Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Mere Onye Inyeaka Ji Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa

Ihe Mere Onye Inyeaka Ji Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa

Ihe Mere Onye Inyeaka Ji Dị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Mkpa

‘ABỤBU m onye nsogbu na-eme ndị mmadụ ihe ihere,’ ka otu nwoke dịbu nganga ma na-eme ihe ike kwetara. Ọ bụwo ajọ onye nkwulu nke jiworo obi ịta mmiri majaa ma wakpoo ụmụazụ Jisọs Kraịst bụ́ ndị na-atụ egwu Chineke. “Otú ọ dị,” ka o ji obi ekele kwuo, “O meere m ebere.” N’agbanyeghị ókè ọ pụrụ iyiru ihe na-apụghị ikwe omume, onye mkpagbu a na-eme ihe ike ghọrọ onye Kraịst ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Pọl onyeozi.—1 Timoti 1:12-16; Ọrụ 9:1-19.

Ọ bụghị mmadụ nile merela ụdị ihe Pọl mere. Ma, anyị nile adịghị emezu ihe ụkpụrụ Chineke chọrọ anyị n’aka. N’ihi gịnị? N’ihi na “mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) Ọzọkwa, ọ dị nnọọ mfe ịbụ ndị obi nkoropụ rikpuru, ikekwe na-eche na anyị dịbigara njọ ókè ịbụ ndị Chineke ga-emere ebere. Ka Pọl n’onwe ya na-atụgharị uche n’ọchịchọ ime mmehie ya, o kwupụtara, sị: “Mmadụ nke hụjuru anya ka mụ onwe m bụ! ònye ga-adọpụta m n’ahụ nke ọnwụ a?” N’ịza ajụjụ ọ jụrụ n’onwe ya, o dere, sị: ‘Ekele dịrị Chineke site n’aka Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.’—Ndị Rom 7:24, 25.

Olee otú Onye Okike nke na-eme ezi omume pụrụ isi soro ndị mmehie na-emekọ ihe? (Abụ Ọma 5:4) Rịba ama na Pọl kwuru, sị: ‘Ekele dịrị Chineke site n’aka Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.’ Onye ọzọ Chineke meere ebere kọwara, sị: “Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emehie, anyị nwere [onye inyeaka, NW] n’ebe Nna anyị nọ, Ya bụ Jisọs Kraịst, bụ́ Onye ezi omume: Ya onwe ya bụkwa ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie nile anyị; ma Ọ bụghị ihe ịjụrụ Ya obi banyere nanị mmehie nke anyị onwe anyị, kama Ọ bụkwa ihe ịjụrụ Ya obi banyere mmehie nke ụwa dum.”—1 Jọn 2:1, 2.

N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Jisọs Kraịst “onye inyeaka n’ebe Nna anyị nọ”? Oleekwa otú Jisọs si bụrụ “ihe ịjụrụ Chineke obi” banyere mmehie?

Ihe Mere Onye Inyeaka Ji Dị Mkpa

Jisọs bịara n’ụwa inye ‘ndụ Ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.’ (Matiu 20:28) Ihe mgbapụta bụ ụgwọ a na-akwụ iji zụtaghachi, ma ọ bụ iji mee ka a tọhapụ, mmadụ ma ọ bụ ihe. Ụdị ngwaa nke okwu Hibru a sụgharịrị ịbụ “ihe mgbapụta” na-enye echiche nke ikpuchi mmehie. (Abụ Ọma 78:38) E ji okwu Grik, dị ka nke ahụ dị na Matiu 20:28, mee ihe kpọmkwem iji zoo aka n’ụgwọ a na-akwụ iji gbapụta ndị a dọọrọ n’agha ma ọ bụ iji tọhapụ ndị ohu. Iji mezuo ihe ikpe ziri ezi chọrọ, a na-enye otu ihe n’ọnọdụ ihe ọzọ nke ọnụ ahịa ya na ya hà nhata.

Ihe a kpọrọ mmadụ banyere n’ịbụ ohu n’ihi isi nwoke mbụ ahụ nupụụrụ Chineke. Dị ka e gosipụtara na Jenesis isi nke 3, nwoke ahụ zuru okè—Adam—họọrọ ịgbaso ụzọ nke inupụrụ Jehova Chineke isi. Site n’ime otú ahụ, o rebanyere onwe ya na ụmụ ndị ọ ka ga-amụ, n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ. Adam si otú a tụfuoro onwe ya na ụmụ ya onyinye nke ndụ mmadụ zuru okè.—Ndị Rom 5:12, 18, 19; 7:14.

