Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwoke Kwesịrị Nṅomi nke Nakweere Mgbazi

Nwoke Kwesịrị Nṅomi nke Nakweere Mgbazi

Nwoke Kwesịrị Nṅomi nke Nakweere Mgbazi

“AGỤ Iyi Ndị Dị na Zambia Erie Mmadụ 30 n’Ọnwa.” Otú ahụ ka otu akwụkwọ akụkọ Africa si kọọ ya n’afọ ụfọdụ gara aga. Dị ka otu ọkà mmụta ndụ ụmụ anụmanụ nke jidere anụ ndị a na-akpụ akpụ iji mụọ ihe banyere ha si kwuo, “o were ndị ikom 12 iji jituo otu agụ iyi.” N’ihi ọdụ dị ike na agbà buru ibu o nwere, agụ iyi bụ nnọọ anụ pụrụ iyi mmadụ egwu!

Ma eleghị anya, n’izo aka n’ebe agụ iyi nọ dị ka “Leviathan” (NW), Onye Okike ji ‘eze anụ ọhịa a dị nganga’ mee ihe iji kụziere ohu ya bụ́ Job ihe dị mkpa. (Job 41:1, 34) Nke a mere n’ihe dị ka afọ 3,500 gara aga n’ala Uz, ikekwe gburugburu ebe ugwu Arebia. Ka Chineke na-akọwa ihe a e kere eke, ọ gwara Job, sị: “Ọ dịghị onye dị irè nke ịkpọte ya: ònyekwa bụ onye ahụ nke ga-eguzo onwe ya n’ihu m?” (Job 41:10) Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu! Ọ bụrụ na anyị na-atụ agụ iyi egwu, lee ka anyị kwesịrị isi na-atụ egwu nke ukwuu karị, ikwu okwu megide Onye ahụ nke kere ya! Job gosipụtara ekele o nwere maka ihe mmụta a site n’ikwupụta ihie ụzọ ya.—Job 42:1-6.

Mgbe a kpọtụrụ Job aha, anyị pụrụ icheta ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi ya n’ịtachi obi n’ọnwụnwa. (Jemes 5:11) N’ezie, Jehova nwere mmasị n’ebe Job nọ ọbụna tupu e lee okwukwe ya ule n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ. N’anya Chineke, n’oge ahụ ọ dịghị “onye dị ka ya n’ụwa, ọ bụ nwoke zuru okè, ziekwa ezie, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” (Job 1:8) Nke a kwesịrị ịkpali anyị ịmụtakwu ihe banyere Job, ebe ọ bụ na ime otú ahụ ga-enyere anyị aka ịhụ otú anyị onwe anyị kwa pụrụ isi na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ.

Mmekọrịta Ya na Chineke Butere Ụzọ

Job bụ nwoke bara ọgaranya. E wezụga ọlaedo, o nwere atụrụ 7,000, camel 3,000, nne ịnyịnya ibu 500, 1,000 ehi, na ndị ohu bara ụba nke ukwuu. (Job 1:3) Ma Job tụkwasịrị Jehova obi, ọ bụghị akụ̀. O chere echiche, sị: “Ọ bụrụ na emewo m ọlaedo ka ọ bụrụ okwukwe efu m, ọ bụrụkwa na asịwo m ọlaedo ọma, Ị bụ ntụkwasị obi m; ọ bụrụ na aṅụrịa m ọṅụ n’ihi na akụ̀ m hiri nne, na n’ihi na aka m achọtawo akụ̀ ukwu; . . . nke ahụ bụkwa ajọ omume ndị ikpe ga-ekpe: n’ihi na n’ime ihe a m ga-agọnahụ Chineke Nke dị n’elu.” (Job 31:24-28) Dị ka Job, anyị kwesịrị iji mmekọrịta chiri anya nke anyị na Jehova Chineke kpọrọ ihe karịa ihe onwunwe.

Imeso Mmadụ Ibe Ya Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi

Olee otú Job si mesoo ndị ohu ya ihe? Okwu Job n’onwe ya na-egosipụta na ha hụtara ya dị ka onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu na onye na-adị mfe njekwuru: “Ọ bụrụ na ajụ m okwu ikpe ohu m nwoke ma ọ bụ ohu m nwanyị, mgbe mụ na ha na-ese okwu: gịnị ka m ga-emekwa mgbe Chineke na-ebili? Mgbe Ọ na-eletakwa, gịnị ka m ga-azaghachi Ya?” (Job 31:13, 14) Job ji ebere Jehova kpọrọ ihe, n’ihi ya kwa, o ji obi ebere mesoo ndị ohu ya ihe. Lee ihe nlereanya ọma nke ahụ bụ, karịsịa nye ndị nọ n’ọnọdụ nlekọta n’ọgbakọ ndị Kraịst! Ha onwe ha kwa aghaghị ịbụ ndị na-ekpe ikpe ziri ezi, ndị na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu, na ndị na-adị mfe njekwuru.

