Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ogologo Oge Hà Aṅaa Fọdụụrụ Ndị Ajọ Omume?

Ogologo Oge Hà Aṅaa Fọdụụrụ Ndị Ajọ Omume?

Ogologo Oge Hà Aṅaa Fọdụụrụ Ndị Ajọ Omume?

“N’ihi gịnị ka Ị [Jehova] na-agba nkịtị mgbe onye na-emebi iwu na-eloda onye dị ezi omume karịa ya?”—HABAKUK 1:13.

1. Olee mgbe ụwa ga-ejupụta n’ọmụma ebube Jehova?

Ọ̀ DỊ mgbe Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume? Ọ bụrụ otú ahụ, ogologo oge hà aṅaa ka anyị na-aghaghị icheru? Ndị mmadụ na-ajụ ajụjụ ndị dị otú ahụ n’ụwa nile. Olee ebe anyị pụrụ ịchọta azịza ha? Anyị pụrụ ịchọta ha n’okwu amụma ndị sitere n’aka Chineke banyere oge Ọ kara aka. Ha na-emesi anyị obi ike na Jehova ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi ndị ajọ omume nile n’oge na-adịghị anya. Ọ bụ nanị mgbe ahụ ka ụwa “ga-ejupụta n’ọmụma ebube Jehova, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” Nke ahụ bụ nkwa e buru n’amụma dị n’Okwu Chineke Dị Nsọ na Habakuk 2:14.

2. Olee usoro ikpe mbibi atọ sitere n’aka Chineke ndị dị n’akwụkwọ Habakuk?

2 N’ịbụ nke e dere n’ihe dị ka 628 T.O.A., akwụkwọ Habakuk nwere usoro ikpe mbibi atọ sitere n’aka Jehova Chineke. E mezuolarị abụọ n’ime ikpe ndị ahụ. Nke mbụ bụ ikpe Jehova megide mba Juda oge ochie na-enupụ isi. Gịnị banyere nke abụọ? Ọ bụ ikpe Chineke e mezuru n’isi Babilọn dị aka ike. Ya mere, n’ezie, anyị nwere nnọọ ihe mere anyị ga-eji enwe obi ike na a ga-emezu nke atọ n’ime ikpe ndị a nke Chineke. N’ezie, anyị pụrụ ịtụ anya mmezu ya n’oge na-adịghị nnọọ anya. N’ihi ndị ziri ezi nọ na mgbe ikpeazụ ndị a, Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume nile. Onye ikpeazụ n’ime ha ga-eku ume ikpeazụ ya ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile’ bụ́ nke ji ọsọ ọsọ na-abịaru nso.—Mkpughe 16:14, 16.

3. Gịnị ka e ji n’aka na ọ ga-adakwasị ndị ajọ omume n’oge anyị?

3 Agha nke oké ụbọchị Chineke na-akpụdewe nnọọ nso. Mmezu nke ihe Chineke kpere n’ikpe n’ahụ ndị ajọ omume n’oge anyị bụ nke e ji n’aka, dị nnọọ ka mmezu nke ikpe Jehova megide Juda na Babilọn. Otú ọ dị, ugbu a, gịnị ma i were ya na anyị bi na Juda n’oge Habakuk? Gịnị na-eme n’ala ahụ?

