Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova Bụ Ebe Mgbaba M na Ike M

Jehova Bụ Ebe Mgbaba M na Ike M

Akụkọ Ndụ

Jehova Bụ Ebe Mgbaba M na Ike M

DỊ KA MARCEL FILTEAU SI KỌỌ

“Ọ bụrụ na ị lụọ ya, ị ga-agarịrị mkpọrọ.” Ihe ahụ ka ndị mmadụ gwara nwanyị m nọ na-eme atụmatụ ịlụ. Ka m kọwaa ihe mere ha ji kwuo ihe dị otú ahụ.

N’OGE a mụrụ m na 1927, ógbè ndị Canada bụ́ Quebec bụ ebe okpukpe Katọlik gbanyesiri mkpọrọgwụ ike. Ihe dị ka afọ anọ mgbe e mesịrị, Cécile Dufour, bụ́ onye ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova, malitere ịbịa n’ebe obibi anyị dị n’obodo Montreal. Ndị agbata obi anyị na-eyikarị ya egwu n’ihi nke a. N’ezie, e jidere ya ma mekpọọ ya ọnụ ọtụtụ ugbo maka izisa ozi Bible. Ya mere, n’oge na-adịghị anya, anyị hụrụ eziokwu dị n’okwu Jisọs bụ́: “Mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.”—Matiu 24:9.

N’oge ahụ, ọtụtụ ndị lere ya anya dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị bụ́ ezinụlọ ndị Canada na-asụ French ịhapụ okpukpe Katọlik ha. Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe nne na nna m ghọrọ Ndịàmà e mere baptism, n’oge na-adịghị anya, ha kwubiri na ozizi ndị Chọọchị Katọlik na Bible ekwekọghị. Ya mere ha gbara ụmụ ha asatọ ume ịgụ akwụkwọ Ndịàmà bipụtara, ha kwadokwara ndị nakweere eziokwu nke Bible n’etiti anyị.

Ịnakwere Ya n’Oge Ihe Isi Ike

Na 1942, mgbe m ka nọ n’ụlọ akwụkwọ, amalitere m inwe ezigbo mmasị n’ọmụmụ Bible. A machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu n’oge ahụ na Canada n’ihi na ha gbasoro ihe nlereanya nke ndị Kraịst oge mbụ ma ghara itinye aka n’agha nke mba dị iche iche. (Aịsaịa 2:4; Matiu 26:52) A kpọgara nwanne m nwoke nke kasị okenye, bụ́ Roland, n’ogige ọrụ mmanye n’ihi ọjụjụ ọ jụrụ ibuli ngwá agha n’oge ahụ agha ụwa na-akpọtụ.

N’oge ahụ, nna m nyere m otu akwụkwọ e dere n’asụsụ French bụ́ nke kọwara ahụhụ ndị Germany bụ́ Ndịàmà na-ata n’ihi ọjụjụ ha jụrụ ịkwado agha nke Adolph Hitler. * A kwaliri m igosipụta ihe nlereanya dị otú ahụ nke iguzosi ike n’ezi ihe, amalitekwara m ịga nzukọ Ndịàmà Jehova, bụ́ nke ha na-enwe n’ụlọ mmadụ. N’oge na-adịghị anya, a kpọrọ m ikere òkè n’ọrụ nkwusa. Anakweere m ọkpụkpọ òkù ahụ na-amata nke ọma na e nwere ike ijide ma tụọ m mkpọrọ.

Mgbe m kpesịrị ekpere maka ume, akụrụ m aka n’ọnụ ụzọ mbụ m. Otu nwanyị nwere obiọma megheere m ụzọ, mgbe m kọwasịkwara onwe m, agụụrụ m ya okwu ndị dị na 2 Timoti 3:16: “Ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru.”

“Ị̀ ga-enwe mmasị ịmụtakwu ihe banyere Bible?” ka m jụrụ.

“Ee,” ka nwanyị ahụ zaghachiri.

