Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Inyere Ụdị Mmadụ Nile Aka na Netherlands

Inyere Ụdị Mmadụ Nile Aka na Netherlands

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

Inyere Ụdị Mmadụ Nile Aka na Netherlands

ABRAHAM bụ nwoke nwere okwukwe pụrụ iche. “Mgbe a kpọrọ Abraham,” ka Pọl onyeozi kwuru, ọ ṅara ntị n’olu Chineke ma “pụọ, n’amaghị ebe ọ na-eje.” Mgbe ya na ezinụlọ ya kwapụsịrị, Abraham “biri dị ka ọbịa n’ala nke e kwere ya rịị ná nkwa” ruo narị afọ ikpeazụ nke ndụ ya.—Ndị Hibru 11:8, 9.

N’otu aka ahụ taa, ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova anakwerewo ihe ịma aka nke ịkwaga mba ọzọ iji jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ndị ọzọ amụwo asụsụ ọzọ ka ha wee nwee ike ịgbara ndị si mba ọzọ kwabata ná mba nke ha, àmà. Dị ka ihe atụ ndị na-esonụ na-egosi, mmụọ ọma a emeghewo “ọnụ ụzọ dị ukwuu nke a ga-ejikwa rụsie ọrụ ike” na Netherlands, bụ́ ebe otu nde n’ime nde mmadụ 15 bi na ya, si mba ọzọ.—1 Ndị Kọrint 16:9.

□ Bahram, onye na-akụzibu Kung Fu, si ná mba dị n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. O nwetara otu Bible na ụfọdụ mbipụta nke Watch Tower. N’ime otu ọnwa, Bahram chọpụtara na ọ chọtawo eziokwu ahụ. A maliteere ya na nwunye ya ọmụmụ ihe, ma e nwere nsogbu dịnụ—onye na-akụziri ha Bible adịghị asụ asụsụ ha. Ha ji mmegharị ahụ, “aka na ụkwụ” kwurịta okwu, dị ka ha chetara. Ka oge na-aga, Bahram na nwunye ya chọtara otu ọgbakọ ji asụsụ ala ha eme ihe, ha nwekwara ọganihu dị ngwa ka e mesịrị. Bahram bụ Onyeàmà e mere baptism ugbu a.

□ Otu di na nwunye bụ́ ndị Netherlands bụ́ ndị ọsụ ụzọ jekwuuru otu nwoke bụ́ onye Indonesia nke guzo n’ihu otu nnukwu ụlọ ahịa. O juru ya anya n’ụzọ na-enye obi ụtọ mgbe di na nwunye ahụ gwara ya okwu n’asụsụ ya. E meziri ndokwa ịkpọtụrụ ya n’ebe obibi ya. A chọpụtara na o biwo na Russia ruo ihe karịrị afọ 20, bụ́ mgbe o ji ghọọ ọkachamara n’ọrịa ụmụ nwanyị. Ọ zọọrọ na ya ekweghị na Chineke dị, ma o kwetara na mgbe ọ bụla o jiri nwanyị ime, ọ ghaghị inwe ihe ijuanya, “Lee nnọọ ka ahụ mmadụ si zuo okè! Lee ọrụ ebube ọ bụ!” O kwetara ịmụ Bible, n’oge na-adịghịkwa anya o kwetara na e nwere Onye Okike nke na-eche banyere ihe a kpọrọ mmadụ. (1 Pita 5:6, 7) Ugbu a ọ bụ nwanna nwoke e mere baptism, ọ na-ejekwa ozi n’ọgbakọ na-asụ Indonesian nke dị n’Amsterdam.

□ Na Rotterdam, bụ́ obodo nwere otu n’ime ọdụ ụgbọ mmiri ndị kasị ukwuu n’ụwa, otu ìgwè ndị ọsụ ụzọ enwewo nkà n’ime nkwusa nye ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-alọbata n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ kwa ụbọchị. N’ihi ọrụ nke ìgwè ndị nkwusa a na-anụ ọkụ n’obi, ọtụtụ ndị ọrụ ụgbọ mmiri, gụnyere otu onyeisi ụgbọ mmiri, otu onye agha ụgbọ mmiri, na onye bụbu onye nche, anatawo eziokwu ahụ. Ugbu a ha onwe ha kwa na-enye aka agbasa ozi ọma nke Alaeze Chineke n’ụwa nile.—Matiu 24:14.

Dị ka ọ dị n’akụkụ ndị ọzọ nke ụwa, Ndịàmà Jehova nọ na Netherlands kpebisiri ike ime òkè ha n’ịkpọsara mba nile, ebo nile, asụsụ nile, na ndị nile ozi ọma ebighị ebi ahụ.—Mkpughe 14:6.