Ala nke Nọ n’Oké Ọgba Aghara

4. Olee akụkọ na-awụ akpata oyi n’ahụ Habakuk nụrụ?

4 Jiri anya nke uche gị hụ onye amụma Jehova bụ́ Habakuk ka ọ na-anọdụ ala n’elu ụlọ ya dị larịị, na-anara ikuku mgbede jụrụ oyi. Ngwá egwu dị n’akụkụ ya. (Habakuk 1:1; 3:19, ihe e dere ná ngwụsi nke akwụkwọ Habakuk) Ma Habakuk nụrụ akụkọ na-awụ akpata oyi n’ahụ. Eze Jehoịakim nke Juda egbuwo Uraị[j]a ma mee ka a tụba ozu onye amụma ahụ n’ebe a na-eli ozu ndị nkịtị. (Jeremaịa 26:23) N’eziokwu, Uraị[j]a ejigideghị ntụkwasị obi o nwere n’ebe Jehova nọ, ọ tụrụ ụjọ ma gbalaga n’Ijipt. Ma, Habakuk maara na ọ bụghị ọchịchọ nke ibuli nsọpụrụ Jehova elu kpaliri Jehoịakim ime ihe ike. Nke a pụtara ìhè site ná nleghara eze ahụ leghaara iwu Chineke kpam kpam nakwa site n’asị ọ kpọrọ Jeremaịa onye amụma na ndị ọzọ na-ejere Jehova ozi.

5. Olee ọnọdụ ime mmụọ e nwere na Juda, oleekwa otú Habakuk si meghachi omume na ya?

5 Habakuk hụrụ anwụrụ nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ka o si n’elu ụlọ ndị dị nso na-apụta. Ndị ahụ adịghị esure ihe nsure ọkụ a na-esi ísì ụtọ dị ka ndị na-efe Jehova. Ha na-etinye aka n’ihe omume okpukpe ụgha nke ajọ Eze Jehoịakim nke Juda na-akwado. Lee ihe ihere ọ bụ! Anya mmiri rujuru Habakuk n’anya, o wee rịọ, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-etiku Gị, ma Ị dịghị anụ? m na-etiku Gị mkpu, sị, Ihe ike! ma Ị dịghị azọpụta. N’ihi gịnị ka Ị na-eme ka m hụ ajọ ihe? n’ihi gịnị ka Ị na-elegide mmegbu? ma ịpụnara mmadụ ihe ma ihe ike dị n’ihu m: ịlụ ọgụ wee dị, esemokwu na-ebulikwa onwe ya. N’ihi nke a ka iwu na-esinwụ, ikpe ziri ezi adịghị apụtakwa ruo mgbe ebighị ebi: n’ihi na onye na-emebi iwu na-agba onye ezi omume gburugburu; n’ihi nke a ka ikpe na-apụta bụrụ ihe gbagọrọ agbagọ.”—Habakuk 1:2-4.

6. Gịnị meworo iwu na ikpe ziri ezi n’ime Juda?

6 Ee, ịpụnara mmadụ ihe na ime ihe ike juru ebe nile. Ebe ọ bụla Habakuk lere anya, ọ na-ahụ nsogbu, esemokwu, ịlụ ọgụ. ‘Iwu esinwụwo,’ ọ kpọnwụwo. Ikpe ziri ezi kwanụ? Leenụ, ọ ‘dịghị apụtakwa ruo mgbe ebighị ebi’ inwe mmeri! Ọ dịghị mgbe ọ na-adị irè. Kama nke ahụ, ‘ndị na-emebi iwu na-agba ndị ezi omume gburugburu,’ jiri akọ na-eleghara ihe ndị iwu kwuru anya bụ́ ndị e mere iji chebe ndị aka ha dị ọcha. N’ezie, “ikpe na-apụta bụrụ ihe gbagọrọ agbagọ.” A na-ahịgharị ya. Lee ọnọdụ dị njọ ọ bụ!

7. Gịnị ka Habakuk kpebisiri ike ime?

7 Habakuk kwụsịtụrụ ma tụgharịa uche n’ọnọdụ ahụ. Ike ọ̀ ga-agwụ ya? Ọ dịghị ma ọlị! Mgbe ọ tụlesịrị mkpagbu nile a kpagbuworo ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, nwoke a na-eguzosi ike n’ihe mere ka mkpebi ya ịnọgidesi ike na iguzosi ike dị ka onye amụma Jehova, dịghachi ọhụrụ. Habakuk ga-anọgide na-akpọsa ozi Chineke—ọ bụrụgodị na ime otú ahụ apụta ọnwụ.

