Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Cyril Lucaris—Nwoke nke Ji Bible Kpọrọ Ihe

Cyril Lucaris—Nwoke nke Ji Bible Kpọrọ Ihe

Cyril Lucaris—Nwoke nke Ji Bible Kpọrọ Ihe

Otu ụbọchị n’oge okpomọkụ na 1638. Ndị ọkụ azụ̀ nọ n’osimiri Marmara nke dịdewere Constantinople (Istanbul nke oge a), nke bụ́ isi obodo alaeze ukwu Ottoman, kụjara ịhụ ozu sere n’elu mmiri. Mgbe ha lerukwuru ya anya, ha chọpụtara n’ụzọ na-awụ akpata oyi n’ahụ na onye ahụ a nyagburu anyagbu bụ onyeisi ndị bishọp na Constantinople, bụ́ onyeisi nke Chọọchị Ọtọdọks. Nke a bụ otú Cyril Lucaris, bụ́ onye a ma ama n’okpukpe na narị afọ nke iri na asaa, si nwụọ ọnwụ ike.

LUCARIS adịteghị ndụ aka iji hụ mmezu nke ihe gụsiri ya agụụ ike—mwepụta nke nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst gaa n’asụsụ Grik a na-eji akparịta ụka. E mezughịkwa ihe ọzọ gụsiri Lucaris agụụ ike—ịhụ ka Chọọchị Ọtọdọks laghachiri ‘n’ikwu okwuchukwu n’ụzọ dị mfe.’ Ònye bụ nwoke a? Ihe mgbochi dịgasị aṅaa ka o chere ihu ná mgbalị ndị ahụ?

Enweghị Ihe Ọmụma Juru Ya Anya

A mụrụ Cyril Lucaris na 1572, na Candia (nke bụ́ Iráklion ugbu a), Krit, bụ́ nke ndị Venice weghaara. N’inwe nkà dị mma, ọ gụrụ akwụkwọ na Venice nakwa na Padua dị n’Itali ma gaa ọtụtụ ebe ná mba ahụ na n’ebe ndị ọzọ. N’ịbụ onye esemokwu nke òtù ndị dị n’ime chọọchị wutere, n’ịbụkwa onye nwere mmasị n’òtù ndị chọrọ iweta mgbanwe na Europe, ọ pụrụ ịbụ na ọ gara Geneva, bụ́ nke ozizi Calvin na-emetụta mgbe ahụ.

Ka ọ nọ na Poland, Lucaris hụrụ na ndị Ọtọdọks nọ n’ebe ahụ, ndị ụkọchukwu na ndị nkịtị n’otu aka ahụ, nọ n’ọnọdụ ime mmụọ jọgburu onwe ya n’ihi enweghị ihe ọmụma ha. Mgbe ọ laghachiri Aleksandria nakwa Constantinople, o nyere ya nsogbu n’obi ịchọpụta na ọbụna ikpo okwu—bụ ebe a na-anọ agụ Akwụkwọ Nsọ—abụrụwo nke e wepụrụ na chọọchị ụfọdụ.

Na 1602, Lucaris gara Alexandria, ebe ọ nọchiri onye ikwu ya, bụ́ Onyeisi Ndị Bishọp bụ́ Meletios, n’ọkwá ahụ. Ọ maliteziri iso ndị ọkà mmụta okpukpe dị iche iche nọ na Europe bụ́ ndị bu mgbanwe n’uche na-ederịta akwụkwọ ozi. N’otu n’ime akwụkwọ ozi ndị ahụ, o kwuru na Chọọchị Ọtọdọks ka nọgidere na-eme ọtụtụ omume ndị na-ezighị ezi. N’akwụkwọ ozi ndị ọzọ, o mesiri ike mkpa ọ dị ka chọọchị jiri ‘ikwu okwuchukwu n’ụzọ dị mfe’ dochie anya nkwenkwe ụgha na ịdabere nanị n’ikike Akwụkwọ Nsọ.

O nyekwara Lucaris nsogbu n’obi na a na-ewere ikike ime mmụọ nke Ndị Nna Chọọchị nwere dị ka nke ya na okwu Jisọs na nke ndị ozi hà nhata. O dere sị: “Apụghịzi m ịnagide ịnụ ka ndị mmadụ na-ekwu na ihe ọdịnala ụmụ mmadụ kwuru na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru enweghị nke ka ibe ya elu.” (Matiu 15:6) Ọ gbakwụnyere na, n’echiche nke ya, ife ihe oyiyi ofufe dị oké njọ. O kwuru na ịkpọku “ndị nsọ” bụ ịkparị Onye Ogbugbo, bụ́ Jisọs.—1 Timoti 2:5.

