Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Agaghị Anọ Ọdụ

Jehova Agaghị Anọ Ọdụ

Jehova Agaghị Anọ Ọdụ

“Ọ bụrụ na [ọhụụ ahụ] laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.”—HABAKUK 2:3.

1. Mkpebi dị aṅaa ka ndị Jehova gosipụtaworo, gịnịkwa ka nke a kwaliworo ha ime?

“N’ELU ebe m na-eche ka m ga-eguzo.” Nke ahụ bụ mkpebi nke onye amụma Chineke bụ́ Habakuk. (Habakuk 2:1) Ndị Jehova na narị afọ nke 20 egosipụtawo otu mkpebi ahụ. N’ihi ya, ha ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi zaa oku ahụ a kpọrọ n’otu mgbakọ dị ịrịba ama e nwere na September 1922: “Nke a bụ ụbọchị kachasị ụbọchị nile. Lee, Eze ahụ na-achị achị! Unu bụ ndị mgbasa ozi ya. Ya mere kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ, Eze ahụ na alaeze ya.”

2. Mgbe e weghachiri ha n’ọnọdụ nke ịrụsi ọrụ ike mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, gịnị ka ndị Kraịst e tere mmanụ pụrụ ikwupụta?

2 Mgbe Agha Ụwa Mbụ gasịrị, Jehova weghachiri ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ n’ọnọdụ nke ịrụsi ọrụ ike. Dị ka Habakuk, onye nke ọ bụla n’ime ha pụziri ikwupụta, sị: “[M ga-eguzo] onwe m n’elu ebe e wusiri ike, m ga-echekwa ịhụ ihe Ọ ga-ekwu megide m.” E ji okwu Hibru pụtara ‘iche nche’ mee ihe ugboro ugboro n’ọtụtụ amụma.

“Ọ Gaghị Anọ Ọdụ”

3. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji nọrọ na nche?

3 Ka Ndịàmà Jehova na-akpọsa ịdọ aka ná ntị Chineke taa, ha aghaghị ịmụrụ anya mgbe nile ịṅa ntị n’okwu mmechi ndị dị n’oké amụma Jisọs: “Na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-abịa, ma ọ bụ n’anyasị, ma ọ bụ n’etiti abalị, ma ọ bụ mgbe oké ọkụkọ kwara, ma ọ bụ n’ụtụtụ; ka O wee ghara ịhụ unu ka unu na-arahụ ụra, ma ọ bụrụ na Ọ bịa na mberede. Ma okwu M na-agwa unu ka M na-agwa mmadụ nile, Na-echenụ nche.” (Mak 13:35-37) Dị ka Habakuk, nakwa n’ikwekọ n’okwu Jisọs, anyị aghaghị ịnọ na nche!

4. Olee otú ọnọdụ anyị si yie nke Habakuk n’ihe dị ka 628 T.O.A.?

4 Habakuk pụrụ idechawo akwụkwọ ya n’ihe dị ka 628 T.O.A., ọbụna tupu Babilọn aghọọ ike ụwa na-achịnụ. Ruo ọtụtụ afọ, a kpọsawo ikpe Jehova megide Jerusalem si n’ezi ofufe dapụ. Ma, e nweghị ihe ọ bụla doro anya e kwuru gosiri mgbe a ga-emezu ihe ahụ e kpere n’ikpe. Ònye gaara ekweta na ọ bụ nanị afọ 21 mgbe e mesịrị nakwa na Babilọn ga-abụ onye mmezu nke ihe Jehova kpere n’ikpe? N’otu aka ahụ taa, anyị amaghị ‘ụbọchị na oge awa’ e debere maka iweta usoro ihe a ná njedebe, ma Jisọs ebuwo ụzọ dọọ anyị aka ná ntị, sị: “Unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge awa nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.”—Matiu 24:36, 44.

5. Olee ihe na-agba ume karịsịa banyere okwu Chineke ndị e dekọrọ na Habakuk 2:2, 3?

5 E nwere ezi ihe mere Jehova ji nye Habakuk ọrụ a na-akpali akpali: “Dee ọhụụ ahụ n’elu mbadamba ihe dị iche iche, tụọ ya akịka, ka onye na-agụ ya wee gbaa ọsọ. N’ihi na ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakuk 2:2, 3) Taa, ajọ omume na ime ihe ike jupụtara ebe nile n’ụwa, na-egosi na anyị na-eguzo kpọmkwem n’ọnụ ọnụ nke “ụbọchị ahụ dị ukwuu dịkwa egwu” nke Jehova. (Joel 2:31) N’ezie, okwu mmesi obi ike nke Jehova n’onwe ya kwuru bụ ihe agbamume: “Ọ gaghị anọ ọdụ”!

