Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Obi Umeala—Àgwà Na-akwalite Udo

Obi Umeala—Àgwà Na-akwalite Udo

Obi Umeala—Àgwà Na-akwalite Udo

Lee ka ụwa ga-esi magbuo onwe ya ma ọ bụrụ na onye ọ bụla na-egosipụta obi umeala. Ndị mmadụ agaghị na-achọ ihe gabigara ókè, ndị òtù ezinụlọ agaghị na-esekarị okwu, òtù dị iche iche agaghị na-asọkarị mpi, mba dị iche iche agaghị na-alụkarịkwa agha. Ọ̀ ga-amasị gị ibi n’ụwa dị otú ahụ?

EZI ndị ohu Jehova Chineke na-ejikere maka ụwa ọhụrụ o kwere ná nkwa, bụ́ ebe a ga-ewere obi umeala n’ebe nile dị ka ikike na àgwà ọma, ọ bụghị dị ka adịghị ike. (2 Pita 3:13) N’ezie, ha na-azụlite àgwà obi umeala ọbụna ugbu a. N’ihi gịnị? Ọ bụ karịsịa n’ihi na nke a bụ ihe Jehova na-achọ n’aka ha. Onye amụma ya bụ́ Maịka dere, sị: “Gị mmadụ, O gosiwo gị ihe dị mma; ọ̀ bụkwa gịnị ka Jehova na-achọ n’aka gị, ma ọ́ bụghị nanị ime ihe e kpere n’ikpe, na ịhụ ebere n’anya, na iji obi umeala soro Chineke gị na-eje ije?”—Maịka 6:8.

Obi umeala pụrụ ịpụta ọtụtụ ihe, dị ka adịghị mpako, ma ọ bụ nganga, na mmadụ ịjụ itu ọnụ banyere ikike ya, ihe ndị ọ rụzuru, na ihe onwunwe ya. Dị ka otu akwụkwọ e ji eme nnyocha si kwuo, obi umeala pụtakwara “agafeghị ókè.” Onye dị obi umeala adịghị agafe ókè nke akparamàgwà ọma. Ọ na-ekwetakwa na ihe o kwesịrị ime na ihe ọ ga-emeli, nwere ókè. Ọ maara na e nwere ihe ndị na-erughịrị ya. N’ezie, anyị na-enwe mmasị n’ebe ndị dị obi umeala nọ. “Ọ dịghị ihe na-adọta mmasị karịa ezi obi umeala,” ka onye England na-ede uri bụ́ Joseph Addison dere.

Obi umeala abụghị àgwà ụmụ mmadụ na-ezughị okè bu pụta ụwa. Anyị aghaghị itinye mgbalị iji zụlite àgwà a. Iji gbaa anyị ume, Okwu Chineke na-akọwa ọtụtụ ihe omume ndị na-egosipụta obi umeala n’ụdị ya dịgasị iche.

Ndị Eze Abụọ Dị Obi Umeala

Otu n’ime ndị ohu Jehova kasị guzosie ike n’ihe bụ Devid, onye bụ́ nwa okorobịa mgbe e tere ya mmanụ dị ka onye ga-abụ eze Israel n’ọdịnihu. Mgbe nke ahụ gasịrị, Eze Sọl nke na-achị mgbe ahụ tinyere Devid na gbalụgbalụ site n’ịnwa igbu ya nakwa site n’ịmanye ya ibi ndụ dị ka onye na-agba ọsọ ndụ.—1 Samuel 16:1, 11-13; 19:9, 10; 26:2, 3.

Ọbụna n’ọnọdụ ndị ahụ, Devid ghọtara na ihe ya kwesịrị ime ka ya na-echebe ndụ ya, nwere ókè. N’otu oge n’ọzara, Devid jụrụ ikwe ka Abishaị merụọ Eze Sọl na-ehi ụra ahụ, na-asị: “Ya bụrụ m ihe arụ sitere na Jehova, bụ́ isetị aka m megide onye Jehova e tere mmanụ.” (1 Samuel 26:8-11) Devid maara na ọ dịghị ya n’aka iwepụ Sọl n’ọnọdụ ịbụ eze. N’ihi ya, Devid gosipụtara obi umeala n’oge a site n’ịghara ịgafe ókè nke akparamàgwà kwesịrị ekwesị. N’otu aka ahụ, ndị ohu Chineke nke oge a maara na ‘site na Jehova,’ e nwere ihe ndị ha na-apụghị nnọọ ime, ọbụna mgbe ndụ mmadụ dị n’ihe ize ndụ.—Ọrụ 15:28, 29; 21:25.

