Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ịga nke Ọma Site n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe

Ihe Ịga nke Ọma Site n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe

Ihe Ịga nke Ọma Site n’Ịnọgidesi Ike n’Ihe

ỊNỌGIDESI ike n’ihe bụ́ ihe bara uru aghọwo nke a na-adịghị ahụkebe n’oge a. Ọtụtụ mmadụ kweere na inwe ihe ịga nke ọma dabeere n’ịnọ n’ebe kwesịrị ekwesị n’oge kwesịrị ekwesị karịa ka ọ dabeere n’ịnọgidesi ike n’ihe. Ònye pụrụ ịta ha ụta? Okwu ndị e ji akpọsa ngwá ahịa jupụtara n’usoro mgbasa ozi bụ́ ndị na-eji ụzọ nzuzo enye echiche na ị pụrụ inweta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile ị chọrọ site n’ime mgbalị dị nta na itinyetụkwu obere ego. Akwụkwọ akụkọ na-enupụta akụkọ ndị na-ekwu banyere ndị ọ zụrụ taa baa echi na ụmụaka ndị na-achụ nta ego bụ́ ndị na-akpata ọtụtụ nde naịra ozugbo ha gụsịrị akwụkwọ.

Onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Leonard Pitts na-akwa arịrị, sị: “N’etiti ọha na eze nwere oké mmasị n’ịmata ihe, ọ na-adị ka ọ dị nnọọ mfe. . . . Ọ na-eyi ihe onye ọ bụla pụrụ ime ma ọ bụrụhaala na ọ ghọtara wayo dị na ya, nwee ikike ya, ma ọ bụ nweta enyemaka Chineke.”

Gịnị Bụ Ịnọgidesi Ike n’Ihe?

Ịnọgidesi ike n’ihe pụtara ‘iguzosi ike ná nzube, ọnọdụ, ma ọ bụ n’ọrụ ụfọdụ n’agbanyeghị ihe mgbochi ma ọ bụ ihe ndọghachi azụ.’ Ọ gụnyere ịnọgide na-enwe mkpebi siri ike n’agbanyeghị ahụhụ, ịbụ onye na-adịghị ahapụ ihe, onye na-adịghị ada mbà n’obi. Bible na-egosipụta mkpa àgwà a dị. Dị ka ihe atụ, Okwu Chineke na-adụ anyị ọdụ, sị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze Ya,” “kụọnụ, a ga-emeghekwara unu,” “n’akụkụ ekpere unu, na-anọgidesinụ ike,” nakwa “jidesienụ ihe ọma ike.”—Matiu 6:33; Luk 11:9; Ndị Rom 12:12; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:21.

Akụkụ dị mkpa nke ịnọgidesi ike n’ihe bụ ịnagide ihe ndọghachi azụ ndị ga-abịarịrịnụ. Ilu 24:16 na-ekwu, sị: “Ugbo asaa ka onye ezi omume na-ada, biliekwa ọzọ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Kama ‘ịkwụsị ime ihe ọ bụla’ mgbe o zutere ihe isi ike ma ọ bụ ọdịda, onye na-anọgidesi ike n’ihe ‘na-ebili,’ ‘na-anọgide,’ ma na-eme mgbalị ọzọ.

Otú ọ dị, ọtụtụ ndị adịghị njikere maka ihe isi ike na ọdịda ndị ha pụrụ inweta. Ebe ọ bụ na ha azụlitebeghị ọchịchọ nke ịnọgidesi ike n’ihe, ọ naghị ara ahụ ha enwee ịda mbà n’obi. “Ọtụtụ mmadụ na-emeghachi omume n’ụzọ na-ewetara ha mmerụ ahụ mgbe ha nwere ọdịda,” ka onye edemede bụ́ Morley Callaghan na-ekwu. “Ha na-emikpu onwe ha n’irubigara onwe ha uju ókè, ha na-ata onye ọ bụla ụta, iwe na-amalite iwe ha, . . . ha na-akwụsịkwa ime ihe ọ bụla.”

Nke a dị mwute. “Anyị na-echefu,” ka Pitts na-ekwu, “na e nwere ihe mere a ga-eji gabiga ule, e nwere uru dị n’ahụhụ.” Olee uru dị na ya? Ọ na-ekwubi, sị: “[Mmadụ] na-amụta na ọdịda adịghị egbu egbu, ịbụ onye e meriri adịghị adịrukwa ebighị ebi. Mmadụ na-amụtakwu ihe. Mmadụ na-adị njikere.” Bible kwuru ya n’ụzọ dị mfe, sị: “Ná ndọgbu nile nke mmadụ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ uru dị ya.”—Ilu 14:23.