Ọkwá Onyeisi Ndị Bishọp Aghọọ Ihe A Na-ere Ere

Echiche ndị ahụ, tinyere oyi ọ na-asọ Chọọchị Roman Katọlik, kpataara Lucaris ịkpọasị na mkpagbu nke ndị Jesuit nakwa ndị nọ n’ime Chọọchị Ọtọdọks bụ́ ndị kwadoro njikọ nke ha na ndị Katọlik. N’agbanyeghị mmegide ahụ, na 1620, a họpụtara Lucaris ịbụ onyeisi ndị bishọp nke Constantinople. Ọkwá onyeisi ndị bishọp Chọọchị Ọtọdọks dị ọchịchị Alaeze Ukwu Ottoman n’aka mgbe ahụ. Ọchịchị Ottoman dị njikere ịchụtu otu onyeisi ndị bishọp ma nabata onye ọhụrụ ma o weta ego.

Ndị iro Lucaris, ọkachasị ndị Jesuit na ndị popu nwere ikike, ndị a na-atụkwa egwu, bụ́ ndị so na Congregatio de Propaganda Fide (Ọgbakọ Maka Mgbasa nke Okwukwe Ahụ), nọgidere na-ekwutọ ma na-akpa nkata megide ya. “Iji mezuo nzube a, ndị Jesuit jiri ụzọ ọ bụla mee ihe—nkata aghụghọ, ebubo ụgha, otuto ọnụ efu ma karịsịa, inye aka azụ, nke bụ́ ngwá agha kasị dị irè iji nweta ihu ọma nke ndị isi [nke Ottoman],” ka akwụkwo bụ́ Kyrillos Loukaris, na-ekwu. N’ihi ya, na 1622, a chụgara Lucaris n’àgwàetiti Rhodes, Gregory nke Amasya jikwa mkpụrụ ego ọlaọcha 20,000 zụrụ ọkwá ahụ. Otú ọ dị, Gregory enweghị ike iweta ego ahụ o kwere nkwa ya, n’ihi ya Anthimus nke Adrianople zụụrụ ọkwá ahụ, ma gbaa arụkwaghịm n’ikpeazụ. N’ụzọ na-eju anya, e weghachiri Lucaris n’ọkwá onyeisi ndị bishọp ahụ.

Lucaris kpebisiri ike iji ohere ọhụrụ a o nwere zụọ ndị ụkọchukwu nke Ọtọdọks na ndị nkịtị site n’ibipụta otu nsụgharị Bible na traktị dị iche iche banyere nkà mmụta okpukpe. Iji mezuo nke a, o mere ndokwa ka e bubata ígwè obibi akwụkwọ na Constantinople n’okpuru nchebe nke onye nnọchianya mba England n’obodo ahụ. Otú ọ dị, mgbe e bubatara ígwè obibi akwụkwọ ahụ na June 1627, ndị iro Lucaris boro ya ebubo iji ya eme ihe maka ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ha mesịrị mee ka e bibie ya. Ugbu a Lucaris aghaghị iji ígwè obibi akwụkwọ ndị dị na Geneva mee ihe.

Nsụgharị nke Akwụkwọ Nsọ Ndị Kraịst

Nkwanye ùgwù dị ukwuu Lucaris nwere maka Bible na ikike Bible nwere izi ndị mmadụ ihe kpaliri ọchịchọ ya ime ka ihe ndị e dere n’ime ya nwee ike irutekwu ndị nkịtị aka. Ọ chọpụtara na asụsụ e ji dee ihe odide Bible Grik mbụ ndị sitere n’ike mmụọ nsọ adịghị ekwezi ndị nkịtị nghọta. Ya mere akwụkwọ mbụ Lucaris nyere ikike ka e wepụta bụ nsụgharị nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst n’asụsụ Grik nke oge ya. Maximus Callipolites, bụ́ onye mọnk gụrụ ezigbo akwụkwọ, malitere ọrụ na ya na March 1629. Ọtụtụ n’ime ndị Ọtọdọks lere ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ anya dị ka arụ, n’agbanyeghị otú ihe odide ahụ pụrụ isi bụrụ nke na-edoghị ndị na-agụ ya anya. Iji mee ka obi dị ha mma, Lucaris mere ka e bipụta ihe odide mbụ n’otu kọlụm nke ya na kọlụm nke nsụgharị ọgbara ọhụrụ dịdewere, na-agbakwụnye nanị mkpụrụ okwu ole na ole. Ebe Callipolites nwụrụ ozugbo o nyefesịrị ya ihe odide ahụ, Lucaris gụgharịziri ha n’onwe ya. E bipụtara nsụgharị ahụ ntakịrị oge mgbe Lucaris nwụsịrị na 1638.