Ya mere agwara m ya na m ga-akpọta otu enyi m nke maara Bible karịa m, bụ́ nke m mere n’izu sochirinụ. Mgbe ahụmahụ mbụ ahụ gasịrị, enwekwuru m obi ike, amatakwara m na ọ bụghị ikike nke aka anyị ka anyị ji ezi ozi ahụ. Dị ka Pọl onyeozi kwuru, anyị na-eme otú ahụ site n’enyemaka Jehova. N’ezie, ọ dị mkpa ka anyị ghọta na “ọkịka nke ike ahụ [bụ] nke Chineke, [o siteghịkwa] n’anyị onwe anyị.”—2 Ndị Kọrint 4:7.

Mgbe nke ahụ gasịrị, ọrụ nkwusa ahụ ghọrọ ihe m na-arụchi anya ná ndụ m, otú ahụ kwa ka a na-ejide ma na-atụ m mkpọrọ. Ka a sịkwa ihe mere e ji gwa onye m na-aga ịlụ, sị, “Ọ bụrụ na ị lụọ ya, ị ga-agarịrị mkpọrọ”! Ma, ahụmahụ ndị dị otú ahụ esighị ike nke otú ahụ n’ezie. Mgbe anyị nọsịrị otu abalị n’ụlọ mkpọrọ, Onyeàmà ibe anyị na-agbapụtakarị anyị.

Mkpebi Ndị Dị Mkpa

N’April 1943, araara m onwe m nye Jehova ma gosipụta ya site na baptism ime mmiri. E mesịa, n’August 1944, ejere m mgbakọ ukwu mbụ m, na Buffalo, New York, U.S.A., kpọmkwem n’ofe ókèala ndị Canada. Ndị bịaranụ dị 25,000, usoro ihe omume ahụ kpalikwara ọchịchọ m ịbụ ọsụ ụzọ, dị ka a na-akpọ ndị ozi oge nile nke Ndịàmà Jehova. E wepụrụ mmachibido iwu ahụ a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova na Canada na May 1945, amalitekwara m ịsụ ụzọ n’ọnwa sochirinụ.

Otú ọ dị, ka òkè m na-ekere n’ozi mụbara, otú ahụ kwa ka ịga mkpọrọ m mụbara. N’otu oge, a tụbakọtara mụ na Mike Miller, bụ́ onye jewooro Jehova ozi ruo ogologo oge, n’otu ọnụ ụlọ mkpọrọ. Anyị nọdụrụ n’ala simenti ma kparịta ụka. Mkparịta ụka anyị na-ewuli elu bụ́ nke dabeere n’ihe ime mmụọ, wusiri m ike nke ukwuu. Otú ọ dị, mgbe e mesịrị, otu ajụjụ gbabatara m n’uche, ‘Gịnị ma ọ bụrụ na anyị enwewo nghọtahie ma ghara ịdị na-eghe ibe anyị ọnụ?’ Oge mụ na nwanna nwoke a m hụrụ n’anya nọrọ na mkpọrọ kụziiri m otu n’ime ihe ndị kasị mma m mụtara ná ndụ—ụmụnna anyị dị anyị mkpa, ya mere anyị kwesịkwara ịdị na-agbaghara ma na-egosi ibe anyị obiọma. Ma ọ bụkwanụ, dị ka Pọl onyeozi dere: “Ọ bụrụ na unu atarịta ibe unu arụ, ripịakwa ibe unu, lezienụ anya ka unu ghara ikpochapụrịta onwe unu.”—Ndị Galetia 5:15.

Na September 1945, a kpọrọ m ije ozi n’alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Toronto, Canada, bụ́ nke anyị na-akpọ Betel. Usoro ihe omume ime mmụọ e nwere n’ebe ahụ na-ewuli elu ma na-ewusi okwukwe ike n’ezie. N’afọ sochirinụ, e kenyere m ịrụ ọrụ n’ugbo Betel, nke dịpụrụ ihe dị ka kilomita 40 n’ebe ugwu nke alaka ụlọ ọrụ ahụ. Ka m so Anne Wolynec na-eto eto na-atụtụ mkpụrụ osisi, ahụrụ m ọ bụghị nanị mma elu ahụ ya kamakwa ịhụnanya na ịnụ ọkụ n’obi o nwere n’ebe Jehova nọ. Anyị malitere mmekọrịta ịhụnanya ma lụọ na January 1947.