Jehova Arụọ “Ọrụ” A Na-apụghị Ikweta Ekweta

8, 9. “Ọrụ” dị aṅaa a na-apụghị ikweta ekweta ka Jehova na-arụ?

8 N’ọhụụ, Habakuk hụrụ ndị okpukpe ụgha ahụ, bụ́ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Gee ntị n’ihe Jehova na-agwa ha: “Hụnụ n’etiti mba nile, legidekwanụ.” Dị ka o yiri, Habakuk nọ na-eche ihe mere Chineke ji na-agwa ndị ajọ omume ahụ okwu otú a. Mgbe ahụ ọ nụrụ ka Jehova na-agwa ha, sị: “Ka o jukwa unu anya nke ukwuu nke ukwuu: n’ihi na ọrụ ka M na-arụ n’ụbọchị unu, nke unu na-agaghị ekwe, mgbe a ga-akọrọ unu ya.” (Habakuk 1:5) N’ezie, ọ bụ Jehova n’onwe ya na-arụ ọrụ a ha na-agaghị ekweta. Ma gịnị ka ọ bụ?

9 Habakuk na-aṅa ntị nke ọma n’ihe ndị ọzọ Chineke na-ekwu, ndị e dekọrọ na Habakuk 1:6-11. Nke a bụ ozi Jehova—ọ dịghịkwa chi ụgha ma ọ bụ arụsị na-adịghị ndụ pụrụ igbochi mmezu ya: “Lee, M gaje ime ka ndị Kaldea bilie, bụ́ mba ahụ dị ilu nke na-emekwa ngwa ngwa; ndị na-ejegharị na mbara ụwa, inweta ebe obibi dị iche iche nke na-abụghị nke ha. Ndị a na-atụ ụjọ, ndị dịkwa egwu, ka ha bụ: n’aka ha onwe ha ka ikpe ha na mbuli elu ha si apụta. Ịnyịnya ha nile nwere ụkwụ nkọ karịa agụ, ha dịkwa nkọ karịa anụ ọhịa wolf nke anyasị; ndị ịnyịnya ha na-awụlikwa elu: ee, ndị ịnyịnya ha na-esi n’ebe dị anya bịa; ha na-efe dị ka ugo nke na-efe ngwa iri ihe. Ha nile na-abịa ime ihe ike; e dosiri ihu ha ike dị ka ifufe Ihu anyanwụ; ha wee chịkọta ndị a dọtara n’agha dị ka ájá. Ee, mba ahụ na-akwa ndị eze emo, ndị isi bụkwaara ya ihe ịchị ọchị: mba ahụ na-achị ebe ọ bụla e wusiri ike ọchị; n’ihi na ọ na-ekpokọba ájá, wee were ya. Mgbe ahụ ọ ga-efebiga dị ka ifufe, o wee gabiga, ikpe ama ya: ike ya nke a ewee ghọọ chi ya.”

10. Olee ndị Jehova na-eme ka ha bilie?

10 Lee ịdọ aka ná ntị amụma sitere n’aka Onye Kasị Ihe Nile Elu ọ bụ! Jehova na-eme ka ndị Kaldea bilie, bụ́ mba Babilọn na-ebibi ihe. Ka ọ na-azọ ije gabiga “mbara ụwa,” ọ ga-emeri ọtụtụ ebe obibi. Lee ihe na-emenye ụjọ ọ bụ! Usuu ndị Kaldea ahụ bụ “ndị a na-atụ ụjọ, ndị dịkwa egwu,” ndị dị njọ na ndị na-emenye mmadụ egwu. Ọ na-eti iwu nke ya ndị a na-adịghị agbanwe agbanwe. ‘N’aka ya onwe ya ka ikpe ya na-esi apụta.’

11. Ị̀ ga-esi aṅaa kọwaa mwakpo ndị agha Babilọn na-abịa ịwakpo Juda?