N’agbanyeghị mkpachara anya Lucaris, nsụgharị ahụ kpalitere oké nkatọ site n’aka ọtụtụ ndị bishọp. Ịhụnanya Lucaris nwere maka Okwu Chineke pụtara nnọọ ìhè n’okwu mmalite nke nsụgharị Bible ahụ. O dere na Akwụkwọ Nsọ, nke e dere n’asụsụ ndị mmadụ na-asụ, bụ “ozi dị ụtọ, e ziri anyị site n’eluigwe.” Ọ dụrụ ndị mmadụ ọdụ “ịmata na ịbụ ndị ihe nile dị na [Bible] doro anya nke ọma” ma kwuo na ọ dịghị ụzọ ọzọ a pụru isi mụta “ihe ndị metụtara okwukwe n’ụzọ ziri ezi . . . ma ọ bụghị site n’Oziọma ahụ dị nsọ nke si n’aka Chineke.”—Ndị Filipaị 1:9, 10.

Lucaris katọrọ ndị na-amachibido ịmụ Bible n’ụzọ siri ike, tinyere ndị jụrụ nsụgharị nke ihe odide mbụ ahụ: “Ọ bụrụ na anyị ekwuo okwu ma ọ bụ gụọ ihe n’aghọtaghị ya, ọ ga-adị ka ikwukanye okwu anyị n’ifufe.”(Tụlee 1 Ndị Kọrint 14:7-9.) N’imechi okwu mmalite ahụ, o dere, sị: “Ka unu nile nọ na-agụ Oziọma a dị nsọ, nke sitere n’aka Chineke, n’asụsụ nke unu, jirinụ uru unu ritere site n’ịgụ ya mee ihe, . . . ka Chineke nọgidekwa na-amụkwasị ìhè n’okporo ụzọ unu ịmata ihe ndị bụ́ ezi ihe.”—Ilu 4:8.

Nkwupụta nke Okwukwe

Mgbe o mesịrị ka a malite nsụgharị nke Bible ahụ, Lucaris mere ihe ọzọ chọrọ obi ike. Na 1629 ọ nọ na Geneva bipụta Confession of Faith (Nkwupụta nke Okwukwe). Ọ bụ nkwupụta nke ihe ndị o kwenyere n’onwe ya bụ́ ndị ọ tụrụ anya na Chọọchị Ọtọdọks ga-anakwere. Dị ka akwụkwọ bụ́ The Orthodox Church si kwuo, Confession ahụ “mere ka ozizi ndị Ọtọdọks banyere ndị ụkọchukwu na usoro dị nsọ ghara inwekwa ihe ọ pụtara, ma katọọ ịsọpụrụ ihe oyiyi na ịkpọku ndị nsọ dị ka ụdị dị iche iche nke ikpere arụsị.”

Confession ahụ nwere isiokwu 18. Isiokwu ya nke abụọ kwupụtara na Akwụkwọ Nsọ sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke nakwa na ikike ya dị elu karịa nke chọọchị. Ọ sịrị: “Anyị kwenyere na ọ bụ Chineke nyere Akwụkwọ Nsọ . . . Anyị kwenyere na ikike Akwụkwọ Nsọ nwere karịrị ikike Chọọchị. Ịbụ onye Mmụọ Nsọ ziri ihe dị nnọọ iche n’ịbụ onye mmadụ ziri ihe.”—2 Timoti 3:16.

Isiokwu nke asatọ na nke iri na-ekwusi ike na ọ bụ Jisọs Kraịst bụ nanị Onye Ogbugbo, Onyeisi Nchụàjà, na Isi nke nzukọ ahụ. Lucaris dere, sị: “Anyị kwenyere na Onyenwe anyị bụ́ Jisọs Kraịst nọ n’aka nri nke Nna Ya, Ọ nọkwa n’ebe ahụ na-arịọchitere anyị arịrịọ, na-arụ ọrụ nanị ya dị ka ezi onyeisi nchụàjà na onye ogbugbo iwu.”—Matiu 23:10.