Job gosipụtakwara mmasị n’ebe ndị na-esoghị n’ezinụlọ ya nọ. N’ikpughe nchegbu o nwere n’ebe ndị ọzọ nọ, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na egbochie m ndị na-enweghị ike n’ihe na-atọ ha ụtọ, ọ bụrụkwa na emee m ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa n’isi; . . . ọ bụrụ na efewo m aka m megide nwa mgbei, n’ihi na m na-ahụ onye inyeaka m n’ọnụ ụzọ ámá: ka ubu m si n’azụ ubu ya dapụ, ka e tijipụkwa ogwe aka m n’ọkpụkpụ ya.” (Job 31:16-22) Ka anyị na-echebara ndị ụwa na-atụ n’ọnụ bụ́ ndị anyị maara n’ọgbakọ anyị echiche n’ụzọ dị otú ahụ.

N’ihi na ọ dịghị achọ uru ọdịmma onwe onye nanị n’ebe mmadụ ibe ya nọ, Job na-ele ndị ọ na-amabughị ọbịa. N’ihi ya, ọ pụrụ ikwu, sị: “Ọ bụghị n’èzí ka ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị; ana m emeghe ọnụ ụzọ m n’ebe ụzọ ámá dị.” (Job 31:32) Lee ezi ihe nlereanya nke a bụụrụ ndị ohu Chineke taa! Mgbe ndị ọhụrụ nwere mmasị n’eziokwu Bible bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị ịnabata ha nke ọma pụrụ ịtụnye ụtụ n’ọganihu ime mmụọ ha. N’ezie, ọ dịkwa ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndị Kraịst ndị ọzọ mkpa ịbụ ndị anyị lere ọbịa n’ụzọ ịhụnanya.—1 Pita 4:9; 3 Jọn 5-8.

Job nwere àgwà ziri ezi ọbụna n’ebe ndị iro ya nọ. Ọ ṅụrịghị ọṅụ n’ọdachi nke pụrụ ịdakwasị onye kpọrọ ya asị. (Job 31:29, 30) Kama nke ahụ, ọ dị njikere imere ndị dị otú ahụ ihe ọma, dị ka o yiri ka ọ pụtara ìhè ná njikere ọ dị ikpere ndị nkasi obi ụgha atọ ya ekpere.—Job 16:2; 42:8, 9; tụlee Matiu 5:43-48.

Ịdị Ọcha n’Ụzọ Mmekọahụ

Job guzosiri ike n’ihe nye nwunye ya, n’ekweghị mgbe ọ bụla ka obi ya zụlite mmetụta ịhụnanya na-ekwesịghị ekwesị n’ebe nwanyị ọzọ nọ. Job kwuru, sị: “Mụ na anya m abụọ gbara ndụ; m ga-esikwa aṅaa lekwasị nwa agbọghọ na-amaghị nwoke anya? Ọ bụrụ na a rafuo obi m ijekwuru nwanyị, m wee chee anwụ n’ụzọ mmadụ ibe m: ka nwunye m gweere nwoke ọzọ nri, ka ndị ikom ọzọ hurukwa ala n’elu ya. N’ihi na nke ahụ bụ nzube ọjọọ; ọzọ, nke ahụ bụ ajọ omume ndị ikpe ga-ekpe.”—Job 31:1, 9-11.

Job ekweghị ka ọchịchọ rụrụ arụ merụọ obi ya. Kama nke ahụ, ọ gbasoro ụzọ ziri ezi. Ka a sịkwa ihe mere Jehova Chineke ji nwee mmasị n’ebe nwoke a kwesịrị ntụkwasị obi nọ bụ́ onye lụsoro ihe ụrà dị iche iche nke omume rụrụ arụ ọgụ!—Matiu 5:27-30.

O Nwere Nchegbu Banyere Ọnọdụ Ime Mmụọ nke Ezinụlọ Ya

Mgbe ụfọdụ, ụmụ ndị ikom Job dokwara oriri na ọṅụṅụ ndị ụmụ ya ndị ikom na ndị inyom nile na-anọ na ha. Mgbe ụbọchị oriri na ọṅụṅụ ndị a gasịrị, Job na-enwe nchegbu na ma eleghị anya ụmụ ya emehiela megide Jehova n’ụzọ ụfọdụ. Ya mere, Job mere ihe, n’ihi na ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-ekwu, sị: “O ruo, mgbe ụbọchị nile nke ọṅụṅụ mmanya vine ha gasịrị gburugburu, na Job ziri doo ha nsọ, o wee bilie n’isi ụtụtụ, suree àjà nsure ọkụ, dị ka ọnụ ọgụgụ ha nile si dị: n’ihi na Job sịrị, Eleghị anya ụmụ m ndị ikom emehiewo, gbakụtakwa Chineke azụ n’obi ha.” (Job 1:4, 5) Lee ka nke a na-aghaghị isiwo kụnye n’obi ndị òtù ezinụlọ Job, nchegbu o nwere ka ha bụrụ ndị na-atụ Jehova egwu nsọpụrụ ma na-eje ije n’ụzọ Ya!