11 Ịnyịnya ndị Babilọn nwere ụkwụ nkọ karịa agụ na-awụ ọsọ. Usuu ndị agha ya na-agba ịnyịnya na-emenye ụjọ karịa anụ ọhịa wolf ndị agụụ ji, na-achụgharị anụ ha ga-eri n’anyasị. N’ịbụ ndị ọ dị ọkụ n’obi ịgawa, ‘ndị ịnyịnya ya na-awụli elu’ n’enweghị ndidi. Ha si Babilọn dị anya na-aga Juda. Ka ha na-efe dị ka ugo ji ọsọ na-efega iri nri dị ụtọ, ndị Kaldea gaje ịnwụde anụ oriri ha n’oge na-adịghị anya. Ma nke a ọ̀ ga-abụ nanị ntakịrị mwakpo, nanị mwakwasị nke ndị soja ole na ole ga-eme? Mbanụ! “Ha nile na-abịa ime ihe ike,” dị ka nnukwute ìgwè nukọọrọ na-aga ịkpata oké mbibi. Ihu ha jupụtara n’oké ọchịchọ, ha gbaara chee ihu n’akụkụ ọdịda anyanwụ na-aga Juda na Jerusalem, na-efe ọsọ dị ka ifufe ihu anyanwụ. Ndị agha Babilọn na-akpọkọrọ ọtụtụ ndị mkpọrọ nke na ha ‘na-achịkọta ndị a dọtara n’agha dị ka ájá.’

12. Gịnị bụ àgwà ndị Babilọn, ikpe gịnịkwa n’ezie ‘ga-ama’ ndị iro a na-emenye mmadụ ụjọ?

12 Ndị agha Kaldea na-akwa ndị eze emo ma na-achị ndị isi ọchị, bụ́cha ndị na-apụghị igbochi ya ịga n’ihu. Ọ “na-achị ebe ọ bụla e wusiri ike ọchị,” n’ihi na ebe ọbụla e wusiri ike ga-ada mgbe ndị Babilọn ‘kpokọbara ájá’ site n’iwu mkputamkpu ájá ebe ha ga-esi wakpo ya. N’oge Jehova kara aka, ndị iro ahụ na-emenye mmadụ ụjọ “ga-efebiga dị ka ifufe.” N’ịwakpo Juda na Jerusalem, ‘ikpe ga-ama ya n’ezie,’ ikpe imejọ ndị Chineke. Mgbe ha nwesịrị mmeri dị ngwa, ọchịagha ndị Kaldea ga-etu ọnụ, sị: ‘Ike nke a bụ chi anyị.’ Ma lee ka o si bụrụ onye na-amachaghị ihe!

Ezi Ihe Ndabere Maka Olileanya

13. N’ihi gịnị ka Habakuk ji nwee olileanya na obi ike?

13 N’ihi ịghọta nzube Jehova karị, Habakuk nwekwuru olileanya. N’ịbụ onye nwere obi ike zuru ezu, o kwuru okwu nsọpụrụ banyere Jehova. Dị ka e kwuru na Habakuk 1:12, onye amụma ahụ na-asị: “Ọ́ bụghị Gị onwe gị siteworo na mgbe ochie, Jehova, bụ́ Chineke m, Onye Nsọ m? [Ị dịghị anwụ anwụ, NW].” N’ezie, Jehova bụ Chineke “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 90:1, 2.

14. Ụzọ ndụ dị aṅaa ka ndị si n’ezi ofufe dapụ nọ na Juda gbasoworo?

