Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Jisọs Kraịst Pụrụ Isi Nyere Anyị aka

Otú Jisọs Kraịst Pụrụ Isi Nyere Anyị aka

Otú Jisọs Kraịst Pụrụ Isi Nyere Anyị aka

IHE Jisọs Kraịst mere iji nyere ndị mmadụ aka mgbe ọ nọ n’ụwa dị egwu. Nke a bụ nnọọ eziokwu nke na, mgbe otu onye ji anya ya hụ ihe merenụ hotasịrị ọtụtụ ihe Jisọs mere ná ndụ ya, o kwuru, sị: “Ma ọtụtụ ihe ọzọ nke Jisọs mere dịkwa, nke, ma ọ bụrụ na e dere ha n’akwụkwọ n’otu n’otu, ọ dị m ka ọbụna ụwa onwe ya agaghị anagide akwụkwọ a ga-ede.” (Jọn 21:25) Ebe ọ bụ na Jisọs mere ihe dị nnọọ ukwuu n’ụwa, anyị pụrụ ịjụ, sị: ‘Ọ̀ pụrụ isi aṅaa bụrụ onye inyeaka anyị ebe ọ nọ n’eluigwe? Ànyị pụrụ irite uru ugbu a site n’ọmịiko Jisọs?’

Azịza ha bụ ihe kasị enye obi ụtọ ma na-emesighachi obi ike. Bible na-agwa anyị na Kraịst bara “n’eluigwe onwe ya, igosi Onwe ya n’ihu Chineke n’ihi anyị ugbu a.” (Ndị Hibru 9:24) Gịnị ka o meere anyị? Pọl onyeozi na-akọwa, sị: “[Kraịst esiteghị] n’ọbara nke ewu na nke ụmụ ehi, kama O sitere n’ọbara nke Ya onwe ya, baa n’ebe nsọ [“eluigwe onwe ya”] nanị otu mgbe, ebe Ọ chọpụtara mgbapụta ebighị ebi.”—Ndị Hibru 9:12; 1 Jọn 2:2.

Lee ozi ọma nke ahụ bụ! Kama ịkwụsị ọrụ dị ebube Jisọs na-arụrụ ụmụ mmadụ, nrịgo ọ rịgoro n’eluigwe mere ka o nwee ike imere ihe a kpọrọ mmadụ ihe ọbụna karị. Nke ahụ bụ n’ihi na Chineke, n’ebere ya dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ, họpụtara Jisọs ije ozi dị ka “onye na-ejere ọha mmadụ ozi”—onyeisi nchụàjà—“n’aka nri nke ocheeze nke Onye Ukwu ahụ n’eluigwe.”—Ndị Hibru 8:1, 2, NW.

“Onye Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”

Mgbe ahụ, Jisọs ga-abụ onye na-ejere ihe a kpọrọ mmadụ ozi n’eluigwe. Ọ ga-arụ ọrụ yiri nke ahụ onyeisi nchụàjà Israel rụụrụ ndị fere Chineke ofufe n’oge ochie. Oleekwa ọrụ ọ bụ? Pọl na-akọwa, sị: “A na-edo onyeisi nchụàjà ọ bụla iche onyinye na àjà dị iche iche n’ihu Chineke: o sitere na nke a dị mkpa ka Onyeisi nchụàjà nke a [Jisọs Kraịst ahụ rịgooro n’eluigwe] nweekwa ihe iche n’ihu Chineke.”—Ndị Hibru 8:3.

Jisọs nwere ihe ọ ga-achụ n’àjà bụ́ nke dị nnọọ ukwuu karịa ihe onyeisi nchụàjà nke oge ochie chụrụ n’àjà. “A sị na ọbara nke ewu na nke oké ehi” pụrụ iwetara Israel oge ochie ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị ọcha ime mmụọ, “ọbara Kraịst . . . ga-esi aṅaa ghara ime akọ na uche anyị ka ọ dị karị ọcha nke ukwuu hie nne pụọ n’ọrụ nile nwụrụ anwụ ikpere Chineke dị ndụ?”—Ndị Hibru 9:13, 14.