6. Olee otú anyị pụrụ isi lanarị ụbọchị mmezu nke ihe e kpere n’ikpe na-abịanụ?

6 Mgbe ahụ, olee otú anyị pụrụ isi lanarị ụbọchị mmezu nke ihe e kpere n’ikpe? Jehova zara ya site n’igosi ọdịiche a dị n’etiti ndị ezi omume na ndị ajọ omume: “Lee, mkpụrụ obi ya afụliwo onwe ya, o zighị ezi n’ime ya: ma onye ezi omume ga-eji okwukwe ya dị ndụ.” (Habakuk 2:4) Ndị ọchịchị na ndị nkịtị dị mpako ma nwee anyaukwu emewo ka akụkọ ihe mere eme nke oge a jupụta n’ọbara nke ọtụtụ nde ndị aka ha dị ọcha nwụrụnụ, karịsịa n’agha ụwa abụọ na ná mgbuchapụ nke agbụrụ dị iche iche. N’ụzọ dị iche, ndị ohu Chineke e tere mmanụ bụ́ ndị hụrụ udo n’anya ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi tachie obi. Ọ bụ ha bụ “mba nke na-eme ezi omume nke na-edebe ikwesị ntụkwasị obi nile.” Mba a, tinyere ndị enyi ya, bụ́ “atụrụ ọzọ” ahụ, na-agbaso ndụmọdụ bụ́: “Tụkwasịnụ obi na Jehova ruo mgbe nile ebighị ebi: n’ihi na Ja Jehova bụ oké nkume nke mgbe nile ebighị ebi.”—Aịsaịa 26:2-4; Jọn 10:16.

7. N’ikwekọ n’otú Pọl si jiri Habakuk 2:4 mee ihe, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?

7 Mgbe ọ na-edegara ndị Hibru bụ́ ndị Kraịst akwụkwọ, Pọl onyeozi hotara Habakuk 2:4 mgbe ọ na-agwa ndị Jehova, sị: “Ntachi obi dị unu mkpa, ka ọ ga-abụ, mgbe unu meworo ihe Chineke na-achọ, ka unu wee nata nkwa ahụ. N’ihi na lee ka nwa oge nta fọdụrụ hà, Onye ahụ Nke na-abịa ga-abịa, Ọ gaghị anọkwa ọdụ. Ma onye ezi omume nke m ga-esite n’okwukwe dị ndụ: ọ bụrụkwa na ọ ga-ewezụga onwe ya, ihe ya adịghị mkpụrụ obi m ezi mma.” (Ndị Hibru 10:36-38) Oge anyị abụghị oge iselata aka ma ọ bụ ịdaba n’ọnyà nke ịbụ onye ụzọ ụwa nke Setan nke ịhụ ihe onwunwe na ihe ụtọ n’anya, riri isi. Gịnị ka anyị na-aghaghi ime ruo mgbe “nwa oge nta” ahụ gwụsịrị? Dị ka Pọl, anyị bụ́ ndị so ná mba dị nsọ nke Jehova aghaghị ‘isetịpụ aka n’ebe ihe nile dị n’ihu dị, na-agbakwuru oké ịgba ọsọ’ nke ndụ ebighị ebi. (Ndị Filipaị 3:13, 14) Dịkwa ka Jisọs, anyị aghaghị ‘ịtachi obi n’ihi ọṅụ e debere n’ihu anyị.’—Ndị Hibru 12:2.

8. Ònye bụ “nwoke” nke e kwuru banyere ya na Habakuk 2:5, n’ihi gịnị kwa ka ọ na-agaghị eji nwee ihe ịga nke ọma?