N’ezie, ịgawakwa n’ihu mgbe e nwesịrị ndọghachi azụ anaghị adịcha mfe mgbe nile. Mgbe ụfọdụ anyị na-eche ihe ịma aka ndị pụrụ iyi ka ha na-eguzogide mgbalị nile anyị na-eme iji merie ha, ihu. Kama ịdị na-abịaru nso, ihe mgbaru ọsọ anyị pụrụ iyi ka ha na-agbapụkwu ihu ruo ebe a na-agaghị ahụzi ha anya. Anyị pụrụ inwe mmetụta nke ịbụ ndị a karịrị ike, ndị na-apụghị ime ihe, anyị pụkwara ịkụda aka, ọbụna daa mbà n’obi. (Ilu 24:10) Ma, Bible na-agba anyị ume, sị: “Ma ike agwụla anyị n’obi n’ime ihe ọma: n’ihi na anyị ga-eweta ihe ubi mgbe oge ya ruru, ma anyị adaghị mbà.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ndị Galetia 6:9.

Gịnị Pụrụ Inyere Anyị Aka Ịnọgidesi Ike n’Ihe?

Nzọụkwụ mbụ maka ịnọgidesi ike n’ime ihe mmadụ họọrọ ime bụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ bara uru na ndị a pụrụ iru eru. Pọl onyeozi ghọtara nke a n’ezie. Ọ gwara ndị Kọrint, sị: “Mụ onwe m na-agba ọsọ otú a, dị ka onye na-adịghị agba n’eleghị anya ihe; otú a ka m na-esu ọkpọ, dị ka onye na-adịghị apịa ifufe.” Pọl maara na ọ bụrụ na ya chọrọ ka mgbalị ya gaa nke ọma, na ọ ga-adị ya mkpa inwe ihe mgbaru ọsọ ndị doro anya, dị ka ọgba ọsọ nke na-atụkwasị uche ya n’ịgbafe ebe a na-agbadebe ọsọ. “Ùnu amataghị na ndị na-agba ọsọ n’ebe ọsọ, ha nile na-agba ọsọ, ma ọ bụ otu onye na-agbata ihe ọsọ? Na-agbanụ otú a, ka unu wee gbata.” (1 Ndị Kọrint 9:24, 26) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a?

“Onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya,” ka Ilu 14:15 na-ekwu. Ọ bụ ihe amamihe ịtụleghachi atụmatụ anyị site n’oge ruo n’oge, na-ajụ onwe anyị ebe anyị na-aga nakwa ma ọ̀ dị mkpa ime mgbanwe. Ọ dị mkpa iburu nnọọ ihe anyị chọrọ ịrụzu na ihe mere anyị ji chọọ ịrụzu ya n’uche. Anyị agaghị enwekarị ọchịchọ ịkwụsị ihe anyị na-eme ma ọ bụrụ na anyị eburu nnọọ nzube anyị ji na-eme ya n’uche. “Ka anya gị abụọ legide n’ihu,” ka Ilu ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ na-agba ume, ka e wee nwee ike ‘idozi ụzọ gị nile.’—Ilu 4:25, 26.

Mgbe ị matasịworo ihe mgbaru ọsọ gị, nzọụkwụ ọzọ bụ ịtụle otú ị ga-esi ruo ha. Jisọs jụrụ, sị: “Ònye n’ime unu, nke na-achọ iwu ụlọ elu, n’ebughị ụzọ nọdụ ala gụọ ego ọ ga-ewe?” (Luk 14:28) N’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ a, otu ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike uche kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ndị m chọpụtaworo banyere ndị nwere ihe ịga nke ọma bụ na ha na-aghọta n’ụzọ doro anya njikọ dị n’etiti ihe kpatara ihe na mmetụta o nwere ná ndụ ha. Ndị nwere ihe ịga nke ọma na-aghọta na ọ bụrụ na ha chọrọ inweta ihe, ha aghaghị ime ihe nile dị mkpa iji nweta ya.” Ịghọta nnọọ nzọụkwụ nile dị anyị mkpa iwere iji rụzuo ihe anyị chọrọ ga-enye aka ime ka anyị lekwasị anya na ya. Ọ ga-emekwa ka ọ kara anyị mfe ịgawakwa n’ihu ma ọ bụrụ na anyị enwee ndọghachi azụ. Ntụle dị otú ahụ bụ mkpịsị ugodi nke ihe ịga nke ọma Orville na Wilbur Wright.

N’ihi ya, mgbe i nwere ndọghachi azụ, mee ihe nile i nwere ike ime iji lee ha anya n’ụzọ ziri ezi nakwa dị ka ahụmahụ e ji amụta ihe. Tụlee ọnọdụ ahụ, chọpụta ebe ị na-emezighị emezi, mgbe ahụ dozie ihie ụzọ ahụ ma ọ bụ adịghị ike ahụ. Ịkọsara ndị ọzọ na-enye aka, ebe ọ bụ na “echiche nile na-eji ndụmọdụ guzosie ike.” (Ilu 20:18) Dị ka ọ na-adịkarị, ị ga-enwetakwu nkà ná mgbalị nke ọ bụla, bụ́ nke ga-emesị tụnye ụtụ n’ihe ịga nke ọma gị.