Jisọs bụkwa onye a ma ama na-ejere ọha mmadụ ozi, n’ihi na e nyewo ya anwụghị anwụ. N’Israel oge ochie, “e mewo ndị ahụ ka ha bụrụ ndị nchụàjà hiri nne, n’ihi na ọnwụ na-egbochi ha ịnọgide.” Ma gịnị banyere Jisọs? Pọl na-ede, sị: “O nwere ọnọdụ onye nchụàjà Ya na-adịghị agabiga onye ọzọ. O sitekwara na nke a pụ ịzọpụtachasị ndị na-esite n’aka Ya abịakwute Chineke, ebe Ọ na-adị ndụ mgbe nile ịrịọ arịrịọ n’ihi ha.” (Ndị Hibru 7:23-25; Ndị Rom 6:9) Ee, n’aka nri Chineke n’eluigwe, anyị nwere onye na-ejere ọha mmadụ ozi bụ́ onye ‘na-adị ndụ mgbe nile ịrịọ arịrịọ n’ihi anyị.’ Cheedị ihe nke ahụ pụtara nye anyị ugbu a!

Mgbe Jisọs nọ n’ụwa, ndị mmadụ nuuru jekwuru ya maka enyemaka, mgbe ụfọdụ kwa, ha na-esi n’ebe dị anya nke ukwuu bịa iji nweta enyemaka ya. (Matiu 4:24, 25) N’eluigwe, ndị si ná mba nile pụrụ ijekwuru Jisọs mgbe ọ bụla ha chọrọ. N’ọnọdụ ya dị elu n’eluigwe, ọ nọ ya mgbe nile dị ka onye na-ejere ọha mmadụ ozi.

Ụdị Onyeisi Nchụàjà Dị Aṅaa Ka Jisọs Bụ?

Nkọwa banyere Jisọs Kraịst bụ́ nke e dekọrọ n’Oziọma ndị ahụ na-eme ka anyị ghara inwe obi abụọ banyere enyemaka na ọmịiko ya. Lee onye na-achụ onwe ya n’àjà ọ bụ! N’ihe karịrị otu ugboro, a manyere aka n’oge nke aka ya mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya chọrọ inwe ezumike dị ha nnọọ mkpa. Kama iche na a na-anapụ ya oge dị oké ọnụ ahịa nke udo na ịnọ jụụ, “o nwere ọmịiko” n’ahụ ndị ahụ chọrọ enyemaka ya. Ọbụna mgbe ike gwụrụ Jisọs, mgbe agụụ na-agụ ya, na mgbe akpịrị na-akpọ ya nkụ, ‘ọ naara ha nke ọma’ ma dị njikere ịnọ n’erighị nri ma ọ bụrụ na ọ pụrụ inyere ndị mmehie obi ha ziri ezi aka.—Mak 6:31-34; Luk 9:11-17; Jọn 4:4-6, 31-34.

N’ịbụ onye ọmịiko kpaliri, Jisọs weere nzọụkwụ kwesịrị ekwesị iji gboo mkpa anụ ahụ, nke mmetụta uche, na nke ime mmụọ nke ndị mmadụ. (Matiu 9:35-38; Mak 6:35-44) Ọzọkwa, ọ kụziiri ha ịchọta ahụ efe na nkasị obi na-adịgide adịgide. (Jọn 4:7-30, 39-42) Dị ka ihe atụ, lee ka òkù ọ kpọrọ n’onwe ya si bụrụ ihe na-adọrọ adọrọ: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu.”—Matiu 11:28, 29.

Ịhụnanya Jisọs nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ dị nnọọ ukwuu nke na o nyere ndụ ya n’ikpeazụ maka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie. (Ndị Rom 5:6-8) N’akụkụ a, Pọl onyeozi tụgharịrị uche, sị: “Onye ahụ [Jehova Chineke] Nke na-azọdoghị Ọkpara nke aka Ya, kama Ọ raara Ya nye n’ihi anyị nile, Ọ̀ ga-esi aṅaa ghara inyekwa anyị ihe nile n’amara ebe O weresịịrị Onye ahụ nye anyị? . . . Ọ̀ bụ Kraịst Jisọs Onye nwụrụ, ma nke karịrị, e mere Ya ka O si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, Onye nọ n’aka nri Chineke, Onye na-arịọkwara anyị arịrịọ?”—Ndị Rom 8:32-34.

