Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iso Ndị Ọzọ Na-ekerịta Olileanya Ndị Kraịst na Senegal

Iso Ndị Ọzọ Na-ekerịta Olileanya Ndị Kraịst na Senegal

Anyị Dị N’etiti Ndị Kwere Ekwe

Iso Ndị Ọzọ Na-ekerịta Olileanya Ndị Kraịst na Senegal

AZỤ̀ abụwo nri bụ́ isi kemgbe oge ochie. Ruo ọtụtụ puku afọ, ndị mmadụ akụwo azụ̀ n’oké osimiri, ọdọ mmiri, na n’osimiri dị iche iche nke ụwa. Ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst bụ ndị ọkụ azụ̀ n’Osimiri Galili. Otú ọ dị, Jisọs mere ka ha mara banyere ụdị ịkụ azụ̀ ọzọ. Nke a bụ ịkụ azụ̀ ime mmụọ nke ga-abara ọ bụghị nanị ndị ọkụ azụ̀ kamakwa azụ ahụ uru.

Banyere nke a, Jisọs gwara onye ọkụ azụ̀ ahụ bụ́ Pita, sị: “Site n’ugbu a ị ga na-anwụta mmadụ ná ndụ.” (Luk 5:10) Ụdị ịkụ azụ̀ a na-aga n’ihu taa n’ihe karịrị ala 230, gụnyere Senegal. (Matiu 24:14) N’ebe a, “ndị ọkụ̀ na-akụta mmadụ” nke oge a ji obi ike na-eso ndị ọzọ ekerịta olileanya ndị Kraịst ha.—Matiu 4:19.

Senegal dị n’ọnụ ọnụ ebe ọdịda anyanwụ Africa. Ọ gbasara site n’ebe bụ́ ọzara nke jupụtara n’ájá bụ́ nke ya na Sahara gbara n’ebe ugwu ruo n’ọhịa mmiri nke ógbè Casamance dị n’ebe ndịda. Senegal bụ ala nwere ikuku na-ekpo ọkụ nke ọzara, tinyere ikuku jụrụ oyi ma dị jụụ n’ahụ nke Oké Osimiri Atlantic. Ihe karịrị nde mmadụ itoolu bi ná mba a. E ji omume ha nke ile ọbịa nke ọma mara ndị Senegal. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha adịghị ekwupụta na ha bụ ndị Kraịst. Ọtụtụ bụ ndị ọzụzụ atụrụ, ebe ndị ọzọ na-akpa ehi, camel, na ewu. E nwekwara ndị ọrụ ugbo, bụ́ ndị na-akọpụta ahụekere, ogho, na osikapa. Ee, e nwekwara ndị ọkụ̀ azụ̀, bụ́ ndị na-ebubata ụgbụ ndị jupụtara n’azụ̀ site n’Oké Osimiri Atlantic nakwa site n’ọtụtụ nnukwu osimiri ndị ọzọ gbara mba ahụ gburugburu. Ọrụ ịkụ azụ̀ na-ekere òkè dị mkpa n’ọnọdụ akụ̀ na ụba nke Senegal. N’ezie, nri mba ahụ a ma ama bụ ceebu jën, bụ́ nri dị ụtọ nke bụ osikapa, azụ̀, na akwụkwọ nri.

“Ndị Ọkụ̀ Na-akụta Mmadụ”

E nwere ndị nkwusa 863 nke Alaeze Chineke na-anụ ọkụ n’obi na Senegal. Ịkụ azụ̀ ime mmụọ malitere ná mba a ná mmalite afọ ndị 1950. E mepere alaka ụlọ ọrụ nke Watch Tower Society na Dakar, bụ́ isi obodo Senegal, na 1965. “Ndị ọkụ̀” bụ́ ndị ozi ala ọzọ malitere ịbata site n’ọtụtụ mba ndị dị anya. Ọrụ “ịkụ azụ̀” biiri ọkụ, iso ndị ọzọ na-ekerịta olileanya ndị Kraịst na Senegal gakwara n’ihu n’esepụghị aka. N’ikpeazụ, e wuru alaka ụlọ ọrụ ọhụrụ n’Almadies, ná mpụga Dakar, a rakwaara ya nye Jehova na June 1999. Lee oge ịṅụrị ọṅụ ọ bụ!