Nwa Eze Devid bụ́ Solomọn gosipụtakwara obi umeala dị ka nwa okorobịa, ọ bụ ezie na ọ bụ n’ụzọ dịtụ iche. Mgbe e chiri Solomọn eze, o chere na ya erughị eru ibu oké ibu ọrụ nke onye bụ́ eze. O kpere ekpere, sị: “Jehova, bụ́ Chineke m, Gị onwe gị emewo ohu Gị eze n’ọnọdụ Devid, bụ́ nna m: ma mụ onwe m bụ nwatakịrị; amaghị m ịpụ apụ na ịbata abata.” N’ụzọ doro anya, Solomọn maara na ya enweghị ikike na ahụmahụ. Ya mere, ọ dị obi umeala, o gosipụtaghị mpako, ma ọ bụ nganga. Solomọn rịọrọ Jehova maka nghọta, e nyekwara ya ihe ọ rịọrọ.—1 Ndị Eze 3:4-12.

Mesaịa na Obu Ụzọ Ya

Ihe karịrị 1,000 afọ mgbe oge Solomọn gasịrị, Jọn Onye Na-eme Baptism rụrụ ọrụ nke idoziri Mesaịa ahụ ụzọ. Dị ka obu ụzọ nke Onye E Tere Mmanụ, Jọn nọ na-emezu amụma Bible. Ọ pụrụ ituwo ọnụ banyere ihe ùgwù ya. Jọn pụkwara ịnwawo ime ka a na-enye ya onwe ya nsọpụrụ n’ihi na ọ bụ onye ikwu Mesaịa ahụ. Ma Jọn gwara ndị ọzọ na ya erughị eru ọbụna ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ Jisọs. Mgbe Jisọs bịakwara ka e mee ya baptism n’Osimiri Jọdan, Jọn kwuru, sị: “Ọ dị mụ onwe m mkpa ka I mee m baptism, Gị onwe gị na-abịakwutekwa m?” Nke a na-egosi na Jọn abụghị onye na-etu ọnụ. Ọ dị obi umeala.—Matiu 3:14; Malakaị 4:5, 6; Luk 1:13-17; Jọn 1:26, 27.

Mgbe e mesịrị Jisọs baptism, ọ malitere ozi oge nile, na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụ ezie na Jisọs bụ nwoke zuru okè, o kwuru, sị: “Mụ onwe m apụghị ime ihe ọ bụla n’Onwe m . . . Etughị m ihe Mụ onwe m na-achọ, kama ihe Onye zitere m na-achọ.” Ọzọkwa, Jisọs achọghị nsọpụrụ sitere n’aka mmadụ, kama o nyere Jehova otuto maka ihe nile o mere. (Jọn 5:30, 41-44) Lee obi umeala ọ bụ!

Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, ndị ohu Jehova guzosiri ike n’ihe—dị ka Devid, Solomọn, Jọn Onye Na-eme Baptism, na ọbụna nwoke ahụ zuru okè bụ́ Jisọs Kraịst—gosipụtara obi umeala. Ha etughị ọnụ, ha adịghị nganga, ma ọ bụ mpako, ha agafeghịkwa ókè kwesịrị ekwesị. Ihe nlereanya ha zuru nnọọ ime ka ndị ohu Jehova nke oge a zụlite ma na-egosipụta obi umeala. Ma, a ka nwekwara ihe ndị ọzọ mere a ga-eji mee otú ahụ.

N’oge a jupụtara n’ọgba aghara n’akụkọ ihe mere eme nke ihe a kpọrọ mmadụ, obi umeala bụ àgwà dị oké ọnụ ahịa nye ezi ndị Kraịst. Ọ na-eme ka mmadụ nwee ike iso Jehova Chineke, ụmụ mmadụ ibe ya na-adị n’udo, nweekwa udo nke obi.

Iso Jehova Chineke Na-adị n’Udo

Anyị iso Jehova na-adị n’udo ga-ekwe omume nanị ma ọ bụrụ na anyị adịghị agafe ókè ọ kpaara ezi ofufe. Nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, gafere ókè Chineke kpara, ha ghọkwara ụmụ mmadụ mbụ dabara n’imebiga ihe ókè. Ha tụfuru ezi mmekọrịta ha na Jehova nwere, tinyere ebe obibi ha, ọdịnihu ha, na ndụ ha. (Jenesis 3:1-5, 16-19) Lee ihe dị nnọọ ukwuu o furu ha!