Onyeisi Nchụàjà nke Pụrụ Iji Obi Soro Ndị Ọzọ Hụkọọ Ahụhụ

Dị ka mmadụ, Jisọs nwere ahụmahụ nke ịnọ agụụ, akpịrị ịkpọ nkụ, ike ọgwụgwụ, nhụjuanya, ihe mgbu, na ọnwụ. Ihe isi ike na nrụgide ndị ọ tachiri obi na ha kwadebere ya n’ụzọ pụrụ nnọọ iche ijere ihe a kpọrọ mmadụ na-ahụsi anya ozi dị ka Onyeisi Nchụàjà. Pọl dere, sị: “[Jisọs] sitere na ya jie ụgwọ ka e mee ka O yie ụmụnna Ya n’ihe nile, ka O wee ghọọ onyeisi nchụàjà dị ebere, Onye kwesịkwara ntụkwasị obi, n’ihe nile dịịrị Chineke, ka O wee mee ka obi Chineke jụrụ n’ebe mmehie nile nke ndị nke Ya dị. N’ihi na ebe Ya onwe ya hụworo ahụhụ site n’ọnwụnwa a nwara Ya, Ọ pụrụ inyere ndị a na-anwa aka.”—Ndị Hibru 2:17, 18; 13:8.

Jisọs gosipụtara na ya ruru eru ma dị njikere inyere ndị mmadụ aka ịbịarukwu Chineke nso. Otú ọ dị, nke a ọ̀ pụtara na ọ ghaghị ịrụgide Chineke nke dị aka ike na-adịghị eme ebere, onye na-adịghị njikere ịgbaghara mmehie, ka ọ gbanwee àgwà ya? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi na Bible na-emesi anyị obi ike na “Onyenwe anyị, dị mma, [Ọ] bụkwa onye na-agbaghara mmehie.” Ọ na-ekwukwa, sị: “Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, Ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa Onye ezi omume, ka O wee gbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume nile.” (Abụ Ọma 86:5; 1 Jọn 1:9) N’ezie, okwu na omume ọmịiko Jisọs na-eme ka ọmịiko, ebere, na ịhụnanya nke Nna ya pụta ìhè.—Jọn 5:19; 8:28; 14:9, 10.

Olee otú Jisọs si ewetara ndị mmehie nwere nchegharị ahụ efe? Ọ bụ site n’inyere ha aka ịchọta ọṅụ na afọ ojuju ná mgbalị ndị ha ji ezi obi na-eme iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ. N’idegara ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ akwụkwọ, Pọl chịkọtara ọnọdụ ahụ site n’ikwu, sị: “Ya mere ebe anyị nwere Onyeisi nchụàjà dị ukwuu, Onye gabigaworo eluigwe nile, bụ́ Jisọs Ọkpara Chineke, ka anyị jidesie nkwupụta anyị ike. N’ihi na anyị enweghị onyeisi nchụàjà onye na-apụghị iji obi soo anyị hụkọọ ahụhụ n’adịghị ike anyị; kama anyị nwere Onye a nwaworo n’ihe nile n’otu ụzọ ahụ a na-anwa anyị, ma O mehieghị. Ya mere ka anyị were nkwuwa okwu bịaruo ocheeze amara, ka e wee meere anyị ebere, ka anyị wee hụkwa amara inyere anyị aka n’oge mkpa.”—Ndị Hibru 4:14-16.

‘Enyemaka n’Oge Mkpa’

Otú ọ dị, gịnị ka anyị pụrụ ime mgbe nsogbu ndị anyị chere na anyị apụghị idozi chere anyị ihu—ajọ ọrịa, ibu arọ na-anyịgbu anyịgbu nke obi amamikpe, oké nkụda mmụọ, na ịda mbà n’obi? Anyị pụrụ iji kpọmkwem ndokwa ahụ Jisọs n’onwe ya dabeere na ya mgbe nile mee ihe—ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke ekpere. Dị ka ihe atụ, n’abalị ahụ tupu ọ tọgbọ ndụ ya n’ihi anyị, “O [kpere] ekpere sie ike karị: ọsụsọ Ya wee ghọọ ihe dị ka oké ọkpụrụkpụ ọbara na-ada n’ala.” (Luk 22:44) Ee, Jisọs maara otú ikpekusi Chineke ekpere ike na-adị. O “[weere] ịkwa ákwá siri ike na anya mmiri chee ekpere na arịrịọ n’ihu Onye ahụ pụrụ ịzọpụta Ya n’ọnwụ, mgbe a nụsịkwara olu Ya n’ihi na Ọ tụrụ egwu Chineke.”—Ndị Hibru 5:7.