8 Habakuk 2:5 na-akọwa otu “nwoke” bụ́ onye, n’ụzọ dị iche n’ihe ndị ohu Jehova na-eme, na-erughị ihe mgbaru ọsọ ya, ọ bụ ezie na o ‘mewo ka ọchịchọ mkpụrụ obi ya saa mbara dị ka [Sheol, NW].’ Ònye bụ nwoke a ‘afọ na-adịghị eju eju’? N’ịbụ onye afọ na-adịghị eju eju dị ka Babilọn nke dị n’oge Habakuk, “nwoke” a ọtụtụ ndị mejupụtara bụ́ ike ọchịchị dị iche iche—ma hà bụ ndị Fascist, Nazi, Kọmunist, ma ọ bụ ọbụna ndị a sị na ha bụ ọchịchị onye kwuo uche ya—na-alụ agha iji gbasawanye ókèala ya. O jikwa ndị aka ha dị ọcha na-emejupụta Sheol, bụ́ ili. Ma “nwoke” a ọtụtụ ndị mejupụtara, nke dị aghụghọ, nke ụwa Setan, bụ́ onye nwere echiche gabigara ókè banyere ịdị mkpa ya, agaghị enwe ihe ịga nke ọma ‘n’ime ka mba nile zukọta n’ebe ọ nọ, na n’ịchịkọta ndị dị iche iche n’ebe ọ nọ.’ Ọ bụ nanị Jehova Chineke pụrụ ime ka ihe nile a kpọrọ mmadụ dị n’otu, ọ ga-emezukwa nke a site n’Alaeze Mesaịa ahụ.—Matiu 6:9, 10.

Nke Mbụ n’Ime Ahụhụ Ise Dị Egwu

9, 10. (a) Gịnị ka Jehova gara n’ihu ịma ọkwa ya site n’ọnụ Habakuk? (b) Banyere uru na-ezighị ezi, gịnị bụ ọnọdụ e nwere taa?

9 Site n’ọnụ onye amụma ya bụ́ Habakuk, Jehova gara n’ihu ịma ọkwa ahụhụ ise ga-esochi onwe ha, bụ́ ikpe ndị a na-aghaghị imezu n’ịkwadebe ụwa maka ndị na-efe Chineke n’ikwesị ntụkwasị obi ibi n’ime ya. Ndị dị otú ahụ obi ha ziri ezi ‘na-atụ ilu’ nke Jehova na-ekwupụta. Anyị na-agụ na Habakuk 2:6, sị: “Ahụhụ dịrị onye ahụ nke na-eme ka ihe na-abụghị nke ya baa ụba! ruo ole mgbe? onye ji ihe ibe ebogbu onwe ya!”

10 N’ebe a ihe e lekwasịrị anya bụ uru na-ezighị ezi. N’ime ụwa gbara anyị gburugburu, ndị ọgaranya na-abawanye ọgaranya, ndị ogbenye ana-adawanyekwa ogbenye. Ndị na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ na ndị nghọrị na-akpakọba akụ̀ dị ukwuu, ebe ọtụtụ n’ime ndị nkịtị na-anwụ n’agụụ. A na-ekwu na otu ụzọ n’ụzọ anọ nke ndị bi n’ụwa bụ ogbenye ọnụ ntụ. Ọnọdụ ibi ndụ dịkwa njọ n’ọtụtụ mba. Ndị agụụ ezi omume na-agụsi ike n’ụwa na-eti mkpu, sị: “Ruo ole mgbe” ka ajọ ihe ndị a ga na-amụba? Ma, njedebe ha dị nso! N’ezie, ọhụụ ahụ ‘agaghị anọ ọdụ.’

11. Gịnị ka Habakuk kwuru banyere nkwafu nke ọbara mmadụ, n’ihi gịnị kwa ka anyị pụrụ iji kwuo na e nwere oké ikpe ọmụma ọbara n’ụwa taa?

11 Onye amụma ahụ na-agwa onye ajọ omume, sị: “N’ihi na ị kwatawo ọtụtụ mba, ya ka ndị nile fọdụrụ n’ime ndị nile dị iche iche ga-akwata gị; n’ihi ọbara mmadụ na ihe ike e mere ala, nke e mere obodo na ndị nile bi n’ime ya.” (Habakuk 2:8) Lee oké ikpe ọmụma ọbara anyị na-ahụ n’ụwa taa! Jisọs kwuru hoo haa, sị: “Mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) N’agbanyeghị nke ahụ, na narị afọ nke 20 a nanị, mba na agbụrụ ndị ikpe ọbara mara akpatawo ogbugbu nke ihe karịrị otu narị nde ụmụ mmadụ. Ahụhụ ga-adịrị ndị na-ekere òkè ná nkwafu ọbara ndị a!

