Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Pọl onyeozi ọ̀ na-egosi ná Ndị Rom 12:19, na ndị Kraịst ekwesịghị iwe iwe, mgbe ọ sịrị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọbọ, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ”?

N’ikwu ya kpọmkwem, ee e. N’ebe a, Pọl onyeozi nọ na-ezo aka n’iwe Chineke. N’ezie, nke a apụtaghị na o nweghị ihe o mere ma ndị Kraịst kwe ka iwe chịkwaa ha. Bible na-enye anyị ndụmọdụ n’ụzọ doro anya megide iwe iwe. Tụlee ihe atụ nke ndụmọdụ Chineke.

“Haa aka iwe iwe, hapụkwa ọnụma: emela ka iwe gị dị ọkụ, ọ na-eduba nanị n’ime ihe ọjọọ.” (Abụ Ọma 37:8) “Onye ọ bụla nke na-ewe iwe megide nwanne ya ga-enye onwe ya n’aka ikpe.” (Matiu 5:22) “Ọrụ nile nke anụ ahụ pụtara ìhè, nke dị ka ndị a, ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ ịkwa iko, ikpere arụsị, ịgwọ nsi, ibu iro, esemokwu, ekworo, ọnụma.” (Ndị Galetia 5:19, 20) “Ka e wepụ ihe ilu na ọnụma na iwe na iti mkpu na nkwulu nile, . . . n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 4:31) “Ka mmadụ ọ bụla bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe.” (Jemes 1:19) Ọzọkwa, akwụkwọ Ilu na-enye anyị ndụmọdụ ugboro ugboro megide iwe iwe ma ọ bụ ịbụ ndị a na-akpasukarị iwe n’ihi obere mmejọ na mmehie ihe nke ụmụ mmadụ.—Ilu 12:16; 14:17, 29; 15:1; 16:32; 17:14; 19:11, 19; 22:24; 25:28; 29:22.

Ihe a na-ekwu banyere ya ná Ndị Rom 12:19 kwekọrọ na ndụmọdụ dị otú ahụ. Pọl tụrụ aro ka ịhụnanya anyị bụrụ nke ihu abụọ na-adịghị na ya, ka anyị na-agọzi ndị na-esogbu anyị, ka anyị na-agbalị iche echiche ọma banyere ndị ọzọ, ka anyị ghara inyeghachi ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ, nakwa ka anyị na-agbalịsi ike isoro mmadụ nile na-adị n’udo. Ọ gbaziri ume, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọbọ, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Mụ nwe ọbọ; Mụ onwe m ga-enyeghachi, ka Onyenwe anyị kwuru.”—Ndị Rom 12:9, 14, 16–19.

Ee, anyị ekwesịghị ikwe ka iwe kpalie anyị iji ịbọ ọ́bọ̀ megwara ihe e mere anyị. Ihe ọmụma anyị nwere banyere ọnọdụ dị iche iche na otú anyị si ele ikpe ziri ezi anya ezughị okè. Ọ bụrụ na anyị ekwe ka iwe kpalie anyị ịbọ ọ́bọ̀, anyị ga na-emehie ihe mgbe mgbe. Nke ahụ ga-emezu nzube Onye Iro Chineke, bụ́ Ekwensu. N’ebe ọzọ, Pọl dere, sị: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu: enyekwala ekwensu ụzọ.”—Ndị Efesọs 4:26, 27.

Ụzọ ka mma, nke amamihe ka dịrị na ya, bụ ikwe ka Chineke kpebie mgbe na onye ọ ga-abọ ọ́bọ̀ n’isi ya. Ọ pụrụ ime otú ahụ na-enwe ihe ọmụma zuru ezu nke ihe ndị bụ́ eziokwu, nkwụghachi ọ bụla o nyekwara ga-egosipụta ezi ikpe ya nke zuru okè. Anyị pụrụ ịhụ na nke a bụ isi ihe Pọl na-ekwu ná Ndị Rom 12:19 mgbe anyị rịbara nhota o hotara Deuterọnọmi 32:35, 41 ama, nke gụnyere okwu ndị a: “Mụ nwe ọ́bọ̀ na nkwụghachi.” (Tụlee Ndị Hibru 10:30.) Ya mere, ọ bụ ezie na okwu ndị bụ́ “nke Chineke” adịghị n’akụkụ akwụkwọ nsọ Grik, ọtụtụ ndị nsụgharị nke oge a etinyewo ha ná Ndị Rom 12:19. Nke a na-eduga n’ịgụ ya n’ụzọ ndị dị otú a “ka Chineke bọọ ọ́bọ̀” (The Contemporary English Version); “nyere iwe nke Chineke ohere” (American Standard Version); “ka Chineke nye ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na ọ chọọ” (The New Testament in Modern English); “nye ohere maka ịbọ ọ́bọ̀ Chineke.”—The New English Bible.

Ọbụna mgbe ndị iro nke eziokwu ahụ kwutọrọ ma ọ bụ kpagbuo anyị, anyị pụrụ igosipụta ntụkwasị obi ná nkọwa banyere Jehova Chineke nke Mosis nụrụ: “Jehova, Jehova, Chineke nke nwere obi ebere, Onye na-eme amara, Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Onye na-aba ụba n’ebere na eziokwu; Onye na-edebere [ọtụtụ puku] ebere, onye na-agbaghara ajọ omume na njehie na mmehie: ma ọ dịghị ụzọ ọ bụla ọ ga-agụ ndị ikpe mara na ha bụ ndị ikpe na-amaghị.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ọpụpụ 34:6, 7.