Ruo afọ abụọ na ọkara sochirinụ, anyị sụrụ ụzọ na London, Ontario, e mesịakwa n’Àgwàetiti Cape Breton, bụ́ ebe anyị nyere aka iguzobe otu ọgbakọ. E mesịa, na 1949, a kpọrọ anyị na klas nke 14 nke Watchtower Bible School of Gilead, bụ́ ebe e nyere anyị ọzụzụ ịghọ ndị ozi ala ọzọ.

Ọrụ Ozi Ala Ọzọ na Quebec

E kenyewo ndị Canada gụsịrị akwụkwọ na klas ndị bu ụzọ nke Gilead ịmalite ọrụ nkwusa na Quebec. Na 1950, anyị na mmadụ 25 ndị ọzọ si na klas nke 14 anyị sonyeere ha. Ọrụ ozi ala ọzọ ahụ mụbaranụ wetara mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ na mwakpo ìgwè na-eme ihe ike, bụ́ ndị ndị ndú nke Chọọchị Roman Katọlik kpaliri.

Ụbọchị abụọ mgbe anyị bịarutesịrị n’ebe mbụ e kenyere anyị ọrụ ozi ala ọzọ n’obodo Rouyn, e jidere Anne ma tụba ya n’azụ ụgbọala ndị uwe ojii. Nke a bụ ahụmahụ ọhụrụ nye ya, ebe ọ bụ na o si n’obodo nta dị n’ógbè Manitoba, Canada, bụ́ ebe ọ na-adịghị ahụkebe onye uwe ojii. Dị ka o kwesịrị ịdị, ụjọ tụrụ ya o wee cheta okwu ndị a, “Ọ bụrụ na ị lụọ ya, ị ga-agarịrị mkpọrọ.” Otú ọ dị, tupu ndị uwe ojii ahụ akwọpụ, ha chọtakwara m ma tụba m n’ụgbọala ahụ Anne nọ na ya. “Obi dị m ụtọ ịhụ gị!” ka o tipụrụ. Ma, ọ nọdụrụ jụụ n’ụzọ na-eju anya, na-ekwu, sị, “Otu ihe ahụ mere ndị ozi maka ikwusa banyere Jisọs.” (Ọrụ 4:1-3; 5:17, 18) Mgbe e mesịrị n’ụbọchị ahụ, a gbapụtara anyị.

N’ihe dị ka otu afọ mgbe ihe ahụ mesịrị, ka anyị nọ n’ozi ụlọ n’ụlọ n’ebe ọhụrụ e kenyere anyị ọrụ na Montreal, anụrụ m mkpọtụ ọgba aghara na ndịda okporo ámá ahụ ma hụ otu ìgwè mmadụ iwe juru obi ka ha na-atụ nkume. Ka m gara inyere Anne na onye ya na ya nọ n’ozi aka, ndị uwe ojii bịarutere n’ebe ahụ. Kama ijide ndị so n’ìgwè ahụ na-eme ihe ike, ndị uwe ojii ahụ jidere Anne na onye ya na ya nọ n’ozi! Ka ha nọ n’ụlọ mkpọrọ, Anne chetaara Onyeàmà ọhụrụ ahụ na ha na-ahụ eziokwu nke okwu Jisọs, bụ́: “Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.”—Matiu 10:22.