Taa, ọ dị ndị Kraịst bụ́ ndị isi ezinụlọ mkpa inye ezinụlọ ha ntụziaka n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. (1 Timoti 5:8) N’ezie kwa, o kwesịrị ekwesị ikpe ekpere maka ndị òtù ezinụlọ.—Ndị Rom 12:12.

O Ji Ikwesị Ntụkwasị Obi Tachie Obi n’Ule

Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-agụ Bible maara ule ndị ahụ tara akpụ bịakwasịrị Job nke ọma. Setan bụ́ Ekwensu ekwupụtawo na n’ọnọdụ ndị na-achọ oké ntachi obi, Job ga-akọcha Chineke. Jehova nakweere ihe ịma aka a, n’egbughịkwa oge ọ bụla, Setan wetaara Job ọdachi. Anụ ụlọ ya nile funahụrụ ya. Nke ka njọ, ụmụ ya nile nwụnahụrụ ya. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, Setan ji ihe ohihi ọjọọ tie Job ihe otiti site n’isi ya ruo n’ọbọ ụkwụ ya.—Job, isi nke 1, 2.

Gịnị si na ya pụta? Mgbe nwunye ya gbara ya ume ịkọcha Chineke, Job kwuru, sị: “Dị ka otu n’ime ndị inyom nzuzu si ekwu, otú a ka ị na-ekwu. Ànyị ga-anarakwa ezi ihe n’aka Chineke, ghara ịnara ihe ọjọọ?” Ihe ndekọ Bible ahụ na-agbakwụnye, sị: “N’ihe a nile Job ejighị egbugbere ọnụ ya mehie.” (Job 2:10) Ee, Job ji ikwesị ntụkwasị obi tachie obi ma si otú a gosi na Ekwensu bụ onye ụgha. Ka anyị onwe anyị n’otu aka ahụ na-atachi obi n’ọnwụnwa ma na-egosi na ọ bụ ezi ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ na-akwali anyị ijere Chineke ozi.—Matiu 22:36-38.

O Ji Obi Umeala Nakwere Mgbazi

Ọ bụ ezie na Job bụ onye kwesịrị nṅomi n’ọtụtụ ụzọ, ọ bụghị nwoke zuru okè. Ya onwe ya kwuru, sị: “Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a sị na ihe ọcha ga-apụta n’ihe rụrụ arụ! ọ dịghị otu ihe ọcha ga-apụta na ya.” (Job 14:4; Ndị Rom 5:12) Ya mere, mgbe Chineke kwuru na Job zuru okè, nke a bụ eziokwu n’echiche nke na o mere ihe kwekọrọ n’ihe Chineke tụrụ anya n’aka otu n’ime ndị ohu ya bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè ndị na-emehie emehie. Lee isi iyi nke agbamume ọ bụ!

Job tachiri obi n’ọnwụnwa bịaara ya, ma o kpughere otu ntụpọ. Mgbe mmadụ atọ a sị na ha bụ ndị nkasi obi nụrụ banyere ọdachi nile dakwasịrị ya, ha letara ya. (Job 2:11-13) Ha boro ebubo na Jehova na-ata Job ahụhụ n’ihi mmehie ndị dị oké njọ o mere. Dị ka o kwesịrị ịdị, Job nwere mwute n’ihi ebubo ụgha ndị a, wee chọsie ike ịgbachitere onwe ya. Ma o mebigara ihe ókè n’ịchọ igosipụta na o nweghị ihe ọjọọ ya mere. Leenụ, ọbụna Job nyere echiche na ya bụ onye ezi omume karịa Chineke!—Job 35:2, 3.