Jisọs maara otú ịbụ ndị a ‘nụrụ olu ha’ na ndị e wusiri ike dịruru ụmụ mmadụ ná mkpa. (Luk 22:43) Ọzọkwa, o kwere nkwa, sị: “Ọ bụrụ na unu ga-arịọ Nna m ihe ọ bụla, Ọ ga-enye unu ya n’aha m. . . . Rịọnụ, unu ga-arịọtakwa, ka ọṅụ unu wee zuo.” (Jọn 16:23, 24) N’ihi ya, anyị pụrụ ịrịọ Chineke arịrịọ, na-enwe obi ike na ọ ga-ekwe ka Ọkpara ya jiri ikike ya na uru nke àjà mgbapụta ya mee ihe maka anyị.—Matiu 28:18.

Anyị pụrụ ijide n’aka na n’ọkwá ya n’eluigwe, Jisọs ga-eweta ụdị enyemaka kwesịrị ekwesị n’oge ya. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị emee mmehie nke anyị ji ezi obi na-akwara ụta, anyị pụrụ inweta nkasi obi site ná mmesi obi ike bụ́ na “anyị nwere [onye inyeaka, NW] n’ebe Nna anyị nọ, Ya bụ Jisọs Kraịst, bụ́ Onye ezi omume.” (1 Jọn 2:1, 2) Onye Inyeaka na Onye Nkasi Obi anyị nke nọ n’eluigwe ga-arịọchitere anyị arịrịọ ka e wee zaa ekpere ndị anyị na-ekpe n’aha ya nakwa n’ụzọ kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ.—Jọn 14:13, 14; 1 Jọn 5:14, 15.

Igosi Ekele Maka Enyemaka Kraịst

A chọkwuru ihe ndị ọzọ ma e wezụga ịrịọ Chineke arịrịọ site n’aka Ọkpara ya. Site n’uru nke àjà mgbapụta ya, “Kraịst,” ghọrọ, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ‘Onyenwe na Onye Mgbapụta’ nke agbụrụ mmadụ. (Ndị Galetia 3:13; 4:5; 2 Pita 2:1) Anyị pụrụ igosi obi ekele anyị maka ihe nile Kraịst meere anyị site n’ikweta na ọ bụ ya nwe anyị na iji obi ụtọ na-aza òkù ya bụ́: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ka o soo m n’azụ, ya jụ onwe ya, buliekwa [osisi ịta ahụhụ, NW] ya kwa ụbọchị, na-esokwa m.” (Luk 9:23) ‘Mmadụ ịjụ onwe ya’ abụghị nanị iji ọnụ kwuo na ọ bụ onye ọzọ nwezi ya. E kwuwerị, Kraịst “nwụkwara n’ọnọdụ mmadụ nile, ka ndị dị ndụ wee ghara ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị Onye ahụ ndụ, bụ́ Onye nwụrụ n’ọnọdụ ha, e meekwa ka O si n’ọnwụ bilie.” (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) Ya mere, inwe ekele maka ihe mgbapụta ahụ ga-enwe mmetụta dị ukwuu n’echiche, ihe mgbaru ọsọ, na n’ụzọ ndụ anyị. Ụgwọ anyị ji “Jisọs Kraịst; Onye nyere Onwe ya n’ihi anyị,” ruo mgbe ebighị ebi kwesịrị ịkwali anyị ịmụtakwu ihe banyere ya na Nna ya na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova Chineke. Anyị kwesịkwara ịchọ ito eto n’okwukwe, ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ bara uru nke Chineke, na ‘ịnụrụ ọrụ ọma ọkụ n’obi.’—Taịtọs 2:13, 14; Jọn 17:3.

Ọgbakọ ndị Kraịst bụ ebe anyị si enweta nri ime mmụọ, agbamume, na nduzi ndị na-abịa n’oge ha. (Matiu 24:45-47; Ndị Hibru 10:21-25) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ dị ndị na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ, ha pụrụ “[ịkpọ ndị okenye a họpụtara ahọpụta] nke nzukọ Kraịst.” Jemes na-agbakwụnye mmesi obi ike bụ́: “Ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike, Onyenwe anyị ga-emekwa ka o bilie; ọ bụrụkwa na o mehieworo, a ga-agbaghara ya mmehie ahụ.”—Jemes 5:13-15.

