Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Mkpịsị Ugodi nke Ihe Ịga nke Ọma?

Gịnị Bụ Mkpịsị Ugodi nke Ihe Ịga nke Ọma?

Gịnị Bụ Mkpịsị Ugodi nke Ihe Ịga nke Ọma?

ỤMỤ okoro abụọ obi kara ji nlezianya na-akwadebe otu ígwè ọrụ dị ịtụnanya maka nnwale dị oké mkpa. Na mberede, oké ifufe buliri ígwè ahụ na-esighị ike elu ma kụpịa ya n’ala n’ụzọ na-adachi ntị. N’ịbụ ndị nwere nkụda mmụọ, ndị ikom ahụ kwụụrụ n’ekwughị okwu. Ọrụ ike ha, nke ha ji mkpachapụ anya rụọ, dakasịrị ghọọ ikpo osisi na ígwè hịkọsịrị ahịkọ.

Nye Orville na Wilbur Wright, ihe ahụ merenụ n’ụbọchị October ahụ na 1900 abụghị ihe ndọghachi azụ mbụ na-ekoropụ obi ha nweworo ná mgbalị ha na-eme ịrụ ígwè dị arọ karịa ifufe bụ́ nke ga na-efe efe. Ha etinyeworị afọ ụfọdụ na ego buru ibu n’ime nchọpụta.

Otú ọ dị, n’ikpeazụ, ịnọgidesi ike n’ihe ha rụpụtaara ha ezi ihe. Na December 17, 1903, na Kitty Hawk, North Carolina, U.S.A., ụmụnne abụọ ahụ bụ́ ụmụ Wright mesịrị nwee ike izipụ ụdị mbụ nke ụgbọ injin na-ebugharị bụ́ nke fere n’elu ruo sekọnd 12—nke dị nnọọ mkpirikpi ma e were ya tụnyere otú ụgbọelu si efe ugbu a, ma ọ dịtere nnọọ aka ruo n’ókè nke ịgbanwe ụwa ruo mgbe ebighị ebi!

Inwe ihe ịga nke ọma n’ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị a na-eme eme na-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’iji ndidi nọgide na-eme ha. Ma ọ̀ bụ ịmụta asụsụ ọhụrụ, ịmụ aka ọrụ, ma ọ bụ ọbụna ịzụlite mmekọrịta, a na-arụzu ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị bara uru nanị site ịnọgide na-eme mgbalị. “Ugboro itoolu n’ime ugboro iri,” ka onye na-ede akwụkwọ bụ́ Charles Templeton na-ekwu, “a na-asị na ihe ịga nke ọma na-esite kpọmkwem n’otu ihe: ịrụsi ọrụ ike.” Onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ, bụ́ Leonard Pitts, Jr., na-ekwu, sị: “Anyị na-ekwu ihe banyere inwe nkà, anyị na-enwe mmasị n’ihe ndabara ọma, ma mgbe mgbe nnọọ, anyị na-elefuru ihe ndị kasị mkpa anya. Nrụsi ọrụ ike na inwe ọtụtụ ọdịda. Ogologo oge nke ịrụ ọrụ.”

Nke a na-emesi ihe Bible kwuru ogologo oge gara aga ike, nke sịrị: “Aka ndị dị nkọ ga-achị achị.” (Ilu 12:24) Ịdị nkọ pụtara na anyị ga-anọgidesi ike na-eme mgbalị. Nke a dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-arụzu ihe anyị malitere ịrụ. Gịnị bụ ịnọgidesi ike n’ihe? Olee otú anyị pụrụ isi nọgidesie ike ná nchụso anyị na-achụso ihe mgbaru ọsọ anyị, na gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịnọgidesi ike? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-esonụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Foto U.S. National Archives