Ihe Ịma Aka nke Ịnakwere Eziokwu Ahụ

A na-akpọtụrụ ndị mmadụ sitere n’ọtụtụ ọnọdụ ndị dịgasị iche, ụfọdụ azaghachiwokwa n’ụzọ dị mma n’ozi olileanya ahụ a na-achọta n’Okwu Chineke. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị enweghị ihe ọmụma Bible, ha na-aṅụrị ọṅụ ịmụta na nkwa ndị Jehova Chineke kwere ndị amụma kwesịrị ntụkwasị obi nke oge ochie gaje imezu n’isi nso.

Ọtụtụ mgbe ọ na-achọ obi ike iji were nguzo siri ike maka ụkpụrụ ndị Kraịst, karịsịa mgbe o metụtara ọdịnala na omenala dị iche iche nke ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, ịlụ karịa otu nwanyị bụ ihe a na-eme ebe nile na Senegal. Tụlee ihe banyere otu nwoke bụ́ onye nwere nwunye abụọ mgbe ọ malitere ịmụ Bible. Ọ̀ ga-enwe obi ike ịnakwere eziokwu ndị Kraịst ma mee ihe kwekọrọ n’ihe Akwụkwọ Nsọ chọrọ nke bụ́ ịbụ di nke otu nwunye? (1 Timoti 3:2) Ọ̀ ga-ahapụ nwunye ọ lụrụ n’okorobịa, ya bụ́ nwanyị mbụ ọ lụrụ, ka ọ nọrọ? Nke ahụ bụ ihe o mere, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka onye okenye na-anụ ọkụ n’obi n’otu n’ime ọgbakọ ndị buru ibu dị n’ógbè Dakar. Nwunye ya nke mbụ anatawokwa eziokwu ahụ tinyere ụmụ 12 ya nile, ụmụ 10 ndị nwunye ya nke mbụ mụrụ na ụmụ 2 ndị nwunye ya nke abụọ lara ala mụrụ.

Ihe mgbochi ọzọ e nwere n’ịnakwere olileanya ndị Kraịst bụ amaghị akwụkwọ. Nke a ọ̀ pụtara na onye na-amaghị akwụkwọ apụghị ịnakwere eziokwu ahụ na ibi ndụ kwekọrọ na ya? Ọ dịghị ma ọlị. Tụlee ihe atụ nke Marie, bụ́ nne na-arụsi ọrụ ike nke nwere ụmụaka asatọ na-eto eto. Ọ hụrụ ozugbo mkpa ọ dị isoro ụmụ ya na-atụle otu akụkụ Bible kwa ụbọchị tupu ha ejewe ụlọ akwụkwọ nakwa tupu ya ejewe ọrụ. Ma olee otú ọ pụrụ isi mee nke a, ebe ọ bụ na ọ pụghị ịgụ ihe? N’isi ụtụtụ ọ bụla, ọ na-ewere akwụkwọ nta ahụ bụ́ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị ma guzoro n’okporo ámá nke ájá jupụtara bụ́ nke dị n’ihu ụlọ ya. Ka ndị mmadụ na-agafe, ọ na-ajụ ha ma ha pụrụ ịgụ ihe. Mgbe ọ hụrụ onye pụrụ ịgụ ihe, ọ na-enye ya akwụkwọ nta ahụ ma jiri obi ya nile kwuo, sị: “Apụghị m ịgụ ihe, biko ị̀ ga-agụtụrụ m akụkụ a taa?” Ọ na-aṅa ntị nke ọma n’ọgụgụ ihe ahụ. Mgbe onye ahụ gụsịrị, ọ na-ekele ya ma banye n’ụlọ ya ngwa ngwa iji soro ụmụ ya tulee akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ tupu ha ejewe akwụkwọ!