14 N’ịtụgharị uche n’ọhụụ Chineke nyere ya na ịṅụrị ọṅụ ná nghọta o si na ya nweta, onye amụma ahụ gara n’ihu, sị: “Jehova, ọ bụ [maka] ikpe ikpe ka I doworo ya; Gị Oké Nkume, ọ bụkwa [maka] ịba mba ka Ị tọwooro ya ntọala.” Chineke amawo ndị si n’ezi ofufe dapụ nọ na Juda ikpe, Jehova ga-abakwara ha mba, nye ha ntaramahụhụ siri ike. Ha kwesịrị ịnọwo na-elegara ya anya dị ka Oké Nkume ha, nanị ebe e wusiri ike n’ezie, ebe mgbaba, na Isi Iyi nke nzọpụta. (Abụ Ọma 62:7; 94:22; 95:1) Ma, ndị ndú Juda si n’ezi ofufe dapụ adịghị abịa Chineke nso, ha nọgidekwara na-akpagbu ndị na-efe Jehova ofufe bụ́ ndị na-adịghị ize ndụ.

15. N’echiche dị aṅaa ka ‘anya Jehova dị ọcha nke ukwuu ịhụ ihe ọjọọ’?

15 Ọnọdụ a wutere onye amụma Jehova nke ukwuu. Ya mere, ọ na-asị: “Gị onye anya Gị abụọ dị ọcha [nke ukwuu] ịhụ ihe ọjọọ, Onye na-apụghịkwa ilegide mmegbu anya.” (Habakuk 1:13) Ee, ‘anya Jehova dị ọcha nke ukwuu ịhụ ihe ọjọọ,’ ya bụ́, ịgbachi nkịtị ka omume ọjọọ na-aga n’ihu.

16. Olee otú ị ga-esi achịkọta ihe e dekọrọ na Habakuk 1:13-17?

16 N’ihi ya Habakuk bu ajụjụ ụfọdụ na-akpali iche echiche n’uche. Ọ na-ajụ, sị: “N’ihi gịnị ka Ị na-elegide ndị na-aghọgbu aghọgbu? n’ihi gịnị ka Ị na-agba nkịtị mgbe onye na-emebi iwu na-eloda onye dị ezi omume karịa ya; I wee mee mmadụ ka ha dị ka azụ̀ nke oké osimiri, dị ka ihe na-akpụ akpụ, nke na-enweghị onye na-achị ha? Ha nile ka o ji nkò azụ̀ dọkpụrụ, ọ na-ekpochapụ ha n’eriri ya, chịkọta ha n’ụgbụ ya: n’ihi nke a ka ọ na-aṅụrị, tegharịa egwú ọṅụ. N’ihi nke a ka ọ na-achụrụ eriri ya àjà, na-esurere ụgbụ ya ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ; n’ihi na site na ha ka òkè ya nwere uru, ihe oriri ya makwara abụba. Ọ̀ ga-ewere n’ihi nke a na-awụpụ eriri ya, ghara inwe ọmịiko n’igbu mba dị iche iche mgbe dum?”—Habakuk 1:13-17.

17. (a) N’ịwakpo Juda na Jerusalem, olee otú ndị Babilọn si na-emezu nzube Chineke? (b) Gịnị ka Jehova ga-ekpughere Habakuk?

17 N’ịwakpo Juda na isi obodo ya, bụ́ Jerusalem, ndị Babilọn ga-eme ihe dị ka ọchịchọ ha si dị. Ha agaghị ama na ha bụ ndị Chineke ji na-emezu ikpe ezi omume ya megide ndị na-adịghị ekwesị ntụkwasị obi. Ọ dị mfe ịhụ ihe mere ọ ga-eji siere Habakuk ike ịghọta ihe mere Chineke ga-eji jiri ndị Babilọn bụ́ ndị ajọ omume mezuo ikpe Ya. Ndị Kaldea ahụ obi tara mmiri adịghị efe Jehova. Ha na-ele ụmụ mmadụ anya nanị dị ka ‘azụ̀ na ihe na-akpụ akpụ’ a ga-anwụde ma chịkwaa. Ma mgbagwoju anya Habakuk nwere agaghị adite aka. N’oge na-adịghị anya Jehova ga-ekpughere onye amụma ya na ndị Babilọn agaghị agbanahụ ntaramahụhụ maka nkwakọrọ ha ji anyaukwu na-akwakọrọ ihe na oké ikpe ọmụma ọbara ha.—Habakuk 2:8.

