ na anyị edebe Jehova n’ọnọdụ mbụ ná ndụ anyị?

19 Taa, ọbụna tupu agha Jehova megide ndị ajọ omume amalite, ọtụtụ ndị na-enwe oké nsogbu. Jisọs buru amụma na agha, ụnwụ nri, ala ọma jijiji, na ajọ ọrịa na-efe efe ga-abụ akụkụ nke ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya’ n’ike ọchịchị. (Matiu 24:3-14, NW; Luk 21:10, 11) Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị bi n’ala ebe ndị mmezu nke okwu Jisọs kpaworo aka ọjọọ, ha na-enwekwa oké ihe isi ike n’ihi ya. Ọ pụrụ imetụta ndị Kraịst ndị ọzọ n’otu aka ahụ n’ọdịnihu. Nye ọtụtụ ndị ọzọ n’ime anyị, ọ pụrụ nnọọ ikwe mee na ‘osisi fig agaghị ama ifuru’ tupu ọgwụgwụ ahụ eruo. Otú ọ dị, anyị maara ihe mere ihe ndị a ji na-eme, nke ahụ na-enyekwa anyị ume. Ọzọkwa, anyị nwere nkwado. Jisọs kwere nkwa, sị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya, na ezi omume Ya [Chineke]; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.” (Matiu 6:33) Nke ahụ adịghị ekwe nkwa ndụ ntụsara ahụ, kama ọ na-emesi anyị obi ike na ọ bụrụ na anyị edebe Jehova n’ọnọdụ mbụ, ọ ga-elekọta anyị.—Abụ Ọma 37:25.

20. N’agbanyeghị ihe isi ike nwa oge, gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 N’agbanyeghị ihe isi ike nwa oge ndị anyị na-aghaghị iche ihu, anyị agaghị akwụsị inwe okwukwe n’ike nzọpụta nke Jehova. Ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’Africa, Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, na n’ebe ndị ọzọ na-enwe oké ihe isi ike, ma ha nọgidere ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova.’ Ka anyị, dị ka ha, ghara ịkwụsị ime otú ahụ mgbe ọ bụla. Cheta na Eze Onyenwe anyị Jehova bụ Isi Iyi anyị nke “ike.” (Habakuk 3:19) Ọ gaghị emechu anyị ihu ma ọlị. Amagedọn aghaghị ịbịa, ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa aghaghịkwa isochi ya. (2 Pita 3:13) Mgbe ahụ “ụwa ga-ejupụta n’ọmụma ebube Jehova, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Habakuk 2:14) Tupu oge ahụ dị ebube eruo, ka anyị gbasoo ezi ihe nlereanya Habakuk. Ka anyị ‘na-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova, na-etegharịkwa egwú ọṅụ n’ime Chineke nke nzọpụta anyị,’ mgbe nile.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú ekpere Habakuk pụrụ isi metụta anyị?

• N’ihi gịnị ka Jehova ji zọlie ije?

• Gịnị ka amụma Habakuk na-ekwu banyere nzọpụta?

• Àgwà dị aṅaa ka anyị kwesịrị iji na-echere oké ụbọchị Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 23]

Ị̀ maara ike Chineke ga-eji eme ihe megide ndị ajọ omume n’Amagedọn?