Ahụhụ nke Abụọ

12. Gịnị bụ ahụhụ nke abụọ Habakuk dekọrọ, oleekwa otú anyị pụrụ isi jide n’aka na uru aghụghọ ga-abụ ihe efu?

12 Ahụhụ nke abụọ, nke e dekọrọ na Habakuk 2:9-11, ga-adakwasị “onye na-eritere ụlọ ya uru ọjọọ, ido àkwụ́ ya n’elu, ka e wee napụta ya n’ọbọ aka ihe ọjọọ!” Uru aghụghọ ga-abụ ihe efu, dị ka ọbụ abụ ahụ na-eme ka o doo anya: “Atụla egwu mgbe mmadụ na-eme ọgaranya, mgbe nsọpụrụ nke ụlọ ya na-aba ụba: n’ihi na mgbe ọ nwụrụ ọ gaghị ewere ihe ahụ nile laa; nsọpụrụ ya agaghị arịda soo ya.” (Abụ Ọma 49:16, 17) Mgbe ahụ, o kwesịrị ka a rịba ndụmọdụ Pọl nke amamihe dị na ya ama: “Na-enye ndị bụ́ ọgaranya n’oge dị ugbu a iwu, ka ha ghara ịtụkwasị uche ha n’ihe dị elu, gharakwa ịtụkwasị obi n’ihe ahụ a na-ejighị aka, bụ́ akụ̀, kama ka ha tụkwasị obi na Chineke, Onye na-ewere akụ̀ Ya nye anyị ihe nile ka ha bụrụ ihe ga-atọ anyị ụtọ.”—1 Timoti 6:17.

13. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nọgide na-akpọsa ịdọ aka ná ntị Chineke?

13 Lee ka o si dị mkpa na a kpọsara ozi ikpe Chineke taa! Mgbe ndị Farisii megidere otuto ìgwè mmadụ toro Jisọs dị ka “Eze Nke na-abịa n’aha Onyenwe anyị,” o kwuru, sị: “Asị m unu na, ọ bụrụ na ndị a ekpuchie ọnụ ha, nkume ga-eti mkpu.” (Luk 19:38-40) N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na ndị Chineke taa ahapụ ikpughe ajọ omume dị n’ụwa, “nkume ga-esi ná mgbidi tie mkpu.” (Habakuk 2:11) Ya mere ka anyị jiri obi ike nọgide na-akpọsa ịdọ aka ná ntị Chineke!

Ahụhụ nke Atọ na Okwu Banyere Ikpe Ọmụma Ọbara

14. Olee ikpe ọmụma ọbara maworo okpukpe ndị dị n’ụwa?

14 Ahụhụ nke atọ a mara ọkwa ya site n’ọnụ Habakuk tụlere okwu banyere ikpe ọmụma ọbara. Habakuk 2:12 na-asị: “Ahụhụ dịrị onye ji ọbara ewu obodo, onye jikwa ajọ omume mee ka obodo guzosie ike!” N’usoro ihe a, ajọ omume na mwụfu ọbara na-agakọtakarị. N’ụzọ dị ịrịba ama, ọ bụrụwo okpukpe ndị dị n’ụwa kpatara ihe ka ukwuu ná mwụfu ọbara kasị njọ e nweworo n’akụkọ ihe mere eme. Ka anyị hota nanị Agha Ntụte, bụ́ ndị mere ka ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst na ndị Alakụba busorịta ibe ha agha; Njụta Okwukwe ndị Katọlik nke e mere na Spain nakwa na Latin America; Agha Iri Afọ Atọ nke Europe bụ́ nke ndị Protestant na ndị Katọlik lụrụ; na agha ụwa abụọ ndị a lụrụ na narị afọ anyị a, bụ́ ndị a kasị wụfuo ọbara na ha, bụ́ ndị malitechara n’ógbè Krisendọm.

15. (a) Gịnị ka mba dị iche iche nọgideworo na-eme ná nkwado ma ọ bụ nkwenye nke chọọchị? (b) Mba Ndị Dị n’Otu ọ̀ pụrụ igbochi ngwá agha ijupụta n’ụwa?