Ijikere Maka Ihe Ndị Ọzọ Jehova Ga-ekwu

18. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’àgwà Habakuk, dị ka e gosipụtara ya na Habakuk 2:1?

18 Otú ọ dị, ugbu a, Habakuk na-echere ịnụ okwu ndị ọzọ Jehova ga-agwa ya. Onye amụma ahụ ji mkpebi siri ike na-ekwu, sị: “N’elu ebe m na-eche ka m ga-eguzo, guzokwa onwe m n’elu ebe e wusiri ike, m ga-echekwa ịhụ ihe Ọ ga-ekwu megide m, na ihe m ga-azaghachi banyere ịba mba m.” (Habakuk 2:1) Habakuk nwere oké mmasị n’ihe Chineke ka ga-ekwu site n’ọnụ ya dị ka onye amụma. Okwukwe o nwere n’ebe Jehova nọ dị ka Chineke na-adịghị agbachi nkịtị n’ihe ọjọọ mere ka ọ na-eche echiche ihe mere ajọ omume ji jupụta, ma ọ dị njikere ikwe ka a gbazie echiche ya. Mgbe ahụ, olee banyere anyị? Mgbe anyị na-eche echiche ihe mere e ji gbachi nkịtị n’ihe ọjọọ ụfọdụ, obi ike anyị nwere n’ezi omume Jehova Chineke kwesịrị inyere anyị aka ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi ma chere ya.—Abụ Ọma 42:5, 11.

19. N’ikwekọ n’ihe Chineke gwara Habakuk, gịnị mere ndị Juu ahụ na-enupụ isi?

19 N’imezu ihe ọ gwara Habakuk, Chineke mezuru ihe e kpere n’ikpe n’isi mba ndị Juu ahụ na-enupụ isi site n’ikwe ka ndị Babilọn wakpo Juda. Na 607 T.O.A., ha bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya, gbuo ma agadi ma nwata, dọrọkwa ọtụtụ ndị n’agha. (2 Ihe E Mere 36:17-20) Mgbe ogologo oge nke ibi na Babilọn gasịrị, ndị Juu fọdụrụnụ bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi laghachiri n’ala nna ha ma mesịa wughachi ụlọ nsọ ahụ. Otú ọ dị, ka e mesịrị, ndị Juu ghọghachiri ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nye Jehova—karịsịa mgbe ha jụrụ Jisọs dị ka Mesaịa ahụ.

20. Olee otú Pọl si jiri Habakuk 1:5 mee ihe n’okwu banyere ịjụ Jisọs?

20 Dị ka Ọrụ 13:38-41 si kwuo, Pọl onyeozi gosiri ndị Juu nọ n’Antiọk ihe ọ ga-apụta bụ́ ịjụ Jisọs ma si otú a lelịa àjà mgbapụta ya anya. N’ihota ihe Habakuk 1:5 kwuru site ná nsụgharị Septuagint nke Grik, Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya, ka ihe ahụ ghara ịbịakwasị unu, nke e kwuworo n’akwụkwọ ndị amụma, sị, Leenụ, ndị nlelị anya, ka o jukwa unu anya, ka e kpochapụkwa unu; n’ihi na ọrụ ka Mụ Onwe m na-arụ n’ụbọchị unu, ọrụ unu na-agaghị ekwe ma ọlị ọ bụrụ na onye ọ bụla kọọrọ unu akụkọ ya.” N’ikwekọ n’ihe Pọl hotara, mmezu nke abụọ nke Habakuk 1:5 weere ọnọdụ mgbe ndị agha Rom bibiri Jerusalem na ụlọ nsọ ya na 70 O.A.