N’otu oge, ihe dị ka okwu ikpe 1,700 megide Ndịàmà Jehova nọ na-echere mkpebi ikpe na Quebec. N’ozuzu ha, e boro anyị ebubo ikesa akwụkwọ na-akpali inupụrụ ọchịchị isi ma ọ bụ ikesa akwụkwọ n’agbataghị laịsensị. N’ihi ya, Ngalaba Okwu Ikpe nke Watch Tower Society mere ihe megide ndị ọchịchị Quebec. Mgbe ọtụtụ afọ nke okwu ikpe gasịrị, Jehova nyere anyị mmeri abụọ dị ukwuu n’ihu Ụlọikpe Kasị Elu nke Canada. Na December 1950, e wepụrụ ebubo ahụ bụ́ na akwụkwọ anyị na-akpali inupụrụ ọchịchị isi, n’October 1953 kwa, a kwadoro nnwere onwe anyị ikesa akwụkwọ ndị dabeere na Bible n’agbataghị laịsensị. Anyị si otú a hụ n’ụzọ pụtara nnọọ ìhè otú Jehova si bụrụ n’ezie “ebe mgbaba na ike, [na-eme] ka a chọta Ya n’inyeaka nke ukwuu ná mkpagbu nile.”—Abụ Ọma 46:1.

N’ụzọ dị ịrịba ama, ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà nọ na Quebec arịwo elu site na 356 na 1945, bụ́ mgbe m malitere ịsụ ụzọ, ruo ihe karịrị 24,000 taa! N’ezie ọ dịwo dị ka Bible buru n’amụma: “Ọ dịghị ihe agha ọ bụla a kpụworo imegide gị ga-aga nke ọma: ọzọ, ire ọ bụla nke ga-ebili imegide gị n’ikpe ka ị ga-ama ikpe.”—Aịsaịa 54:17.

Ọrụ Anyị na France

Na September 1959, a kpọrọ mụ na Anne ije ozi na Betel dị na Paris, France, bụ́ ebe e kenyere m ọrụ ilekọta obibi akwụkwọ. Tupu anyị erute na January 1960, ọ bụ ụlọ ọrụ a na-akwụ ụgwọ na-ebi akwụkwọ ndị ahụ. Ebe ọ bụ na a machibidoro Ụlọ Nche iwu na France n’oge ahụ, anyị biri magazin ahụ kwa ọnwa n’ọdịdị akwụkwọ nta nwere peji 64. A kpọrọ akwụkwọ nta ahụ The Interior Bulletin of Jehovah’s Witnesses, ọ na-ebukwa isiokwu ndị a ga-amụ n’ọnwa n’ọgbakọ dị iche iche. Site na 1960 ruo 1967, ọnụ ọgụgụ ndị na-ekere òkè n’ọrụ nkwusa na France rịrị elu site na 15,439 ruo 26,250.

N’ikpeazụ, e kenyegharịrị ihe ka ọtụtụ ná ndị ozi ala ọzọ ọrụ n’ebe ndị ọzọ, ụfọdụ gara ná mba ndị na-asụ French n’Africa, ndị ọzọkwa gaghachiri na Quebec. Ebe ọ bụ na ahụ esighị Anne ike, ya adịkwa mkpa ka a waa ya ahụ, anyị laghachiri Quebec. Mgbe e nyesịrị Anne nlekọta ahụ ike ruo afọ atọ, e mere ka ahụ dịghachi ya ike. Mgbe ahụ, e kenyere m ọrụ sekit, ileta ọgbakọ dị iche kwa izu iji nye ha agbamume ime mmụọ.

Ọrụ Ozi Ala Ọzọ n’Africa

Afọ ole na ole mgbe e mesịrị, na 1981, anyị nwere obi ụtọ iketa ọrụ ọhụrụ dị ka ndị ozi ala ọzọ na Zaire, ebe bụzi Democratic Republic of Congo. Ndị ahụ dara ogbenye, ha nwekwara ọtụtụ ihe isi ike. Mgbe anyị bịarutere, e nwere Ndịàmà 25,753, ma taa ọnụ ọgụgụ ahụ arịwo elu ruo ihe karịrị 113,000, mmadụ 446,362 gakwara Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst n’afọ 1999!