Ebe ọ bụ na Chineke hụrụ Job n’anya, O ji otu nwa okorobịa mee ihe iji mee ka ihie ụzọ Job pụta ìhè. Ihe ndekọ ahụ na-asị: “Iwe Elaịhu . . . we dị ọkụ: megide Job ka iwe ya dị ọkụ, n’ihi na ọ gụrụ onwe ya n’onye ezi omume karịa Chineke.” Dị ka Elaịhu kwuru: “Job sịrị, Abụ m onye ezi omume, ma Chineke ewezụgawo ikpe m.” (Job 32:2; 34:5) Otú o sina dị, Elaịhu esonyereghị “ndị nkasị obi” atọ ahụ n’ikwubi n’ụzọ na-ezighị ezi na Chineke na-ata Job ahụhụ n’ihi mmehie ndị o mere. Kama nke ahụ, Elaịhu kwupụtara obi ike o nwere n’ikwesị ntụkwasị obi Job, ma dụọ ya ọdụ, sị: “Okwu ikpe gị dị n’ihu [Jehova], ị ga-echerekwa Ya.” N’ezie, Job kwesịrị icherewo Jehova kama ikwu okwu n’echeghị echiche n’ịgbachitere onwe ya. Elaịhu mesiri Job obi ike, sị: “Ikpe na ịba ụba nke ezi omume [Chineke adịghị] eweda n’ala.”—Job 35:14; 37:23.

Ọ dị mkpa ka a gbazie echiche Job. N’ihi ya, Jehova kụziiri ya ihe n’ipe mpe nke mmadụ ma e were ya tụnyere ịdị ukwuu nke Chineke. Jehova rụtụrụ aka n’ebe ụwa, oké osimiri, eluigwe jupụtara na kpakpando, ụmụ anụmanụ, nakwa n’ebe ọtụtụ ihe ndị ọzọ dị ebube e kere eke dị. N’ikpeazụ, Chineke kwuru banyere Leviathan—agụ iyi. Job ji obi umeala nakwere mgbazi, o setịpụkwara ihe nlereanya ọzọ na nke a.

Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịdị na-eme nke ọma n’ozi Jehova, anyị ga-ehie ụzọ. Ọ bụrụ na ihie ụzọ ahụ dị oké njọ, Jehova pụrụ isi n’ụzọ ụfọdụ gbazie anyị. (Ilu 3:11, 12) Otu akụkụ akwụkwọ nsọ nke na-ama akọ na uche ikpe pụrụ ịgbabata anyị n’uche. Ikekwe Ụlọ Nche ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ nke Watch Tower Society bipụtara pụrụ ikwu ihe ga-eme ka anyị mara banyere otu ihie ụzọ. Ma ọ bụ ikekwe onye Kraịst ibe anyị ejiri obiọma mee ka anyị mara na anyị adawo n’itinye otu ụkpụrụ Bible n’ọrụ. Olee otú anyị ga-esi meghachi omume ná mgbazi dị otú ahụ? Job gosipụtara àgwà nchegharị, na-asị: “M na-ajụ onwe m ajụ, wee chegharịa n’elu ájá na ntụ.”—Job 42:6.

Jehova Kwụghachiri Ya Ụgwọ

Jehova kwụghachiri Job ụgwọ, na-ekwe ka ohu ya dị ndụ ruo afọ 140 ọzọ. N’oge ahụ, o nwetara ihe karịrị nnọọ ihe funahụworo ya. N’agbanyeghịkwa na Job nwụrụ n’ikpeazụ, o nwere obi ike na a ga-akpọlite ya n’ọnwụ banye n’ime ụwa ọhụrụ Chineke.—Job 42:12-17; Ezikiel 14:14; Jọn 5:28, 29; 2 Pita 3:13.

Anyị onwe anyị kwa pụrụ inwe obi ike na anyị ga-enweta ihu ọma na ngọzi Chineke ma ọ bụrụ na anyị ejiri iguzosi ike n’ihe na-ejere ya ozi ma na-anakwere mgbazi nile dabeere na Bible bụ́ ndị a ga-enye anyị. N’ihi ya, anyị ga-enwe olileanya e ji n’aka nke ịdị ndụ n’ime usoro ihe ọhụrụ Chineke. Nke ka mkpa, anyị ga-asọpụrụ Chineke. A ga-akwụghachi omume ikwesị ntụkwasị obi anyị ụgwọ, ọ ga-esokwa n’ihe na-agba akaebe na ndị ya na-ejere ya ozi, ọ bụghị n’ihi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, kama n’ihi ịhụnanya sitere n’obi dum. Lee ihe ùgwù anyị nwere ime ka obi Jehova ṅụrịa, dị ka Job kwesịrị ntụkwasị obi mere, bụ́ onye ji obi umeala nakwere mgbazi!—Ilu 27:11.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Job gosipụtara nchegbu ịhụnanya n’ebe ụmụ mgbei, ndị inyom di ha nwụrụ, na ndị ọzọ nọ

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

A kwụghachiri Job ụgwọ n’ụba n’ihi iji obi umeala nakwere mgbazi