21. Olee otú ndị Juu nke oge Habakuk si lee “ọrụ” Chineke nke ime ka ndị Babilọn bibie Jerusalem, anya?

21 Nye ndị Juu nọ n’oge Habakuk, “ọrụ” Chineke nke ime ka ndị Babilọn bibie Jerusalem bụ ihe a na-apụghị ichetụ n’echiche n’ihi na obodo ahụ bụ isi ọnọdụ nke ofufe Jehova na ebe eze ya e tere mmanụ nọkwasịrị n’ocheeze. (Abụ Ọma 132:11-18) N’ihi ya, e bibitụbeghị Jerusalem mbụ. A gbatụbeghị ụlọ nsọ ya ọkụ. A kwatutụbeghị usoro ndị eze Devid. Ọ bụ ihe a na-apụghi ikweta ekweta na Jehova ga-ekwe ka ihe ndị dị otú ahụ mee. Ma site n’ọnụ Habakuk, Chineke nyere ịdọ aka ná ntị zuru ezu na ihe ndị a na-awụ akpata oyi n’ahụ ga-eme. Akụkọ ihe mere eme na-egosikwa na ha mere dị ka e buru ụzọ kwuo.

“Ọrụ” A Na-apụghị Ikweta Ekweta nke Chineke Na-arụ n’Oge Anyị

22. Gịnị ka “ọrụ” a na-apụghị ikweta ekweta nke Jehova ga-agụnye n’oge anyị?

22 Jehova ọ̀ gaje ịrụ “ọrụ” a na-apụghị ikweta ekweta n’oge anyị? Jide n’aka na ọ ga-arụ, ọ bụ ezie na nye ndị na-arụ ụka, nke ahụ yiri ihe a na-apụghị ikweta ekweta. Na nke ugbu a, ọrụ a na-apụghị ikweta ekweta nke Jehova ga-abụ mbibi nke Krisendọm. Dị ka Juda oge ochie, ọ na-azọrọ na ya na-efe Chineke ma ọ ghọwo nke rụrụ arụ kpam kpam. Jehova ga-ahụ na e kpochapụrụ akụkụ nile fọdụrụnụ n’usoro okpukpe Krisendọm n’isi nso, dị ka a ga-ekpochapụ “Babilọn Ukwu” ahụ dum, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha.—Mkpughe 18:1-24.

23. Gịnị ọzọ ka mmụọ Chineke kpaliri Habakuk ime?

23 Jehova ka nwere ọrụ Habakuk ga-arụ tupu e bibie Jerusalem na 607 T.O.A. Gịnị ka Chineke ka ga-agwa onye amụma ya? Habakuk ga-anụ ihe ndị ga-eme ka ọ chịlie ngwá egwú ya ma bụkuo Jehova abụ ákwá nke ekpere. Otú ọ dị, tupu nke ahụ, mmụọ Chineke ga-akpali onye amụma ahụ ịkpọsa oké ahụhụ dị iche iche. N’ezie ọ ga-amasị anyị ịghọta ihe miri emi okwu amụma ndị dị otú ahụ pụtara maka oge Chineke kara aka. Ya mere ka anyị ṅakwuo ntị n’amụma Habakuk.

Ị̀ Na-echeta?

• Olee ọnọdụ ndị e nwere na Juda n’oge Habakuk?

• Olee “ọrụ” a na-apụghị ikweta ekweta nke Jehova rụrụ n’oge Habakuk?

• Ihe ndabere dị aṅaa maka olileanya ka Habakuk nwere?

• Olee “ọrụ” a na-apụghị ikweta ekweta nke Chineke ga-arụ n’oge anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 9]

Habakuk chere ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume jupụta ebe nile. Ị̀ na-eme otú ahụ?

[Foto dị na peeji nke 10]

Habakuk buru amụma banyere ọdachi ga-abịakwasị ala Juda site n’aka Babilọn

[Foto dị na peeji nke 10]

Ihe ndị e si ná mkpọmkpọ ebe Jerusalem gwupụta, bụ́ nke e bibiri na 607 T.O.A.