Na 1984 anyị nwetara ala dị ihe dị ka hekta 200 n’aka gọọmenti iji wuo alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ. E mesịa, na December 1985, e nwere mgbakọ mba nile n’isi obodo ahụ, bụ́ Kinshasa, ndị bịaranụ bụ́ ndị si n’ọtụtụ akụkụ nke ụwa dị 32,000. Mgbe nke ahụ gasịrị, mmegide nke ndị ụkọchukwu kpalitere kpaghasịrị ọrụ anyị na Zaire. Na March 12, 1986, e nyere ụmụnna ndị nwere ibu ọrụ akwụkwọ ozi nke kwupụtara na iwu megidere njikọ nke Ndịàmà Jehova n’obodo Zaire. Ọ bụ president nke mba ahụ n’oge ahụ, bụ́ Mobutu Sese Seko nke nwụrụla anwụ ugbu a, bịanyere aka ná mmachibido iwu ahụ.

N’ihi ihe ndị a a na-atụghị anya ha merenụ, anyị aghaghị itinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ nke bụ́: “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya.” (Ilu 22:3) Anyị chọtara ụzọ anyị ga-esi na-enweta akwụkwọ, ink, film foto, plate ndị e ji ebi akwụkwọ, na chemical dị iche iche site ná mba ọzọ iji na-ebi akwụkwọ anyị na Kinshasa. Anyị wulitekwara usoro nkesa ihe nke anyị. Ozugbo anyị hazisịrị onwe anyị, usoro nzipụ ihe nke anyị rụrụ ọrụ n’ụzọ dị mma karịa usoro nzipụ akwụkwọ ozi nke gọọmenti!

E jidere ọtụtụ puku Ndịàmà, a takwara ọtụtụ n’ime ha ahụhụ n’ụzọ obi ọjọọ. Ma, e wezụga mmadụ ole na ole, ha ji obi ike chee mmeso dị otú ahụ ihu ma nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi. E jidekwara mụ onwe m, ahụkwara m ọnọdụ dị egwu e dotere ụmụnna ahụ n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe, ndị uwe ojii nzuzo na ndị ọchịchị kpagburu anyị n’akụkụ nile, ma Jehova na-emere anyị ụzọ mgbapụ mgbe nile.—2 Ndị Kọrint 4:8.

Anyị zoro ihe dị ka katọn akwụkwọ 3,000 n’ụlọ nkwakọba ihe nke otu onye ọchụnta ego. Otú ọ dị, n’ikpeazụ, otu n’ime ndị ọrụ ya gwara ndị uwe ojii nzuzo, ha jidekwara onye ọchụnta ego ahụ. Ka ha na-aga n’ụlọ mkpọrọ, ọ dabara na ha zutere m ka m nọ n’ụgbọala m. Onye ọchụnta ego ahụ gwara ha na ọ bụ m mere ndokwa ka o debe akwụkwọ ahụ. Ndị uwe ojii ahụ kwụsịrị ma jụọ m ajụjụ banyere ya, na-ebo m ebubo idebe akwụkwọ iwu na-akwadoghị n’ụlọ nkwakọba ihe nke nwoke a.

“Ùnu ji otu n’ime akwụkwọ ndị ahụ?” ka m jụrụ.

“Eenụ,” ka ha zara.

“Àpụrụ m ịhụ ya?” ka m jụrụ.

Ha wetaara m otu, egosikwara m ha peji ime ya, bụ́ nke na-ekwu, sị: “E biri ya na United States of America site n’aka Watch Tower Bible & Tract Society.”

“Ihe unu ji n’aka bụ ihe onwunwe ndị America, ọ bụghịkwa nke ndị Zaire,” ka m chetaara ha. “Gọọmenti unu machibidoro ụlọ ọrụ iwu kwadoro nke njikọ Ndịàmà Jehova nke Zaire iwu ọ bụghịkwa Watch Tower Bible & Tract Society nke United States. Ya mere unu ga-akpachakwara anya n’ihe unu ji mbipụta ndị a eme.”