15 Otu n’ime akụkụ ndị kasị njọ n’agha ụwa nke abụọ bụ Oké Mgbukpọ ahụ ndị Nazi mere bụ́ nke tara isi ọtụtụ nde ndị Juu na ndị ọzọ aka ha dị ọcha na Europe. Ọ bụ nanị na nso nso a ka ndị isi Roman Katọlik nọ na France kwupụtara na ha emeghị ihe iji megide nziga e zigara ọtụtụ narị puku ndị mmadụ n’ogige ọnwụ nke ndị Nazi. N’agbanyeghị nke ahụ, mba dị iche iche ka nọgidere na-ejikere ịwụfu ọbara, na-enwe nkwado ma ọ bụ nkweta nke chọọchị. N’ikwu banyere Chọọchị Ọtọdọks nke Russia, magazin bụ́ Time, (mbipụta na-aga mba ndị ọzọ) kwuru na nso nso a, sị: “Chọọchị ahụ a tụteghachiri nwekwara ikike dị ukwuu n’akụkụ ebe e cheburu na ọ gaghị ekwe omume: ìgwè ndị agha Russia. . . . Ịgọzi ụgbọelu e ji alụ agha na ogige ndị agha aghọwo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe a na-ahụ mgbe nile. Na November, n’Ebe Obibi Ndị Mọnk nke Danilovsky dị na Moscow, bụ́ isi ọnọdụ nke Ndị Bishọp Chọọchị Ọtọdọks nke Russia, chọọchị ruru n’ókè nke ịgọzi nkwakọba ngwá agha nuklia nke ndị Russia.” Mba Ndị Dị n’Otu ọ̀ pụrụ igbochi ngwá agha ndị jọgburu onwe ha ijupụta n’ụwa? Ọ dịghị ma ọlị! Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Guardian nke London, England, si kwuo, otu onye nwetara Onyinye Nobel Maka Ime Udo kwuru, sị: “Ihe na-akpata oké nchegbu n’ezie bụ na mba ise so ná ndị òtù a na-adịghị agbanwe agbanwe nke Òtù Nchebe nke UN bụ mba ise bụ́ isi na-ere ngwá agha n’ụwa.”

16. Gịnị ka Jehova ga-eme mba ndị na-akpasu agha?

16 Jehova ọ̀ ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi mba ndị na-akpasu agha? Habakuk 2:13 na-ekwu, sị: “Lee, ó siteghị na Jehova nke usuu nile nke ndị agha na ndị dị iche iche na-adọgbu onwe ha n’ọrụ nye ọkụ, na ike na-agwụkwa mba nile n’efu?” “Jehova nke usuu nile nke ndị agha”! Ee, Jehova nwere usuu ndị agha bụ́ ndị mmụọ ozi nke eluigwe, bụ́ ndị ọ ga-eji bibie ndị mmadụ na mba ndị na-enwe mmasị n’ịlụ agha!

17. Ruo ókè ha aṅaa ka ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa mgbe e mezusịrị ihe o kpere n’ikpe n’isi ọtụtụ mba ndị na-eme ihe ike?

17 Gịnị ga-esochi mgbe Jehova mezusịrị ihe e kpere n’ikpe n’isi ọtụtụ mba ndị a na-eme ihe ike? Habakuk 2:14 na-enye azịza ya: “Ụwa ga-ejupụta n’ọmụma ebube Jehova, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” Lee atụmanya magburu onwe ya ọ bụ! N’Amagedọn, a ga-ewepụ ọbụbụeze Jehova n’ụta ruo mgbe ebighị ebi. (Mkpughe 16:16) Ọ na-emesi anyị obi ike na ya ‘ga-eme ka ọnọdụ ụkwụ ya abụọ nwee nsọpụrụ,’ bụ́ ụwa a anyị bi n’elu ya. (Aịsaịa 60:13) A ga-akụziri ihe nile a kpọrọ mmadụ ụzọ ndụ nke Chineke, nke na ihe ọmụma ha nwere banyere nzube Jehova ndị dị ebube ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si ejupụta oké osimiri.

Ahụhụ nke Anọ na nke Ise

18. Gịnị bụ ahụhụ nke anọ a mara ọkwa ya site n’ọnụ Habakuk, oleekwa otú o si pụta ìhè n’ọnọdụ omume e nwere n’ụwa taa?

18 A kọwara ahụhụ nke anọ na Habakuk 2:15 n’okwu ndị a: “Ahụhụ dịrị onye na-eme ka mmadụ ibe ya ṅụọ ihe, onye na-agwakọta ya na ọnụma gị, ọzọ, ị na-emekwa ka ọ ṅụbiga mmanya ókè, ka i wee legide ọtọ ha anya!” Nke a na-enye echiche nke ọnọdụ rụrụ arụ, nke nnupụisi ụwa nke oge a. Omume ya rụrụ arụ, nke ọbụna òtù okpukpe ndị na-agbachi ihe ọjọọ nkịtị na-akwado, akawo nnọọ njọ. Ọrịa ọjọọ ndị dị ka AIDS na ọrịa ndị ọzọ a na-ebute site ná mmekọahụ, na-agbasa n’ụwa nile. Kama igosipụta “ebube Jehova,” ọgbọ nke ịchọ nanị ọdịmma onwe onye nke dị taa na-emikpuwanye n’ịrụ arụ, na-agarukwa ná mmezu nke ikpe Chineke. N’ịbụ nke ‘afọ ihere juworo karịa nsọpụrụ,’ n’isi nso, ụwa a na-enupụ isi gaje ịṅụ ihe site n’ọkwá nke ọnụma Jehova, nke na-anọchite anya ihe O bu n’uche ime ya. ‘Ihere nke jọgburu onwe ya ga-adịkwa n’elu ebube ya.’—Habakuk 2:16.