Akụkụ nke atọ nke ịnọgidesi ike n’ihe bụ ịnọgide na-eme ihe ahụ. Pọl onyeozi na-agba anyị ume, sị: “N’ihe ahụ anyị gbaruru, ka anyị na-agazi dị ka ihe ahụ si dị.” (Ndị Filipaị 3:16) Dị ka otu onye ọkà nkụzi si kwuo ya, “imeru ihe n’ókè na ịnọgide na-eme ihe ruo oge ụfọdụ na-arụpụta ihe ndị dị ịrịba ama.” E gosipụtara nke a nke ọma n’akụkọ ifo Aesop ahụ a maara n’ebe nile banyere mbe na òké bekee. Mbe meriri n’ọsọ ahụ, n’agbanyeghị na òké bekee ka ya agba ọsọ. N’ihi gịnị? N’ihi na mbe ji ịnọgidesi ike n’ihe na àgwà kwesịrị ekwesị so ya. Ọ kwụsịghị kama ọ họọrọ ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ọ ga-agbali, mgbe ahụ kwa, ọ gbagidere ya ruo mgbe o ruru ebe a na-agbadebe. Ebe ọ bụ na onye haziri onwe ya ahazi, nke na-anọgidesi ike na-anọgide na-enwe ọganihu, ọ na-anọgide na-enwe mkpali, o yikarịghịkwa ka ọ ga-akwụsị ma ọ bụ bụrụ onye e meriri n’ọsọ ahụ. Ee, “na-agbanụ otú a,” ka unu wee ruo ihe mgbaru ọsọ unu.

Ịhọrọ Ihe Mgbaru Ọsọ Ndị Bara Uru

Otú ọ dị, iji mee ka ịnọgidesi ike n’ihe baa uru ọ bụla, ọ dị anyị mkpa inwe ihe mgbaru ọsọ ndị bara uru. Ọtụtụ ndị na-achụso ihe ndị na-adịghị eweta obi ụtọ. Ma Bible na-ekwu, sị: “Onye nyochaworo n’ime iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe ya, nke na-anọgidekwa otú a . . . ga-abụ onye ngọzi n’omume ya.” (Jemes 1:25) Ee, ịmụ ihe iji ghọta iwu Chineke dị ka e depụtara ya n’ime Bible, bụ ihe mgbaru ọsọ bara nnọọ uru. N’ihi gịnị? N’ụzọ bụ́ isi, ọ bụ n’ihi na iwu Chineke dabeere n’ụkpụrụ ya ndị zuru okè ma zie ezi. Dị ka Onye Okike, ọ maara ihe kasị mma maka ihe ndị o kere eke. Ya mere, ọ bụrụ na anyị anọgide na-amụ ntụziaka Chineke ma na-etinye ha n’ọrụ ná ndụ anyị, ịnọgidesi ike n’ihe dị otú ahụ ga-ewetara anyị obi ụtọ n’ezie. “Tụkwasị Jehova obi gị nile, . . . n’ụzọ gị nile mara Ya, Ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi,” ka Ilu 3:5, 6 na-ekwe nkwa ya.

Tụkwasị na nke a, inweta ihe ọmụma banyere Chineke na banyere Jisọs “bụ ndụ ebighị ebi,” ka Jisọs na-ekwu. (Jọn 17:3) Amụma Bible na-egosi na anyị na-ebi “na mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe a. (2 Timoti 3:1-5; Matiu 24:3-13) N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke, ọchịchị ezi omume ya, ga-achị ndị bi n’ụwa. (Daniel 2:44; Matiu 6:10) Ọchịchị a ga-ewetara ihe a kpọrọ mmadụ oge udo, ọganihu, na ọnọdụ ọma a na-enwetụbeghị ụdị ya. (Abụ Ọma 37:10, 11; Mkpughe 21:4) “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu,” ka Ọrụ 10:34 na-ekwu. Ee, a na-akpọ onye ọ bụla òkù inweta abamuru ndị ahụ!

Bible bụ akwụkwọ ochie nke amamihe na nghọta jupụtara na ya. Ịghọta ya na-ewe oge na mgbalị. Ma site n’enyemaka Chineke—ọ bụrụkwa na anyị anọgide na-achọ ihe ọmụma ya—ọ ga-abụ akwụkwọ anyị ga-aghọta. (Ilu 2:4, 5; Jemes 1:5) N’eziokwu, itinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ime mgbanwe n’echiche ma ọ bụ n’àgwà anyị. Ndị enyi ma ọ bụ ndị òtù ezinụlọ na-echere anyị ezi echiche pụrụ ọbụna iguzogide ọmụmụ anyị na-amụ Bible. N’ihi ya ịnọgidesi ike n’ihe dị oké mkpa. Pọl onyeozi na-echetara anyị na Chineke ga-enye ndị na-egosipụta “ntachi obi n’ezi ọrụ” ndụ ebighị ebi. (Ndị Rom 2:7) Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka iru ihe mgbaru ọsọ a.

Jide n’aka na ị ga-enwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na ị nọgidesie ike n’ịmụ banyere Chineke na uche ya, na-anọgidesikwa ike n’itinye ihe ị na-amụta n’ọrụ.—Abụ Ọma 1:1-3.

[Foto dị na peeji nke 6]

Ị ga-enwe ihe ịga nke ọma ma ọ bụrụ na ị nọgidesie ike n’ịmụ banyere Chineke na uche ya

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]

Culver Pictures