Ha kwere ka m laa n’ihi na ha enweghị ikike ụlọikpe ijide m. N’abalị ahụ, anyị ji gwongworo abụọ gaa n’ụlọ nkwakọba ihe ahụ ma bukọrọ akwụkwọ ndị ahụ. Mgbe ndị ọchịchị bịara n’echi ya, iwe were ha nke ukwuu ịhụ na ebe ahụ tọgbọrọ chakoo. N’oge ahụ, ha na-achọgharị m ebe ọ bụ na ha nweziri ikike ụlọikpe ijide m. Ha chọtara m, ebe ọ bụkwa na ha ejighị ụgbọala ọ bụla, akwọọrọ m onwe m gaa n’ụlọ mkpọrọ! Onyeàmà ọzọ sonyeere m iji kwọlaa ụgbọala m tupu ha ejichie ya.

Mgbe ha gbasịrị m ajụjụ ọnụ were awa asatọ, ha kpebiri ịgbara m ụgbọ nwa mkpi. Ma egosiri m ha otu akwụkwọ ozi sitere n’aka gọọmenti bụ́ nke na-akwado nhọpụta a họpụtara m irekpọ ngwongwo nke njikọ Ndịàmà Jehova ahụ a machibidoro iwu mgbe ahụ na Zaire. N’ihi ya, e kwere ka m nọgide na-arụ ọrụ na Betel.

Mgbe afọ anọ nke ije ozi n’okpuru nrụgide nke mmachibido iwu nke ọrụ ahụ na Zaire gasịrị, enwetara m ọnyá afọ na-agba ọbara bụ́ nke na-eyi ndụ egwu. E kpebiri na m ga-aga nara ọgwụgwọ na South Africa, bụ́ ebe alaka ụlọ ọrụ ahụ lekọtara m anya nke ọma, agbakekwara m. Mgbe m jesịrị ozi ruo afọ asatọ na Zaire, nke bụ́ ahụmahụ kwesịrị ncheta na nke obi ụtọ n’ezie, anyị kwagara n’alaka South Africa na 1989. Na 1998, anyị laghachiri n’ala a mụrụ anyị, kemgbe ahụ anyị anọwokwa na-eje ozi ọzọ na Betel dị na Canada.

Inwe Ekele Maka Ije Ozi

Mgbe ọ bụla m leghachiri anya azụ n’afọ 54 m nọrọla n’ozi oge nile, ana m enwe nnọọ ekele na m ji ike ntorobịa m mee ihe n’ozi dị oké ọnụ ahịa nke Jehova. N’agbanyeghị na Anne aghaghị ịtachi obi n’ọtụtụ ọnọdụ ndị siri ike, o mebeghị mkpesa kama ọ nọwo na-enye m nkwado n’ihe omume anyị nile. Anyị abụọ enwewo ihe ùgwù nke inyere ọtụtụ ndị aka ịmara Jehova, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha nọ n’ozi oge nile ugbu a. Ọ bụ nnọọ ihe ọṅụ ịhụ ụfọdụ n’ime ụmụ ha na ọbụna ụmụ ụmụ ha ka ha na-ejere Chineke ukwu anyị, bụ́ Jehova ozi!

Ekwenyesiri m ike na ọ dịghị ihe ọ bụla ụwa a pụrụ inye nke a pụrụ iji tụnyere ihe ùgwù na ngọzi ndị Jehova nyeworo anyị. N’eziokwu, anyị ediwo ọtụtụ ule, ma ha nile ekerewo òkè n’iwulite okwukwe na obi ike anyị nwere n’ebe Jehova nọ. N’ezie o gosipụtawo onwe ya ịbụ ụlọ elu dị ike, ebe mgbaba, na onye enyemaka a pụrụ nnọọ ịchọta n’oge mkpagbu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 E bipụtara akwụkwọ ahụ na nke mbụ ya n’asụsụ German dị ka Kreuzzug gegen das Christentum (Ibu Agha Megide Iso Ụzọ Kraịst). A sụgharịrị ya gaa n’asụsụ French na Polish ma a sụgharịghị ya gaa n’asụsụ Bekee.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ka anyị na-asụkọ ụzọ na 1947; mụ na Anne taa

[Foto dị na peeji nke 29]

Ndị anyị zutere na Zaire nwere mmasị n’eziokwu Bible