Isiokwu nke 12 na-ekwu na chọọchị pụrụ imehie ihe, na-ewere ụgha dị ka eziokwu, ma ìhè nke mmụọ nsọ pụrụ ịnapụta ya site n’ịrụsi ọrụ ike nke ndị ozi na-ekwesị ntụkwasị obi. N’isiokwu nke 18, Lucaris kwusiri ike na pọgatrị bụ nanị ihe e chepụtara echepụta: “O doro anya na e kwesịghị ịnakwere ihe ahụ e chepụtara echepụta bụ́ Pọgatrị.”

Ntụaka isiokwu nke Confession ahụ nwere ọtụtụ ajụjụ na azịza. N’ebe ahụ Lucaris mesiri ya ike nke mbụ na onye ọ bụla n’ime ndị kwesịrị ntụkwasị obi kwesịrị ịdị na-agụ Akwụkwọ Nsọ nakwa na ọ bụ ihe ize ndụ onye Kraịst ịghara ịgụ Okwu Chineke. Ọ gbakwụnyeziri na e kwesịrị izere akwụkwọ Apọkrịfa.—Mkpughe 22:18, 19.

Ajụjụ nke anọ na-ajụ, sị: “Olee otú anyị kwesịrị isi were Ihe Oyiyi?” Lucaris zara, sị: “Akwụkwọ Nsọ, nke sitekwara n’aka Chineke na-ezi anyị ihe, bụ́ nke kwuru n’ụzọ doro anya, sị, ‘Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, ma ọ bụ oyiyi nke ụdị ọ bụla nke dị n’eluigwe n’elu, ma ọ bụ nke dị n’ụwa n’okpuru ya, gị akpọla isiala nye ha, efekwala ha ofufe: [Ọpụpụ 20:4, 5]’ ebe anyị kwesịrị ife, ọ bụghị ihe e kere eke kama nanị Onye Okike na Onye Mere eluigwe na ụwa, nanị Ya ka anyị ga-akpọ isiala nye. . . . Anyị na-ajụ ife na ịsọpụrụ [ihe oyiyi], dị ka a machibidoro ya iwu n’ime . . . Akwụkwọ Nsọ, ka anyị wee ghara ichezọ, wee kpọọ isiala nye àgwà, ọrụ nkà, na ihe e kere eke kama ịkpọ isiala nye Onye Okike na Onye Mere ihe nile.”—Ọrụ 17:29.

Ọ bụ ezie na Lucaris aghọtachaghị ihie ụzọ nile e hiere n’oge ọchịchịrị ime mmụọ o biri ndụ na ya, * o mere mgbalị kwesịrị ịja mma ime ka Bible bụrụ ebe nkwenkwe chọọchị gbakwasịrị ụkwụ na ikụziri ndị mmadụ ozizi ya.

Ozugbo e wepụtasịrị Confession a, a maliteghachiri imegide Lucaris n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. Na 1633, Cyril Contari, bụ́ onye bi n’ógbè Beria (nke bụ́ Aleppo ugbu a), onye iro nke Lucaris nakwa onye ndị Jesuit na-akwado, gbalịrị iso ndị Ottoman kwuo ego ole ọ ga-akwụ banyere ọkwá onyeisi ndị bishọp ahụ. Otú ọ dị, atụmatụ ahụ dara mgbe Contari na-akwụlighị ego ahụ. Lucaris jigidere ọkwá ahụ. N’afọ na-eso ya Athanasius nke Tesalọnaịka kwụrụ mkpụrụ ego ọlaọcha 60,000 maka ọkwá ahụ. A chụtukwara Lucaris ọzọ. Ma n’ihe na-erughị otu ọnwa a kpọghachiri ya ma nyeghachi ya ọkwá ahụ. Mgbe ọ na-erule oge ahụ Cyril Contari enwetazuwo mkpụrụ ego ọlaọcha 50,000 ya. Na nke ugbu a, a chụgara Lucaris na Rhodes. Mgbe ọnwa isii gasịrị, ndị enyi ya mere ka e weghachi ya.