Ụdị Mmadụ Nile Na-azaghachi

Na Senegal, a pụrụ ịhụ ndị mmadụ ka ha nọdụrụ ala n’okporo ámá na-ere azụ̀, akwụkwọ nri, ma ọ bụ ka ha nọ n’ahịa na-ere mkpụrụ osisi ma ọ bụkwanụ ka ha nọkọtara n’okpuru nnukwu osisi boabab na-aṅụ ataya, bụ́ tii na-elutụ ilu nke na-acha ahịhịa ndụ ahịhịa ndụ. N’ịbụ ndị kpebisiri ike isoro onye ọ bụla ha zutere kerịta ozi ọma ahụ, ụmụnna nwoke abụọ gwara otu nwoke nwere nkwarụ bụ́ onye na-arịọ arịrịọ n’okporo ámá okwu. Mgbe ha kelesịrị ya, ha sịrị: “Ọtụtụ ndị na-enye gị ego ma ha adịghị akwụsị ịgwa gị okwu. Anyị bịara ịgwa gị okwu banyere ihe dị oké mkpa nke metụtara ọdịnihu gị.” O juru onye arịrịọ ahụ anya. “Ọ ga-amasị anyị ịjụ gị otu ajụjụ,” ka ụmụnna ahụ gara n’ihu ikwu. “Gịnị ka i chere mere e ji nwee oké nhụjuanya n’ime ụwa?” “Ọ bụ uche Chineke,” ka onye arịrịọ ahụ zaghachiri.

Mgbe ahụ, ụmụnna ahụ sooro ya tụgharịa uche site n’Akwụkwọ Nsọ ma kọwaa Mkpughe 21:4. Ozi olileanya a nakwa eziokwu ahụ bụ́ na o nwere onye nwere nnọọ mmasị n’ebe ọ nọ ruo n’ókè nke ịkwụsị iji soro ya tụlee Bible, metụrụ onye arịrịọ ahụ n’ahụ n’ụzọ miri emi. Anya mmiri juru ya n’anya. Kama ịrịọ maka ego, ọ rịọrọ ụmụnna ahụ ka ha were mkpụrụ ego nile o nwere n’ime efere arịrịọ ya! O siri ọnwụ nke mere na nke a dọtara uche ndị nile na-agafe ebe ahụ. O siiri nnọọ ụmụnna ahụ ike ime ka o kweta idowe ego ya. O mesịrị kweta ma sie ọnwụ na ha ga-eleta ya ọzọ.

Mahadum ukwu dị na Dakar na-atụkwasịkwa ihe n’ihe ndị a nwụtara n’ime ụgbụ ime mmụọ ahụ. N’ebe ahụ, otu nwa akwụkwọ aha ya bụ Jean-Louis bụ́ onye na-amụ nkà ọgwụ na ahụ ike, malitere ịmụ Bible. Ọ nakweere eziokwu ahụ ozugbo, rara ndụ ya nye Jehova, e meekwa ya baptism. Ọchịchọ ya bụ ijere Chineke ozi n’ozi ọsụ ụzọ oge nile, ma o nwekwara mmasị n’ihe ọmụmụ nkà ọgwụ na ahụ ike ya. N’ihi nkwekọrịta ya na ala nna ya nwere, iwu ji ya ịgụcha akwụkwọ ya. Ma, ọ malitere ije ozi dị ka onye ọsụ ụzọ inyeaka n’otu oge ahụ. N’oge na-adịghị anya mgbe o nwetasịrị diplọma ya dị ka onye dibịa bekee ruru eru, a kpọrọ ya ije ozi dị ka dọkịta ezinụlọ n’otu nnukwu ebe obibi Betel nke dị n’Africa. Nwa okorobịa ọzọ a kpọtụụrụ na Mahadum Dakar sokwa ezinụlọ Betel dị n’obodo ya na-eje ozi ugbu a.

Ịkụ azụ̀ ime mmụọ na Senegal na-akwụghachi ụgwọ n’ezie. E ji akwụkwọ e ji amụ Bible nke Ndịàmà Jehova na-ebipụta kpọrọ ihe nke ukwuu, a na-ebipụtakwa ya ugbu a n’asụsụ Wolof ndị obodo ahụ na-asụ. Ịnụ ozi ọma ahụ n’asụsụ ala ha agbawo ọtụtụ ndị obi ha ziri ezi ume iji obi ekele zaghachi. Obi abụọ adịghị ya na site ná ngọzi Jehova, a ga-anwụtakwu ọtụtụ azụ̀ ihe atụ, ka ‘ndị ọkụ̀ ji ịnụ ọkụ n’obi na-akụta mmadụ’ nke Senegal nọgidere jiri okwukwe na obi ike na-eso ndị ọzọ ekerịta olileanya ndị Kraịst.

[Map/Foto dị na peeji nke 31]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

SENEGAL

[Foto]

Iso ndị ọzọ na-ekerịta olileanya ndị Kraịst na Senegal

[Ebe E Si Nweta Foto]

Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.