19. Ihe buteere ahụhụ nke ise ahụ Habakuk mara ọkwa ya ụzọ metụtara gịnị, n’ihi gịnị kwa ka okwu ndị dị otú ahụ ji baa uru n’ụwa nke oge a?

19 Ihe butere ahụhụ nke ise ụzọ na-adọsi aka ná ntị ike megide ife ihe oyiyi a kpụrụ akpụ ofufe. Jehova mere ka onye amụma ahụ kpọsaa okwu ndị a dị ike: “Ahụhụ dịrị onye na-asị osisi, Teta; nke na-asị nkume dara ogbi, Kpọtee onwe gị! Nke a, ọ̀ ga-ezi ihe? Lee, ihe a bụ ihe e ji ọlaedo na ọlaọcha machite, ọ dịghịkwa mmụọ ọ bụla dị n’ime ya.” (Habakuk 2:19) Ruo taa, ma Krisendọm ma ndị a sị na ha bụ ndị ọgọ mmụọ na-akpọ isiala nye obe, Madona, ihe oyiyi, na ihe ndị ọzọ yiri mmadụ na anụ ọhịa. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a pụrụ iteta iji zọpụta ndị na-efe ya mgbe Jehova bịara imezu ihe o kpere n’ikpe. Ọlaedo na ọlaọcha e ji machite ha adịtụghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ịdị ebube nke Chineke ahụ nke na-adịru mgbe ebighị ebi, bụ́ Jehova, na ebube nke ihe ndị o kere eke dị ndụ. Ka anyị too aha ya na-enweghị atụ ruo mgbe ebighị ebi!

20. Ndokwa ụlọ nsọ dị aṅaa ka anyị nwere ihe ùgwù nke iji ọṅụ na-eje ozi na ya?

20 Ee, Chineke anyị, bụ́ Jehova, ruru eru inweta otuto nile. N’inwe nsọpụrụ ofufe dị omimi n’ebe ọ nọ, ka anyị ṅaa ntị n’ịdọ aka ná ntị a siri ike megide ikpere arụsị. Ma gee ntị! Jehova ka na-ekwu okwu: “Jehova nọ n’ụlọukwu Ya dị nsọ: dere duu n’ihu Ya, gị ụwa nile.” (Habakuk 2:20) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na onye amụma ahụ bu ụlọ nsọ Jerusalem n’uche. Otú ọ dị, taa anyị nwere ihe ùgwù nke ife ofufe ná ndokwa ụlọ nsọ ime mmụọ ka ebube, ebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-eje ozi dị ka Onyeisi Nchụàjà. N’ebe a, n’ogige elu ala nke ụlọ nsọ ahụ, anyị na-ezukọ, na-eje ozi, ma na-ekpe ekpere, na-enye Jehova nsọpụrụ ruuru aha ya dị ebube. Leekwa ọṅụ anyị na-enwe n’ife Nna anyị nke eluigwe na-ahụ n’anya ofufe sitere n’ezi obi!

Ị̀ Na-echeta?

• Olee otú i si ele okwu Jehova bụ́: “Ọ gaghị anọ ọdụ,” anya?

• Gịnị ka ahụhụ ndị ahụ a mara ọkwa ha site n’ọnụ Habakuk pụtara n’oge a?

• N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nọgide na-akpọsa ịdọ aka ná ntị Jehova?

• Olee ụlọ nsọ nke anyị nwere ihe ùgwù nke ije ozi n’ogige ya?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto ndị dị na peeji nke 15]

Dị ka Habakuk, ndị ohu Chineke nke oge a maara na Jehova agaghị anọ ọdụ

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Ị̀ na-enwe ekele maka ihe ùgwù nke ife Jehova ofufe n’ogige ụlọ nsọ ime mmụọ ya?

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 16]

Foto U.S. Army