Otú ọ dị, na 1638, ndị Jesuit na ndị ya na ha gbakọrọ aka bụ́ ndị Ọtọdọks, boro ya ebubo ịgba Alaeze Ukwu Ottoman mgba okpuru. N’oge a, onye ọchịchị ahụ nyere iwu ka e gbuo ya. E jidere Lucaris, na July 27, 1638, e tinyere ya ná ntakịrị ụgbọ mmiri dị ka a ga-asị na a chọrọ ịgbara ya ụgbọ nwa mkpi. Ozugbo ụgbọ ahụ banyere n’osimiri, a nyagburu ya. E liri ozu ya n’ikperé mmiri, mesịa bọpụta ya ma tụnye ya n’ime mmiri. Ndị ọkụ azụ̀ chọtara ya, ndị enyi ya mesịkwara lie ya.

Ihe Mmụta Nye Anyị

“E kwesịghị ichezọ na otu n’ime nzube bụ́ isi [nke Lucaris] bụ iwelite ọ̀tụ̀tụ̀ agụmakwụkwọ nke ndị ụkọchukwu ya na ìgwè atụrụ na ime ka ha nwee nghọta, bụ́ nke daruworo ala na narị afọ nke iri na isii na nke iri na asaa,” ka otu onye ọkà mmụta kwuru. Ọtụtụ ihe gbochiri Lucaris imezu nzube ya. E wepụrụ ya n’ọ́kwá onyeisi ndị bishọp ugboro ise. Iri afọ atọ na anọ mgbe ọ nwụsịrị, nzukọ ndị isi chọọchị e nwere na Jerusalem katọrọ nkwenkwe ya dị ka ozizi nduhie. Ha kwupụtara na ‘ọ bụghị nnọọ onye ọ bụla kwesịrị ịgụ Akwụkwọ Nsọ, kama ọ bụ nanị ndị na-enyoba anya n’ihe ndị dị omimi nke mmụọ nsọ mgbe ha mesịworo nnyocha kwesịrị ekwesị’—ya bụ, nanị ndị ụkọchukwu e lere anya dị ka ndị gụrụ akwụkwọ.

Ọzọkwa, ndị òtù na-achị achị na chọọchị bịanyụrụ mgbalị ndị e mere ime ka Okwu Chineke ruo ìgwè atụrụ ha aka. Ha ji ime ihe ike mechie ọnụ nke na-ekwupụta ihe ndị na-ezighị ezi dị n’ime nkwenkwe ha ndị Bible na-akwadoghị. Ha gosiri na ha so ná ndị kasị bụrụ ndị iro nke nnwere onwe okpukpe na eziokwu. N’ụzo dị mwute, nke a bụ omume dịgideworo rute n’oge anyị n’ụzọ dịgasị iche. Ọ bụ ihe ncheta na-akpali iche echiche nke ihe na-eme mgbe aghụghọ ndị okpukpe kpalitere gbochiri nnwere onwe iche echiche na ikwu okwu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 24 N’ime Confession ya, ọ kwadoro Atọ n’Ime Otu na ozizi banyere akara aka na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ—ndị bụcha ozizi ndị Bible na-akwadoghị.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 29]

Lucaris mere mgbalị kwesịrị ịja mma ime ka Bible bụrụ ebe nkwenkwe chọọchị gbakwasịrị ụkwụ na ịkụziri ndị mmadụ ozizi ya

[Igbe/Foto dị na peeji nke 28]

Lucaris na Codex Alexandrinus

Otu n’ime akụ̀ dị oké ọnụ ahia nke British Library bụ Codex Alexandrinus, bụ́ ihe odide Bible nke narị afọ nke ise O.A. N’ime ibe akwụkwọ 820 o nwere na mbụ, e chebewo 773.

Mgbe Lucaris bụ onyeisi ndị bishọp nke Aleksandria, Ijipt, o nwere ọtụtụ akwụkwọ. Mgbe ọ ghọrọ onyeisi ndị bishọp nke Constantinople, o weere Codex Alexandrinus ahụ. Na 1624 o nyere ya onye nnọchianya mba Britain na Turkey dị ka onyinye ọ ga-enye Eze England, bụ́ James nke Mbụ. Ka afọ atọ gasịrị, e nyefere ya onye nọchiri ya, bụ́ Charles nke Mbụ.

Na 1757 e nyere mba Britain ọ́ba akwụkwọ King’s Royal Library, e debekwara ọmaricha Codex a ugbu a na John Ritblat Gallery nke British Library ọhụrụ ahụ ka a na-ekiri ya.

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Site na The Codex Alexandrinus in Reduced Photographic Facsimile, 1909

Gewerbehalle, Vol. 10

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 26]

Bib. Publ. Univ. de Genève