Ka anyị mụta ihe n’ọdịda Adam na Iv dara, n’ihi na ezi ofufe na-akpa ókè n’otú anyị na-aghaghị isi mee omume. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu na “ndị na-akwa iko, ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị, ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye, ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Jehova ji amamihe kpaa ókè ndị a maka ọdịmma anyị, anyị ga-egosipụtakwa amamihe site n’ịghara ịgafe ha. (Aịsaịa 48:17, 18) Ilu 11:2 na-agwa anyị, sị: “N’ebe ndị dị umeala n’obi nọ ka amamihe dị.”

Gịnị ma ọ bụrụ na otu òtù okpukpe agwa anyị na anyị pụrụ ịgafe ókè ndị a ma ka nọgide soro Chineke na-adị n’udo? Okpukpe ahụ na-anwa iduhie anyị. N’aka nke ọzọ, obi umeala na-enyere anyị aka iwulite mmekọrịta chiri anya n’ebe Jehova Chineke nọ.

Iso Ụmụ Mmadụ Ibe Anyị Na-adị n’Udo

Obi umeala na-emekwa ka anyị na ndị ọzọ na-enwe mmekọrịta udo. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị nne na nna setịpụrụ ihe nlereanya n’inwe afọ ojuju n’ihe ndị bụ́ isi ná ndụ na n’ibute ihe ime mmụọ ụzọ, o yikarịrị ka ụmụ ha hà ga-azụlite otu ụdị àgwà ahụ. Ọ ga-adịziri ndị nke ka obere mfe karị, inwe afọ ojuju, n’agbanyeghị na ha nwere ike ghara inweta ihe ha chọrọ mgbe nile. Nke a ga-enyere ha aka iji obi umeala na-ebi ndụ, ezinụlọ ga-ebikwa ndụ n’ụzọ udo karị.

Ọ dị ndị nlekọta mkpa ilezi anya karịsịa ịdị obi umeala ma ghara iji ikike ha na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Dị ka ihe atụ, a na-atụziri ndị Kraịst, sị: “Unu agabigala ihe e deworo n’akwụkwọ.” (1 Ndị Kọrint 4:6) Ndị okenye ọgbakọ na-aghọta na ha agaghị anwa ịmanye ndị ọzọ ime ihe n’ụzọ ha chọrọ. Kama nke ahụ, ha na-eji Okwu Chineke eme ihe dị ka ihe ndabere maka ịgba mmadụ ume ịgbaso ụzọ ziri ezi n’ihe banyere akparamàgwà, uwe, ejiji, ma ọ bụ ntụrụndụ. (2 Timoti 3:14-17) Mgbe ndị òtù ọgbakọ hụrụ na ndị okenye adịghị agafe ihe ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ, nke a na-eme ka a na-akwanyere ndị ikom a ùgwù ma na-atụnye ụtụ ná mmụọ obi ụtọ, ịhụnanya, na udo n’ime ọgbakọ.

Inwe Udo nke Obi

A na-eji udo nke obi akwụghachi ndị na-egosipụta obi umeala ụgwọ ọrụ. Oké ọchịchọ adịghị erikpu onye dị obi umeala. Nke a apụtaghị na o nweghị ihe mgbaru ọsọ onwe onye. Dị ka ihe atụ, ọ pụrụ ịchọ inwetakwu ihe ùgwù ije ozi, ma ọ na-echere Chineke, ọ na-enyekwa Jehova otuto maka ihe ùgwù ọ bụla o nwere dị ka onye Kraịst. Ọ dịghị ele ha anya dị ka ihe ndị ọ rụzuru n’onwe ya. Nke a na-adọtakwu onye ahụ dị obi umeala nso n’ebe Jehova, bụ́ “Chineke nke udo,” nọ.—Ndị Filipaị 4:9.

Were ya na anyị na-eche mgbe ụfọdụ na ndị ọzọ na-eleghara anyị anya. Ọ́ gaghị aka mma na e leghaara anyị anya n’ihi na anyị dị obi umeala kama iji mpako na-adọrọ uche aga n’ebe anyị onwe anyị nọ? Oké ọchịchọ adịghị erikpu ndị dị obi umeala. N’ihi ya, ha na-enwe udo n’ime onwe ha, bụ́ nke bara uru maka ahụ ike mmetụta uche na nke anụ ahụ.

Ịzụlite na Ịnọgide Na-enwe Obi Umeala

Adam na Iv dabara n’imebiga ihe ókè—àgwà nke ha bufeere ụmụ ha. Gịnị pụrụ inyere anyị aka izere ihie otu ụzọ ahụ nne na nna anyị mbụ hiere? Olee otú anyị pụrụ isi zụlite ezi àgwà nke obi umeala?