N’Israel oge ochie, Chineke mere ndokwa maka àjà ụmụ anụmanụ iji kpuchie mmehie ha. (Levitikọs 1:4; 4:20, 35) Dị ka a pụrụ isi kwuo ya, e nyere ndụ anụmanụ ahụ e ji chụọ àjà n’ọnọdụ ndụ onye mmehie ahụ. (Levitikọs 17:11) N’ihi ya, a pụrụ ikwu na “ụbọchị mkpuchi mmehie” bụ “ụbọchị mgbapụta.”—Levitikọs 23:26-28.

Otú ọ dị, ebe ọ bụ na ụmụ anụmanụ dị ala karịa mmadụ, “ọbara nke oké ehi na nke ewu apụghị iwepụ mmehie [kpam kpam].” (Ndị Hibru 10:1-4) Ka àjà wee nwee ọnụ ahịa zuru ezu iji kpuchie, ma ọ bụ wepụ mmehie n’ụzọ na-adịgide adịgide, ọnụ ahịa ya na ihe Adam tụfuru aghaghị ịha nhata. Iji mee ka ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ikpe ziri ezi guzozie, a chọrọ nwoke zuru okè (Jisọs Kraịst) nke ga-enye ihe ya na ihe nwoke ọzọ zuru okè (Adam) tụfuru hà nhata. Ọ bụ nanị ndụ mmadụ zuru okè pụrụ ịkwụ ụgwọ mgbapụta ahụ iji napụta ụmụ Adam n’ohu nke nna ha mbụ renyere ha. ‘Ndụ ịlara ndụ’ ga-emezu ihe ezi ikpe ziri ezi chọrọ.—Ọpụpụ 21:23-25.

Mgbe Adam mehiere, a maakwa ya ikpe ọnwụ, ụmụ ya bụ́ ndị a na-amụbeghị amụ ka nọ n’úkwù ya, n’ihi ya kwa, ha so ya nwụọ. Nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs, bụ́ “Adam ikpeazụ,” ji ọchịchọ obi ya jụ inwe ezinụlọ. (1 Ndị Kọrint 15:45) O nwere ụmụ ndị a na-amụghị amụ nọ n’úkwù ya mgbe ọ nwụrụ dị ka àjà mmadụ zuru okè. Ya mere, a pụrụ ikwu na ihe ahụ gaara abụ agbụrụ mmadụ bụ́ nke nọ n’úkwù ya so ya nwụọ. Jisọs weghaara ezinụlọ Adam nke na-emehie emehie ma na-anwụ anwụ, dị ka nke ya. Ọ hapụrụ ihe ruuru ya bụ́ inwe ezinụlọ nke aka ya. Site n’ịchụ ndụ mmadụ ya zuru okè n’àjà, Jisọs zụtaghachiri ihe nile a kpọrọ mmadụ bụ́ ụmụ Adam ka ha wee nwee ike ịghọ ezinụlọ Ya, na-eme ka Ọ bụụrụ ha “Nna mgbe nile ebighị ebi.” —Aịsaịa 9:6, 7.

Àjà mgbapụta Jisọs megheere ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ụzọ ịbụ ndị Chineke meere ebere na inweta ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, Pọl onyeozi dere, sị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ; ma onyinye amara nke Chineke bụ ndụ ebighị ebi n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) A na-akpali anyị ito Jehova maka ịhụnanya na ọmịiko nke kpaliri ya inye ihe mgbapụta ahụ, bụ́ nke furu ya na Ọkpara ọ hụrụ n’anya nke ukwuu, ihe hiri nne. (Jọn 3:16) N’ezie, Jisọs gosipụtakwara na ọ bụ “onye inyeaka n’ebe Nna anyị nọ” mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe, o gosikwa Chineke uru nke àjà mgbapụta ya n’eluigwe. * (Ndị Hibru 9:11, 12, 24; 1 Pita 3:18) Ma olee otú Jisọs Kraịst si egosipụta ugbu a na ọ bụ onye inyeaka anyị nke nọ n’eluigwe?

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Lee isi nke 4 na nke 7 nke akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 4]

Ndụ mmadụ zuru okè nke Jisọs ghọrọ ihe a chọrọ iji gbapụta ụmụ Adam