Iji maa atụ: Otu nwoke nọ mkpọrọ na South Africa degaara otu onye okenye ọgbakọ akwụkwọ, na-ekwupụta ekele ya maka “Ndịàmà Jehova nile bụ́ ndị na-arụ ezi ọrụ ahụ Jisọs Kraịst malitere n’inyere ndị mmadụ aka ịgbalịsi ike iji banye Alaeze Chineke.” O deziri, sị: “Aṅụrịrị m ọṅụ nke ukwuu maka inweta akwụkwọ ozi gị. Nchegbu i nwere maka mgbapụta ime mmụọ m metụrụ m n’ahụ nke ukwuu. Ọ bụ ihe mekwuru m ga-eji malite ịṅa ntị n’òkù Jehova Chineke na-akpọ maka nchegharị. Ruo afọ 27, anọwo m na-asụ ngọngọ, na-akpafukwa n’ọchịchịrị nke mmehie, aghụghọ, ịda iwu, omume rụrụ arụ, na okpukpe ndị a na-enyo enyo. Mgbe a kọwasịịrị Ndịàmà Jehova onye m bụ, echere m na achọtawo m ụzọ ahụ n’ikpeazụ—ezi ụzọ ahụ! Nanị ihe m ga-eme bụ iso ya.”

Enyemaka Ndị Ọzọ n’Ọdịnihu Dị Nso

Ọnọdụ ụwa nke na-ajọwanye njọ bụ ihe àmà doro anya na anyị na-ebi n’oge dị oké mkpa bụ́ nke ga-ebu ntiwapụ nke ‘oké mkpagbu ahụ’ ụzọ. Ka ọ dị ugbu a, oké ìgwè mmadụ bụ́ ndị si ná mba nile, ebo nile, ndị nile, na asụsụ nile ‘na-asa uwe mwụda ha, na-emekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa atụrụ ahụ.’ (Mkpughe 7:9, 13, 14; 2 Timoti 3:1-5) Site n’igosipụta okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs, a na-agbaghara ha mmehie ha ma na-enyere ha aka isoro Chineke na-enwe mmekọrịta chiri anya—n’ezie, na-aghọ ndị enyi ya.—Jemes 2:23.

Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, “ga-azụ [ndị lanarịrị oké mkpagbu ahụ] dị ka atụrụ, Ọ ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ: Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.” (Mkpughe 7:17) Mgbe ahụ, Kraịst ga-arụtọpụ ọrụ ya dị ka Onyeisi Nchụàjà. Ọ ga-enyere ndị nile bụ́ ndị enyi Chineke aka irite uru zuru ezu site “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ”—n’ụzọ ime mmụọ, n’ụzọ anụ ahụ, n’uche, na n’ụzọ mmetụta uche. Mgbe ahụ, a ga-arụzu ihe Jisọs malitere ịrụ na 33 O.A. na ihe ọ nọgideworo na-arụ n’eluigwe kemgbe ahụ, ruo izu okè.

Ya mere, adala mbà mgbe ọ bụla igosipụta ekele miri emi i nwere maka ihe nile Chineke na Kraịst mewooro—ma na-emere—anyị. Pọl onyeozi gbara ume, sị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: . . . Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Filipaị 4:4, 6, 7.

E nwere ụzọ dị mkpa ị pụrụ isi gosipụta obi ekele gị n’ebe Jisọs Kraịst, bụ́ Onye Inyeaka anyị nke eluigwe, nọ. Mgbe anyanwụ dasịrị na Wednesday, April 19, 2000, Ndịàmà Jehova nọ gburugburu ụwa ga-agbakọta ime Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. (Luk 22:19) Nke a ga-abụrụ gị ohere ime ka ekele i nwere maka àjà mgbapụta Kraịst mikwuo emie. E ji obi ụtọ kasịnụ na-akpọ gị òkù ịbịa ma nụrụ otú ndokwa dị ebube Chineke mere maka nzọpụta site n’aka Kraịst pụrụ isi baara gị uru ruo mgbe ebighị ebi. Biko jụọ Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè unu maka kpọmkwem oge na ebe a ga-enwe nzukọ a pụrụ iche.

[Foto dị na peeji nke 7]

Jisọs maara otú ikpekusi Chineke ekpere ike na-adị

[Foto ndị dị na peeji nke 8]

Kraịst ga-enyere anyị aka ịnagide nsogbu ndị nanị anyị na-apụghị idozi

[Foto dị na peeji nke 9]

Kraịst na-enyere anyị aka site n’aka ndị okenye na-ahụ n’anya