Ṅaa Ntị n’Ịdọ Aka ná Ntị Ahụ!
Ṅaa Ntị n’Ịdọ Aka ná Ntị Ahụ!
BUUM! Na June 3, 1991, Ugwu Fugen nke dị na Japan ji ụda na-adachi ntị nupụta gas na ntụ na-ekwo ekwo bụ́ ndị si ná mgbawa ugwu. Ngwakọta ahụ dị oké ọkụ si n’elu ugwu ahụ na-asọda. Mgbawa ahụ gburu mmadụ 43. Ọkụ rekasịrị nnọọ ọtụtụ ndị jisiri ike lanarị ahụ. “Mmiri, mmiri, biko,” ka ụfọdụ na-eti. Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na ndị uwe ojii ji anya ọkụ gbara bịa inyere ha aka.
IHE dị ka izu abụọ tupu mgbe ahụ, a hụrụ otu nkume kpụkọtara ọnụ n’elu elu Ugwu Fugen, n’ihi ya, ndị ọchịchị na ndị bi n’ógbè ahụ anọwo na nche. Ihe karịrị nnọọ otu izu tupu ọdachi ahụ emee, e nyere ndụmọdụ ka e si n’ógbè ahụ pụọ. Nanị otu ụbọchị tupu ugwu ahụ agbawaa, ndị uwe ojii gwara ndị nta akụkọ ka ha kwụsị ịbanye n’ógbè ahụ a machibidoro iwu. Ka o sina dị, n’ehihie ahụ dị egwu, mmadụ 43 ahụ nwụrụnụ nọ n’ógbè ahụ dị ize ndụ.
N’ihi gịnị ka ọtụtụ mmadụ ji tinye onwe ha n’ihe ize ndụ nke ịbanye n’ógbè ahụ ma ọ bụ ịnọgide n’ebe ahụ? Ụfọdụ ndị ọrụ ugbo bụ́ ndị sirila n’ebe obibi ha pụọ laghachiri azụ inyocha ihe onwunwe na ugbo ha. Mmadụ atọ bụ́ ndị ọkà n’ihe banyere ugwu mgbawa nọ na-anwa ịgaru ugwu mgbawa ahụ nso ruo ókè o kwere mee iji mụtakwuo ihe. Ọtụtụ ndị nta akụkọ na ndị na-ese foto kachiri obi gafee ebe ahụ a sịrị onye agala n’ihi na ha chọrọ inweta akụkọ ga-ehi ụdụ banyere mgbawa ugwu ahụ. Ndị ọkwọ ụgbọala atọ bụ́ ndị ndị nta akụkọ ahụ goro n’ọrụ, nọ n’ebe ahụ. Ndị uwe ojii na ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ na-arụ ọrụ afọ ofufo, nọ n’ọrụ. Onye nke ọ bụla nwere ihe mere o ji banye n’ógbè ahụ dị ize ndụ—ihe sikwa na ya pụta bụ na ọ tụfuru ndụ ya.
Ị̀ Nọ n’Ógbè Dị Ize Ndụ?
Anyị nile nwere ike ghara ibi nso n’ugwu na-agbawa agbawa. Ma, gịnị ma ọ bụrụ na anyị na-eche ọdachi ga-ezu ụwa ọnụ ihu, na-etinye anyị nile n’ógbè dị ize ndụ nke gụnyere ụwa dum? Otu akwụkwọ nke gosipụtaworo onwe ya ịbụ ebe a pụrụ ịdabere na ya isi nweta ihe ọmụma n’ụzọ amụma, na-adọ anyị aka ná ntị banyere ọdachi ga-ezu ụwa ọnụ nke na-abịanụ, ọ na-akọwakwa ya n’ụzọ dị otú a: “Anyanwụ ga-agba ọchịchịrị, ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya, kpakpando nile ga-adakwa site n‘eluigwe, a ga-emekwa ka ike nile nke eluigwe Matiu 24:29, 30) N’ebe a, a kọwara ihe ndị dị ịtụnanya ga-eme n’eluigwe bụ́ ndị ga-ezu eluigwe na ala, dị ka ihe ga-emetụta “ebo nile nke ụwa.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, amụma a na-ezo aka n’ọdachi nke ga-emetụta onye ọ bụla n’ime anyị.
mee mkpatụ: . . . ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi.” (Akwụkwọ amụma a a pụrụ ịdabere na ya bụ Bible. N’ụzọ na-akpali mmasị, ihe ndị gbara akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ a kpọtụrụ aha n’elu gburugburu na-enye nkọwa zuru ezu nke ihe ndị ga-eduga n’ọdachi ahụ ga-ezu ụwa ọnụ. Dị nnọọ ka nkume ahụ kpụkọtara ọnụ na ihe ndị ọzọ na-agba àmà mgbawa ugwu si nye ndị ọrụ obodo Shimabara ihe mere ha ji kwuo na ógbè ahụ dị ize ndụ, Bible na-enye anyị ihe ndị mere anyị ga-eji nọrọ na nche ma na-ejikere maka nlanarị. Anyị pụrụ ịmụta ihe site n’ọdachi ahụ mere n’Ugwu Fugen ma ghọta otú ihe dị n’ihu siruru n’ike.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
IHU AKWỤKWỌ: Yomiuri/Orion Press/Sipa Press
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
Yomiuri/Orion Press/Sipa Press