Nke mbụ, inwe nghọta zuru ezu nke ọnọdụ anyị ma e jiri ya tụnyere nke Jehova, bụ́ Onye Okike nke eluigwe na ala, ga-enyere anyị aka. Olee ihe ndị anyị rụzuru n’onwe anyị ndị anyị pụrụ ịzọrọ na a pụrụ iji ha tụnyetụdịrị ihe ndị Chineke rụzuru? Jehova jụrụ ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job, sị: “Olee ebe ị nọ mgbe M tọrọ ntọala ụwa? Gosi m, ma ọ bụrụ na ị maara nghọta.” (Job 38:4) Job apụghị inye azịza ọ bụla. Ọ̀ bụ na a kpaaraghị ihe ọmụma, ikike, na ahụmahụ anyị ókè n’otu aka ahụ? Ọ̀ bụ na ọ baghịrị anyị uru ikweta na anyị erughị eru?

Ọzọkwa, Bible na-agwa anyị, sị: “Jehova nwe ụwa na ùjú ya; elu ụwa dum mmadụ bi na ndị bi n’ime ya.” Nke a na-agụnye “anụ ọhịa ọ bụla nke oké ọhịa, ya na anụ nile n’elu [otu puku ugwu].” Jehova pụrụ ikwu, sị: “Mụ nwe ọlaọcha nile, ọ bụkwa Mụ nwe ọlaedo nile.” (Abụ Ọma 24:1; 50:10; Hagaị 2:8) Olee ihe onwunwe anyị pụrụ iwepụta nke a pụrụ iji tụnyere ndị nke Jehova? Leenụ, ọbụna mmadụ kasị baa ọgaranya enweghị ihe mere ọ ga-eji tuo ọnụ n’ihe o nwere! Ya mere, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịgbaso ndụmọdụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke Pọl onyeozi nyere ndị Kraịst nọ na Rom, sị: “Esitere m n’amara nke e nyere m sị onye ọ bụla nọ n’etiti unu, ka ọ ghara ịtụkwasị uche n’onwe ya karịa nke o kwesịrị ịtụkwasị uche.”—Ndị Rom 12:3.

Dị ka ndị ohu Chineke bụ́ ndị na-achọ ịzụlite obi umeala, anyị kwesịrị ikpe ekpere maka mkpụrụ nke mmụọ nsọ—ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, ikwesị ntụkwasị obi, ịdị nwayọọ, imeru ihe n’ókè. (Luk 11:13; Ndị Galetia 5:22, 23) N’ihi gịnị? N’ihi na nke ọ bụla n’ime àgwà ndị a ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe ịdị obi umeala. Dị ka ihe atụ, inwe ịhụnanya n’ebe ụmụ mmadụ ibe anyị nọ ga-enyere anyị aka ịluso àgwà nke itu ọnụ ma ọ bụ mpako ọgụ. Imeru ihe n’ókè ga-emekwa ka anyị kwụsị ma chee echiche tupu anyị ana-emebiga ihe ókè.

Ka anyị kpachara anya! Ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche mgbe nile megide ọnyà nke imebiga ihe ókè. Abụọ n’ime ndị eze ahụ a kpọtụrụ aha ná mmalite adịghị obi umeala n’oge nile. Eze Devid mere ihe n’echeghị echiche site n’ịgụ ụmụ Israel ọnụ, bụ́ ihe megidere uche Jehova. Eze Solomọn ghọrọ onye na-emebiga ihe ókè ọbụna ruo n’ókè nke ikere òkè n’ofufe ụgha.—2 Samuel 24:1-10; 1 Ndị Eze 11:1-13.

Ruo ogologo oge nile usoro ihe a na-adịghị asọpụrụ Chineke ga-adịru, ịdị obi umeala chọrọ ịnọ na nche mgbe nile. Otú ọ dị, o ruru mgbalị e tinyere na ya. N’ụwa ọhụrụ Chineke, ndị ga-emejupụta ọha mmadụ ga-abụ nanị ndị dị obi umeala. Ha ga-ewere obi umeala dị ka ikike, ọ bụghị dị ka adịghị ike. Lee ka ọ ga-esi magbuo onwe ya mgbe a ga-eji udo nke na-esite n’obi umeala gọzie mmadụ na ezinụlọ nile!

[Foto dị na peeji nke 23]

Jisọs ji obi umeala nye Jehova otuto maka ihe nile o mere